< 5 Mose 22 >

1 Sɛ wuhu sɛ wo yɔnko Israelni bi nantwi anaa ne guan nam basabasa a, mmu wʼani ngu so; mmom kyere no kɔma ne wura.
Ọ bụrụ na ị hụ ehi, maọbụ atụrụ nwanna gị ka ọ na-akpafu, emela dịka a ga-asị na ị hụghị ya, jide ya, kpụlaara ya onye nwe ya.
2 Sɛ ne wura nte mmɛn wo, anaasɛ wunnim no a, fa no kɔ wo fi kosi sɛ ne wura no bɛba abɛhwehwɛ no na wode nʼaboa ma no.
Ọ bụrụ na ị maghị onye nwe ya, maọbụ na nwanna gị ebighị nso, were ya laa nʼụlọ gị, hapụ ya nʼebe ahụ tutu onye nwe ya achọwa ya, mgbe ahụ ka ị ga-ewere ya nyeghachi ya.
3 Sɛ wuhu wo nua bi afurum anaa ne ntama anaa ne biribi a ayera a, yɛ no saa ara. Mmu wʼani ngu so.
Otu a kwa ka ị ga-eme ma ị hụ ịnyịnya ibu nwanna gị, maọbụ uwe, maọbụ ihe ọbụla ị ga-atụtụta. Were ya debere onye nwe ya.
4 Sɛ wuhu sɛ wo yɔnko Israelni bi afurum anaa ne nantwi bi atew ahwe wɔ ɔkwan mu a, mmu wʼani ngu so. Kɔboa ne wura no na ɔmma aboa no so nnyina hɔ.
Ọ bụrụ na ị hụ ịnyịnya ibu, maọbụ ehi nwanna gị ka ha dara nʼụzọ, elela anya nʼebe ọzọ, gaa nyere ya aka bulie ya.
5 Ɛnsɛ sɛ ɔbea hyɛ mmarima atade, saa ara nso na ɛnsɛ sɛ ɔbarima hyɛ mmea atade, efisɛ Awurade, mo Nyankopɔn no, kyi obiara a ɔyɛ eyi.
Nwanyị ekwesighị iyi uwe ndị ikom, nwoke agaghị eyikwa uwe ndị inyom. Nʼihi na ihe arụ ka ọ bụ nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị.
6 Sɛ wokɔto anomaa berebuw wɔ ɔkwankyɛn, sɛ ɛhyɛ dua mu anaa ɛda fam, na sɛ anomaa no na butuw ne ba no so anaa obutuw nkesua so a, mfa anomaa no na ne ne ba no nkɔ.
Ọ bụrụ na ị hụ akwụ nnụnụ tọgbọ nʼala, maọbụ nke dị nʼelu osisi, ọ bụrụkwa na ọ bụ nnụnụ nke nọ nʼelu ụmụ ya, maọbụ nʼelu akwa ya, ewerela nne na ụmụ nnụnụ ya.
7 Wutumi fa ne ba no nanso hwɛ sɛ wobɛma ne na no akɔ, sɛnea ebesi wo yiye na wo nkwanna aware.
Hapụ nne nnụnụ ka ọ laa, ma were naanị ụmụ ya. Ihe ga-agakwara gị nke ọma nʼihi ya, ị ga-enwekwa ndụ ogologo.
8 Sɛ wusi ɔdan foforo a, yɛ ban fa wo dan no nkuruso no ho na obi amfi hɔ antew anhwe amma woamfa mogyahwiegu ho afɔdi amma wo ne wo dan no so.
Mgbe i wuru ụlọ, wuokwa ihe mgbochi gburugburu elu ya, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara isi nʼelu ya dapụ, si otu a wetara ụlọ na onye nwe ya ikpe ọmụma nke iwufu ọbara.
9 Nnua nnɔbae foforo biara wɔ bobe ntam wɔ wo bobeturo mu. Sɛ woyɛ saa a, na wo nnɔbae no ne bobeturo no so aba nyinaa ho agu fi.
Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi vaịnị gị. Ọ bụrụ na i mee otu a, ihe ọkụkụ ndị a, na mkpụrụ ha mịrị ga-abụ ihe rụrụ arụ.
10 Nsa nantwi ne afurum mmɔ mu mfuntum afuw.
Ejikọla ehi na ịnyịnya ibu maka ịdọ ihe e ji akọ ala ubi.
11 Mfura ntama a wɔde kuntu ne sirikyi afra anwen.
Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ kpaa, dịka uwe ajị anụ na ogho ọcha kpaa.
12 Yɛ ntama a wufura no ano anan no nyinaa mpɛsɛ.
Ị ga-akpanyere onwe gị ihe ogho akpara akpa, nʼakụkụ anọ nke uwe mgbokwasị gị.
13 Sɛ ɔbarima ware ɔbea na ɔne no da na akyiri no ɔmpɛ no bio,
Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaagbọghọ, mesie mgbe o dinakwuru ya kpebie nʼobi ya na ọ chọkwaghị ịlụ ya ọzọ,
14 na enti ɔka ne ho asɛmmɔne, bɔ no din bɔne se, “Mewaree no no, manhu biribiara a ɛkyerɛ sɛ ɔyɛ ɔbabun,”
ọ bụrụ na nwoke a ekwutọọ nwaagbọghọ ahụ, mebie aha ya kwuo na nwaagbọghọ ahụ amatalarị nwoke tupu ha abụọ alụọ,
15 a, ɔbea no agya ne ne na wɔ ho kwan sɛ wɔde adansede a ɛkyerɛ sɛ wɔn babea no yɛ ɔbabun bɛkyerɛ kurow no mpanyimfo wɔ kurow no pon.
nne nwaagbọghọ ahụ, na nna ya, ga-ewere ihe ga-egosi na nwa ha amabeghị nwoke gaa nʼihu ndị okenye obodo ahụ, nʼọnụ ụzọ ama.
16 Ɛsɛ sɛ ɔbea no agya ka kyerɛ wɔn se, “Mede me babea maa ɔbarima yi aware nanso ose ɔmpɛ no bio.
Nna nwaagbọghọ ahụ ga-agwa ndị okenye, “Enyere m nwoke a nwa m nwanyị dịka nwunye, ma ugbu a, ọ chọkwaghị ịlụ ya.
17 Wagu nʼanim ase aka se, ‘Manhu sɛ wo babea no yɛ ɔbabun.’ Nanso adansede a ɛkyerɛ sɛ ɔyɛ ɔbabun no ni.” Afei, wɔbɛtrɛw ntama no mu wɔ kurow no mpanyimfo anim,
Ugbu a, o boola ya ebubo ihere, sị, ‘Achọpụtaghị m ihe ọbụla nʼahụ nwa gị nwanyị a ihe na-egosi na ọ maghị nwoke.’ Ma nke a bụ ihe ngosi na ada anyị amaghị nwoke.” Mgbe ahụ ndị mụrụ ya ga-agbasapụ akwa ahụ nʼihu ndị okenye obodo ahụ.
18 na mpanyimfo no bɛfrɛ ɔbarima no atwe nʼaso.
Ndị okenye obodo ahụ ga-akpọrọ nwoke nyekwa ya ahụhụ.
19 Wɔbɛbɔ no ka kilogram baako sɛ wagu Israel ɔbabun no anim ase. Wobetua sika no ama ɔbea no agya. Afei, ɔbabea no bɛyɛ ɔbarima no yere a ɔrennyaa no bio.
Ha ga-emekwa ya ka ọ kwụọ nna nwaagbọghọ ahụ narị shekel ọlaọcha, nʼihi na o boro nwaagbọghọ Izrel na-amaghị nwoke ebubo ụgha. Nwaagbọghọ ahụ ga-anọgide bụrụ nwunye nwoke ahụ. Nwoke ahụ agaghị achụpụkwa ya ụbọchị ndụ ya niile.
20 Sɛ ɛkɔba sɛ kwaadu a wɔde bɔɔ no no yɛ nokware na wɔannya adansede a ɛfa ne babunyɛ no ho ankyerɛ a,
Ma ọ bụrụ na ebubo nwoke ahụ bụ eziokwu, na achọpụtaghị ihe gosiri na nwaagbọghọ ahụ amaghị nwoke.
21 wɔde ɔbea no bɛba nʼagya fi abɔntenpon ano na kurom hɔ mmarima asiw no abo akum no. Ɔnam aguamammɔ so ayɛ animguase ade wɔ Israel, bere a ɔne nʼawofo te. Ɛsɛ sɛ mutu saa bɔne no ase fi mo mu.
A ga-eduru nwaagbọghọ ahụ pụta nʼọnụ ụzọ ụlọ nna ya, nʼebe ahụ ka ndị ikom obodo ya ga-anọ were nkume tugbuo ya. Nʼihi na o mere ihe ihere jọgburu onwe ya nʼIzrel, site nʼibi ndụ akwụna mgbe ọ ka nọ nʼụlọ nne ya na nna ya. Ị ghaghị ikpochapụ ihe ọjọọ ahụ site nʼetiti unu.
22 Sɛ wohu sɛ ɔbarima bi ne ɔbarima foforo bi yere da a, ɛsɛ sɛ wokum ɔbarima a ɔne ɔbea no dae no ne ɔbea no nyinaa. Ɛsɛ sɛ mutu saa bɔne no ase wɔ Israel.
Ọ bụrụ na e jide nwoke ebe ya na nwunye onye ọzọ dina, ma nwoke ahụ dinara ya ma nwanyị ahụ o dinara aghaghị ịnwụ. Nʼụzọ dị otu a, ị ga-ekpochapụ ihe ọjọọ a site nʼIzrel.
23 Sɛ ɔbarima bi hyia ababaa a ɔyɛ ɔbabun a ɔne obi ahyehyɛ aware na ɔbarima no ne ababaa no da na sɛ saa asɛm no sii wɔ kurow no mu a,
Ma ọ bụrụ na nwaagbọghọ na-amaghị nwoke a na-alụ alụ na nwoke ọzọ edinakọọ nʼime obodo,
24 ɛsɛ sɛ mode wɔn baanu no kɔ kurow no apon ano kosiw wɔn abo kum wɔn. Ababaa no di fɔ, efisɛ na ɔwɔ kurom nanso wanteɛteɛ mu ampɛ mmoa. Ɛsɛ sɛ ɔbarima no nso wu, efisɛ wafa obi yere. Ɛsɛ sɛ mutu saa bɔne no ase fi mo mu.
ya na nwoke ahụ ka a ga-eduru gaa nʼọnụ ụzọ ama obodo, were nkume tugbuo ha nʼebe ahụ, ka ha nwụọ, nwaagbọghọ ahụ ga-anwụ nʼihi na o tighị mkpu, ma nwoke ahụ ga-anwụ nʼihi na o mebiela nwunye nwoke ibe ya na-achọ ịlụ. Unu aghaghị ikpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti unu.
25 Sɛ ɔbarima bi hyia ɔbea a obi ne no ahyehyɛ aware wɔ wuram, na ɔbarima no hyɛ no ne no da a, ɛsɛ sɛ wokum ɔbarima a ɔyɛɛ saa no nkutoo.
Ma ọ bụrụ na nwoke ezute nwaagbọghọ na-amaghị nwoke a na-alụ alụ nʼọhịa, were ike mee ka ha abụọ dina, ọ bụ naanị nwoke ahụ ga-anwụ.
26 Monnyɛ ababaa no hwee, efisɛ ɔnyɛɛ bɔne biara a ɛma ɔfata owu. Saa asɛm yi te sɛ obi a watow ahyɛ ne yɔnko so akum no,
Aka nwaagbọghọ ahụ dị ọcha, ọ dịghị mmehie o mere nke ikpe ọnwụ ji adịrị ya, nʼihi na ọnọdụ ya dị ka ọnọdụ mmadụ ahụ onye iro ya bịakwasịrị na mberede gbuo ya.
27 efisɛ ɔbarima no hyiaa ɔbea no wɔ wuram, na asiwa no teɛteɛɛ mu de, nanso wannya ogyefo biara.
A pụrụ ị sị na nwaagbọghọ ahụ tiri mkpu ma ọ dịghị onye nọ ịnapụta ya.
28 Sɛ wɔkyere ɔbarima bi sɛ wahyɛ ababaa bi a obi ne no nhyehyɛe aware, ne no ada a,
Ọ bụrụ na nwoke ọbụla ejiri ike jide nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, nke nwoke ọbụla na-ekwebeghị nkwa ịlụ, mee ka ha abụọ dinaa,
29 ɛsɛ sɛ otua dwetɛ kilogram abien ne fa ma ababaa no agya. Na ɛno akyi no, ɛsɛ sɛ ɔbarima no ware ababaa no, efisɛ wagu nʼanim ase na ɔrentumi nnyae no aware da.
nwoke ahụ ga-akwụ nna nwaagbọghọ ahụ iri shekel ọlaọcha ise. Ọ ga-alụkwa nwaagbọghọ ahụ nʼihi na o mebiela ya. Ọ gakwaghị achụpụ ya ụbọchị niile nke ndụ ya.
30 Ɔbarima biara nni ho kwan sɛ ɔne nʼagya yere da; ɛnsɛ sɛ ogu nʼagya mpa ho fi.
Nwoke ọbụla agaghị alụ nwunye nna ya, nʼihi na ọ bụ nwunye nna ya. Ime ihe dị otu a bụ imerụ ihe ndina nna ya.

< 5 Mose 22 >