< Wimbo wa Sulemani 5 >

1 Nimekuja katika bustani yangu, dada yangu, bibi arusi wangu; Nimekusanya udi wangu na manukato yangu. Nimekula mziga wangu wa asali na asali yangu; Nimekunywa mvinyo wangu pamoja na maziwa yangu. Marafiki wanazungumza na wapenzi Kuleni, marafiki; kunyweni na mlewe na mapenzi. Mwanamke mdogo akizungumza mwenyewe
Abatala m nʼubi m a gbara ogige, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m. Achịkọtala m máá ya na ụda m, arachakwala m mmanụ aṅụ m na ugbugbo mmanụ aṅụ. Aṅụkwala m mmiri ara ehi na mmanya m. Ndị Enyi Rie, ṅụọkwa, unu ndị bụ enyi; ṅụjuo afọ, unu ndị hụrụ onwe unu nʼanya.
2 Nilikuwa nimelala, lakini moyo wangu ulikuwa umeamka katika ndoto. Sauti ya mpenzi wangu yabisha na kusema, “Nifungulie, dada yangu, mpenzi wangu, hua wangu, wangu usiye na doa, kwa kuwa kichwa changu kimelowa na matone, nywele zangu na unyevu wa usiku.”
A rahụrụ m ụra, ma obi m mụ anya. Gee ntị, onye ahụ m hụrụ nʼanya na-akụ aka nʼibo ọnụ ụzọ. “Megheere m ụzọ, nwanne m nwanyị, onye m hụrụ nʼanya, nduru m, onye na-enweghị ntụpọ. Igirigi ezokwasịla m nʼisi, agịrị isi m jupụtara na mmiri nke abalị.”
3 “Nimevua joho langu; lazima nilivae tena? Nimeosha miguu yangu; lazima ni ichafue?”
Eyipụlarị m uwe m. Ọ bụ m yirikwa ha ọzọ? Asaala m ụkwụ m, aga m eme ka ha ruo unyi ọzọ?
4 Mpenzi wangu anaeka mkono wake kwenye kitasa, na moyo wangu ukawaka kwa ajili yake.
Onye m hụrụ nʼanya gbatịrị aka ya imeghe ụzọ, mgbe ahụ, obi m chọsikwara ya ike.
5 Nimeamka kumfungulia mlango mpenzi wangu; mikono yangu ikawa yamiminika na udi, vidole vyangu na unyevu wa udi, katika komeo la mlango.
Mụ onwe m biliri imeghere onye m hụrụ nʼanya ụzọ, ma aka m abụọ jupụtakwara na mmanụ máá, mmanụ máá si na mkpịsịaka m niile na-atapụsi, nʼelu ihe mkpọchi nke ibo.
6 Nimemfungulia mlango mpenzi wangu, lakini mpenzi wangu aligeuka na kwenda. Moyo wangu ukadidimia; nikakosa tumaini. Nikamtafuta, lakini sikumpata; nikamuita, lakini hakunijibu.
Mgbe m megheere onye m hụrụ nʼanya ụzọ, ma lee, ọ nọkwaghị ya, ọ laala. Obi fepụrụ m mgbe ọ pụwara. Elegharịrị m anya chọọ ya ma ahụghị m ya ebe ọbụla. Akpọrọ m ya oku ma ọ zaghị.
7 Walinzi waliokuwa wakizunguka mjini walinipata mimi; walinipiga chini na kunijeruhi; askari katika ukuta walichukua nguo yangu ya juu. Mwanamke mdogo akizungumza na wanawake wa mji
Ndị nche hụrụ m mgbe ha na-agagharị nʼobodo, ha tiri m ihe merụọ m ahụ. Ndị nche mgbidi obodo napụrụ m akwa mkpuchi m.
8 Ninataka uhaidi, mabinti wa Yerusalemu, kwamba mkimuona mpenzi wangu, mwambie ninaumwa sababu ya upendo wangu kwake. Wanawake wa mji wakizungumza na mwanamke mdogo
Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi, ọ bụrụ na unu ahụ onye m hụrụ nʼanya, gịnị ka unu ga-agwa ya? Gwa ya na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụchasịa nʼahụ.
9 Mpenzi wako ana ubora gani kuliko mwanaume mwengine, wewe uliye mzuri miongoni mwa wanawake? Kwanini mpenzi wako bora kuliko mpenzi mwengine, hadi utuulize tuweke nadhiri kama hii? Mwanamke mdogo akizungumza na wanawake wa mji
Gị nwanyị kachasị mma, olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ? Olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ nke i ji enye anyị iwu dị otu a?
10 Mpenzi wangu amenawiri na ana ng'aa, kati ya wanaume elfu kumi.
Onye m hụrụ nʼanya chapụrụ achapụ, dị mma ile anya. Ọ pụrụ iche nʼetiti puku ndị nwoke iri.
11 Kichwa chake ni dhahabu safi; nywele zake ni laini na nyeusi kama kunguru.
Isi ya dịka ọlaedo a nụchara anụcha, agịrị isi ya na-eruda dịka igu nkwụ, na-ejikwa nji dịka ugolọma.
12 Macho yake ni kama ya hua pembezoni ya vijito vya maji, yameoshwa na maziwa, yameundwa kama mikufu.
Anya ya abụọ dịka nduru nọ nʼakụkụ mmiri iyi nke e jiri mmiri ara ehi sachaa, dịka nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị.
13 Mashavu yake ni kama vitanda vya manukato, vinavyotoa arufu ya marashi. Midomo yake nni nyinyoro, inayo tiririka udi.
Nti ya abụọ dị ka ihe ndina ụda nke jupụtara na mmanụ isi ụtọ. Egbugbere ọnụ ya dị ka okoko urodi, nke na-agbụsị mmanụ máá.
14 Mikono yake ni ya mianzi ya dhahabu iliyo zungushiwa mikufu; tumbo lake ni pembe lililo funikwa yakuti samawi.
Aka ya abụọ dị ka mkpara ọlaedo a kpụziri akpụzi, nke a hịọnyere nkume oke ọnụahịa beril nʼime ya. Ahụ ya na-akwọ mụrụmụrụ dịka ọdụ nke e ji nkume dị oke ọnụahịa safaia chọọ mma.
15 Miguu yake ni nguzo za marimari, iliyo ekwa juu ya dhahabu safi; muonekano wake ni kama Lebanoni, mizuri kama mierezi.
Ogwe ụkwụ ya abụọ dị ka ogidi e ji nkume mabụl kpụọ, nke e ji ọlaedo a ṅụchara anụcha tọọ ntọala ha. Ụdịdị ya dị ka Lebanọn, dịkwa oke ọnụ dịka osisi sida ya.
16 Mdomo wake ni mtamu; ni mzuri sana. Huyu ni mpenzi wangu, na huyu ni rafiki yangu, mabinti wa Yerusalemu.
Ọnụ ya bụ ihe tọkarịsịrị ụtọ nʼonwe ya, ihe niile banyere ya dị mma nʼile anya. Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, onye dị otu a bụ onye ahụ m hụrụ nʼanya, ọ bụkwa enyi m.

< Wimbo wa Sulemani 5 >