< İbraniler 5 >
1 İnsanlar arasından seçilen her başkâhin, günahlara karşılık sunular ve kurbanlar sunmak üzere Tanrı'yla ilgili konularda insanları temsil etmek için atanır.
A na-esite nʼetiti ndị mmadụ họrọ onyeisi nchụaja ọbụla, ka ọ nnọchite anya ndị mmadụ nʼihe banyere ife Chineke, ka ọ na-eche onyinye na-achụkwa aja maka mmehie dị iche iche.
2 Bilgisizlere, yoldan sapanlara yumuşak davranabilir. Çünkü kendisi de zayıflıklarla kuşatılmıştır.
Ebe ọ bụ na ya onwe ya bụ onye na-adịghị ike, ọ pụrụ iji nwayọọ na-emeso ndị na-amaghị ihe na ndị na-ejehie ụzọ omume.
3 Bundan ötürü, halk için olduğu gibi, kendisi için de günah sunusu sunmak zorundadır.
Nʼihi nke a, ọ ghaghị ịchụ aja maka mmehie nke onwe ya na nke ndị mmadụ.
4 Kimse başkâhin olma onurunu kendi kendine alamaz; ancak Harun gibi, Tanrı tarafından çağrılırsa alır.
O nweghị onye na-ewere ugwu a nʼonwe ya, kama ọ bụ Chineke na-akpọ dịka o si kpọọ Erọn.
5 Nitekim Mesih de başkâhin olmak için kendi kendini yüceltmedi. O'na, “Sen benim Oğlum'sun, Bugün ben sana Baba oldum” diyen Tanrı O'nu yüceltti.
Nʼotu aka ahụ kwa, Kraịst enyeghị onwe ya ebube nke ịbụ onyeisi nchụaja, kama Chineke sịrị ya, “Ị bụ Ọkpara m. Taa abụrụla m Nna gị.”
6 Başka bir yerde de diyor ki, “Melkisedek düzeni uyarınca Sen sonsuza dek kâhinsin.” (aiōn )
Nʼebe ọzọ, o kwuru, “Dị ka usoro Melkizedek si dị, ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.” (aiōn )
7 Mesih, yeryüzünde olduğu günlerde kendisini ölümden kurtaracak güçte olan Tanrı'ya büyük feryat ve gözyaşlarıyla dua etti, yakardı ve Tanrı korkusu nedeniyle işitildi.
Mgbe ọ ka dị ndụ nʼanụ ahụ, o ji oke olu na anya mmiri kpee ekpere rịọkwa arịrịọ nye onye ahụ pụrụ ịzọpụta ya site nʼọnwụ. A nụkwara olu ya nʼihi ndụ nrube isi na mweda nʼala ya.
8 Oğul olduğu halde, çektiği acılarla söz dinlemeyi öğrendi.
Ọ bụ ezie na ọ bụ Ọkpara ma ọ mụtara irube isi site nʼahụhụ ọ tara.
9 Yetkin kılınınca, sözünü dinleyen herkes için sonsuz kurtuluş kaynağı oldu. (aiōnios )
Ma mgbe e mere ka o zuo oke, ọ ghọrọ isi nke nzọpụta ebighị ebi nye ndị niile na-erubere ya isi. (aiōnios )
10 Çünkü Tanrı tarafından Melkisedek düzeni uyarınca başkâhin atanmıştı.
Ebe Chineke mere ya onyeisi nchụaja nʼusoro Melkizedek.
11 Bu konuda söyleyecek çok sözümüz var, ama kulaklarınız uyuştuğu için anlatmak zor.
Ọ dị ọtụtụ ihe ọzọ anyị nwere ikwu banyere ya, ma o siri ike ịkọwa ya nʼihi na unu adịghị amụta ihe ọsịịsọ.
12 Şimdiye dek öğretmen olmanız gerekirken, Tanrı sözlerinin temel ilkelerini size yeni baştan öğretecek birine ihtiyacınız var. Size yine süt gerekli, katı yiyecek değil!
Nʼezie, ugbu a, unu kwesiri ịbụ ndị ozizi nye ndị ọzọ, ma unu ka nọ na-achọ onye ga-ezikwa unu ụkpụrụ mbụ nke okwu Chineke. Unu na-achọ mmiri ara kama nri siri ike.
13 Sütle beslenen herkes bebektir ve doğruluk sözünde deneyimsizdir.
Onye ọbụla nke na-aṅụ ara, ka bụ nwantakịrị, ọ matabeghị ozizi banyere ezi omume.
14 Katı yiyecek, yetişkinler içindir; onlar duyularını iyi ile kötüyü ayırt etmek üzere alıştırmayla eğitmiş kişilerdir.
Nri dị ike dịrị ndị tozuru oke, ndị siterela nʼihe ha na-eme zụọ onwe ha ịchọpụta ihe dị iche nʼetiti ezi ihe na ajọ ihe.