< 2 до солунян 3 >

1 На останок, молітесь, братте, за нас, щоб слово Господнє ширилось та славилось, яко ж і в вас,
Nʼikpeazụ, ụmụnna, na-ekperenụ anyị ekpere ka ozi Onyenwe anyị gaa nʼihu na-agbasa ruo ebe niile ma bụrụ ihe a na-asọpụrụ, dị ka ọ gbasara nʼetiti unu.
2 і щоб нам визволитись од безпутних і лукавих людей; бо не у всїх віра.
Ka e nwee ike napụta anyị nʼaka ndị ajọ mmadụ, nʼihi na ọ bụghị mmadụ niile nwere okwukwe.
3 Вірен же Господь, котрий утвердить вас і обереже від лукавого.
Ma Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi, ọ ga-echebe unu ma gbaakwa unu ume ka unu hapụ ịdaba nʼaka ajọ onye ahụ.
4 Уповаємо ж у Господі про вас, що що ми вам повеліваємо, ви робите і робити мете.
Anyị nwere nchekwube nʼime Onyenwe anyị na unu na-eme ma ga-anọgidekwa na-eme ihe niile anyị nyere unu nʼiwu.
5 Господь же нехай направить серця ваші у любов Божу і в терпіннє Христове.
Ka Onyenwe anyị duzie obi unu ịghọta ịhụnanya Chineke ya na ụdị ntachiobi Kraịst nwere.
6 Повеліваємо ж вам, братте, імям Господа нашого Ісуса Христа, відлучатись від усякого брата, що ходить непорядно і не по переказу, який прийняв од нас.
Ụmụnna, nke a bụ iwu anyị na-enye unu site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka unu zere onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye kwere ekwe nʼime unu na-ebi ndụ umengwụ na onye na-adịghị eso ozizi nke unu natara nʼaka anyị.
7 Самі бо знаєте, як вам треба подобити ся нам; бо не робили ми безладдя між вами,
Nʼihi na unu maara nke ọma nʼime onwe unu na unu kwesiri ịgbaso omume anyị. O nweghị mgbe ọbụla unu hụrụ anyị ka anyị na-agagharị hapụ ọrụ anyị kwesiri ịrụ.
8 анї їли дармо хлїб у кого; а в труді і журбі, ніч і день роблячи дїло, щоб не отягчити нікого з вас:
O nweghị onye ọbụla anyị riri nri ya nke anyị na-ebughị ụzọ kwụọ ya ụgwọ. Kama anyị rụsịrị ọrụ ike, dọgbukwaa onwe anyị nʼọrụ ehihie na abalị, ka anyị ghara ịbụ ibu arọ nye onye ọbụla.
9 не тим що не маємо власти, а щоб себе за взір дати вам, щоб уподобати ся нам.
Ọ bụghị na anyị enweghị ikike ịnara unu ihe oriri, kama ọ bụ ka anyị kuziere unu site nʼomume anyị ihe unu ga na-eṅomi.
10 Бо, як були ми у вас, то так завітували вам, що хто не хоче робити діла, нехай і не їсть.
Ọ bụladị mgbe anyị na unu nọ, anyị nyere unu iwu a sị, “Onye ọbụla na-agaghị ọrụ ya erila nri.”
11 Чуємо бо, що деякі непорядно ходять між вами, нічого не роблять, а метушять ся.
Ma anyị anụla na ụfọdụ nʼetiti unu na-anọ nkịtị na-arụghị ọrụ ọbụla, kama ndị dị otu a na-agagharị, na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha. Ha anaghị arụ ọrụ ọbụla.
12 Таким-то повеліваємо і напоминаємо Господом нашим Ісусом Христом, щоб мовчки роблячи, свій хлїб їли.
Anyị na-enye ndị a iwu, na-adụsịkwa ha ọdụ ike site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, si ha wetuo obi ha ala rụsie ọrụ ha ike. Ka ha riekwa nri ha ji aka ha rụpụta.
13 Ви ж, братте, не втомлюйтесь, роблячи добре.
Otu ọ dị ụmụnna, unu ekwela ka ike ịrụ ọrụ ọma gwụ unu.
14 Коли ж хто не послухає слова нашого посланнєм, такого назначіть і не мішайтесь із ним, щоб йому був сором.
Ma ọ bụrụ na ndị ọbụla adịghị erube isi nye ihe anyị kwuru nʼime akwụkwọ ozi a, hụbanụ ndị dị otu a ama ma kwụsịkwa iso ha nwekọ ihe ọbụla, ka ihere mekwa ha.
15 Та не за ворога вважайте його, а навчайте, яко брата.
Nʼagbanyeghị nke a, unu agụkwala ha dị ka ndị iro unu, kama nyenụ ha ndụmọdụ dị ka ụmụnna.
16 Сам же Господь миру нехай дасть вам мир завсїди всіма способами. Господь із усіма вами.
Ugbu a, ka Onyenwe anyị, onye udo na-esi nʼaka ya abịa tụkwasịrị unu udo ya mgbe niile, nʼime ọnọdụ ọbụla unu nọ nʼime ya. Onyenwe anyị nọnyekwara unu.
17 Витаннє моєю рукою Павловою, котре єсть знав у всякому посланню; так пишу:
Mụ onwe m bụ Pọl ji aka m depụta ekele a, nke m na-ekele unu niile. Nke a bụ ihe e ji arịba akwụkwọ niile m dere ama. Otu a ka m si ede ihe.
18 Благодать Господа нашого Ісуса Христа з усіма вами. Амінь.
Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere unu niile.

< 2 до солунян 3 >