< 2 Mose 14 >
1 Awurade ka kyerɛɛ Mose sɛ,
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis,
2 “Ka kyerɛ nnipa no na wɔmmane mfa Pihahirot a ɛwɔ Migdol ne ɛpo no ntam na ɛne Baal-Sefon di nhwɛanimu no. Sɛ wɔduru hɔ a, wɔnsi wɔn ntomadan wɔ mpoano hɔ.
“Gwa ụmụ Izrel ka ha chigharịa azụ jee maa ụlọ ikwu ha na ncherita ihu Pi Hahirot, nke dị nʼetiti Migdol na osimiri. Ọ bụ nʼakụkụ osimiri, na ncherita ihu obodo Baal-Zefọn ka ha ga-ama ụlọ ikwu ha.
3 Sɛ wɔyɛ saa a, Farao bɛsusu sɛ, ‘Saa Israelfoɔ no aka ɛserɛ no ne ɛpo no ntam.’
Fero ga-asị banyere ụmụ Izrel, ‘Ha na-awagharị gburugburu ala ahụ nʼọnọdụ mgbagwoju anya ebe ọzara riri ha.’
4 Na mɛsane mapirim Farao akoma bio ama wataa mo. Mayɛ saa nhyehyɛeɛ yi sɛdeɛ ɛbɛma manya animuonyam ne anidie wɔ Farao ne nʼasraafoɔ mu na ama Misraimfoɔ no nso ahunu sɛ, mene Awurade no.” Enti, wɔsii ntomadan wɔ baabi a wɔkyerɛɛ wɔn hɔ no.
Aga m eme ka obi Fero sie ike ka ọ chụso unu ọsọ nʼazụ, ma m ga-ewetara onwe m otuto site na Fero na ndị agha ya niile. Ndị Ijipt niile ga-ama na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.” Ndị Izrel mekwara otu ahụ.
5 Nnansa akyi a Misraimhene no tee sɛ Israelfoɔ no abɔ wɔn tirim sɛ wɔrensane mma Misraim bio na mmom kɔ ara na wɔrekɔ no, Farao ne nʼahokafoɔ akoma sɔree bio. Wɔbisaa sɛ, “Ɛdeɛn na yɛayɛ yi a yɛama nkoa yi ɛkwan ama wɔkɔ?”
Mgbe a gwara eze Ijipt na ndị a agbaala ọsọ, obi Fero na ndị ozi ya gbanwere megide ndị Izrel. Ha sịrị, “Gịnị bụ ihe anyị mere, site na izipụ ndị Izrel nʼọrụ ife anyị?”
6 Enti, Farao faa ne teaseɛnam dii nʼasraafoɔ no anim taa wɔn.
Na-atụfughị oge, Fero rigoro nʼelu ụgbọ agha ya, duru ndị agha ya ịchụso ha.
7 Ɔmaa Misraim apɔnkɔsotefoɔ dɔm a wɔn dodoɔ yɛ ahansia ne apɔnkɔ foforɔ bi a asraafoɔ tete wɔn so sram wɔn.
Ọ chịịrị ụgbọ agha dị narị isii e leziri anya họpụta, tinyere ụgbọ agha Ijipt niile. Ndịisi agha ndị Ijipt nọcha nʼelu ha niile.
8 Farao taa Israelfoɔ no so, ɛfiri sɛ, na wɔde Misraimfoɔ agyapadeɛ bebree kɔ.
Onyenwe anyị mere ka obi Fero eze Ijipt sie ike. Ọ chụsoro ụmụ Izrel, ndị na-aga nʼihu nʼije ha, na-atụghị egwu maọbụ ịda mba.
9 Farao de nʼapɔnkɔdɔm nyinaa taa Israelfoɔ no so bɛtoo wɔn sɛ wɔasisi wɔn ntomadan wɔ Pihahirot mpoano wɔ Baal-Sefon anim.
Ndị Ijipt chụsoro ha ọsọ, ịnyịnya Fero na ụgbọ agha, na ndị na-agba ịnyịnya na ndị agha ndị ọzọ chụsoro ndị Izrel ọsọ chụkwute ha nʼebe ha na-ezu ike nʼakụkụ osimiri dị nso na Pi Hahirot na ncherita ihu Baal-Zefọn.
10 Ɛberɛ a Misraim asraafoɔ no rebɛn Israelfoɔ no, Israelfoɔ no hunuu wɔn firi akyiri sɛ wɔde mmirika reba enti wɔn akoma tuiɛ, na wɔsu frɛɛ Awurade sɛ ɔmmoa wɔn.
Mgbe ndị agha Fero na-abịa nso, ndị Izrel lere anya nʼazụ, hụ ndị Ijipt ka ha na-abịa nso. Ha tụrụ egwu, tie mkpu akwa, kpọkuo Onyenwe anyị.
11 Ɛmaa wɔn ani beree Mose so bisaa no sɛ, “Wode yɛn aba ɛserɛ yi so sɛ yɛmmɛwuwu wɔ ha, ɛfiri sɛ, adamena nni Misraim a sɛ yɛwuwu a wɔbɛsie yɛn wɔ mu? Adɛn enti na womaa yɛtu firii Misraim?
Ha jụrụ Mosis sị, “Ọ bụ na o nweghị ili dị nʼala Ijipt, i ji kwagide anyị ka anyị niile bịa nwụọ nʼebe a nʼọzara? Gịnị mere i ji kwagide anyị ka anyị hapụ Ijipt?
12 Ɛberɛ a yɛwɔ nkoasom mu no, yɛanka ankyerɛ wo sɛ ma yɛmpɛ yɛn baabi ntena? Yɛkaeɛ sɛ yɛpɛ sɛ yɛbɛhyɛ nkoasom ase wɔ Misraim sene sɛ yɛbɛwuwu agu ɛserɛ so ha.”
Ọ bụ na anyị agwaghị gị nʼala Ijipt si gị, ‘Hapụ anyị ka anyị nọgide na-ejere ndị Ijipt ozi?’ Ọ gara akara anyị mma ị bụ ohu ndị Ijipt karịa ịnwụ nʼọzara.”
13 Nanso, Mose ka kyerɛɛ nnipa no sɛ, “Monnsuro. Monnyina pintinn na monhwɛ biribi. Na mobɛhunu anwanwakwan a Awurade nam so bɛgye mo afiri atamfoɔ nsam ɛnnɛ. Misraimfoɔ a mohunu wɔn seesei yi, morenhunu wɔn bio.
Mosis zaghachiri ha sị, “Unu atụla egwu. Guzosienụ ike. Unu ga-ahụ ụzọ dị ebube Onyenwe anyị ga-esi zọpụta unu taa. Ndị Ijipt a unu na-ahụ taa, unu agaghị ahụkwa ha ọzọ.
14 Awurade bɛko ama mo a monha mo ho koraa!”
Nọrọnụ jii. Onyenwe anyị ga-alụrụ unu ọgụ.”
15 Afei, Awurade ka kyerɛɛ Mose sɛ, “Adɛn enti na wosu frɛ me? Ka kyerɛ Israelfoɔ no na wɔnkɔ wɔn anim.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Gịnị mere i ji na-akpọku m. Gwa ụmụ Izrel ka ha gaa nʼihu.
16 Fa wo poma no. Fa kyerɛ nsuo no so na ɛpo no mu bɛpae ama ɛkwan ada mu ma Israelfoɔ no afa asase wesee so.
Welie mkpanaka gị elu. Setịpụ ya nʼelu osimiri ahụ ka o kewaa abụọ. Ụzọ ga-adịkwa nʼetiti osimiri ahụ. Ụmụ Izrel ga-esitekwa nʼala akọrọ gafee.
17 Mɛpirim Misraimfoɔ no akoma ama wɔaka mo so na di a mɛdi Farao ne ne dɔm so bɛma mo ahunu mʼanimuonyam.
Aga m eme ka obi ndị Ijipt sie ike, ka ha sorokwa unu nʼazụ banye. Aga m ewetara onwe m otuto site na Fero, na ndị agha niile, na ụgbọ agha niile nakwa ndị na-agba ịnyịnya ya.
18 Na Misraimfoɔ nyinaa bɛhunu sɛ, mene Awurade.”
Nʼoge ahụ, ndị Ijipt ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. M ga-enweta nsọpụrụ site na Fero, na ụgbọ agha ya niile, na ndị na-agba ịnyịnya ya.”
19 Afei, Onyankopɔn ɔbɔfoɔ a ɔdi Israelfoɔ anim no twee ne ho bɛdii Israelfoɔ no akyi. Na omununkum dum nso bɛdii Israelfoɔ no akyi.
Mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke, onye na-aga nʼihu ndị agha Izrel, sitere nʼihu pụọ gaa nọdụ nʼazụ ha. Otu a kwa, ogidi igwe ojii ahụ sitere nʼihu gaa nʼazụ ha.
20 Ɛbɛtwaa Israelfoɔ no ne Misraimfoɔ no ntam. Na anadwo no, ɛdanee ogya maa esum tɔɔ Misraimfoɔ no so maa ne hann no kyerɛɛ Israelfoɔ no ɛkwan. Enti Misraimfoɔ no anhunu Israelfoɔ no akyiri kwan.
Nke a mere ka ogidi igwe ojii ahụ dịrị nʼetiti ụmụ Izrel na ndị Ijipt. Nʼabalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ogidi igwe ojii ahụ nye ụmụ Izrel ìhè, ma ndị Ijipt nọgidere nʼọchịchịrị. Otu a, ndị Ijipt enweghị ike bịarute nʼebe ụmụ Izrel nọ.
21 Mose tenee ne nsa wɔ ɛpo no so, na anadwo no nyinaa Awurade de apueeɛ mframa denden maa ɛpo no sanee nʼakyiri ma asase no yɛɛ wesee.
Mgbe ahụ, Mosis setịpụrụ aka ya nʼelu Osimiri Uhie ahụ. Onyenwe anyị ji oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke fere nʼabalị ahụ niile, nughachi osimiri ahụ, mee ka osimiri ahụ kebie ụzọ abụọ, ka ụzọ pụta nʼala osimiri ahụ.
22 Enti Israelfoɔ no faa ɛpo ɛkwan a emu wesee no so. Na nsuo no yɛɛ afasuo wɔ benkum ne nifa maa wɔn.
Ụmụ Izrel sitere nʼetiti osimiri ahụ gafee. Mmiri osimiri ahụ ghọọrọ mgbidi nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha.
23 Afei, Misraimfoɔ no nso ne Farao apɔnkɔ, nteaseɛnam ne apɔnkɔsotefoɔ tii wɔn kɔduruu ɛpo no mfimfini.
Mgbe ndị agha Ijipt na-achụ ha ọsọ hụrụ ha ka ha na-agafe, ha sogidere ha baa, ọ bụladị nʼetiti osimiri ahụ. Ndị agha Ijipt niile sooro ha, ya bụ, ụgbọ agha Fero, ndị agha ya na ndị na-agba ịnyịnya ya niile.
24 Na anɔpahema no, Awurade de ogya ne mununkudum no too Misraim dɔm no so maa wɔn ho yeraa wɔn.
Nʼisi ụtụtụ echi ya, Onyenwe anyị ledatara anya site nʼogidi igwe ojii ahụ na-enye ihe. O legidere ndị agha Ijipt anya, tinyekwa ha ụjọ nʼobi nke mere na ha amakwaghị onwe ha.
25 Wɔn nteaseɛnam no nan tutuiɛ enti na wɔntumi nkɔ bio. Enti Misraimfoɔ no kaa sɛ, “Momma yɛnnwane mfiri Israelfoɔ anim, ɛfiri sɛ, Awurade reko ma wɔn na yɛn deɛ, ɔreko tia yɛn.”
O mebiri ụkwụ ụgbọ agha ha mee ka o siere ịnyịnya ha ike ịdọkpụ ụgbọ agha ndị ahụ. Mgbe ahụ, ndị Ijipt kwuru sị, “Ka anyị sinụ nʼịchụ ndị Izrel gbapụ, nʼihi na Onyenwe anyị na-alụrụ ha ọgụ, na-emegidekwa anyị.”
26 Awurade ka kyerɛɛ Mose sɛ, “Tene wo nsa wɔ ɛpo no so, na nsuo no nsane mmra Misraimfoɔ ne wɔn nteaseɛnam ne apɔnkɔsotefoɔ no so.”
Mgbe ụmụ Izrel gafesịrị ruo nʼakụkụ nke ọzọ nke osimiri ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Setịpụ aka gị ọzọ ka mmiri ahụ kpuchigide ndị Ijipt, na ụgbọ agha ha niile, na ndị na-agba ịnyịnya ya.”
27 Mose yɛɛ saa, na adeɛ kyee anɔpa no, ɛpo no sane nʼakyi tenee sɛdeɛ na ɛteɛ. Misraimfoɔ no pɛɛ sɛ wɔdwane, nanso Awurade maa nsuo no faa wɔn.
Mosis setịpụrụ aka nʼelu osimiri ahụ. Nʼụtụtụ ya, mmiri osimiri ahụ sọghachiri gaa ebe ọ nọ na mbụ. Ndị Ijipt chọsịrị ụzọ ha si agbapụ ike, ma Onyenwe anyị mere ka osimiri ahụ kpuchie ha.
28 Nsuo no kataa ɛkwan no ne nteaseɛnam ne apɔnkɔsotefoɔ no nyinaa so. Farao asraafoɔ dodoɔ a wɔfaa ɛpo no mu taa Israelfoɔ no nso, anka ɔbaako koraa.
Osimiri ahụ kpuchigidere ụgbọ agha ha niile, na ndị na-agba ịnyịnya, na ndị agha Fero niile ndị chụụrụ ụmụ Izrel baa nʼime osimiri ahụ. O nweghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ.
29 Israelfoɔ no nante faa asase wesee a nsuo yɛ ɔfasuo wɔ benkum ne nifa no so.
Ma ụmụ Izrel esitelarị nʼala nke mmiri kọrọ gafee osimiri ahụ. Mgbe ha na-agafekwa, akụkụ abụọ nke osimiri ahụ guzoro ọtọ dịka mgbidi, nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha.
30 Saa ɛda no Awurade gyee Israelfoɔ firii Misraimfoɔ nsa mu. Na Israelfoɔ no hunuu Misraimfoɔ no sɛ wɔawuwu deda mpoano.
Site nʼụzọ dị otu a, Onyenwe anyị zọpụtara ụmụ Izrel site nʼaka ndị Ijipt. Ụmụ Izrel hụkwara ozu ndị Ijipt nʼikpere mmiri osimiri ahụ.
31 Ɛberɛ a Israelfoɔ hunuu tumi a Awurade ada no adie de atia Misraimfoɔ no, wɔsuroo Awurade, na wɔgyee Awurade ne nʼakoa Mose diiɛ.
Ụmụ Izrel tụrụ egwu Onyenwe anyị mgbe ha hụrụ ihe ịrịbama ndị a Onyenwe anyị ji zọpụta ha site nʼaka ndị Ijipt. Ha kwenyere na Onyenwe anyị, kwenyekwa na Mosis ohu ya.