< Ufunuo 5 >
1 Kisha nikaona katika mkono wa kulia wa yule aliyekuwa amekaa katika kiti cha enzi, gombo lililoandikwa mbele na nyuma, na lilikuwa limetiwa mihuri saba.
Mgbe ahụ, ahụrụ m akwụkwọ e dere ihe ihu na azụ, nke a fụkọrọ afụkọ, kakwasịkwa ya akara asaa, ka ọ dị nʼaka nri onye ahụ nọkwasịrị nʼelu ocheeze ahụ.
2 Nilimwona malaika mwenye nguvu akihubiri kwa sauti kubwa, “Nani astahiliye kulifungua gombo na kuzivunja mihuri yake?”
Ahụkwara m otu mmụọ ozi dị ukwuu, ka ọ na-ekwusa okwu nʼoke olu na-asị, “Ọ bụ onye kwesiri ịnyakapụ akara ndị a ma saghee akwụkwọ ahụ a fụkọrọ afụkọ?”
3 Hakuna mtu mbinguni au duniani au chini ya dunia aliyeweza kulifungua gombo au kulisoma.
Ma ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịsaghe akwụkwọ ahụ maọbụ ilenye ya anya a hụrụ nʼeluigwe, maọbụ nʼụwa, maọbụ nʼokpuru ụwa.
4 Nililia kwa uchungu kwa kuwa hakupatikana yeyote aliyestahili kulifungua gombo au kulisoma.
Akwara m akwa nʼobi ilu nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla a hụrụ tozuru oke ịsaghe akwụkwọ ahụ maọbụ ileba anya nʼime ya.
5 Lakini mmoja wa wazee akaniambia, “Usilie. Tazama! Simba wa kabila ya Yuda, shina la Daudi, ameshinda, na anaweza kulifungua gombo na mihuri yake saba.”
Mgbe ahụ, otu onye nʼime ndị okenye ahụ gwara m sị, “Akwala akwa. Lee, Ọdụm ebo Juda, bụ mgbọrọgwụ Devid, emeriela. Ọ pụrụ ịnyakapụ akara asaa ahụ ma saghekwaa akwụkwọ ahụ.”
6 Kati ya kiti cha enzi na wenye uhai wanne na miongoni mwa wazee, niliona mwanakondoo amesimama, akionekana kama aliye uawa. Alikuwa na pembe saba na macho saba - hizi ni roho saba za Mungu zilizotumwa duniani kote.
Mgbe ahụ, ahụrụ m Nwa Atụrụ na-eguzo nʼetiti ocheeze ahụ dịka e gburu ya egbu. Anụ anọ ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ gbara ya gburugburu. O nwekwara mpi asaa na anya asaa, nke bụ mmụọ asaa nke Chineke, ndị e zipụrụ nʼime ụwa niile.
7 Akaenda akalichukua gombo kutoka katika mkono wa kuume wa yule aliye kaa katika kiti cha enzi.
Ọ gara nʼihu were akwụkwọ ahụ site nʼaka nri onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ.
8 Alipolichukua gombo, wenye uhai wanne na wazee ishirini na wanne wakainama hadi nchi mbele ya mwanakondoo. Kila mmoja alikuwa na kinubi na bakuli ya dhahabu iliyojaa uvumba ambayo ni maombi ya waamini.
Mgbe ọ weere ya, anụ anọ ahụ dị ndụ na iri ndị okenye abụọ na anọ ndị ahụ dara nʼala nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha niile nʼotu nʼotu jikwa ụbọ akwara na efere e ji ọlaedo mee, nke ihe jupụtara nʼime ha bụ ụda na-esi isi ụtọ, bụ ekpere ndị nsọ.
9 Waliimba wimbo mpya: “Unastahili kulitwaa gombo na kuzifungua muhuri zake. Kwa kuwa ulichinjwa, na kwa damu yako ukamnunulia Mungu watu wa kila kabila, lugha, jamaa na taifa.
Ha na-abụ abụ ọhụrụ na-asị, “I kwesiri ịnara akwụkwọ ahụ na ịnyakapụ akara ya, nʼihi na e gburu gị, ma site nʼọbara gị, ị gbataara Chineke ndị mmadụ, ndị si nʼebo niile, na asụsụ niile, na ndị niile, na mba niile.
10 Ukawafanya ufalme na makuhani kwa ajili ya kumtumikia Mungu wetu, nao watatawala juu ya nchi.”
Ị chịkọtaala ha, mee ha otu alaeze na ndị nchụaja na-ejere Chineke anyị ozi. Ha ga-achịkwa achị nʼụwa.”
11 Kisha nilitazama na nikasikia sauti ya malaika wengi kuzunguka kiti cha enzi - idadi yao ilikuwa 200, 000, 000 na wenye uhai na wazee.
Mgbe ahụ, elere m anya, hụ ma nụkwa olu nke ọtụtụ ndị mmụọ ozi, nke ọnụọgụgụ ha ruru puku kwụrụ puku, na nde kwụrụ nde. Ha gbara ocheeze ahụ gburugburu, na anụ anọ ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ.
12 Wakasema kwa sauti kuu, “Astahili mwanakondoo ambaye amechinjwa kupokea uwezo, utajiri, hekima, nguvu, heshima, utukufu, na sifa.”
Ha na-abụ abụ nʼoke olu na-asị, “O kwesiri bụ Nwa Atụrụ ahụ e gburu egbu ịnara ike na akụnụba na amamihe na ike na nsọpụrụ na otuto na ngọzị.”
13 Nikasikia kila kilichoumbwa kilichokuwa mbinguni na duniani na chini ya nchi na juu ya bahari, kila kitu ndani yake kikisema, “Kwake yeye aketiye juu ya kiti cha enzi na kwa mwanakondoo, kuwe sifa, heshima, utukufu na nguvu ya kutawala milele na milele.” (aiōn )
Mgbe ahụ, anụrụ m ka ihe niile nọ nʼeluigwe na ndị nọ nʼụwa na ndị nọ nʼokpuru ụwa, na ndị nọ nʼokpuru oke osimiri na-eti mkpu abụ na-asị, “Ka ngọzị, na nsọpụrụ niile, na otuto niile, na ike niile dịrị onye ahụ na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, na Nwa Atụrụ ahụ (aiōn )
14 Wenye uhai wanne wakasema, “Amina!” na wazee wakainama chini na kuabudu.
Anụ anọ ahụ dị ndụ zakwara sị, “Amen!” Ndị okenye ahụ dakwara nʼala nʼihu ya kpọọ isiala nye ya.