< Hesekiel 33 >

1 Awurade asɛm baa me nkyɛn se:
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2 “Onipa ba, kasa kyerɛ wo manmma na ka kyerɛ wɔn se: ‘Sɛ metwe mʼafoa wɔ asase bi so, na sɛ asase no so nnipa yi wɔn mmarima no mu baako sɛ ɔnyɛ ɔwɛmfo mma wɔn,
“Nwa nke mmadụ, gwa ndị gị okwu sị ha, ‘Mgbe m wetara mma agha imegide mba ọbụla, ma ndị ala ahụ ahọpụta otu onye nʼetiti ha mee ya ka ọ ghọrọ ha onye nche,
3 na ohu sɛ afoa reba abɛko atia asase no a, ɔhyɛn torobɛnto de bɔ nnipa no kɔkɔ.
onye ga-ahụ mma agha ka ọ na-abịakwasị ala ahụ, ọ bụrụ na o gbuo opi ike, ịdọ ndị bi na mba ahụ aka na ntị banyere mma agha nke na-abịa,
4 Na sɛ obi te torobɛnto no nnyigyei na wanna ne ho so, na sɛ afoa no bekum no a, ne mogya bɛbɔ ɔno ankasa ti so.
ọ bụrụkwa na onye ọbụla anụ opi ike ahụ ma jụ ịnabatara onwe ya ịdọ aka na ntị ahụ, mma agha ahụ gbuo ya, ọbara ya ga-adịkwasị ya nʼisi.
5 Esiane sɛ ɔtee torobɛnto no nnyigyei na wantie kɔkɔbɔ no nti, ne mogya bɛbɔ nʼankasa ti so. Sɛ otiee kɔkɔbɔ no a, anka onyaa ne ti didii mu.
Nʼihi na ha nụrụ ụda opi nke ịdọ aka na ntị ahụ ma ha geghị ntị. Ọ bụ ha wetaara onwe ha ịla nʼiyi. A sị na ha gere ntị ha gaara azọpụta ndụ ha.
6 Nanso sɛ ɔwɛmfo no hu sɛ afoa no reba na wanhyɛn torobɛnto no ammɔ nnipa no kɔkɔ, na sɛ afoa no ba bekum wɔn mu baako a, wɔbɛfa saa onipa no akɔ wɔ ne bɔne nti, nanso mɛma ɔwɛmfo no abu owufo no mogya ho akontaa.’
Ma ọ bụrụ na onye nche elepụ anya hụ ndị agha ka ha na-abịa hapụ igbu opi ịdọ ndị mmadụ aka na ntị, ọnwụ ha dị nʼisi ya. Ha ga-anwụ nʼime mmehie ha, ma aga m ajụta ọbara ha site nʼaka onye nche ahụ.’
7 “Onipa ba, mayɛ wo ɔwɛmfo ama Israelfi, ɛno nti tie mʼanom nsɛm na fa kɔkɔbɔ a efi me nkyɛn ma wɔn.
“Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka ị bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka ị dọọrọ m ha aka na ntị.
8 Sɛ meka kyerɛ omumɔyɛfo se, ‘Wo omumɔyɛfo, owu na wubewu,’ na sɛ woankasa ankyerɛ no amma wamfi nʼakwan so a, saa omumɔyɛfo no bewu ne bɔne mu, na mɛma woabu ne mogya ho akontaa.
Mgbe m na-asị onye ajọ omume, gị onye na-emebi iwu, ị ghaghị ịnwụ! Ọ bụrụ na ị kwughị okwu, ime ka o chigharịa site nʼụzọ ya pụta, onye ahụ na-emebi iwu ga-anwụ nʼihi mmehie ya niile, ma nʼaka gị ka m ga-ajụta ọbara ha.
9 Nanso sɛ wobɔ omumɔyɛfo no kɔkɔ sɛ omfi nʼakwan so na sɛ wanyɛ a, ne bɔne nti, obewu, nanso worenni ne mogya ho fɔ.
Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka na ntị ka o chigharịa site nʼụzọ ya pụta, ma o meghị nke a, ha ga-anwụ nʼihi mmehie ha, ma ndụ gị onwe gị ka ị zọpụtara.
10 “Onipa ba, ka kyerɛ Israelfi se: ‘Sɛɛ ne nea moreka: “Yɛn mfomso ne yɛn nnebɔne hyɛ yɛn so, yɛresɛe, esiane eyinom nti. Na dɛn na yɛbɛyɛ na yɛanya nkwa?”’
“Nwa nke mmadụ, gwa ụlọ Izrel, ‘Otu a ka unu na-ekwu, “Njehie niile anyị na mmehie niile anyị adịla arọ nʼahụ anyị. Ọ bụkwa nʼime ya ka anyị na-ata ahụ. Olee otu anyị ga-esi dị ndụ?”’
11 Ka kyerɛ wɔn se, ‘Sɛ mete ase yi, Otumfo Awurade asɛm ni, mʼani nnye amumɔyɛfo wu ho, na mmom mepɛ sɛ wɔdan fi wɔn akwan so na wonya nkwa. Monnan! Monnan mfi mo amumɔyɛ akwan no so! Adɛn nti na ɛsɛ sɛ muwuwu, Israelfi?’
Gwa ha, ‘Dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ọnwụ onye na-emebi iwu adịghị atọ m ụtọ, kama ọ na-atọ m ụtọ mgbe onye na-emebi iwu sitere nʼụzọ ya chegharịa dịrị ndụ. Chigharịanụ, sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu niile chigharịa. Nʼihi gịnị ka unu ga-eji nwụọ, unu bụ ụlọ Izrel?’
12 “Ɛno nti onipa ba, ka kyerɛ wo manmma se, ‘Ɔtreneeni trenee rentumi nnye no nkwa wɔ bere a ɔnyɛ osetie; na omumɔyɛfo amumɔyɛ remma ɔnhwe ase wɔ bere a ɔdan fi ho. Sɛ ɔtreneeni yɛ bɔne a, ɔrennya nkwa wɔ ne kan treneeyɛ nti.’
“Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, gwa ndị ala gị, ‘Ezi omume nke onye na-eme ezi ihe agaghị azọpụta ya ma ọ bụrụ na ọ tụgharịa, mee ihe ọjọọ. Otu a kwa, mmehie niile nke onye na-emebi iwu agaghị eme ka ọ laa nʼiyi ma ọ bụrụ na o chegharịa pụọ site na mmehie.’
13 Sɛ meka kyerɛ ɔtreneeni sɛ obenya nkwa, na afei ɔde ne ho to ne treneeyɛ so na ɔyɛ bɔne a, wɔrenkae ne kan trenee nneyɛe biara. Obewu wɔ ne bɔne a wayɛ nti.
Ọ bụrụ na m asị onye ezi omume, na ọ ghaghị ịdị ndụ, ma onye dị otu a atụkwasị obi nʼezi omume ya mee ajọ ihe, ọ dịghị ihe ezi omume nke onye dị otu a mere nke a ga-echetakwa. Ha ga-anwụ nʼihi ajọ ihe ha mere.
14 Na sɛ meka kyerɛ omumɔyɛfo se, ‘Owu na wubewu,’ na afei ɔdan fi ne nnebɔne ho na ɔyɛ nea eye na ɛteɛ,
Ma ọ bụrụ na m asị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ ma onye ahụ esite na mmehie ya chigharịa, mee ihe ziri ezi na nke dị mma,
15 na sɛ ɔsan de bosea ho awowaside ma, na ɔsan de nea wawia ma, na odi ahyɛde a ɛma nkwa so, na wanyɛ bɔne a, ampa ara obenya nkwa, na ɔrenwu.
ọ bụrụ na o nyeghachi ihe ebe ọ naara nʼaka ndị ọ gbazinyere ego, kwụghachi ihe niile o zuuru nʼohi, gbasoo ụkpụrụ ahụ niile bụ nke na-enye ndụ, gharakwa ime ajọ omume; onye dị otu a aghaghị ịdị ndụ, ọ gaghị anwụ.
16 Wɔrenkae bɔne a wayɛ no mu biara ntia no. Wayɛ nea eye na ɛteɛ, ampa ara obenya nkwa.
Ọ dịghị mmehie niile nke onye ahụ mere nke a ga-echeta megide ya. Nʼihi na o meela ihe ziri ezi na nke dịkwa mma, ọ gaghị ịdị ndụ.
17 “Nanso wo manmma ka se, ‘Awurade akwan nteɛ.’ Nanso ɛyɛ wɔn akwan mmom na ɛnteɛ.
“Ma ndị gị na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi.’ Ma ọ bụ ụzọ ha bụ nke na-ezighị ezi.
18 Sɛ ɔtreneeni fi ne trenee ho na ɔyɛ bɔne a, ɛno nti obewu.
Ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa malite ime ihe ọjọọ, ọ ga-anwụ maka ya.
19 Na sɛ omumɔyɛfo dan fi ne nnebɔne ho na ɔyɛ nea eye na ɛteɛ a, obenya nkwa.
Ma ọ bụrụ na onye ajọ omume esite nʼajọ omume ya chigharịa malite ime ihe ziri ezi na nke dị mma, ọ ga-adị ndụ site nʼime nke a.
20 Nanso Israelfi, moka se, ‘Awurade akwan nteɛ.’ Nanso mebu obiara atɛn sɛnea nʼakwan te.”
Ma unu bụ ụlọ Izrel na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi.’ Ma aga m ekpe onye ọbụla nʼime unu ikpe dịka ụzọ ya si dị.”
21 Yɛn asutwa afe a ɛto so dumien no sram a ɛto so du no nnaanum so, ɔbarima bi a waguan afi Yerusalem baa me nkyɛn bɛkae se, “Kuropɔn no ahwe ase!”
O ruo nʼafọ nke iri na abụọ nke e mere ka anyị jee biri na mba ọzọ, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke ise nke ọnwa ahụ, otu onye nʼime ndị sitere na Jerusalem gbapụ bịakwutere m gwa m sị, “Obodo ahụ adaala.”
22 Na anwummere a ade rebɛkye ama ɔbarima no aba no, na Awurade nsa wɔ me so na obuee mʼano ansa na ɔbarima no baa anɔpa. Enti na mʼano abue a mitumi kasa.
Ma nʼanyasị, tupu onye ahụ gbapụrụ agbapụ abịa, aka Onyenwe anyị ruru m ahụ, mee ka m nweekwa ike ikwu okwu ọzọ.
23 Afei Awurade asɛm baa me nkyɛn se,
Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
24 “Onipa ba, nnipa a wɔtete saa nnwiriwii so wɔ Israel asase no so no reka se, ‘Abraham yɛ onipa baako, nanso onyaa asase no nyinaa. Nanso yɛdɔɔso, na nokware wɔde asase no ama yɛn sɛ yɛn agyapade.’
“Nwa nke mmadụ, ndị ahụ bi nʼebe dakpọsịrị adakpọsị nʼala Izrel na-asị, ‘Ebraham bụ otu nwoke, ma o nwetachara ala a niile! Ma anyị dị ukwuu, nʼihi enyela anyị ala dịka ihe nweta anyị.’
25 Ɛno nti, ka kyerɛ wɔn se, ‘Sɛɛ na Otumfo Awurade se: Sɛ mowe nam a mogya wɔ mu, mosom mo anyame na muhwie mogya gu nti, ɛsɛ sɛ mofa asase no ana?
Ya mere, gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ebe ọ bụ na unu na-eri anụ nke ọbara dị nʼime ya, na-elekwasịkwa arụsị unu anya, na-awụsikwa ọbara, o kwesiri ka unu nweta ala a?
26 Mode mo ho to mo afoa so. Moyɛ akyiwade na mo mu biara gu ne yɔnko yere ho fi. Ɛsɛ sɛ munya asase no ana?’
Unu na-atụkwasị obi unu na mma agha unu, unu na-eme ihe arụ dị iche iche, onye ọbụla nʼime unu na-emerụ nwunye onye agbataobi ya. Ọ bụkwa ala nke a ka unu ga-enweta?’
27 “Ka eyi kyerɛ wɔn se, ‘Nea Otumfo Awurade se ni: Ampa ara sɛ mete ase yi, wɔn a wɔaka wɔ kurow no nnwiriwii mu no bɛtotɔ wɔ afoa ano. Wɔn a wɔwɔ wuram no mede wɔn bɛma nkekaboa ama wɔawe wɔn na wɔn a wɔwɔ abandennen ne abodan mu no, ɔyaredɔm bekunkum wɔn.
“Gwa ha nke a, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, dịka m na-adị ndụ, ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ e tikpọrọ etikpọ ga-anwụcha site na mma agha. Ndị bi nʼọhịa ka anụ ọhịa ga-atagbu. Ndị niile bi nʼọgba na nʼebe niile e wusiri ike ga-anwụ site nʼọrịa.
28 Mɛsɛe asase no ama ayɛ amamfo, na nʼahomaso ahoɔden no bɛba awiei na Israel mmepɔw no bɛda mpan a obiara rentwa mu wɔ hɔ.
Aga m eme ka ala unu ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Nganga ya, na ike ya ga-agwụsị. Obodo niile dị nʼugwu Izrel ga-aghọ ebe e tikpọrọ etikpọ, mmadụ agakwaghị esite nʼebe ahụ gafee ọzọ.
29 Afei wobehu sɛ mene Awurade no, bere a mama asase no ada mpan wɔ akyiwade a wɔayɛ nyinaa nti.’
Ha ga-amakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m mesiri ka ala ahụ ghọọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, nʼihi ihe arụ niile nke ha mere.’
30 “Wo de, onipa ba, wo manmma reka wo ho nsɛm wɔ afasu ho ne afi apon ano kyerɛ wɔn ho wɔn ho se, ‘Mommra mmetie asɛm a efi Awurade nkyɛn aba.’
“Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, ndị ala gị na-ekwu banyere gị nʼakụkụ mgbidi ha na nʼọnụ ụzọ ụlọ ha. Ha na-asịrịta onwe ha, ‘Bịanụ ka anyị gaa nụrụ ozi sitere nʼọnụ Onyenwe anyị.’
31 Me nkurɔfo ba wo nkyɛn, sɛnea wɔyɛ daa no, bɛtenatena wʼanim betie wo nsɛm, nanso wɔmmfa nyɛ adwuma. Wɔde wɔn ano ka ahofama, nanso wɔn koma mu de, wɔn ani bere asisi mu adenya.
Ha na-abịakwute gị dịka ndị mmadụ si abịa, ha na-anọrọ ala nʼihu gị na-anụ ihe ị na-ekwu ma ha anaghị emepụta ya nʼomume: nʼihi na ha na-eji egbugbere ọnụ ha na-egosi ịhụnanya, ma obi ha nọ naanị na uru ọjọọ ha ga-enweta.
32 Nokware, wɔn de, wote sɛ obi a ne nne yɛ dɛ, na ɔde nnwontode to ɔdɔ nnwom, efisɛ wɔte wo nsɛm nanso wɔmmfa nyɛ adwuma.
Nʼanya ha, ị dịka onye ji ezigbo olu na-ekwe ukwe ịhụnanya, dịka onye nwere olu ụtọ, nke na-abụ abụ dị ụtọ, na onye maara ka e si eti ịgba. Ha na-anụ ihe ị na-ekwu ma ha ejighị ya kpọrọ ihe ọbụla.
33 “Sɛ eyinom nyinaa ba mu a, na nokware ɛbɛba mu nso, na afei wobehu sɛ odiyifo bi baa wɔn mu.”
“Ma mgbe nke a bịara na mmezu, nʼihi ọ ghaghị ịbịa, ha ga-amata na onye amụma anọtụla nʼetiti ha.”

< Hesekiel 33 >