< Hesekiel 14 >

1 Israel mpanyimfo no mu bi baa me nkyɛn bɛtenatenaa mʼanim.
Ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel bịakwutere m, nọdụ ala nʼihu m.
2 Afei Awurade asɛm baa me nkyɛn se:
Mgbe ahụ okwu Onyenwe anyị ruru m ntị,
3 “Onipa ba, saa mmarima yi de ahoni ahyɛ wɔn koma mu na wɔde amumɔyɛ hintidua asisi wɔn anim. Ɛsɛ sɛ mema wobisa mʼase koraa ana?
“Nwa nke mmadụ, ndị ikom ndị a na-efe arụsị nʼime obi ha, ma tinyekwa ihe ịsụ ngọngọ nke ajọ omume ya nʼihu ha. Aga m ekwenye ka ha jụta m ase ọbụla?
4 Enti kasa kyerɛ wɔn na ka se, ‘Sɛɛ na Otumfo Awurade se: Sɛ Israelni biara de ahoni hyehyɛ ne koma mu na ɔde amumɔyɛ hintidua sisi nʼanim, na afei ɔkɔ odiyifo nkyɛn a, me Awurade, mɛma no mmuae a ɛfata nʼahonisom no kɛseyɛ.
Ya mere, gwa ha okwu sị ha ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Mgbe onye Izrel ọbụla na-agbaso arụsị nʼobi ya, nke na-ekwekwa ka arụsị ndị a na-eduba ya na mmehie, bịakwutere onye amụma ịjụta ya ase, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-aza onye ahụ dịka o si dị, ya bụ dịka ịba ụba nke arụsị ya niile si dị.
5 Mɛyɛ eyi de atwe Israelfo a wɔagyaw me akodi wɔn abosom akyi no koma aba bio.’
Nʼụzọ dị otu a ka m ga-esi nwetaghachikwa obi ndị Izrel niile bụ ndị si nʼebe m nọ wezuga onwe ha, ma malite ife arụsị.’
6 “Enti ka kyerɛ Israelfi se, ‘Sɛɛ na Otumfo Awurade se: Monsakra mo adwene. Mumfi mo ahoni ho na munnyae mo nneyɛe a ɛyɛ akyiwade no!
“Nʼihi ya, gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Chegharịanụ! Sitenụ nʼife arụsị unu niile chigharịa, jukwanụ omume unu niile rụrụ arụ.
7 “‘Sɛ Israelni bi anaa ɔnanani a ɔte Israel twe ne ho fi me nkyɛn na ɔde ahoni hyɛ ne koma mu de amumɔyɛ hintidua si nʼanim, na afei ɔkɔ odiyifo nkyɛn kobisa mʼase a, me, Awurade ankasa bebua no.
“‘Nʼihi na onye ọbụla nʼụlọ Izrel maọbụ onye ọbụla nʼime ndị ọbịa bi nʼala Izrel, nke kewapụrụ onwe ya site nʼiso m, si otu a mee ka arụsị ọ na-efe baa ya nʼobi, nke na-etinye ihe ịsọ ngọngọ ajọ omume nʼihu ha, mechaa, gakwuru onye amụma maka isite nʼaka ya ịjụta m ase, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-azaghachi ha.
8 Metu mʼani asa onipa no na mede no ayɛ nhwɛso ne kasabebui. Meyi no afi me nkurɔfo mu. Afei mubehu sɛ mene Awurade no.’
Aga m edokwa onwe m imegide ha, mee ka ha bụrụ ihe ịmaatụ na ilu nye ndị ọzọ. Aga m esitekwa nʼetiti ndị m wezuga ha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
9 “‘Na sɛ odiyifo no ma wɔdaadaa no ma ɔhyɛ nkɔm a, me Awurade na madaadaa odiyifo no, mɛteɛ me nsa wɔ ne so na matwa no afi me nkurɔfo Israelfo mu.
“‘Ọ bụrụ na arafuo onye amụma ahụ ka o buo amụma, ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị rafuru onye amụma ahụ. Aga m esetipụ aka m megide ya, bipụkwa ya site nʼetiti ndị m, bụ Izrel.
10 Wɔbɛsoa wɔn afɔdi; odiyifo no ne nea okohuu no no nyinaa bedi fɔ.
Ha ga-ata ahụhụ nʼihi mmehie ikpe ọmụma ha, dịka ikpe ọmụma dịrị onye na-ajụ ase, otu a ka ọ ga-adịkwa nye onye amụma ụgha ahụ.
11 Na Israelfo renkwati me bio, na wɔremfa wɔn nnebɔne no ngu wɔn ho fi bio. Wɔbɛyɛ me nkurɔfo na mɛyɛ wɔn Nyankopɔn, Otumfo Awurade asɛm ni.’”
Mgbe ahụ, ụmụ Izrel agaghị esitekwa nʼiso m kpafuo ọzọ. Ha agakwaghị eji mmehie merụọ onwe ha, kama ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara ya.’”
12 Awurade asɛm baa me nkyɛn se:
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
13 “Onipa ba, sɛ ɔman bi anni me nokware na enti wɔyɛ bɔne de tia me, na meteɛ me nsa wɔ wɔn so na migyae wɔn aduanma, na mema ɔkɔm ba bekunkum mu nnipa ne wɔn mmoa a,
“Nwa nke mmadụ, ọ bụrụ na ndị bi nʼala emehie megide m, site nʼekwesighị ntụkwasị obi ha, ọ bụrụ na m esetipụ aka m mee ka oke ụnwụ bịakwasị ha, ọ bụrụkwa na m emee ka mmadụ na anụmanụ niile dị nʼala a nwụchasịa,
14 mpo sɛ saa nnipa baasa a wɔyɛ Noa, Daniel ne Hiob wɔ ɔman no mu a, wɔn trenee begye wɔn nko ara nkwa, Otumfo Awurade asɛm ni.
a sịkwa na Noa, Daniel na Job bi nʼetiti ya, ha ga-azọpụta naanị onwe ha nʼezi omume ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
15 “Anaa sɛ mema wuram mmoa kɔ saa asase no so na wokunkum so nnipa nyinaa na asase no sɛe a obiara ntumi mfa so, esiane wuram mmoa no nti a,
“Asị na m eziga anụ ọhịa ọjọọ ka ha bịa bibie ala ahụ, mee ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu meekwa ka mmadụ ọbụla ghara ị site nʼime ya gafee nʼihi anụ ọhịa ndị ahụ,
16 sɛ mete ase yi, Otumfo Awurade asɛm ni, mpo sɛ saa mmarima baasa yi wɔ asase no so a, wɔrentumi nnye wɔn ankasa mmabarima ne mmabea nkwa. Wɔn nko ara na wobegye wɔn nkwa na asase no bɛsɛe.
dịka m na-adị ndụ ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ọ bụrụkwarị na ndị ikom atọ ndị a nọ nʼebe a, ha agaghị anapụta ọ bụladị ụmụ ha ndị nwoke maọbụ ụmụ ha ndị nwanyị site nʼịla nʼiyi. Naanị ha ka a ga-azọpụta, ma ala ahụ ga-abụ ihe tọgbọrọ nʼefu.
17 “Sɛ nso metwe afoa wɔ asase no so, na meka se, ‘Ma afoa no nkɔ asase no so nyinaa,’ na mikunkum so nnipa ne wɔn mmoa,
“Ọ bụrụ na a sị na m mere ka mma agha bịakwasị ala ahụ, m sị, ‘Ka mma agha gabiga site nʼala ahụ niile gburugburu,’ ma gbuo mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime ya,
18 sɛ mete ase yi, Otumfo Awurade asɛm ni, mpo sɛ saa mmarima baasa yi wɔ asase no so a, wɔrentumi nnye wɔn ankasa mmabarima ne mmabea nkwa. Wɔn nko ara na wobenya nkwa.
dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, a sịkwarị na ndị ikom atọ ndị a nọ nʼala ahụ, ha agaghị anapụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom site nʼịla nʼiyi. Kama, ọ bụ naanị ha onwe ha ka a ga-anapụta.
19 “Sɛ nso mesoma ɔyaredɔm kɔ asase no so na menam mʼabufuwhyew so hwie mogya gu wɔ asase no so, kunkum so nnipa ne wɔn mmoa a,
“Ọzọkwa, ọ bụrụ na m eziga oke iwe m site nʼajọ ọrịa na-efe efe, ọ bụrụ na ọrịa ahụ egbuo mmadụ na anụmanụ ha niile,
20 sɛ mete ase yi, Otumfo Awurade asɛm ni, sɛ Noa, Daniel ne Hiob mpo wɔ hɔ a, wɔrentumi nnye ɔbabarima anaa ɔbabea nkwa. Wɔn trenee nti wobegye wɔn nkwa.
dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, a sịkwa na Noa, Daniel na Job bi nʼime ya, ha agaghị anapụta ụmụ ha ndị ikom maọbụ ndị inyom site nʼịla nʼiyi. Ha ga-azọpụta naanị onwe ha nʼezi omume ha.
21 “Na sɛɛ na Otumfo Awurade se: Ɛbɛyɛ hu mmoroso sɛ mɛma mʼatemmu huhuhuhu anan, a ɛyɛ afoa, ɔkɔm, wuram mmoa ne ɔyaredɔm akɔ Yerusalem so akokunkum ne mmarima ne wɔn mmoa!
“Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, a ga-esi aṅaa napụta ya, mgbe m zipụrụ ụzọ ikpe m anọ dị oke egwu nke na-echere Jerusalem. Ikpe ndị a bụ: mma agha na ụnwụ, anụ ọhịa ọjọọ na-adọgbu adọgbu na ọrịa na-efe efe, ka ha gbuchapụ mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime ya.
22 Nanso ebinom bɛka, mmabarima ne mmabea a wobeyi wɔn afi mu no. Wɔbɛba mo nkyɛn na sɛ muhu wɔn su ne wɔn nneyɛe a, mo bo bɛtɔ mo yam wɔ amanehunu a me de aba Yerusalem so no ho, amanehunu a mede aba ne so biara.
Ma a ga-enweta ụfọdụ ndị ga-afọdụ ndụ, bụ ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị a ga-anapụta site nʼahụhụ ndị a. Ha ga-abịakwute unu. Mgbe unu hụrụ omume ha, na obibi ndụ ha, ha ga-abụrụ unu ihe nkasiobi nʼihi na unu ga-esite na ha mata ụdị mbibi nke m mere ka ọ bịakwasị Jerusalem.
23 Sɛ muhu wɔn su ne wɔn nneyɛe a mo bo bɛtɔ mo yam, efisɛ mubehu sɛ, menyɛɛ biribiara wɔ hɔ a enni farebae, Otumfo Awurade asɛm ni.”
A ga-akasịkwa unu obi mgbe unu hụrụ omume ha na obibi ndụ ha, unu ga-amatakwa na ọ bụghị nʼefu ka m mere ka ihe ndị a niile dakwasị ha.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.

< Hesekiel 14 >