< Habakkuk 3 >
1 Peygamber Habakkuk'un Duası - Şigyonot Makamında
Nke a bụ ekpere Habakuk onye amụma kpere. Ọ dị nʼusoro Shiginot. Nke a bụ ihe o kwuru.
2 Ya RAB, ününü duydum ve yaptıklarının karşısında ürperdim. Günümüzde de aynı şeyleri yap, ya RAB, Şimdi herkes bilsin neler yapabildiğini. Öfkeliyken merhametini anımsa!
Onyenwe anyị anụla m ihe niile e kwuru banyere ude gị. Ịdị ukwuu nke ọrụ gị niile na-emekwa ka m dere duu nʼegwu nʼihu gị, Onyenwe anyị. Mekwaa ya ọzọ nʼoge nke anyị, mekwaa ka anụ akụkọ ya nʼọgbọ anyị. Nʼoke iwe gị chetakwa ebere.
3 Tanrı Teman'dan, Kutsal Tanrı Paran Dağı'ndan geldi. (Sela) Görkemi kapladı gökleri, O'na sunulan övgüler dünyayı doldurdu.
Chineke si na Teman bịa, Onye Nsọ ahụ sikwa nʼugwu Paran. (Sela) Ebube ya na-ekpuchi eluigwe, otuto ya jupụtakwara nʼụwa.
4 Güneş gibi parıldıyor, Elleri ışık saçıyor. Gücünün gizi ellerinde.
Ịma mma ya na-achapụta dịka ihe anyanwụ ụtụtụ, ihe na-enwupụta site nʼaka ya, ọ bụkwa nʼebe ahụ ka e zoro ike ya.
5 Yayılıyor salgın hastalıklar önüsıra, Ardısıra da ölümcül hastalıklar.
Nʼihu ya ka ajọ ọrịa na-efe efe na-aga, oke mbibi na-esokwa ya nʼazụ.
6 Duruşuyla dünyayı sarstı, Titretti ulusları bakışıyla, Yaşlı dağlar darmadağın oldu, Dünya kurulalı beri var olan tepeler O'na baş eğdi. Tanrı'nın yolları değişmezdir.
O guzoro ọtọ yọgharịa ụwa; o lere anya, mee ka mba niile maa jijiji. Ugwu ukwu ochie ahụ niile dara, ugwu nta ochie ndị ahụ dakwara. Nʼihi na ụzọ ya ga-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi.
7 Kuşan çadırlarını çaresizlik içinde gördüm, Midyan konutları korkudan titriyordu.
Ahụrụ m ụlọ ikwu nke Kushan ka ha nọ ọnọdụ ụbọchị ọjọọ, na ebe obibi ndị Midia ka ha nọ na oke ahụ ụfụ.
8 Ya RAB, nehirlere mi öfkelendin? Gazabın ırmaklara mı? Yoksa denize mi kızdın da, Atlarına, yenilmez savaş arabalarına bindin?
Ọ bụ osimiri, ka gị bụ Onyenwe anyị were iwe megide? Ọnụma gị, ọ dị ukwuu megide iyi niile? Oke iwe gị ọ bụ megide oke osimiri mgbe ị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya gị, nakwa nʼelu ụgbọ ịnyịnya ị wetara ndị nke gị mmeri?
9 Gerdin yayını, Okların içtiğin antlardır. (Sela) Yeryüzünü akarsularla yardın.
I kpughepụrụ ụta gị, kpọọ oku ka a chịtara gị ọtụtụ àkụ. (Sela) I ji osimiri dị iche iche kewaa ụwa.
10 Sarsıldı dağlar seni görünce, Seller her yanı süpürüp geçti. Engin denizler gürledi, dalgalar yükseldi.
Mgbe ugwu niile hụrụ gị ha nyagharịrị onwe ha nʼihi ihe mgbu bịakwasịrị ha. Oke mmiri ozuzo gabigakwara. Ogbu mmiri mere ka olu ya daa ụda, buliekwa ebili mmiri elu.
11 Uçuşan oklarının pırıltısından, Parlayan mızrağının ışıltısından, Yerlerinde durakaldı güneş ve ay.
Anyanwụ na ọnwa guzokwara duu na mbara eluigwe, mgbe ha hụrụ ihe nke àkụ gị, mgbe ha hụrụ amụma nke ùbe gị gburu.
12 Gazap içinde ilerledin yeryüzünde, Ulusları öfkeyle çiğneyip ezdin.
I sitere nʼọnụma gị zọgharịa ije nʼụwa, sitekwa nʼiwe gị zọchaa mba dị iche iche dịka ọka.
13 Kendi halkını, seçtiğin ulusu kurtarmaya geldin. Kötü soyun başını ezdin, Soydun onu tepeden tırnağa. (Sela)
Ị pụtara ịzọpụta ndị gị, ịzọpụta onye ahụ i tere mmanụ. Ị zọpịara isi onyendu nke ala ajọ omume ahụ, gbawa ya ọtọ site nʼisi ruo nʼụkwụ.
14 Başını kendi mızrağıyla deldin. Askerleri fırtına gibi gelmişti bizi dağıtmaya, Saklanan düşkünleri yok etmiş gibi seviniyorlardı.
Ọ bụ ùbe ya ka i ji mawaa ya isi, mgbe ndị dike nʼagha ya bịara dịka oke ifufe ịchụsa anyị, mgbe ha si nʼobi ụtọ ha chee na ha na-aga iripịa ndị ogbenye e wedara nʼala, bụ ndị na-ezo onwe ha.
15 Sense atlarınla çiğneyip geçtin büyük denizleri, Sularını köpürterek...
Ị chịrịla ịnyịnya gị zọọ ije nʼoke osimiri, kpagharịa mmiri ukwu ndị ahụ.
16 Sesini duyunca yüreğim hopladı, Seğirdi dudaklarım, Kemiklerim eridi sanki, Çözüldü dizlerimin bağı. Ama bize saldıran halkın felakete uğrayacağı günü Sabırla bekleyeceğim.
Amara m jijiji nʼobi m mgbe m nụrụ ihe ndị a niile, egbugbere ọnụ m abụọ kụkọtara nʼegwu, ọkpụkpụ dị m nʼahụ malitere ire ure, mee ka ụkwụ m maa jijiji. Ma aga m eji ndidi chere ụbọchị ọjọọ ahụ nke ga-abịakwasị ndị ahụ na-abịa ibuso anyị agha.
17 Tomurcuklanmasa incir ağaçları, Asmalar üzüm vermese, Boşa gitse de zeytine verilen emek, Tarlalar ürün vermese de, Boşalsa da davar ağılları, Sığır kalmasa da ahırlarda,
A sịkwarị na osisi fiig amaghị ifuru, na ọ dịghị mkpụrụ dị nʼosisi vaịnị, a sịkwa na mkpụrụ osisi oliv ebilata na ala ubi niile emepụtaghị ihe oriri, a sịkwa na ọ dịghị atụrụ dị nʼọgba anụ, na ọ dịkwaghị ehi nọ nʼụlọ anụmanụ,
18 Ben yine RAB sayesinde sevineceğim, Kurtuluşumun Tanrısı sayesinde sevinçten coşacağım.
mụ onwe m ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị. Aga m etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke Onye nzọpụta m.
19 Egemen RAB gücümdür benim. Ayaklarıma geyik ayağının çevikliğini verir. Aşırtır beni yükseklerden. Müzik şefi için: Telli sazlar eşliğinde söylenecek.
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ ike m, ọ na-eme ụkwụ m abụọ ka ha dịka nke ele. Ọ na-emekwa ka m zọọ ije nʼebe niile dị elu. Nke a dịrị onyeisi abụ, nʼụbọ akwara m dị iche iche.