< 3 Івана 1 >
1 Ста́рець — улю́бленому Гаєві, якого я направду люблю́.
Ọ bụ okenye ahụ, Na-edegara Gaiọs, onye ahụrụ nʼanya akwụkwọ a, bụ onye m hụrụ nʼanya nʼeziokwu.
2 Улю́блений, — я молюся, щоб добре вело́ся в усьому тобі, і щоб був ти здоровий, як добре веде́ться душі твоїй.
Onye m hụrụ nʼanya, ekpere m bụ na ahụ ga-esi gị ike, ka ihe na-agara gị nke ọma, dịka ọ na-agara mkpụrụobi gị nke ọma.
3 Бо я дуже зрадів, як прийшли були браття, і засві́дчили правду твою, як ти живеш у правді.
Aṅụrịrị m ọṅụ nke ukwu, mgbe ụfọdụ ụmụnna bịara gbaa ama banyere ikwesi ntụkwasị obi gị nye eziokwu, na otu i si nọgide na-agbaso eziokwu ahụ.
4 Я не маю більшої радости від цієї, щоб чути, що діти мої живуть у правді.
O nweghị ihe na-enye m ọṅụ karịa ịnụ na ụmụ m na-agbaso eziokwu.
5 Улю́блений, — вірно ти чи́ниш, як що робиш для братті та для чужи́нців, —
Onye m hụrụ nʼanya, i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe ọbụla nke ị na-emere ụmụnna, ọ bụ ezie na ha bụ ọbịa nye gị.
6 вони про любов твою свідчили Церкві; добре ти зробиш, як їх ви́провадиш, як достойно для Бога,
Ha akọọlara nzukọ banyere ịhụnanya gị. Biko, mgbe ha na-apụ, nyekwara ha aka nʼije ha nʼụzọ ga-enye Chineke otuto.
7 бо вийшли вони ради Йме́ння Його, нічого не взявши від поган.
Ọ bụ nʼihi aha ahụ ka ha biliri ije, na-anaraghị enyemaka ọbụla site nʼaka ndị na-ekweghị ekwe.
8 Отож, ми повинні приймати таких, щоб бути співробі́тниками правді.
Nke a mere o ji kwesi ekwesi na anyị ga-elekọta ndị dị otu a anya ka anyị bụrụ ndị so ha na-ejikọta aka nʼotu nʼọrụ eziokwu ahụ.
9 Я до Церкви писав був, але Діотре́ф, що любить бути першим у них, нас не приймає.
Edere m akwụkwọ ozi zigara nzukọ ahụ, ma Diotrefis onye ọ na-atọ ụtọ ịbụ onye mbụ, anabataghị anyị nke ọma.
10 Тому́ то, коли я прийду́, то згадаю про вчинки його, що їх ро́бить, словами лихими обмовля́ючи нас. І він тим не задово́льнюється, — а й сам не приймає братів, і тим, що бажають приймати, боронить, і виго́нить із Церкви.
Ya mere, ọ bụrụ na m abịa, aga m eme ka ihe niile ọ na-eme na ọtụtụ ihe niile ọ na-ekwu megide anyị pụta ìhè. Ọ bụghị naanị na afọ ejughi ya nʼihi ihe ndị a niile, ọ jụrụ ịnabata ndị ụmụnna, ma na-egbochi ndị ọzọ chọrọ ịnabata ha ka ha ghara ime otu ahụ. Ọ na-achụpụkwa ha site nʼụlọ nzukọ.
11 Улюблений, — не робися подібним до лихо́го, а до доброго: доброчинець від Бога, а злочинець Бога не бачив.
Onye m hụrụ nʼanya, eṅomila ihe dị njọ kama ṅomie ihe dị mma. Onye ọbụla na-eme ezi ihe na-egosi na o si na Chineke. Onye ọ bụlakwa na-eme ajọ ihe ahụbeghị Chineke anya.
12 Про Димитрія сві́дчили всі й сама правда. І сві́дчимо й ми, а ви знаєте, що свідчення наше правдиве.
Onye ọbụla na-agba ezi ama banyere Dimitriọs ọ bụladị eziokwu ahụ nʼonwe ya. Anyị na-ekwukwa ezi ihe banyere ya. Ị makwaara na ọ bụ ezi ama ka anyị na-agba.
13 Багато хотів я писати, та не хочу писати до тебе чорнилом та очерети́нкою,
Enwere m ọtụtụ ihe m chọrọ idere gị nʼakwụkwọ, ma achọghị m iji mkpisi odee na inki dee ha.
14 але маю надію побачити тебе незаба́ром, і говорити уста́ми до уст. Мир тобі! Друзі вітають тебе. Привітай друзів пойменно! Амі́нь.
Ọ bụ olileanya m ịbịa ịhụ gị nʼoge na-adịghị anya. Mgbe ahụ anyị ga-anọdụ ala kwuo ihe niile nʼihu nʼihu. Ka udo dịrị gị. Ndị enyi niile nọ nʼebe a na-ekele gị. Kelekwa ndị enyi niile nọ nʼebe ahụ nʼaha nʼaha.