< Mezmurlar 34 >
1 Davut'un mezmuru Avimelek'in önünde kendini deli gösterip kovulduğu, gittiği zaman Her zaman RAB'be övgüler sunacağım, Övgüsü dilimden düşmeyecek.
Abụ Ọma Devid. Mgbe ọ gbanwere omume ya mee ka onye na-ayị ara nʼihu Abimelek, onye nke chụpụrụ ya, ya a pụọ. Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile. Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m.
2 RAB'le övünürüm, Mazlumlar işitip sevinsin!
Mkpụrụobi m ga-anya isi na Onyenwe anyị; ka ndị niile a na-akpagbu gee ntị ṅụrịa ọṅụ.
3 Benimle birlikte RAB'bin büyüklüğünü duyurun, Adını birlikte yüceltelim.
Soro m too Onyenwe anyị; ka anyị bulie aha ya elu.
4 RAB'be yöneldim, yanıt verdi bana, Bütün korkularımdan kurtardı beni.
Nʼihi na etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ zakwara m, napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile.
5 O'na bakanların yüzü ışıl ışıl parlar, Yüzleri utançtan kızarmaz.
Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe; ihere adịghị eme ha.
6 Bu mazlum yakardı, RAB duydu, Bütün sıkıntılarından kurtardı onu.
Onye ogbenye a kpọkuru Onyenwe anyị, ọ zakwara ya; ọ zọpụtara ya site na nsogbu ya niile.
7 RAB'bin meleği O'ndan korkanların çevresine ordugah kurar, Kurtarır onları.
Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu na-anapụtakwa ha.
8 Tadın da görün, RAB ne iyidir, Ne mutlu O'na sığınan adama!
Jiri aka gị tulee ma hụkwa na Onyenwe anyị dị mma; onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya.
9 RAB'den korkun, ey O'nun kutsalları, Çünkü O'ndan korkanın eksiği olmaz.
Tụọnụ egwu Onyenwe anyị, unu ndị nsọ ya, nʼihi na ọ dịghị ihe na-akọ ndị niile na-atụ egwu ya.
10 Genç aslanlar bile aç ve muhtaç olur; Ama RAB'be yönelenlerden hiçbir iyilik esirgenmez.
Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha, ma ihe ọbụla bụ ihe ọma agaghị akọ ndị niile na-achọ Onyenwe anyị.
11 Gelin, ey çocuklar, dinleyin beni: Size RAB korkusunu öğreteyim.
Ụmụ m, bịanụ gee m ntị; aga m ezi unu ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ.
12 Kim yaşamdan zevk almak, İyi günler görmek istiyorsa,
Onye ọbụla nʼime unu hụrụ ndụ nʼanya, ma nwee ọchịchọ ihu ọtụtụ ụbọchị ndị dị mma,
13 Dilini kötülükten, Dudaklarını yalandan uzak tutsun.
chezie ire gị ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ, chezikwaa egbugbere ọnụ gị ka ọ gharakwa ịgha ụgha.
14 Kötülükten sakının, iyilik yapın; Esenliği amaçlayın, ardınca gidin.
Site nʼihe ọjọọ wezuga onwe gị ma mee ezi ihe, chọọ udo ma gbasookwa ya.
15 RAB'bin gözleri doğru kişilerin üzerindedir, Kulakları onların yakarışına açıktır.
Anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye mkpu akwa ha;
16 RAB kötülük yapanlara karşıdır, Onların anısını yeryüzünden siler.
ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ, ime ka a hapụ ichetakwa ihe banyere ha nʼụwa.
17 Doğrular yakarır, RAB duyar; Bütün sıkıntılarından kurtarır onları.
Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka; ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile.
18 RAB gönlü kırıklara yakındır, Ruhu ezikleri kurtarır.
Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ.
19 Doğrunun dertleri çoktur, Ama RAB hepsinden kurtarır onu.
Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu, ma Onyenwe anyị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile.
20 Bütün kemiklerini korur, Hiçbiri kırılmaz.
Ọ na-anapụtakwa ha kpamkpam. Ọ gaghị ekwe ka ọ bụladị otu ọkpụkpụ dị ha nʼahụ gbajie.
21 Kötü insanın sonu kötülükle biter, Cezasını bulur doğrulardan nefret edenler.
Ihe ọjọọ ga-eme ka onye ajọ omume nwụọ; ndị na-akpọ onye ezi omume asị ka a ga-ama ikpe ọnwụ.
22 RAB kullarını kurtarır, O'na sığınanların hiçbiri ceza görmez.
Onyenwe anyị na-agbapụta ndị ohu ya; ọ dịghị onye ọbụla nke na-agbaba nʼime ya a ga-ama ikpe ọnwụ.