< 2 царів 13 >

1 Двадцятого й третього року Йоаша, сина Ахазії, Юдиного царя, зацарював над Ізраїлем у Самарії Єгоахаз, син Єгу, на сімнадцять літ.
Nʼafọ nke iri abụọ na atọ nke ọchịchị eze Joash nwa Ahazaya na Juda, ka Jehoahaz nwa Jehu malitere ịbụ eze nʼIzrel nʼobodo Sameria. Ọ chịkwara na Sameria afọ iri na asaa.
2 І робив він зло в Господніх оча́х, і ходив у гріхах Єровоама, Неватового сина, що вводив у гріх Ізраїля, і не відхиля́вся від того.
Kama Jehoahaz bụ eze ọjọọ. O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O soro ụzọ ọjọọ niile nke Jeroboam nwa Nebat, onye dubara ndị Izrel na mmehie.
3 І запалився гнів Господа на Ізраїля, і Він дав їх у руку Газаїла, царя сирійського, та в руку Бен-Гадада, Газаїлового сина, на всі ті дні.
Nʼihi nke a, iwe were Onyenwe anyị nke ukwuu megide Izrel. O mere ka ha nọrọ nʼokpuru ọchịchị Hazael eze Aram na Ben-Hadad nwa ya ogologo oge.
4 Та вблагав Єгоахаз лице Господнє, — і Господь його вислухав, бо бачив Він горе Ізраїля, бо тиснув їх сирійський цар.
Ma Jehoahaz kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị nʼoge a ka o nyere ya aka, Onyenwe anyị gere ya ntị, nʼihi na Chineke hụrụ mmegbu nke eze Aram na-emegbu ndị Izrel.
5 І дав Господь Ізраїлеві спаси́теля, і вони вийшли з-під руки Сирії. І сиділи Ізраїлеві сини в своїх наметах, як давніш.
Onyenwe anyị họpụtaara Izrel onye nzọpụta, ha sitere nʼaka ike ndị Aram nwere onwe ha. Izrel biri nʼụlọ nke aka ha dịka ha biiri nʼoge gara aga.
6 Тільки не відійшли вони з гріхів дому Єровоама, що вводив у гріх Ізраїля, і сам у тому ходив, і Астарта стояла в Самарії.
Ma ha esighị na mmehie niile nke ụlọ Jeroboam wezuga onwe ha, bụ nke o jiri mee ka Izrel mehie, kama ha nọ na-ejegharị nʼime ha. Ọzọkwa, ogidi Ashera ka guzoro na Sameria.
7 А Сирія не позоставила Єгоахазові наро́ду, як тільки п'ятдеся́т верхівці́в та десять возів, та десять тисяч піхоти, бо їх вигубив сирійський цар, і зробив їх порохом на топта́ння.
Ọ dịghị ihe fọdụrụ na ndị agha Jehoahaz ma ọ bụghị naanị iri ndị agha ise na-agba ịnyịnya, na ụgbọ agha iri, na puku ndị agha iri. Nʼihi na eze Aram alaala ndị nke fọdụrụ nʼiyi, meekwa ka ha dịrị ka uzuzu mgbe a na-azọcha mkpụrụ.
8 А решта діл Єгоахаза, і все, що́ він робив, та його лица́рськість, он вони написані в Книзі Ізраїлевих царів.
Akụkọ gbasara ọchịchị Jehoahaz, na ihe niile o mere, na ihe ọ rụpụtara, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha?
9 І спочив Єгоахаз з батька́ми своїми, і поховали його в Самарії, а замість нього зацарював син його Йоаш.
Jehoahaz sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Nwa ya Jehoash nọchiri anya ya.
10 Тридцятого й сьомого року Йоаша, Юдиного царя, зацарював над Ізраїлем у Самарії Йоаш, Єгоахазів син, на шістнадцять літ.
Nʼafọ iri atọ na asaa nke ịbụ eze Joash na Juda, ka Jehoash nwa Jehoahaz malitere ị bụ eze Izrel na Sameria. Ọ chịrị afọ iri na isii.
11 І робив він зле в Господніх оча́х, і не відходив від усіх гріхів Єровоама, Неватового сина, що вводив у гріх Ізраїля, і в тому́ ходив.
O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O siteghị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, mmehie nke Jeroboam dubara Izrel ime. Jehoash nọgidere nʼime ha.
12 А решта діл Йоаша, і все, що він робив, і лица́рськість його́, як він воював з Амацією, Юдиним царем, — он вони написані в Книзі Хроніки Ізраїлевих царів.
Akụkọ gbasara ọchịchị Jehoash, na ihe niile o mere, na ihe ọ rụpụtara, tinyere agha o buru megide Amazaya eze Juda, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha?
13 І спочив Йоаш з батьками своїми, а Єровоам сів на троні його. І був похований Йоаш у Самарії, з Ізраїлевими царями.
Jehoash soro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, Jeroboam anọchie nʼocheeze ya. E liri Jehoash na Sameria, nʼebe e liri ndị eze Izrel ndị ibe ya.
14 А Єлисей заслаб на неду́гу, що з неї й поме́р. І зійшов до нього Йоаш, Ізраїлів цар, і плакав над ним і говорив: „Ба́тьку мій, батьку мій, колесни́це Ізра́їлева та верхівці́ його!“
Nʼoge a, Ịlaisha nọ nʼọrịa nke ọ ga-esite na ya anwụ. Jehoash, bụ eze Izrel gara ịhụ ya, ọ kwara akwa mgbe ọ hụrụ ya sị, “Nna m, nna m, usuu ụgbọ agha na usuu ndị na-agba ịnyịnya Izrel!”
15 І сказав йому Єлисей: „Візьми лука та стрі́ли“. І приніс той до нього лука та стріли.
Ịlaisha gwara ya okwu sị, “Wepụta ụta na àkụ ụfọdụ.” O mere dịka Ịlaisha gwara ya.
16 А він сказав Ізраїлевому цареві: „Поклади свою руку на лука!“І той поклав свою руку. А Єлисей поклав свої руки на руки цареві.
Ịlaisha gwakwara eze Izrel okwu sị ya, “Jide ụta ahụ nʼaka gị abụọ.” Mgbe o jidere ụta ahụ Ịlaisha tụkwasịrị aka nke ya nʼaka eze.
17 І він сказав: „Відчини вікно на схід!“І той відчинив. І сказав Єлисей: „Стріляй!“І той вистрілив, а він сказав: „Стріла́ спасі́ння Господнього, і стріла спасіння проти Сирії. І поб'єш ти Сирію в Афеку аж до кінця!“
Ịlaisha gwara ya sị, “Meghee oghereikuku ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ.” O meghere ya. Mgbe ahụ Ịlaisha gwara ya sị, “Gbapụ àkụ.” Eze gbapụrụ àkụ. Ịlaisha kwuru sị, “Àkụ mmeri Onyenwe anyị, àkụ mmeri megide Aram. Ị ga-ebibi ndị Aram kpamkpam nʼAfek.”
18 І він сказав: „Візьми стрі́ли!“І той узяв, а він сказав до Ізраїлевого царя: „Удар по землі!“І він ударив три рази та й став.
Ọ sịrị, “Chilite àkụ ndị ahụ,” ọ chilitere ha. Ịlaisha gwara eze Izrel, “Gbaa ha nʼala.” Ọ gbara ha nʼala ugboro atọ, ma kwụsị.
19 І розгнівався на нього Божий чоловік і сказав: „Щоб ти був ударив п'ять або шість раз, тоді побив би Сирію аж до кінця! А тепер тільки три рази поб'єш ти Сирію“.
Ma onye nke Chineke ahụ were iwe sị ya, “Ị gaara apịa ya nʼala ugboro ise maọbụ isii. Mgbe ahụ, ị gaara enwe ike merie ndị Aram bibie ha kpamkpam. Ma ugbu a, ọ bụ naanị ugbo atọ ka ị ga-emeri ha.”
20 І спочи́в Єлисей, і поховали його. А моавські о́рди прийшли до Кра́ю наступного року.
Ya mere, Ịlaisha nwụrụ. E likwara ya. Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike na-esi nʼala ndị Moab na-abịa nʼala Izrel izu ohi site nʼọnwa nke atọ nʼafọ ọhụrụ ọbụla.
21 І сталося, як ховали одно́го чоловіка, то погребальники побачили ті о́рди, та й кинули того чоловіка до Єлисеєвого гро́бу. А коли впав і доторкнувся той чоловік до Єлисеєвих косте́й, то воскрес, і встав на ноги свої...
Otu ụbọchị, mgbe ụfọdụ ndị ikom na-eli otu nwoke nwụrụ anwụ, ha hụrụ ndị a na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Nʼihi nke a, ha mere ngwangwa site nʼụjọ tụbanye nwoke ahụ nʼili Ịlaisha. Mgbe ozu nwoke ahụ dara metụ ọkpụkpụ Ịlaisha ahụ, nwoke ahụ nwụrụ anwụ megharịrị ahụ bilie, guzo nʼụkwụ ya abụọ.
22 А Газаїл, сирійський цар, тиснув Ізраїля всі дні Єгоахаза.
Hazael, eze Aram, busoro Izrel agha ụbọchị niile nke ndụ Jehoahaz eze Izrel.
23 Та Господь був милости́вий до них, і змилувася над ними, і звернувся до них ради заповіта Свого з Авраамом, Ісаком та Яковом, і не хотів ви́губити їх, і не відкинув їх від Свого лиця аж дотепер.
Ma Onyenwe anyị meere ha amara, nwee ọmịiko nʼebe ha nọ, ma gosikwa ha na ihe banyere ha na-emetụ ya nʼobi nʼihi ọgbụgba ndụ ya na Ebraham na Aịzik na Jekọb. Ruo taa, o kweghị ka e bibie ha, maọbụ ka e site nʼihu ya chụpụ ha.
24 І спочи́в Газаїл, сирійський цар, а замість нього зацарював син його Бен-Гадад.
Emesịa, Hazael eze Aram nwụrụ, Ben-Hadad nwa ya nọchikwara nʼọnọdụ ya.
25 І Йоаш, Єгоахазів син, узяв назад ті міста з руки Бен-Гадада, Газаїлового сина, що взяв був із руки Єгоахаза, свого батька, у війні. Три ра́зи побив його Йоаш, і вернув Ізраїлеві міста.
Jehoash nwa Jehoahaz, weghachitere obodo niile nke ọ naara nʼaka nna ya Jehoahaz site nʼaka Ben-Hadad nwa Hazael. Ugboro atọ ka Jehoash meriri ya, site otu a weghachi obodo niile nke Izrel.

< 2 царів 13 >