< До филип'ян 3 >
1 Нарешті, брати мої, радійте в Господі! Мені писати вам усе це неважко, а для вас це корисно.
Na nchịkọta okwu ndị a niile, ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị. Ike adịghị agwụ m ịgwa unu ihe ndị a. Ọ bakwaara unu uru ịnụ ụdị okwu a mgbe niile.
2 Стережіться псів! Стережіться поганих працівників [на Божій ниві], стережіться тих, у кого порізана [плоть]!
Kpachapụrụnụ onwe unu anya nʼebe ndị mmadụ ọjọọ ahụ yiri nkịta nọ. Ndị ahụ na-eyiwasị ahụ ha.
3 Адже обрізання – це ми, що служимо Божим Духом, що вихваляємося в Христі Ісусі й що не покладаємося на тіло,
Nʼihi na ọ bụ anyị bụ ndị ezi obibi ugwu ahụ, ọ bụghị ha, nʼihi na anyị bụ ndị na-efe Chineke site na Mmụọ ya. Anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime Kraịst Jisọs. Anyị adịghị atụkwasị obi nʼihe e mere nʼanụ ahụ.
4 хоча я й міг би покластися на тіло. Якщо хтось інший вважає, що може покластися на тіло, то тим більше я:
Mụ onwe m nwere ike nwee ntụkwasị obi nʼihe ndị a. Nʼihi na e nwee onye chere na ọ pụrụ ịtụkwasị obi ya nʼanụ ahụ, mụ onwe m nwere ụdị ntụkwasị obi ahụ karịa onye ahụ:
5 обрізаний восьмого дня, з роду Ізраїля, з племені Веніаміна, єврей з євреїв, щодо Закону – фарисей,
e biri m ugwu nʼabalị nke asatọ site na mgbe a mụrụ m, abụ m onye Izrel, sitere nʼagbụrụ Benjamin; abụ m onye Hibru a mụrụ nʼetiti ndị Hibru; dị ka o si metụta iwu abụ m onye Farisii;
6 щодо ревності – переслідувач Церкви, щодо праведності, яка відповідає Закону, – бездоганний.
igosi ịnụ ọkụ nʼobi m, akpagburu m chọọchị, nʼụzọ ezi omume nʼokpuru iwu, abụ m onye zuruoke.
7 Але те, що для мене колись було надбанням, я визнав втратою заради Христа.
Ma ihe ndị a niile m gụrụ dịka ihe bara uru nʼoge gara aga, bụụrụ m ugbu a, ihe na-abaghị uru nʼihi Kraịst.
8 Навіть більше, я все вважаю втратою через вищу [цінність] пізнання Христа Ісуса, мого Господа. Задля Нього я втратив усе і вважаю це сміттям, аби здобути Христа
E, karịa nke a, akpọọla m ihe ndị a niile ihe efu, nʼihi na a pụghị iji ha tụnyere ịdị oke ọnụahịa nke ịmata Kraịst Jisọs, Onyenwe m. Nʼihi ya, etufuola m ihe ndị a niile, gụọ ha dị ka ihe na-abaghị uru, ka m nwee ike rite Kraịst nʼuru.
9 й знайти себе в Ньому, не маючи власної праведності, яка [походить] від Закону, але таку, що приходить через віру в Христа: праведність, яка [приходить] від Бога, [на основі] віри.
Ka e nwee ike hụ m nʼime ya. Enweghị m ezi omume nke aka m, nke dabere nʼiwu, kama ọ bụ nke sitere nʼokwukwe na Kraịst, ezi omume si na Chineke nke dabeere nʼokwukwe.
10 [Прагну] пізнати Його й силу Його воскресіння, а також розділити Його страждання, уподібнюючись Йому в смерті,
Naanị ihe m chọrọ bụ ịmara Kraịst na ike dị na mbilite nʼọnwụ ya, na nnwekọ nke isoro ya keta oke nʼahụhụ ya, nakwa ka m yie ya nʼọnwụ.
11 щоб таким чином якось досягти воскресіння з мертвих.
Ka m si otu a, ruo nʼogo nke inweta mbilite site nʼọnwụ.
12 Не [кажу], що я вже це отримав чи вже став довершеним. Я лише прагну досягнути [воскресіння], яким досягнув мене Христос Ісус.
Anaghị m ekwu na m etozuola oke, maọbụ nwezuo ihe niile. Ma a na m agbalịsi ike ka m jide ihe ahụ nke Kraịst Jisọs jidere m nʼihi ya.
13 Брати, я не вважаю, що досягнув [цього], але [роблю] одне: забуваючи те, що позаду, і тягнучись до того, що попереду,
Ụmụnna m, nʼezie, abụbeghị m ihe ahụ m kwesiri ịbụ. Ma ihe m ji ike m niile na-eme bụ ichefu ihe niile ndị gara aga, na ilekwasị anya nʼihe ahụ m na-agbaso bụ nke dị m nʼihu.
14 переслідую ціль – [отримати] винагороду Божого покликання згори в Христі Ісусі.
Ana m agbasi ọsọ ike iji gbaruo nʼisi, maka irite ihe ahụ a na-agbata nʼọsọ, bụ ọkpụkpọ ịbanye na ndụ eluigwe ahụ nke Chineke kpọrọ m site na Jisọs Kraịst.
15 Отже, якщо хтось зрілий духовно, нехай так думає! Якщо ж ви думаєте інакше, то Бог вам відкриє і це.
Ka anyị niile, bụ ndị tozuru oke nʼime mmụọ nwee uche dị otu a. Ọ bụrụkwa na ụfọdụ nʼime unu nwere uche ọzọ dị iche, Chineke ga-ekpughere unu nke a.
16 Однак дотримуймося того, чого вже досягли!
Ka anyị jidesienụ aka ike naanị nʼihe ahụ anyị nweterela.
17 Брати, будьте моїми послідовниками та дивіться уважно на тих, хто живе за прикладом, який ми вам подали.
Ụmụnna m, na-agbasonu ụdị ndụ m na-ebi, chọpụtakwanụ ndị ọzọ na-adị ndụ dị ka anyị si adị, mee ha ihe ilere anya unu.
18 Адже багато людей – про них я не раз згадував, а тепер говорю з плачем – живуть як вороги Христового хреста.
Nʼihi na agwala m unu nke a ọtụtụ mgbe, na-achọkwa ịgwa unu ya ọzọ ugbu a. Lee, anya mmiri dị m nʼanya ugbu a m na-ekwu ya sị na e nwere ọtụtụ ndị na-ebi ndụ ha dị ka ha bụ ndị iro obe Kraịst nʼezie.
19 Їхній кінець – знищення, їхній бог – шлунок, а їхня слава – в їхньому соромі. Вони думають тільки про земне.
Ọgwụgwụ ndị dị otu a ga-abụ ịla nʼiyi. Afọ ha bụ chi ha, ndị otuto ha dịkwa nʼihere ha. Ha na-atụkwasị uche naanị nʼihe nke ụwa.
20 Але наше громадянство знаходиться на небесах, звідки ми очікуємо Спасителя, Господа Ісуса Христа,
Ma ebe obibi anyị dị nʼeluigwe, ebe anyị na-atụsi anya ike na Onye nzọpụta bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-esi bịa.
21 Який перетворить наше принижене тіло, щоб воно було подібне до Його прославленого тіла, через дію Його сили, яка підкорює все.
Onye ga-agbanwe ahụ anyị dị ala ka ọ dị ka nke ya dị ebube, site nʼike nke mere ka o debe ihe niile nʼokpuru ya.