< 5 Mose 7 >

1 Sɛ Awurade, mo Nyankopɔn, de mo ba asase a morebɛkɔ akɔtena so no so, na ɔpam amanaman pii a wɔwɔ mo anim, a wɔyɛ Hetifo, Girgasifo, Amorifo, Kanaanfo, Perisifo, Hewifo ne Yebusifo, aman ason a wɔwɔ so na wɔyɛ den sen mo,
Mgbe Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-akpọbata unu nʼala ahụ unu na-abanye inweta, mgbe o si nʼihu unu chụpụ ọtụtụ mba ndị a nʼihu unu, bụ ndị Het, ndị Gigash, ndị Amọrait, ndị Kenan, ndị Periz, ndị Hiv na ndị Jebus, bụ mba asaa ndị dị ike nke ukwuu, baakwa ụba karịa unu;
2 na Awurade, mo Nyankopɔn, de saa aman yi hyɛ mo nsa na mudi wɔn so a, monsɛe wɔn pasapasa. Mo ne wɔn nhyehyɛ apam biara na munnhu wɔn mmɔbɔ.
mgbe Onyenwe anyị bụ Chineke unu nyefere ha nʼaka unu, unu meriekwa ha, lezienụ anya hụ na unu bibiri ha kpamkpam. Ka unu na ha ghara ịgba ndụ, unu emekwarala ha ebere.
3 Mo ne wɔn nni aware na mommma mo mmabea ne mo mmabarima nware wɔn mmabarima ne wɔn mmabea.
Unu na ha alụrịtakwala di na nwunye, unu enyekwala ụmụ ha ndị ikom ụmụ unu ndị inyom ka ha lụọ, maọbụ lụtara ụmụ unu ndị ikom ụmụ ha ndị inyom.
4 Efisɛ wɔbɛma mo mma asan afi mʼakyi akɔsom wɔn anyame foforo. Na Awurade abufuw bɛdɛw atia mo na wasɛe mo ntɛm.
Nʼihi na nke a ga-eme ka ụmụ unu site nʼiso m tụgharịa, malite ife chi ndị ọzọ. Mgbe ahụ iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ megide unu, laakwa unu nʼiyi ngwangwa.
5 Nea ɛsɛ sɛ moyɛ wɔn ne sɛ, mummubu wɔn afɔremuka na munnwiriw wɔn abosom adum no ngu. Muntwitwa wɔn abosompɔw ngu na monhyew wɔn ahoni.
Kama otu a ka unu ga-eme: tikpọọnụ ebe ịchụ aja ha niile. Kụrienụ ogidi arụsị ha niile. Gbutukwaanụ osisi Ashera ha, ma suo arụsị ha niile ọkụ.
6 Na moyɛ nnipa kronkron a moyɛ, Awurade, mo Nyankopɔn no, de. Nnipa a wɔwɔ asase so nyinaa mu no, mo na Awurade, mo Nyankopɔn, ayi mo sɛ nʼagyapade a ɛsom no bo.
Nʼihi na unu bụ ndị dị nsọ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Onyenwe anyị bụ Chineke unu ahọpụtala unu site nʼagbụrụ niile dị nʼụwa a, ka unu bụrụ ndị nke ya, ihe onwunwe ya dị oke ọnụahịa.
7 Ɛnyɛ sɛ modɔɔso sen nnipa a aka no nti na Awurade anya mo ho dɔ no, mo na na musua koraa wɔ nnipa no nyinaa mu.
Ọ bụghị nʼihi na unu dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị ji họpụta unu, hụ unu nʼanya otu a, nʼezie unu dịkarịsịrị nta nʼọnụọgụgụ.
8 Na mmom, Awurade dɔɔ mo na odii ne ntam a ɔka kyerɛɛ mo agyanom sɛ ɔde ne nsa a tumi wɔ mu no beyi wɔn afi nkoasom asase so ne Misraimhene Farao tumi ase no.
Kama, ọ bụ nʼihi Onyenwe anyị hụrụ unu nʼanya, mezuokwa iyi ọ ṅụrụ nye nna nna unu ha, ka o ji site nʼaka ya dị ike gbapụta unu site nʼala ebe unu bụ ndị ohu, site nʼike nke Fero, bụ eze Ijipt.
9 Enti munhu sɛ, Awurade, mo Nyankopɔn, yɛ Onyankopɔn; ɔyɛ nokware Nyankopɔn a odi wɔn a wɔdɔ no na wodi nʼahyɛde so no dɔ apam so kosi awo ntoatoaso apem so.
Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị bụ Chineke unu bụ Chineke. Ọ bụ Chineke kwesiri ntụkwasị obi, onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya ya ruo puku ọgbọ, nye ndị niile hụrụ ya nʼanya, ndị na-edebe ihe niile o nyere nʼiwu.
10 Nanso, ɔntwentwɛn na ɔtwe wɔn a wokyi no no aso, sɛe wɔn.
Ma onye kpọrọ ya asị, ọ na-eji mbibi kwụghachi ya ụgwọ nʼihu ya, ọ gaghị egbu oge ịkwụghachi onye kpọrọ ya asị ụgwọ nʼihu ha.
11 Ɛno nti, monhwɛ yiye na munni ahyɛde ne mmara a mede rema mo nnɛ yi nyinaa so.
Nʼihi ya, hụ na unu debezuru iwu na ụkpụrụ ndị a m na-enye unu taa.
12 Sɛ mutie mmara yi na mudi ne nyinaa so nokware mu a, Awurade, mo Nyankopɔn no, nso bedi nʼapam a ofi ne nokware dɔ mu ne mo agyanom pamee no so.
Ọ bụrụ na unu elezie anya, ṅaa ntị nʼiwu ndị a, debe ha, ma mezuokwa ha, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-emezuru unu ọgbụgba ndụ ịhụnanya ahụ dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha.
13 Ɔbɛdɔ mo na wahyira mo na wama mo ase afɛe. Obehyira mo yafunu mu ade; mo asase so nnɔbae, mo atoko, nsa foforo ne ngodua, mo nantwimma ne nguamma wɔ asase a ɔkaa ho ntam kyerɛɛ mo agyanom se ɔde bɛma mo no so.
Ọ ga-ahụ unu nʼanya, gọzie unu, meekwa ka unu baa ụba nʼọnụọgụgụ. Ọ ga-agọzi unu nʼọmụmụ, gọzie ihe ọkụkụ nke ala unu, ọka unu, na mmanya ọhụrụ unu, na mmanụ unu, na ụmụ ehi unu mụrụ, na ụmụ igwe atụrụ unu mụrụ, nʼala ahụ ọ ṅụụrụ nna nna unu ha iyi inye unu.
14 Wobehyira mo akyɛn aman a wɔwɔ asase so no nyinaa. Mo mmarima renyɛ asaadwe na mo mmea nso renyɛ abonin na mo nyɛmmoa nso bɛwowo.
A ga-agọzi unu karịa mba ndị ọzọ niile dị nʼụwa. Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu, maọbụ nwoke maọbụ nwanyị ga-anọ na-amụtaghị nwa, ọ dịkwaghị anụ ụlọ unu ga-agba aka nwa.
15 Na Awurade bɛbɔ mo ho ban afi ɔyare nyinaa ho. Ɔremma owuyare a bi bɔɔ mo wɔ Misraim no bi mmɔ mo na ɔde saa ɔyare no nyinaa begu mo atamfo so.
Onyenwe anyị ga-ewepụrụ unu ọrịa niile. Ọ gaghị ekwe ka ọrịa ndị Ijipt ọbụla, nke unu na-echeta nke ọma dakwasị unu, ọrịa ndị a niile ka ọ ga-eme ka ọ bịakwasị ndị iro unu!
16 Monsɛe aman a Awurade mo Nyankopɔn de bɛhyɛ mo nsa no nyinaa. Munhu wɔn mmɔbɔ na monnsom wɔn anyame. Sɛ moyɛ saa a, ebesum mo afiri.
Mba ọbụla Onyenwe anyị bụ Chineke unu nyefere unu nʼaka ka unu ga-ala nʼiyi. Unu emerela ha ebere, unu efekwala chi niile ha, nʼihi na nke a ga-abụrụ unu ihe ịma nʼọnya.
17 Mubebisa mo ho se, “Na sɛ saa aman yi yɛ den kyɛn yɛn. Ɛbɛyɛ dɛn na yɛatumi apam wɔn?”
Ma eleghị anya, unu ga na-eche nʼime onwe unu sị, “Mba ndị a dị ike karịa anyị, olee otu anyị ga-esi chụpụ ha?”
18 Nanso munnsuro wɔn. Monkae ade a Awurade, mo Nyankopɔn, de yɛɛ Farao ne ne manfo nyinaa wɔ Misraim no.
Ma unu atụla egwu! Naanị chetanụ ihe Onyenwe anyị bụ Chineke unu mere Fero na ndị Ijipt niile.
19 Mode mo ankasa mo ani huu amanehunu, nsɛnkyerɛnne a ɛyɛ hu ne anwonwasɛm a ɛbaa wɔn so, tumi nsa ne abasa a wɔatrɛw mu a Awurade, mo Nyankopɔn, nam so yii mo fii hɔ no. Nnipa a musuro wɔn mprempren no, Awurade Nyankopɔn de wɔn bɛfa saa ɔkwan koro no ara so.
Unu ji anya unu hụ ọnwụnwa ukwuu niile, ihe ịrịbama niile na ihe ebube niile, nʼaka ahụ dị ike na ogwe aka esetipụrụ esetipụ, nke Onyenwe anyị bụ Chineke unu ji kpọpụta unu. Onyenwe anyị bụ Chineke ga-emekwa otu ihe ahụ nʼebe ndị niile a unu na-atụ egwu ugbu a.
20 Ɛno akyi no, Awurade, mo Nyankopɔn, bɛma mpenaa abɛpam kakra a wɔaka no afi wɔn ahintawee mu kosi sɛ wɔn ase bɛtɔre.
Karịsịa, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-ezipụ ebu nʼetiti ha tutu ruo mgbe ọ bụladị ndị fọdụrụ ndụ, ndị ahụ ga-ezo onwe ha site nʼebe unu nọ, ghọrọ ndị e bibiri.
21 Munnsuro saa aman no, efisɛ Awurade, mo Nyankopɔn, a ɔso na ne ho yɛ nwonwa no wɔ mo afa.
Unu amala jijiji nʼihu ha, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu, onye nọ nʼetiti unu bụ Chineke dị ukwuu, dịkwa egwu.
22 Nkakrankakra, Awurade, mo Nyankopɔn, bedi mo anim kan apam saa aman no. Ɔrenyi wɔn nyinaa mfi hɔ prɛko pɛ; anyɛ saa a, nkekaboa no ase bɛdɔ ntɛm na wɔaba mo so.
Onyenwe anyị bụ Chineke unu, ga-achụpụ mba ndị a ntakịrị ntakịrị. Ọ gaghị ekwe ka unu chụpụ ha otu ugboro, ma ọ bụghị ya, ụmụ anụ ọhịa ọjọọ ga-amụba megide unu.
23 Nanso Awurade, mo Nyankopɔn, de wɔn bɛhyɛ mo nsa, na ɔbɛma wɔn adwene ayɛ basabasa akosi sɛ ɔbɛsɛe wɔn.
Onyenwe anyị Chineke unu ga-enyefe ha nʼaka unu, ọ ga-etinye ha oke ọgbaaghara nʼobi, tutu ruo mgbe ha lara nʼiyi.
24 Ɔde wɔn ahemfo bɛhyɛ mo nsa na mobɛpepa wɔn din afi ɔsoro ase. Obiara rentumi nsɔre ntia mo; mobɛsɛe wɔn.
Eze ha niile ka ọ ga-enyefe nʼaka unu, unu ga-ehichapụkwa aha ha nʼelu ụwa. Ọ dịkwaghị onye pụrụ iguzo nʼihu unu, nʼihi na unu ga-ebibi ha niile.
25 Momfa ogya nhyew wɔn anyame ahoni no. Mommma mo ani mmere dwetɛ anaa sikakɔkɔɔ a egugu so no na mommfa; anyɛ saa a ɛbɛyɛ mfiri ayi mo, efisɛ ɛyɛ Awurade, mo Nyankopɔn, akyiwade.
Kpọọnụ arụsị niile nke apịrị apị nke chi niile ha ọkụ. Unu enwela anya ukwu nʼebe ọlaọcha maọbụ ọlaedo dị ha nʼahụ dị. Unu ewerela ya ka ọ bụrụ nke unu, ka unu ghara ịbụ ndị ọ matara nʼọnya, nʼihi na ọ bụ ihe arụ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu.
26 Mommfa akyiwade biara mma mo fi na wɔanyi mo angu nkyɛn amma ɔsɛe sɛ ɛno ara pɛ. Munhu no sɛ enye a wokyi korakora; efisɛ wɔayi ato hɔ ama ɔsɛe.
Unu ewebatala ihe arụ ọbụla nʼụlọ unu, ka unu ghara ịbụ ihe e debere iche nye mbibi dịka ya. Kpọọnụ ihe arụ ahụ asị, ledakwanụ ya anya, nʼihi na ihe e debere iche nye mbibi ka ọ bụ.

< 5 Mose 7 >