< 1 Івана 5 >

1 Кожен, хто вірить, що Ісус є Христос, той народжений від Бога. І кожен, хто любить Того, Хто народив, любить і народжених від Нього.
Onye ọbụla kweere na Jisọs bụ Kraịst bụ onye amụrụ site na Chineke. Onye ọbụla nke hụkwara Nna nʼanya na-ahụkwa Ọkpara ya nʼanya.
2 Так ми розуміємо, що любимо Божих дітей, коли ми любимо Бога й виконуємо Його заповіді.
Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị hụrụ ụmụ Chineke nʼanya, mgbe anyị na-ahụ Chineke nʼanya, na-erubekwa isi nʼiwu ya niile.
3 Ми проявляємо любов до Бога, якщо дотримуємося Його заповідей. А заповіді Його не важкі.
Nke a bụ ịhụnanya Chineke, na anyị ga-edebe iwu ya. Iwu ya adịghịkwa arọ.
4 Адже кожен, хто народжений від Бога, перемагає світ. І те, що перемогло світ, – це наша віра.
Nʼihi na onye ọbụla amụrụ site na Chineke na-emeri ụwa. Nke a bụkwa mmeri ahụ na-emeri ụwa, ọ bụladị okwukwe anyị.
5 Хто перемагає світ, як не той, хто вірить, що Ісус є Син Божий?
Onye pụrụ imeri ụwa, ma ọ bụghị naanị onye ahụ kweere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke?
6 Ісус Христос – це Той, Хто прийшов через воду і кров. Він прийшов не тільки через воду, але через воду і кров. І Дух – це Той, Хто свідчить [про це], оскільки Дух – істина.
Ọ bụ onye ahụ bịara site na mmiri na ọbara, ya bụ Jisọs Kraịst. O siteghị naanị na mmiri bịa, kama o sitere na mmiri na ọbara. Ọ bụkwa Mmụọ Nsọ na-agba ama maka ya, nʼihi na Mmụọ Nsọ bụ eziokwu.
7 Бо троє свідчать:
Nʼihi na ha dị atọ gbara akaebe:
8 Дух, вода і кров. І троє [свідчать] одне.
Mmụọ Nsọ, na mmiri na ọbara, ha atọ kwekọrịtara.
9 Якщо ми приймаємо людське свідчення, [то] свідчення Бога є величнішим, адже це є свідчення Бога: Він засвідчив про Свого Сина.
Ọ bụrụ na anyị nabata akaebe nke mmadụ gbara, akaebe nke Chineke gbara dị ukwuu karịa, nʼihi na ọ bụ akaebe Chineke gbara banyere Ọkpara ya.
10 Хто вірить у Сина Божого, має свідчення в собі самому. Хто не вірить Богові, робить Його обманщиком, оскільки він не вірить свідченню, яке зробив Бог щодо Свого Сина.
Onye ọbụla kweere nʼỌkpara Chineke nwere ọgbụgba ama a nʼobi ya. Ma onye ọbụla na-ekwereghị na Chineke emeela ya ka ọ bụrụ onye ụgha, nʼihi na o kwereghị nʼama ahụ Chineke gbara banyere Ọkpara ya.
11 І ось це свідчення: Бог дав нам вічне життя, і це життя – у Його Сині. (aiōnios g166)
Ama ahụ bụkwa nke a, na Chineke enyela anyị ndụ ebighị ebi, ndụ a dịkwa nʼime Ọkpara ya. (aiōnios g166)
12 Хто має Сина, має й життя; а хто не має Сина Божого, не має життя.
Onye ọbụla nwere Ọkpara ahụ nwere ndụ ma onye ọbụla na-enweghị Ọkpara Chineke enweghị ndụ.
13 Я написав це вам, віруючим в ім’я Сина Божого, щоб ви знали, що маєте вічне життя. (aiōnios g166)
Ana m edere unu ihe ndị a unu ndị kweere nʼaha Ọkpara Chineke, ime ka unu mata na unu nwere ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
14 І це є сміливість, яку ми маємо перед Богом: якщо ми просимо щось згідно з Його волею, Він чує нас.
Nkwuwa okwu anyị nwere na ya bụ, na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọbụla dịka ọchịchọ obi ya siri dị, ọ na-anụ olu anyị.
15 І якщо ми знаємо, що Бог нас чує, то що б ми не просили, знаємо, що отримали те, що попросили в Нього.
Ọ bụrụkwanụ na anyị matara na ọ na-anụ olu anyị mgbe ọbụla anyị rịọrọ ya ihe, anyị na-amatakwa na anyị anatala ihe ọbụla anyị rịọrọ ya.
16 Якщо хтось бачить свого брата, [який] грішить не смертельним гріхом, нехай просить, і [Бог] дасть йому життя – [тому], хто грішить не смертельним гріхом. Але є гріх, який веде до смерті, і я не кажу, щоб ви молилися за того.
Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ka nwanna ya na-eme mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ, ya kpee ekpere, Chineke ga-enyekwa onye ahụ ndụ. Nke a bụ maka ndị ahụ mmehie ha na-abụghị nke na-eduba nʼọnwụ. E nwere mmehie na-eduba nʼọnwụ. Asịghị m unu kpee ekpere maka nke ahụ.
17 Будь-яка неправедність є гріхом, але є гріх, який не веде до смерті.
Ajọ omume niile bụ mmehie, ma ọ dị mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ.
18 Ми знаємо, що кожен народжений від Бога не грішить. Адже Народжений від Бога охороняє його, і лукавий не нашкодить йому.
Anyị matara na onye ọbụla amụrụ site na Chineke anaghị aga nʼihu na-eme mmehie, kama onye ahụ nke amụrụ site na Chineke na-echekwa ha, ajọ onye ahụ adịghị emetụkwa ha aka.
19 Ми знаємо, що ми є від Бога і що весь світ знаходиться у владі лукавого.
Anyị maara na anyị bụ ụmụ Chineke, ụwa niile nọkwa nʼokpuru ike ajọ onye ahụ.
20 Ми знаємо, що Син Божий прийшов і дав нам розуміння, щоб пізнали Істинного. І тепер ми в Істинному, у Його Сині – Ісусі Христі. Він – істинний Бог і життя вічне. (aiōnios g166)
Anyị matakwara na Ọkpara Chineke abịala, nyekwa anyị nghọta ka anyị mara ya, onye bụ eziokwu. Anyị nọ nʼime onye ahụ bụ eziokwu, ọ bụladị nʼime Ọkpara ya, bụ Jisọs Kraịst. Ya onwe ya bụ ezi Chineke bụrụkwa ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
21 Діточки, бережіть себе від ідолів!
Ụmụ m, wezuganụ onwe unu site nʼarụsị niile.

< 1 Івана 5 >