< Nnwom 50 >

1 Asaf dwom. Tweduampɔn, Onyankopɔn, Awurade no kasa, na ɔfrɛ asase nyinaa efi apuei kosi atɔe.
Abụ Ọma Asaf. Onyenwe anyị, Chineke, Onye kachasị chi niile, ekwuola okwu ma kpọkọta ụwa niile, site na ọwụwa anyanwụ ruo na ọdịda ya.
2 Onyankopɔn hyerɛn fi Sion kurow a ne fɛ wie pɛyɛ.
Chineke na-enwupụta dịka ìhè, site na Zayọn, nke zuruoke nʼime ịma mma.
3 Yɛn Nyankopɔn reba nanso ɔrenyɛ komm; ogya a ɛhyew nneɛma di nʼanim, ahum a ɛretu atwa ne ho ahyia.
Chineke anyị na-abịa, ọ gaghị emechikwa ọnụ; ọkụ na-erepịa erepịa dị nʼihu ya, oke ifufe na-efesi ike gbakwara ya gburugburu.
4 Ɔfrɛ ɔsorosoro ne asase, sɛ ɔrebu ne nkurɔfo atɛn;
Ọ na-akpọku eluigwe na ụwa ka o kpee ndị ya ikpe: Ọ na-asị,
5 Ɔka se, “Boaboa nnipa a wɔatew wɔn ho no ano ma me; wɔn a wɔnam afɔrebɔ so ne me yɛɛ apam no.”
“Chikọtaranụ m ndị m e doro nsọ, bụ ndị mụ na ha ji ịchụ aja gbaa ndụ.”
6 Ɔsoro pae mu ka ne trenee, na Onyankopɔn ankasa ne otemmufo.
Eluigwe na-ekwupụta ezi omume ya, nʼihi na Chineke nʼonwe ya bụ onye ikpe. (Sela)
7 “Muntie, me nkurɔfo, na mɛkasa, medi adanse atia wo, Israel; Mene Onyankopɔn, wo Nyankopɔn no.
“Nụrụnụ, ndị m, m ga-ekwukwa, Izrel, aga m agba ama megide unu, Abụ m Chineke, Chineke unu.
8 Merenka mo anim wɔ mo afɔrebɔde anaa mo hyew afɔre a ɛwɔ mʼanim daa no ho.
Anaghị m abara unu mba nʼihi ịchụ aja unu, na aja nsure ọkụ unu nke na-adị m nʼihu oge niile.
9 Anantwinini a wofi mo mfuw so anaa mpapo a wofi mo buw mu ho nhia me,
Enweghị m mkpa maka oke ehi unu site nʼụlọ anụmanụ unu maọbụ mkpi site nʼọgba igwe ewu na atụrụ unu,
10 efisɛ kwae mu aboa biara yɛ me de, anantwi a wɔwɔ nkoko mpempem so nso saa ara.
nʼihi na ụmụ anụmanụ niile nke oke ọhịa bụ nke m, ha na ehi niile nọ nʼelu otu puku ugwu.
11 Minim anomaa biara a ɔwɔ mmepɔw no so, na wuram abɔde nyinaa yɛ me de.
Amaara m ụmụ nnụnụ niile nọ nʼelu ugwu niile, ihe niile e kere eke nọ nʼọhịa bụ nke m.
12 Sɛ ɔkɔm dee me a, anka merenka nkyerɛ mo; efisɛ, wiase ne nea ɛwɔ mu nyinaa yɛ me de.
Ọ bụrụ na agụụ agụọ m, agaghị m agwa gị ya, nʼihi na ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke m.
13 Mewe anantwinini nam, na menom mpapo mogya ana?
Ana m ata anụ oke ehi, ka ọ bụ ọbara mkpi ka m ga-aṅụ?
14 Momfa aseda afɔre mma Onyankopɔn, na munni bɔ a mohyɛɛ Ɔsorosoroni no so,
“Chụọrọ Chineke aja ekele, mezuo nkwa i kwere Onye kachasị ihe niile elu,
15 na momfrɛ me hiada; na megye mo na moahyɛ me anuonyam.”
ma kpọkuo m nʼụbọchị nsogbu gị, aga m agbapụta unu, unu ga-enyekwa m nsọpụrụ.”
16 Nanso amumɔyɛfo de, Onyankopɔn bisa wɔn se, “Adɛn nti na moka me mmara na mʼapam da mo ano?
Ma Chineke na-agwa ndị na-eme ihe ọjọọ okwu sị, “Olee, nkwuwa okwu unu nwere ịgụgharị iwu m, maọbụ kwupụta ọgbụgba ndụ m nʼọnụ unu?
17 Mukyi me nkyerɛkyerɛ, na motow me nsɛm gu mo akyi.
Unu kpọrọ ndụmọdụ m asị, na-atụfekwa okwu m nʼazụ unu.
18 Sɛ muhu ɔkorɔmfo a mode mo ho bɔ no; na mo ne nguaman nso bɔ.
Mgbe unu hụrụ onye ohi, unu na ya na-ejikọta aka; unu na ndị na-akwa iko na-ekekọkwa oke.
19 Mode mo ano yɛ bɔne, na mode mo tɛkrɛma boaboa nnaadaa ano.
Ọnụ unu na-eme ọsịịsọ ikwu okwu ọjọọ, okwu aghụghọ na nke rere ure na-esikwa nʼọnụ unu na-asọpụta dịka iyi.
20 Mokasa tia mo nuabarima bere biara na mosopa mo ankasa na ba.
Unu na-ekwugide ụmụnna unu mgbe niile, na-ekwutọkwa nwanne unu nwoke.
21 Moayɛ eyinom nyinaa; nanso manka hwee, enti mususuw sɛ mete sɛ mo. Nanso mɛka mo anim, na mede mo sobo asi mo anim.
Ihe ndị a ka unu mere ma agbachiri m nkịtị; unu chekwara na adị m ka unu. Ma aga m abara unu mba ma bokwaa unu ebubo unu nʼihu unu.
22 “Munnwen eyi ho, mo a mo werɛ fi Onyankopɔn, anyɛ saa a, mɛtetew mo mu nketenkete a obiara remmegye mo;
“Tụgharịa uche na nke a, unu ndị na-echefu Chineke, ma ọ bụghị ya, aga m adọrisi unu, ọ dịkwaghị onye ga-agbapụta unu.
23 Nea ɔbɔ aseda afɔre no hyɛ me anuonyam, na osiesie kwan sɛnea mɛda Onyankopɔn nkwagye adi akyerɛ no.” Wɔde ma dwonkyerɛfo.
Onye na-eji ekele achụrụ m aja, na-asọpụrụ m, ọ bụkwa onye na-edozi ụzọ ya, ka m ga-eme ka ọ hụ nzọpụta Chineke.”

< Nnwom 50 >