< Дії 19 >
1 І сталося, що коли Аполло́с перебував у Кори́нті, то Павло, перейшовши горі́шні країни, прибув до Ефе́су, і деяких учнів знайшов,
Mgbe Apọlọs nọ na Kọrint, Pọl sitere ụzọ nke nʼime elu ala bịarute Efesọs. Nʼebe ahụ, ọ hụrụ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ,
2 та й спитав їх: „Чи ви Духа Святого одержали, як увірували?“А вони відказали йому: „Та ми навіть не чули, чи є Дух Святий!“
sị ha, “Unu natakwara Mmụọ Nsọ mgbe unu kweere?” Ha sịrị ya, “Mba, anyị anụbeghị na ọ nwere ihe dịka Mmụọ Nsọ.”
3 І він запитав: „Тож у що́ ви христились?“Вони ж відказали: В Іванове хрищення“.
Ya mere, ọ sịrị, “Gịnị ka unu kwenyere nʼime ya mgbe e mere unu baptizim?” Ha sịrị, “Baptizim nke Jọn.”
4 І промовив Павло: „Таж Іван христив хрищенням на покая́ння, говорячи лю́дям, щоб вірили в Того, Хто при́йде по ньому, цебто в Ісуса“.
Mgbe ahụ, Pọl sịrị, “Baptizim Jọn bụ nke gbasara nchegharị site na mmehie, na-agwa ndị mmadụ ka ha kwere nʼonye ahụ na-eso ya na-abịa, nke bụ, ikwere nʼime Jisọs.”
5 Як почули ж ́, то христились вони в Ім'я́ Господа Ісуса.
Mgbe ha nụrụ nke a, e mere ha baptizim nʼaha Onyenwe anyị Jisọs.
6 А коли Павло руки на них покла́в, то зійшов на них Дух Святий, — і різними мовами стали вони промовляти та пророкувати!
Mgbe Pọl bikwasịrị ha aka ya abụọ nʼisi, ha natara Mmụọ Nsọ. Ha kwukwara okwu nʼasụsụ dị iche iche, bukwaa amụma.
7 А всіх їх було́ чоловіка з двана́дцять.
Ha niile ruru ndị ikom iri na abụọ.
8 А до синагоги ввійшовши, промовляв він відважно, три місяці про Боже Царство навчаючи та переконуючи.
Ọ banyere nʼụlọ nzukọ ahụ ma were nkwuwa okwu, na ịrụ ụka nʼebe o doro anya gwasie ha okwu ike banyere alaeze Chineke. Ọ bụ ọnwa atọ ka o were ya ime nke a.
9 А коли опиралися дехто й не вірували, і дорогу Господню лихосло́вили перед наро́дом, то він їх покинув і виділив учнів, і щодня проповідував у школі одно́го Тира́на.
Ma ụfọdụ nʼime ha mechiri obi ha; ha juru ikwenye, kama ha kwuru okwu ọjọọ megide Ụzọ ahụ nʼihu ọgbakọ ahụ niile. Ya mere, o sitere nʼebe ha nọ pụọ, kpọrọkwa ndị na-eso ụzọ ahụ, ha na-akparịta ụka kwa ụbọchị nʼụlọ ọgbakọ Tiranọs.
10 Це ж два роки продовжувалось, так що всі, хто замешкував в Азії, юдеї та ге́ллени, слухали слово про Господа.
Ihe ndị a gakwara nʼihu afọ abụọ. Ndị niile bi na Eshịa nụkwara oziọma Onyenwe anyị. Ọtụtụ nʼime ha bụ ndị Juu, ma ndị ọzọ bụ ndị Griik.
11 І Бог чуда чинив надзвича́йні руками Павловими,
Chineke sitere nʼaka Pọl rụọ ọtụtụ ọrụ ebube pụrụ iche.
12 так що навіть хустки́ й пояси́ з його тіла прино́сили хворим, — і хвороби їх кидали, і ду́хи лукаві вихо́дили з них.
Nke bụ na-ewere ụfọdụ nʼime akịsị maọbụ ịchafọ na akwa mgbochi nke metụrụ ya nʼahụ na-atụkwasị nʼahụ ndị ọrịa, ahụ a dịkwa ha ike. E sitekwara na ya chụpụ mmụọ ọjọọ.
13 Дехто ж із мандрівни́х ворожби́тів юдейських зачали́ закликати Ім'я́ Господа Ісуса над тими, хто мав злих духів, проказуючи: Заклинаємо вас Ісусом, Якого Павло́ проповідує!“
Ụfọdụ ndị Juu dịkwa ndị na-ejegharị nʼobodo dị iche iche na-achụpụ mmụọ ọjọọ nʼime mmadụ. Ha chọkwara ime nke a nʼaha Onyenwe anyị Jisọs na-asị, “E ji m aha Jisọs, onye Pọl na-ekwusa na-enye unu iwu ka unu site nʼime ya pụta.”
14 Це ж робили якісь сім синів юдейського первосвященика Ске́ви.
Ndị na-eme ihe dị otu a bụ ụmụ asaa nke Skiva, onyeisi nchụaja, bụ onye Juu.
15 Відповів же злий дух і сказав їм: „Я знаю Ісуса, і знаю Павла, а ви хто такі?“
Mmụọ ọjọọ ahụ zara ha sị, “Amaara m onye Jisọs bụ, amakwaara m onye Pọl bụ, ma unu onwe unu, unu bụ ndị ole?”
16 І ско́чив на них чоловік, що в ньому злий дух був, і, перемігші обох, поду́жав їх так, що втекли вони з дому нагі́ та пора́нені.
Nwoke ahụ mmụọ ọjọọ na-achị makwasịrị ha, tie ha ihe nke ukwuu, mee ka ha gbaa ọsọ. Ha gbara ọtọ gbapụ nʼụlọ ahụ. Ha merụkwara ahụ.
17 І це стало відо́ме юдеям та ге́лленам, усім, що в Ефесі замешкують, — і о́страх напав на всіх їх, і сла́вилося Ім'я́ Господа Ісуса.
Akụkọ banyere ihe ndị a jezuru obodo Efesọs niile. Mgbe ahụ, ndị Juu na ndị Griik ụfọdụ nụkwara ihe ndị a. Oke egwu jidekwara ha. Nʼihi nke a, e mekwara ka aha Onyenwe anyị Jisọs daa ụda nʼebe niile.
18 І багато-хто з тих, що ввірували, прихо́дили, визнаваючи та відкриваючи вчинки свої.
Ọtụtụ ndị kwenyerenụ bịara na-ekwupụta omume ọjọọ ha niile, nʼihu mmadụ niile.
19 І багато-хто з тих, що займалися ча́рами, позно́сили книги свої та й перед усіма́ попалили. І злічили ціну́ їх, і вийшло на срібло п'ятдесят тисяч драхм.
Ọtụtụ nʼime ndị na-agwọ ọgwụ mgbaasị bupụtara akwụkwọ niile ha ji na-eme mgbaasị, kpọọ ha ọkụ nʼihu mmadụ niile. Akwụkwọ niile a kpọrọ ọkụ nʼụbọchị ahụ ga-eru ego ruru puku ọlaọcha iri ise.
20 Так могуче росло та зміцнялося Вожеє Слово!
Ya mere, okwu Onyenwe anyị toro, na-agbasa nʼike nʼike na-adịkwa ire.
21 А як спо́внилось це, Павло в Дусі задумав перейти Македо́нію та Ахаю, та й удатись у Єрусалим, говорячи: „Як побу́ду я там, то треба мені й Рим побачити“.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Pọl kpebiri nʼime mmụọ ya na ya ga-eje ruo Masidonia na Akaịa tupu ọ bịaruo Jerusalem. O sịkwara “na ya aghaghị ijeru Rom nʼọgwụgwụ ije ya niile.”
22 Тож він послав у Македо́нію двох із тих, що служили йому, Тимофі́я й Ера́ста, а сам позостався якийсь час ув Азії.
O zipụrụ ndị na-enyere ya aka, bụ Timoti na Erastọs ka ha buru ụzọ jeruo Masidonia. Ma ya onwe ya nọgidere nʼime Eshịa nwa oge.
23 І ро́зрух чималий був стався там ча́су того за Господню дорогу.
Ma ọ bụ nʼoge a ka oke nsogbu malitere megide Ụzọ ahụ.
24 Бо один золота́р, Дмитро на ім'я́, що робив срібляні́ Артемі́дині храмки, та ремісникам заробі́ток чималий давав,
Otu onye ụzụ na-agbaze ọlaọcha, aha ya bụ Dimitriọs, onye ji ọlaọcha na-akpụ ụlọ arụsị ala ahụ a na-akpọ Atemis. Ọ na-ewetara ya na ndị ụzụ ibe ya ego nʼebe o hiri nne.
25 згромадив він їх і ще інших подібних робі́тників, та й промовив: „Ви знаєте, мужі, що з цього ремесла́ заробі́ток ми маємо.
Nwoke a kpọkọtara ndị ọrụ ya niile, na ndị ya na ha na-arụkọ otu ọrụ, sị, “Ndị ibe m, unu ma na ọ bụ site nʼọrụ nke a ka anyị si enweta akụnụba anyị.
26 І ви бачите й чуєте, що не тільки в Ефе́сі, але мало не в усій Азії — цей Павло збаламу́тив і відвернув багате́нно наро́ду, говорячи, ніби то не боги, що руками поро́блені.
Unu niile ahụla ma nụkwa, otu nwoke a na-akpọ Pọl si rafuo ọtụtụ ndị mmadụ site nʼime ka ha kwenye na chi ọbụla e ji aka mee abụghị chi. Ọ bụkwaghị naanị nʼEfesọs kama ọ fọdụrụ ihe nta ka ọ bụrụ nʼEshịa niile.
27 І не тільки оце нам загрожує, що при́йде зайняття в упадок, а й храм богині великої Артемі́ди в ніщо́ зарахується, і буде зруйнована й ве́лич тієї, що шанує її ціла Азія та цілий світ“.
Ọ bụkwaghị naanị na ihe ize ndụ dị banyere ọrụ aka anyị nke a ga elelị kama tinyere nke a, ụlọ nke oke chi nwanyị bụ Atemis agaghị enwekwa nsọpụrụ. Ya bụ, chi nwanyị nʼonwe ya bụ onye a na-efe nʼobodo Eshịa niile nakwa nʼelu ụwa niile ka a ga-anapụ nkwanye ugwu dịrị ya dịka chi.”
28 Почувши ж оце, вони перепо́внились гнівом, та й стали кричати, говорячи: „Артемі́да ефе́ська велика!“
Ma mgbe ha nụrụ ihe ndị a, ha were oke iwe tie mkpu na-asị, “Atemis ndị Efesọs dị ukwuu!”
29 І місто напо́внилось за́колотом. І кинулися однодушно до видо́вища, схопи́вши Павло́вих супу́тників — Гая та Ариста́рха, македо́нян.
Ọgbaaghara ahụ gbasara, zuo obodo ahụ niile. Ha banyere nʼebe a na-eme ihe ileleanya, kpọpụta Gaiọs na Arịstakọs ndị Masidonia, bụ ndị ha na Pọl na-arụkọ ọrụ.
30 Як Павло ж хотів у наро́д увійти, то учні його не пустили.
Pọl chọrọ ịbakwuru igwe mmadụ ahụ, ma ndị na-eso ụzọ ahụ ekweghị ya.
31 Також дехто з азі́йських начальників, що були йому при́ятелі, послали до нього й просили, щоб він не вдава́всь на видо́вище.
Otu aka ahụ kwa, ụfọdụ ndị enyi ya nʼetiti ndị na-achị Eshịa zigakwaara ya ozi na-arịọ ya ka ọ hapụ ịbanye nʼebe ahụ a na-eme ihe ileleanya.
32 І кожен що інше кричав, бо збори бурхли́ві були, і багате́нно з них навіть не знали, чого ради зібралися.
Ugbu a, nzukọ ahụ na-agba aghara, ụfọdụ mmadụ na-eti mkpu otu ihe, ndị ọzọ na-eti ihe ọzọ. Nʼezie, ọtụtụ nʼime ha amatakwaghị ihe ha jiri nọdụ nʼebe ahụ.
33 А з наро́ду взяли Олександра, бо юдеї його висували. І Олекса́ндер дав знака рукою, і хотів ви́правдатися перед наро́дом.
Ụfọdụ ndị Juu nʼime ọgbakọ ahụ nupuru Alegzanda, sepụta ya, mee ka o buru ụzọ. Alegzanda feere ha aka ka ha dere duu mgbe ọ chọrọ ịgọrọ onwe ya nʼihu ọha mmadụ ahụ.
34 А коли розпізнали, що юде́янин він, то злилися всі в один голос, і годин зо дві гукали: „Артеміда ефеська велика!“
Ma nʼotu ntabi anya ahụ, mgbe ha matara na ọ bụ onye Juu, ha bidoro iti mkpu ihe dịka ogologo awa abụọ na-asị, “Atemis ndị Efesọs dị ukwuu!”
35 А як писар міськи́й заспоко́їв наро́д, то промовив: „Мужі ефеські, яка ж то люди́на не знає, що місто Ефес — то храмо́вий догля́дач Артеміди великої й її образу, упалого з неба?
Nʼikpeazụ, ode akwụkwọ nke obodo ahụ kwụsịrị igwe mmadụ ahụ ime ụzụ. O kwuru, “Ndị ikom Efesọs, o nwere onye na-amaghị na obodo Efesọs bụ obodo na-echekwa ụlọ ofufe Atemis, na oyiyi ya nke si nʼeluigwe daa?
36 Коли ж цьому перечити не можна, то потрібно вам бути спокійними, і не роби́ти необачно нічо́го.
Ebe ihe ndị a adịghị na ngọpụ, ọ dị mkpa ka unu nọdụ nwayọọ, ghara imebi ihe ọbụla nʼecheghị echiche.
37 А ви ж привели́ цих людей, що ані святокрадці, ані вашої богині не знева́жили.
Lee ugbu a, ndị a unu kpọtara nʼebe a abụghị ndị ohi, ndị na-ezuru ihe nʼogige chi anyị, maọbụ na-ekwutọ eze nwanyị arụsị anyị.
38 Отож, як Дмитро та його ремісники мають справу на ко́го, то суди є на ринку й проконсули, — один о́дного хай позивають.
Ọ bụrụ na Dimitriọs na ndị ọkpụ ụzụ ibe ya nwere ihe ọbụla megide ha, ha gaa nʼụlọikpe. Ndị na-ekpe ikpe ga-eleba okwu ha anya. Kama ha mee ya nʼusoro iwu kwadoro.
39 А коли чогось іншого допомина́єтеся, то те вирішиться на зако́ннім зібра́нні.
Ma ọ bụrụ na o nwere ihe ọzọ dị iche unu chọrọ ka e mee, a ga-edozi ya na nzukọ nke ndị obodo na-eme nʼụzọ ziri ezi.
40 Бо ось є небезпека, що нас за сьогоднішній ро́зрух оскаржити можуть, і немає жа́дної причини, якою могли б виправдати це зборище“.
Nʼihi na egwu dị, na-eleghị anya a ga-eji ihe nke mere taa boo anyị ebubo na anyị na-ebute ọgbaaghara. Anyị enweghị ọsịsa ziri ezi banyere ọgbaaghara nke a.”
41 І, промовивши це, розпустив він громаду.
Mgbe o kwuchara nke a, ọ gbasara ha.