< 2 Mose 18 >

1 Ankyɛ biara na Mose ase, Midian sɔfo Yetro, tee anwonwade a Onyankopɔn ayɛ ama ne nkurɔfo Israelfo ne Mose, ne sɛnea wayi wɔn afi Misraim asase so no.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jetro, nna nwunye Mosis, onye bụkwa onye nchụaja Midia, nụrụ banyere ihe niile Chineke meere Mosis na Izrel ndị nke ya, na ụzọ Onyenwe anyị si napụta Izrel site nʼaka ndị Ijipt.
2 Mose de ne yere Sipora kɔe no, nʼase Yetro gyee no
Jetro ọgọ nwoke Mosis kpọọrọ Zipọra, nwunye Mosis, mgbe Mosis chụlara ya
3 a na ne mmabarima baanu ka ne ho. Mose too ne babarima a na ɔyɛ nʼabakan no din Gersom a ɔkyerɛ ase se, “Mabɛyɛ ɔhɔho wɔ ananafo asase so.”
na ụmụ ya ndị ikom abụọ. Aha nwa ya nke mbụ bụ Geshọm, nke pụtara, abụ m ọbịa na mba ọzọ.
4 Na ne babarima a ɔto so abien no nso, ɔtoo ne din Elieser a ɔkyerɛ ase se “Mʼagyanom Nyankopɔn no yɛ me boafo. Ogyee me fii Farao afoa ano.”
Aha nwa nwoke nke abụọ bụ Elieza, nke bụ, Onyenwe anyị bụ onye inyeaka m. Nʼihi na mgbe Mosis mụrụ Elieza o kwuru sị, “Chineke nna m bụ onye inyeaka m, nʼihi na ọ napụtara m site na mma agha Fero.”
5 Yetro kɔsraa Mose. Ɔde Mose yere ne ne mmabarima baanu no kaa ne ho. Wodui no, na Mose ne nnipa no abɔ atenae wɔ Onyankopɔn bepɔw no ho.
Jetro, ọgọ nwoke Mosis, bịakwutere ha nʼime ọzara. O dutere ụmụ ndị ikom Mosis abụọ na nwunye Mosis. Nʼoge ahụ, Mosis na ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu Chineke.
6 Wɔka kyerɛɛ Mose se, “Wʼase Yetro reba abɛsra wo. Wo yere ne wo mmabarima baanu no ka ne ho.”
O ziri Mosis ozi sị, “Mụ bụ Jetro ọgọ gị nwoke bịakwutere gị, nwunye gị na ụmụ gị abụọ sokwa m.”
7 Mose sɔre kohyiaa nʼase. Ɔkotow no nidi mu gyee no fɛw so. Wokyiakyiaa wɔn ho wɔn ho na wɔkɔɔ Mose ntamadan mu.
Nʼihi ya, Mosis gara zute ọgọ ya nwoke, kpọọ isiala nye ọgọ ya, sutu ya ọnụ. Emesịa, ọ kpọbatara ha nʼime ụlọ ikwu ya. Jetro na ọgọ ya Mosis kwurịtara okwu, jụọ ihe banyere otu ihe si agara ibe ha.
8 Mose kaa nsɛm a asisi nyinaa kyerɛɛ nʼase no. Ɔkaa nea Awurade ayɛ atia Farao ne Misraimfo a ɔnam so agye Israelfo, ayi wɔn afi Misraim, asan ayi wɔn afi ɔhaw ne abɛbrɛsɛ mu no nso kyerɛɛ no.
Mosis kọọrọ nna nwunye ya ihe niile Onyenwe anyị mere Fero na ndị Ijipt niile nʼihi ndị Izrel. Ọ kọkwaara ya banyere ihe ndakwasị niile dakwasịrị ha nʼime ọzara, na otu Onyenwe anyị si napụta ha.
9 Yetro tee nea Awurade ayɛ ama Israel, ne titiriw no, sɛnea oyii wɔn fii Misraim no, nʼani gyee yiye.
Jetro soro Mosis ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu nʼihi ihe niile Onyenwe anyị meere ndị Izrel, na otu o siri napụta ha site nʼaka ndị Ijipt.
10 Yetro kae se, “Nhyira nka Awurade sɛ wagye mo afi Misraimfo ne Farao nsam, na wagye ɔman Israel nso.
Jetro kwuru sị, “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ. Onye napụtara unu site nʼaka ndị Ijipt na site nʼaka Fero.
11 Afei, mahu sɛ Awurade yɛ ɔkɛse sen onyame foforo biara, efisɛ wayɛ eyi ama wɔn a wɔde ahantan di wɔn so no.”
Ugbu a, amaara m na Onyenwe anyị kachasị chi ndị ọzọ niile elu, nʼihi na ọ zọpụtara ndị ya site nʼaka ndị Ijipt ndị sitere na mpako ha meso Izrel mmeso.”
12 Yetro de ɔhyew afɔrebɔde bae, na ɔbɔɔ afɔre maa Onyankopɔn. Akyiri no, Aaron ne Israel mpanyimfo no baa Yetro nkyɛn. Wɔn nyinaa too nsa dii afɔreguan no wɔ Awurade anim.
Jetro, nna nwunye Mosis chụọrọ Chineke aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ. Emesịa, Erọn na ndị okenye Izrel bịara soro Mosis na ọgọ ya nwoke rie ihe nʼihu Chineke.
13 Ade kyee no, Mose tenaa ase fii anɔpa kosii anwummere tiee ntawntaw a asisi wɔ nnipa no mu.
Nʼụbọchị nke ọzọ ya, Mosis bịara nọdụ ala ikpere ndị mmadụ ikpe. Igwe mmadụ nọgidere Mosis site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị.
14 Mose ase no huu brɛ a ɔrebrɛ nnipa no ho no, obisaa no se, “Adɛn nti na wopɛ sɛ wo nko ara wudi dwuma kɛse yi a enti nnipa gyina wo so saa ara fi anɔpa kosi anwummere yi?”
Ọgọ Mosis hụrụ ihe niile ọ na-emere ndị mmadụ, nke a mere na ọ jụrụ, “Gịnị bụ ihe nke a ị na-emere ndị a? Gịnị mere i ji nọdụ ala naanị gị, ndị a niile gbaa gị gburugburu malite nʼụtụtụ ruo nʼanyasị?”
15 Mose buae se, “Nnipa no de akasakasa bi a asisi wɔn ntam bɛtoo mʼanim sɛ mimmisa Onyankopɔn hɔ akwankyerɛ.
Mosis zara nna nwunye ya sị, “Nʼihi na ha bịara ịjụta m ihe si nʼaka Chineke.
16 Sɛ ntawntaw bi ba wɔn ntam a, wɔba ma misiesie. Mekyerɛ wɔn Onyankopɔn mmara ne nʼapɛde.”
Ọ bụrụ na esemokwu adịrị nʼetiti mmadụ ọbụla na ibe ya, ha na-abịakwute m, ka m kpebie ihe dị nʼetiti mmadụ na ibe ya. Ana m eme ka ha mata iwu na ụkpụrụ Chineke.”
17 Nʼase no kae se, “Nea woreyɛ no nye.
Mgbe Jetro, nna nwunye Mosis, nụrụ ihe ndị a niile, ọ sịrị Mosis, “Ihe ị na-eme adịghị mma.
18 Worekum wo ho na sɛ wuwu a, nnipa yi bɛyɛ dɛn? Mose, adwuma yi so dodo sɛ wo nko ara wobɛyɛ.
Ike ga-agwụ gị, gwụkwa igwe mmadụ ndị a. Ọrụ a ị na-arụ dị ukwuu karịa gị. Naanị gị agaghị ebuli ya.
19 Tie fo a merebetu wo yi na Onyankopɔn behyira wo. Kɔ so ara si nnipa no anan wɔ Onyankopɔn anim na fa wɔn haw to nʼanim.
Ugbu a, gee m ntị. M ga-adụ gị ọdụ, ka Chineke nọnyekwara gị. Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na ị bụ onye na-anọchi anya ndị a nʼihu Chineke. Nʼụzọ dị otu a, i nwere ike iweta nsogbu niile ha nwere nʼihu Chineke.
20 Kyerɛ wɔn Onyankopɔn akwan a wɔmfa so ntena ase.
Ihe ọzọ ị ga-eme bụ nke a: ị ga-akụziri ha iwu na ụkpụrụ Chineke, gosikwa ha ụzọ ha ga-esi bie ndụ, na ọrụ ha kwesiri ịrụ.
21 Na hwehwɛ nnipa bi a wɔyɛ nyamesurofo na wɔyɛ nokwafo a wɔmpɛ adanmudegye, na wɔn mu baako biara nyɛ nnipa apem so otemmufo. Ɛsɛ sɛ saa onipa no nya atemmufo du hyɛ nʼase na wɔn mu baako biara ahwɛ nnipa ɔha so. Na wɔn ase no, wobeyi atemmufo baanu a wɔbɛhwɛ nnipa aduonum so, na wɔn nso, atemmufo baanum bɛhyɛ wɔn mu biara ase na wɔatu nnipa du fo.
Ma site nʼetiti ndị a họpụta ndị ikom tozuru, ndị ikom na-atụ egwu Chineke, ndị kwesiri ntụkwasị obi na ndị kpọrọ uru nʼezighị ezi asị. Mee ha ndịisi na-achị imerime puku ndị mmadụ, ndịisi narị mmadụ, ndịisi iri mmadụ ise na ndịisi mmadụ iri.
22 Ma saa nnipa yi nni wɔn ho ni na wonni nokware daa. Asɛm biara a ɛho hia anaa ɛkyere adwene no, wɔmfa mmra wʼanim. Wɔn ankasa nhwɛ nka nsɛm nketenkete a ɛbɛba wɔn anim no. Sɛ wofa saa kwan yi so a, adwuma no bɛyɛ mmerɛw ama wo, efisɛ woakyekyɛ nnwuma no ama wɔn.
Mee ka ha bụrụ ndị ikpe nye ndị mmadụ oge niile. Nye iwu ka ha na-ewetara gị okwu dịkarịsịrị ike, ma na-ekpe ikpe gbasara okwu dị mfe na ndị ọzọ niile dị iche iche. Nʼụzọ dị otu a, ndị ikpe ndị ahụ ga-enyere gị aka ime ka ibu arọ gị dị mfe.
23 Sɛ wutie afotu no na Onyankopɔn nso pene so a, wubetumi agyina asɛm biara ano na asomdwoe aba.”
Ọ bụrụ na ị ga-eme ihe niile ndị a, ọ bụrụkwa na Chineke ekwenye, ị ga-enwe ike nagide nsogbu niile. Mmadụ niile ga-ewere udo na ọṅụ birikwa.”
24 Mose tiee nʼase afotu no dii so pɛpɛɛpɛ.
Mosis gere ntị nʼihe niile nna nwunye ya gwara ya. O mekwara ihe niile o kwuru.
25 Oyiyii nnipa pa a wɔwɔ Israelman mu nyinaa de wɔn yɛɛ atemmufo—apem apem, ɔha ɔha, aduonum aduonum ne du du.
O sitere nʼetiti ụmụ Izrel họpụta ndị kwesiri ekwesi mee ka ha bụrụ ndịisi. Ụfọdụ ka o mere ndịisi na-elekọta imerime puku mmadụ, ụfọdụ na-achị narị mmadụ, ụfọdụ, iri mmadụ ise, ụfọdụ, mmadụ iri.
26 Na wobuu ɔman no atɛn bere nyinaa mu. Wɔde nsɛm akɛse no maa Mose na wɔn nso dii nsɛm nketenkete no.
Ha jere ozi dịka ndị ikpe nye ndị mmadụ nʼoge niile. Ha na-ewetara Mosis okwu niile siri ike, ma ha onwe ha na-ekpe ikpe banyere okwu nke dịkarịsịrị nta.
27 Akyiri no, Mose gyaa nʼase kwan ma ɔkɔɔ ne kurom.
Mgbe ahụ, Mosis zilagara nna nwunye ya. Jetro laghachikwara nʼobodo nke aka ya.

< 2 Mose 18 >