< Yeremia 33 >

1 Bere a Yeremia da so da dua mu wɔ awɛmfo adiwo hɔ no, Awurade asɛm baa ne nkyɛn ne mprenu so se:
Mgbe Jeremaya ka nọ dịka onye mkpọrọ nʼogige ụlọ ndị nche, okwu Onyenwe anyị ruru ya ntị nke ugboro abụọ, sị ya,
2 “Sɛɛ na Awurade se, nea ɔbɔɔ asase, Awurade a ɔyɛe na ɔma egyinae, Awurade ne ne din:
“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, onye ahụ kere ụwa kwuru, Onyenwe anyị, onye kpụrụ ya mee ya ka o guzosie ike, Onye aha ya bụ Onyenwe anyị:
3 ‘Frɛ me na megye wo so, na maka wo nsɛm akɛse ne nneɛma a ahintaw a wunnim.’
‘Kpọkuo m, aga m aza gị, gosi gị ihe dị ukwuu dị iche iche, na ihe siri ike na nghọta nke ị na-amaghị.’
4 Na nea Awurade, Israel Nyankopɔn, ka de fa afi a ɛwɔ saa kuropɔn yi mu ne Yuda ahemfi ahorow a wɔabubu no ho, sɛnea ɛbɛyɛ a wubenya nea wɔde besiw ntuano afasu ne afoa no ano,
Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel, kwuru banyere ụlọ ndị ahụ niile dị nʼobodo, na ụlọeze niile nke ndị eze Juda, bụ nke akwadara maka iji megide nnọchibido niile na mma agha
5 wɔ wɔne Babiloniafo ɔko no mu. ‘Nnipa a mede mʼabufuw ne mʼabufuwhyew bekunkum wɔn no afunu bɛyɛ hɔ ma. Meyi mʼani afi saa kuropɔn yi so esiane nʼamumɔyɛ nyinaa nti.
nʼagha a na-alụso ndị Babilọn. ‘Aga eji ozu ndị mmadụ ahụ niile m ga-etigbu site nʼiwe m na nʼọnụma m kpojuo ha. Aga m ezo ihu m site nʼebe obodo a nọ, nʼihi ajọ omume ya niile.
6 “‘Nanso mede ahoɔden ne ayaresa bɛbrɛ no; mɛsa me nkurɔfo yare na mama wɔanya asomdwoe ne bammɔ a ɛdɔɔso.
“‘Ma otu ọ dị, aga m agwọ ya, mee ka ahụ sie ya ike. Aga m agwọ ndị m, meekwa ka ha nwe udo nʼebe ọ bara ụba. Ha ga-ebikwa nʼudo na-enweghị egwu ọbụla.
7 Mɛsan de Yuda ne Israel afi nnommum mu aba na masan agye wɔn asi hɔ sɛ nea na wɔte dedaw no.
Aga m emekwa ka ndị Izrel na ndị Juda a dọtara nʼagha lọta. Aga m ewugharịkwa ha dịka ụlọ, mee ka ha dịrị ka ha dị na mbụ.
8 Mɛhohoro wɔn bɔne a wɔayɛ atia me no nyinaa, na mede wɔn atuatew ho bɔne nso akyɛ wɔn.
Aga m eme ka ha dị ọcha site na mmehie ha niile, nke ha mere megide m. Aga m agbaghara ha mmehie ha na nnupu isi ha niile megide m.
9 Na saa kuropɔn yi bɛma me din ahyeta, ɛbɛma me anigye, ayeyi ne anuonyam wɔ asase so aman a wɔte nnepa a meyɛ ma no nyinaa mu; wobesuro na wɔn ho apopo wɔ yiyedi ne asomdwoe bebrebe a mede ma no nti.’
Mgbe ahụ, obodo a ga-aghọkwa ihe ga-eme ka mba niile nke ụwa mara m, ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime m, tookwa m, ma wetara m nsọpụrụ, mgbe ha ga-anụ ihe ọma niile m meere obodo a. Ha ga-atụkwa oke egwu, maakwa jijiji, nʼihi ezi ihe ahụ niile na nʼihi udo ahụ niile nke mụ onwe m mere ka o rute ha aka.’
10 “Sɛɛ na Awurade se: ‘Woka fa saa beae yi ho se, “Ada mpan a nnipa anaasɛ mmoa nni so.” Nanso Yuda nkurow ne Yerusalem mmɔnten a ada mpan na nnipa anaa mmoa nni no, hɔ na wɔbɛsan ate bio,
“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu na-asị banyere ebe a, “Ọ bụ mkpọmkpọ ebe, ebe ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya.” Ma nʼobodo Juda, ya na okporoụzọ niile dị na Jerusalem, nke tọgbọrọ nʼefu ugbu a, nke mmadụ maọbụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya, a ga-emesịa nụkwa
11 ahurusi ne anigye nnyigyei, ayeforo ne ayeforokunu nne ne wɔn a wɔde aseda afɔrebɔ reba Awurade fi nne se, “‘“Momfa aseda mma Asafo Awurade, efisɛ Awurade ye, na ne dɔ wɔ hɔ daa.” Na mɛsan de asase no so nnepa a wɔwɔ hɔ dedaw no aba bio,’ Awurade, na ose.
olu ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị ahụ niile na-eweta onyinye ekele nʼụlọ Onyenwe anyị, ndị ahụ ga-asị, “‘“Nyenụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekele nʼihi na Onyenwe anyị dị mma. Ịhụnanya ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.” Nʼihi na aga m eme ka ndị ala a, nke a dọtara nʼagha lọta, dịkwa ka ha dị na mbụ,’ otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
12 “Sɛɛ na Asafo Awurade se: ‘Ɛha yi a ada mpan a nnipa ne mmoa nni no; ne nkurow nyinaa so no, wobenya nguanhwɛfo adidibea ne nea wɔn nguankuw bɛhome.
“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Nʼebe a, nke bụ mkpọmkpọ ebe ugbu a, nke mmadụ maọbụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya, ka a ga-emesịa nweekwa ebe ịta nri nke igwe ewu na atụrụ, nʼime obodo niile, ebe ndị ọzụzụ atụrụ ga-eduru igwe ewu na atụrụ ha gaa izuike.
13 Nkurow a ɛwɔ ɔman a ɛda bepɔw so no atɔe fam mmepɔw ase mu, Negeb, Benyamin mantam mu, nkuraa a atwa Yerusalem ho ahyia ne Yuda nkurow mu, nguankuw betwa mu bio wɔ nea ɔkan wɔn no nsa ase.’ Awurade, na waka.
Nʼime obodo niile nke dị nʼala ugwu ugwu, na nʼobodo niile nke dị na mgbada ugwu niile nke Negev, nʼoke ala Benjamin, nʼime obodo nta niile nke gbara Jerusalem gburugburu, na nʼime obodo niile nke Juda. Igwe ewu na atụrụ ga-agabigakwa ọzọ nʼokpuru aka abụọ nke onye na-agụ ha ọnụ.’ Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu.
14 “‘Nna no reba,’ Awurade na ose, a mɛma adom bɔ a mehyɛɛ Israel ne Yudafi no aba mu.
“‘Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘mgbe m ga-emezu ezi nkwa ahụ m kwere ụlọ Izrel na ụlọ Juda.
15 “‘Nna no mu ne saa bere no mɛma trenee Dubaa afefɛw afi Dawid ase; ɔbɛyɛ nea ɛteɛ ne nea eye wɔ asase no so.
“‘Nʼụbọchị ndị ahụ, na nʼoge ahụ, aga m eme ka Alaka ezi omume pupụta site nʼezinaụlọ Devid. Ọ ga-eme ihe ziri ezi, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ.
16 Saa nna no mu, wobegye Yuda nkwa na Yerusalem bɛtena asomdwoe mu. Eyi ne din a wɔde bɛfrɛ no Awurade, Yɛn Trenee.’
Nʼụbọchị ndị ahụ, ka a ga-azọpụta Juda, Jerusalem ga-ebikwa nʼudo. Nke a bụ aha a ga-akpọ ya, Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ ezi omume anyị.’
17 Na sɛɛ na Awurade se: ‘Ɔbarima a ɔbɛtena Israel ahengua so no remmɔ Dawid da,
Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘O nweghị oge a ga-ahapụ inweta otu onye site nʼezinaụlọ Devid onye ga-anọ nʼocheeze ụlọ Izrel.
18 saa ara nso na asɔfo a wɔyɛ Lewifo no, ɔbarima a obegyina mʼanim daa abɔ ɔhyew afɔre ne aduan afɔre na ɔde afɔre ahorow abrɛ me, remmɔ wɔn da.’”
Ọ dịkwaghị mgbe a ga-ahapụ inweta onye ga-esite nʼetiti ndị nchụaja na ndị Livayị, nke ga-eguzo nʼihu m ụbọchị niile ịchụ aja nsure ọkụ, na i wetara m onyinye ịnata ihuọma, na ịchụrụ m aja dị iche iche.’”
19 Awurade asɛm baa Yeremia nkyɛn se:
Emesịa, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
20 “Sɛɛ na Awurade se: ‘Sɛ wubetumi abu me ne adekyee ne adesae apam so, na adekyee ne adesae amma wɔn bere a wɔahyehyɛ no a,
“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ọ bụrụ na unu nwere ike ime ka ọgbụgba ndụ m na ehihie, na ọgbụgba ndụ mụ na abalị ghara ịdịkwa, ime ka ehihie na abalị gharakwa ịpụta nʼoge ha,
21 ɛno de, na me ne mʼakoa Dawid apam ne Lewifo a wɔyɛ asɔfo a wɔsom wɔ mʼanim no apam no nso, wubetumi abu so, na Dawid rennya nʼaseni a ɔbɛtena ahengua so adi hene bio.
mgbe ahụ ọgbụgba ndụ nke mụ na Devid ohu m gbara, na ọgbụgba ndụ nke m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na ndị Livayị, bụ ndị nchụaja na-eje ozi ha nʼihu m, agaghị adịkwa. A gaghị enwekwa onye ga-esi nʼezinaụlọ Devid nke ga-anọkwasị nʼocheeze ya.
22 Mɛma mʼakoa Dawid asefo ne Lewifo a wɔsom wɔ mʼanim no ase adɔ te sɛ ɔsoro nsoromma a wontumi nkan ne mpoano nwea a wontumi nsusuw.’”
Aga m eme ka ụmụ ụmụ Devid ohu m, na ndị Livayị, bụ ndị na-eje ozi ha nʼihu m, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando dị na mbara eluigwe; ha ga-adịkwa ukwuu dịka uzuzu dị nʼọnụ mmiri osimiri nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.’”
23 Awurade asɛm baa Yeremia nkyɛn se,
Okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
24 “Wontee sɛ nnipa yi reka se, ‘Awurade apo ahenni abien a oyii no’ ana? Enti wobu me man animtiaa na wɔmmfa wɔn sɛ wɔyɛ ɔman bio.
“Ị hụla ajụjụ ndị a na-ajụ? Ha na-ajụ na-asị, ‘Onyenwe anyị ọ jụla agbụrụ abụọ ndị a ọ họpụtara?’ Nʼihi ya, ha na-elelị ndị m, ha adịghị agụkwa ha dịka mba.
25 Nea Awurade se ni: ‘Sɛ mantintim me ne adekyee ne adesae apam ne ɔsoro ne asase mmara no a,
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ọ bụrụ na m emeghị ka ọgbụgba ndụ dịrị nʼetiti mụ na ehihie na abalị, meekwa ka iwu na-achị eluigwe na ụwa guzosie ike,
26 ɛno de anka mɛpo Yakob ne mʼakoa Dawid asefo, na merenyi ne mmabarima mu baako sɛ onni Abraham, Isak ne Yakob asefo so. Na mede wɔn ahonyade bɛsan ama wɔn, na manya ayamhyehye ama wɔn.’”
mgbe ahụ, agaara m ajụ ụmụ ụmụ Jekọb, na ụmụ ụmụ Devid ohu m. Agaraghị m ahọpụta otu nʼime ụmụ ya ka ọ chịa ụmụ ụmụ Ebraham na Aịzik na Jekọb. Ma aga m eme ka ndị ha a dọtara nʼagha lọta; aga m enwekwa obi ebere nʼahụ ha.’”

< Yeremia 33 >