< 5 Mose 2 >

1 Afei, yɛsan yɛn akyi de yɛn ani kyerɛɛ sare so wɔ baabi a Po Kɔkɔɔ no da hɔ sɛnea Awurade kyerɛɛ me sɛ menyɛ no. Yɛnantenantew faa Seir bepɔw man no ho nna bebree.
Anyị laghachiri azụ chee ihu nʼọzara nʼụzọ gawara Osimiri Uhie, dịka Onyenwe anyị gwara m. Ọtụtụ afọ ka anyị nọ na-awagharị gburugburu ugwu Sia.
2 Na Awurade ka kyerɛɛ me se,
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m,
3 “Moatwa afa saa ɔman a ɛda bepɔw yi so no ho mmere sann, enti monnan mo ani nkyerɛ atifi fam.
“Unu agbaala ala ugwu ugwu a gburugburu ogologo oge, cheenụ ihu nʼakụkụ ugwu.
4 Hyɛ ɔman no se, ‘Morebɛfa mo nuanom Edomfo, a wɔyɛ Esau asefo a wɔte Seir no asase so. Edomfo no besuro mo, nanso monhwɛ yiye.
Nye ụmụ Izrel iwu ndị a: ‘Unu ga-aga site nʼala ụmụnna unu ndị Edọm gafee. Ndị Edọm bụ ụmụ ụmụ Ịsọ, onye biri na Sia. Ha ga-atụ egwu mgbe ha nụrụ na unu ga-esi nʼala ha gafee, ma kpachapụnụ anya.
5 Monnhyɛ wɔn abufuw a ɛde ɔko bɛba na meremfa wɔn nsase no mu biara mma mo; mpo, baabi a mode mo anan besisi, efisɛ mede Seir bepɔw kurow ama Esau sɛ nʼatenae.
Unu akpasukwala ha ka ha lụsoo unu ọgụ, nʼihi na agaghị m enye unu ala ọbụla sitere nʼala ha, ọ bụladị ebe ga-ezuru unu ịzọkwasị ụkwụ unu. Enyela m Ịsọ ala niile nke ugwu Sia dịka nke aka ya.
6 Aduan biara a mubedi ne nsu biara a mobɛnom no, momfa dwetɛ ntua wɔn ho ka.’”
Jirinụ ọlaọcha kwụọ ha ụgwọ nri ọbụla unu riri, jirikwanụ ọlaọcha kwụọ ha ụgwọ nʼihi mmiri ọbụla unu ṅụrụ.’”
7 Awurade, mo Nyankopɔn, ahyira mo nsa ano nnwuma nyinaa. Wahwɛ mo so wɔ mo akwantu wɔ sare kakraa yi nyinaa so. Saa mfe aduanan yi nyinaa mu no, Awurade aka mo ho na hwee ho anhia mo.
Onyenwe anyị Chineke unu agọziela unu nʼihe ọbụla bụ akaọrụ unu. O cheela nzọ ụkwụ unu nche iri afọ anọ ndị a niile unu wagharịrị nʼọzara ukwuu a. Onyenwe anyị Chineke unu anọnyerela unu, ọ dịkwaghị ihe kọrọ unu.
8 Yetwa faa yɛn nuanom a wɔyɛ Esau asefo a wɔte Seir ho no. Yɛfaa Araba subon kwan no a efi Elat ne Esion-Geber no so na yɛbɛfaa Moab sare so kwan no so.
Ya mere, anyị sitere nʼala ụmụnna anyị bụ ụmụ Ịsọ, ndị bi na Sia gafee. Anyị hapụkwara ụzọ Araba nke si Elat na Eziọn Geba, tụgharịa gawa elu elu ụzọ ọzara Moab.
9 Na Awurade ka kyerɛɛ me se, “Monnhaw Moabfo no anaa monhyɛ wɔn abufuw a ɛde ɔko bɛba, na meremfa wɔn nsase no mu biara mma mo. Efisɛ mede Ar ama Lot asefo sɛ agyapade.”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị dọrọ anyị aka na ntị sị, “Unu esogbula maọbụ lụso ndị Moab ọgụ nʼihi na unu enweghị oke nʼala ha, nʼihi na enyela m ụmụ ụmụ Lọt ala Ar ka ọ bụrụ ihe nketa nke ha.”
10 Kan no na Emifo na wɔte hɔ. Na wɔsoso na wɔdɔɔso a wɔwoware te sɛ Anakfo no.
(Ndị biri nʼebe ahụ na mgbe gara aga bụ ndị Emim, agbụrụ ha gbara dimkpa dịkwa ọtụtụ nʼọnụọgụgụ. Ha toro ogologo dịka ndị Anak.
11 Wɔn nso, na wɔyɛ abran sɛ Anakfo no ara pɛ, a na wɔfrɛ wɔn Refaitefo, nanso Moabfo de, na wɔfrɛ wɔn Emifo.
A na-eche na ha bụ ndị Refaim, dịka ndị Anak, ma ndị Moab na-akpọ ha ndị Emim.
12 Kan no na Horifo na wɔte Seir, nanso Esau asefo no tuu wɔn fii hɔ. Wɔsɛee Horifo no tenaa wɔn anan mu sɛnea Israel yɛɛ wɔ asase a Awurade de maa wɔn sɛ wɔn agyapade no so no pɛpɛɛpɛ.
Ma mgbe gara aga ọ bụ ndị Hor bi na Sia, ma ndị Edọm, ụmụ Ịsọ, chụpụrụ ha. Ha bibiri ndị Hor bichikwaa ala ha, dịka ụmụ Izrel si bichie nʼala ahụ Onyenwe anyị nyere ha dịka ihe nketa.)
13 Na Awurade kae se, “Afei, sɔre na kotwa Sered bon no.” Enti yekotwaa obon no.
Onyenwe anyị gwara anyị okwu sị, “Ugbu a bilienụ, gafee Ndagwurugwu Zered.” Anyị bilikwara gafee.
14 Na nna dodow a yɛde nantew fi Kades-Barnea besii sɛ yetwaa Sered bon no yɛ mfirihyia aduasa awotwe. Saa bere no, na mmarima a wɔanyinyin yiye a wobetumi akɔ ɔko no nyinaa awuwu wɔ sare no so sɛnea Awurade kaa ho ntam no.
Iri afọ atọ na asatọ gasịrị, site na mgbe anyị hapụrụ Kadesh Banea ruo mgbe anyị gafere Ndagwurugwu Zered! Nʼoge a, ọgbọ ndị ikom ahụ niile na-alụ agha anwụchaala site nʼọmụma ụlọ ikwu, dịka Onyenwe anyị ṅụrụ ha nʼiyi.
15 Na Awurade nsa tiaa wɔn ara kosi sɛ wɔn nyinaa wuwuu wɔ wɔn atenae hɔ.
E, aka Onyenwe anyị dị megide ha, ruo mgbe o mere ka ha niile nwụchaa site nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ.
16 Saa nnipa yi mu akofo a otwa to wuu no pɛ,
Mgbe onye nke ikpeazụ nʼime ndị niile a tozuru ije agha nwụchara,
17 na Awurade ka kyerɛɛ me se,
Onyenwe anyị sịrị m,
18 “Nnɛ, ɛsɛ sɛ wofa Ar wɔ Moab mantam mu.
“Taa, ụmụ Izrel ga-esi na Ar gafee oke ala ndị Moab.
19 Na sɛ wudu Amonfo mu a, nhaw wɔn anaa nhyɛ wɔn abufuw a ɛde ɔko bɛba, efisɛ meremma mo Amorifo nsase no bi. Mede ama Lot asefo sɛ agyapade.”
Mgbe unu bara nʼala ndị Amọn, unu esogbula ha, unu alụsola ha ọgụ, nʼihi na agaghị m enye unu ala ndị Amọn. Enyela m ụmụ ụmụ Lọt ala ahụ dịka ihe onwunwe ha.”
20 Saa beae hɔ na abran akɛse a na Amonfo frɛ wɔn Samsumifo no te kan no.
Ndị bi nʼebe a na mbụ bụ ndị Refaim, ma ụmụ Amọn na-akpọ ha ndị Zamzum.
21 Na wɔyɛ nnipa ahoɔdenfo a wɔdɔɔso na wɔwoware te sɛ Anakfo no. Na Awurade sɛee Samsumifo no wɔ Amonfo anim ma wɔpam wɔn tenaa wɔn anan mu.
Ha bụ agbụrụ dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, siekwa ike nke ukwuu, ha toro ogologo dịka ụmụ Anak. Onyenwe anyị sitere nʼaka ndị Amọn laa ha nʼiyi, bụ ndị chụpụrụ ha ma bichie nʼobodo ha.
22 Saa ara na Awurade sɛee Horifo wɔ Esau asefo a na wɔte Seir no anim ma wɔpam wɔn, tenaa wɔn anan mu de besi nnɛ yi.
Onyenwe anyị mekwara otu ihe ahụ nye ndị agbụrụ Ịsọ bụ ndị bi nʼugwu Sia mgbe ọ lara ndị Hor bụ ụzọ biri nʼebe ahụ nʼiyi. Ha chụpụrụ ha, bichie ala ha ruo taa.
23 Na Awifo a wɔtenaa nkuraa nkuraa trɛw koduu Gasa no nso, Kaftorfo a wofi Kaftor bɛsɛee wɔn, tenaa wɔn anan mu.
Ebe ọzọkwa Onyenwe anyị mere ihe dị otu a bụ mgbe o mere ka ndị Kafto laa ndị Avim nʼiyi. Ha bichiri obodo nta niile ndị Avim nwere nke dị gburugburu ebe ahụ rukwaa Gaza.
24 “Sɔre kotwa Arnon Subon. Mede Hesbonhene Sihon a ɔyɛ Amorini no ne man ahyɛ wo nsa. Kɔtow hyɛ ne so, na monko, na fa.
Emesịa, Onyenwe anyị sịrị, “Gafeenụ ndagwurugwu dị warawara nke Anọn, baakwanụ nʼalaeze Saịhọn, onye Amọrị, eze obodo Heshbọn. Lụsonụ ya agha, bichiekwanụ nʼala ya nʼihi na enyefeela m ya bụ eze na ala ya nʼaka unu.
25 Efi nnɛ yi ara, mede mo ho suro ne hu bɛhyɛ aman a wɔwɔ ɔsoro ase nyinaa mu. Wɔbɛte mo ho nsɛm na wɔn ho bɛpopo na mo nti, wɔanya adwenemhaw esiane mo nti.”
Site taa gaa nʼihu, aga m etinye egwu na ụjọ nʼobi ndị niile bi nʼokpuru mbara eluigwe. Ha ga-anụ akụkọ unu tụọ oke egwu, maakwa jijiji nʼihi unu.”
26 Mituu abɔfo fii Kedemot sare so kɔɔ Hesbonhene Sihon nkyɛn asomdwoe so kɔka kyerɛɛ no se,
Esitere m nʼọzara Kedemot zipụ ndị ozi, ka ha jekwuru Saịhọn, eze Heshbọn, zie ya ozi na anyị chọrọ udo, sị,
27 “Ma yentwa mu mfa wo man mu ha. Yɛbɛfa ɔtempɔn no so tee; yɛremman mfa benkum anaa nifa.
“Kwere ka anyị site nʼobodo gị gafee. Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-anọ. Anyị agaghị atụgharị gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe.
28 Tɔn aduan ma yenni na tɔn nsu nso ma yɛnnom. Nea yɛrehwehwɛ ara ne ɔkwan a wobɛma yɛn ama yɛanantew atwa mu,
Renye anyị ihe oriri anyị ga-eri na mmiri anyị ga-aṅụ nʼọnụ ahịa ọlaọcha. Naanị kweere ka anyị gabiga nʼụkwụ ala,
29 sɛnea Esau asefo a na wɔte Seir ne Moabfo a na wɔte Ar yɛɛ yɛn no akosi sɛ yebetwa Yordan akɔ asase a Awurade, yɛn Nyankopɔn, de rema yɛn no so.”
dịka ụmụ Ịsọ, bụ ndị bi na Sia, nakwa ndị Moab bi nʼobodo Ar meere anyị, ruo mgbe anyị gafere Jọdan banye nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-enye anyị.”
30 Nanso Hesbonhene Sihon amma yɛantwa mu wɔ hɔ. Efisɛ na Awurade, mo Nyankopɔn, ayɛ ne honhom sisirii, apirim ne koma sɛnea ɔnam so de no bɛhyɛ mo nsam, sɛnea wayɛ no nnɛ yi.
Ma Saịhọn, eze Heshbọn, ekweghị ka anyị si nʼala ya gafee. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu mere ka mmụọ ya sie ike, meekwa ka o mesie obi ya ike, ka o si otu a nyefee ya nʼaka unu dịka ọ mere ugbu a.
31 Awurade ka kyerɛɛ me se, “Hwɛ, mafi ase de Sihon ne ne man ahyɛ wo nsam. Afei, fi ase na di wɔn so, na fa nʼasase no.”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m sị, “Lee, amalitela m iwere Saịhọn na obodo a nyefee unu nʼaka. Ngwanụ, malitenụ ibuso ya agha! Merienụ ya, nwetakwanụ ala ya.”
32 Bere a Sihon ne ne dɔm behyiaa yɛn sɛ wɔne yɛn rebɛko wɔ Yahas no,
Mgbe Saịhọn na ndị agha ya niile pụtara izute anyị nʼagha nʼebe a na-akpọ Jehaz,
33 Awurade, yɛn Nyankopɔn, yii no maa yɛn ma yɛbobɔɔ ɔno, ne mmabarima ne nʼasraafo nyinaa hwehwee.
Onyenwe anyị Chineke anyị nyefere ya nʼaka anyị. Anyị gburu ya, gbukwaa ụmụ ya ndị ikom niile, na ndị agha ya niile.
34 Na yɛfaa ne nkurow nyinaa saa bere no sɛee ne mmarima, mmea ne mmofra a yɛannyaw obiara.
Nʼoge ahụ, anyị meriri obodo ya niile, bibiekwa ha niile kpamkpam, ma ndị ikom, ma ndị inyom, ma ụmụntakịrị. Anyị ahapụghị mmadụ onye ndụ.
35 Mmom, nyɛmmoa ne asade ahorow a ɛwɔ nkurow a yedii so no mu no de, yɛsoa kɔe.
Ma ihe ndị anyị bukọọrọ bụ naanị anụ ụlọ, na ngwongwo ndị ọzọ dị iche iche anyị si nʼobodo ndị anyị meriri kwata.
36 Efi Aroer a ɛda Arnon Subon ano ne kurow a ɛda subon no mu no, ne mpo, de kosi Gilead no, kurow biara nni hɔ a na ɛsodi yɛ den ma yɛn; Awurade, yɛn Nyankopɔn de ne nyinaa hyɛɛ yɛn nsa.
Anyị lụgburu ndị niile bi nʼobodo dị site nʼAroea ruo nʼọnụ ndagwurugwu dị warawara nke Anọn, na site nʼetiti ndagwurugwu ahụ ruo Gilead. O nweghị obodo ọbụla rara anyị ahụ imeri, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke nyefere ha niile nʼaka anyị.
37 Nanso, yɛankɔ Amorifo asase ne asase a ɛda Asubɔnten Yabok ho ne mmepɔw no so nkurow no baabiara a Awurade yɛn Nyankopɔn hyɛɛ yɛn sɛ yɛnnkɔ so no so.
Ma dịka usoro iwu Onyenwe anyị Chineke anyị si dị, anyị abanyeghị ala ndị Amọn ọbụla maọbụ ruokwa nʼala dị nʼakụkụ iyi Jabọk nso, maọbụ nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼugwu.

< 5 Mose 2 >