< До євреїв 1 >

1 Багато разі́в і багатьма́ способа́ми в давнину́ промовляв був Бог до отців через пророків,
Na mgbe ochie, Chineke gwara nna nna anyị ha okwu nʼoge dị iche iche site nʼọnụ ndị amụma, na site nʼụzọ ndị ọzọ dị iche iche.
2 а в останні ці дні промовляв Він до нас через Сина, що Його настанови́в за Наслідника всього, що Ним і віки́ Він створив. (aiōn g165)
Ma nʼoge ikpeazụ ndị a, ọ gwala anyị okwu site nʼọnụ Ọkpara ya, onye o nyefere ihe niile nʼaka. Ọ bụ site nʼaka ya ka o siri kee ụwa niile na ihe dị nʼime ya. (aiōn g165)
3 Він був сяєвом слави та образом істоти Його, трима́в усе словом сили Своєї, учинив Собою очи́щення наших гріхів, — і засів на прави́ці величности на висоті.
Ọ na-enwupụta ebube ya na-anọchitekwa anya ụdịdị ya, ebe o ji okwu ya dị ike na-ejikọta ihe niile. Mgbe ọ sachapụrụ ma hichapụkwa mmehie niile, ọ nọdụrụ nʼaka nri nke Onye dị ukwuu, dị elu nʼeluigwe.
4 Він остільки був ліпший понад анголі́в, оскільки славніше за них успадкува́в Ім'я́.
Ya mere, ọ bụrụla onye dị ukwu karịa ndị mmụọ ozi dị ka aha e nyere ya si dị elu karịa nke ha.
5 Кому́ бо коли з анголів Він промовив: „Ти Мій Син, — Я сьогодні Тебе породив“! І зно́ву: „Я буду Йому за Отця, а Він Мені буде за Сина“!
Onye nʼetiti ndị mmụọ ozi ka ọ gwarala sị, “Ị bụ Ọkpara m. Taa abụrụla m Nna gị”? Maọbụ ọzọkwa, “Aga m abụrụ ya Nna, ya onwe ya ga-abụkwara m Nwa”?
6 І коли знов Він уводить на світ Перворі́дного, то гово́рить: „І нехай Йому вкло́няться всі анголи Божі“.
Ọzọkwa, mgbe o mere ka nwa mbụ ya bịa nʼụwa, o nyere iwu sị, “Ka ndị mmụọ ozi Chineke niile fee ya ofufe.”
7 А про анголів Він говорить: „Ти чиниш духів ангола́ми Своїми, а палю́чий огонь — Своїми слугами“.
O kwukwara banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị, “Ọ na-eme ndị mmụọ ozi ya ka ha bụrụ ikuku, na-emekwa ndị na-ejere ya ozi ka ha bụrụ ire ọkụ.”
8 А про Сина: „Престол Твій, о Боже, навік віку; бе́рло Твого царюва́ння — бе́рло праведности. (aiōn g165)
Ma banyere Ọkpara ahụ, ọ sịrị, “Ocheeze gị, O Chineke, ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ. (aiōn g165)
9 Ти полюбив праведність, а беззако́ння знена́видів; через це намасти́в Тебе, Боже, Твій Бог оливою радости більше, ніж дру́зів Твоїх“.
Ị hụrụ ezi omume nʼanya ma kpọọ ihe ọjọọ asị. Nʼihi nke a, Chineke, nke bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị niile site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.”
10 І: „Ти, Господи, землю колись закла́в, а небо — то чин Твоїх рук.
Ọ sịkwara, “Na mmalite, Onyenwe anyị, ọ bụ gị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.
11 Загинуть вони, а Ти будеш стояти, — всі вони, як той одяг, поста́ріють.
Ha ga-ala nʼiyi, ma gị onwe gị ga-anọgide. Ha niile ga-aka nka dịka uwe.
12 Як одежу, їх змі́ниш, — і минуться вони, а Ти за́вжди Той Са́мий, і роки Твої не закі́нчаться“!
Ị ga-apịakọta ha, gbanwee ha dị ka akwa. Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe. Ọnụọgụgụ afọ gị agaghị enwe ọgwụgwụ ruo mgbe ebighị ebi.”
13 Кому з анголів Він промовив коли: „Сядь право́руч Мене, доки не покладу́ Я Твоїх ворогів підніжком ногам Твоїм“!
O nweela mmụọ ozi ọbụla ọ sịrị, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị”?
14 Чи не всі вони ду́хи служебці, що їх посилають на службу для тих, хто має спасіння вспадкувати?
Ndị mmụọ ozi niile, ha abụghị mmụọ ndị na-ejere Chineke ozi, ndị a na-ezipụ ka ha jee ozi nʼihi ndị ahụ ga-eketa nzọpụta?

< До євреїв 1 >