< Ufunuo 12 >

1 Ishara kuu ilionekana mbinguni: mwanamke aliyefunikwa na jua, na akiwa na mwezi chini ya miguu yake; na taji ya nyota kumi na mbili ilikuwa juu ya kichwa chake.
Oke ihe ịrịbama pụtara ihe nʼeluigwe, otu nwanyị e yikwasịrị anyanwụ dịka uwe. Ọnwa dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya abụọ. Okpueze nwee kpakpando iri na abụọ dịkwa ya nʼisi.
2 Alikuwa na mimba na alikuwa analia kwa ajili ya maumivu ya kuzaa—katika uchungu wa kujifungua.
Ọ dị ime, na-etikwa mkpu nʼihi ahụhụ na ihe ụfụ nke ọmụmụ nwa.
3 Na ishara nyingine ilionekana mbinguni: Tazama! Kulikuwa na joka mwekundu mkubwa ambaye alikuwa na vichwa saba na pembe kumi, na kulikuwa na taji saba kwenye vichwa vyake.
Mgbe ahụ, ihe ama ọzọ pụtara ihe nʼeluigwe, agwọ ochie nke dị ukwuu na-acha uhie uhie a na-akpọ dragọn, nke nwere isi asaa na mpi iri. O kpukwasịkwara okpueze asaa nʼisi ya.
4 Mkia wake ulikokota theluthi moja ya nyota mbinguni na kuzitupa chini duniani. Joka alisimama mbele ya mwanamke aliyekuwa anakaribia kuzaa, ili kwamba wakati anazaa, apate kummeza mtoto wake.
O nwere ọdụdụ nke o ji dọkpụrụ otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke kpakpando niile dị nʼeluigwe, tụda ha nʼala. Ọ bịara guzo nʼihu nwanyị ahụ na-achọ ịmụpụta nwa ahụ ọ dị ime ya, nọọ na njikere iri nwantakịrị ahụ ma a mụpụta ya.
5 Alimzaa mwana, mtoto wa kiume, ambaye atayatawala mataifa yote kwa fimbo ya chuma. Mtoto wake alinyakuliwa juu kwa Mungu na kwenye kiti chake cha enzi,
Ọ mụpụtara nwantakịrị nwoke, “onye ga-ejikwa mkpara ọchịchị chịa mba niile ọchịchị.” Nʼotu oge ahụ kwa, e si nʼebe ahụ wepụ nwata ahụ were ya gaa nʼebe Chineke nọ nʼeluigwe nʼocheeze ya.
6 na mwanamke alikimbilia nyikani, mahali ambapo Mungu alikuwa ameandaa eneo kwa ajili yake, ili aweze kuhudumiwa kwa siku 1, 260.
Ma nwanyị ahụ si nʼebe ahụ gbapụ gbalaa nʼọzara ebe Chineke kwadebere na ọ ga-anọ. Ebe ahụ ka a ga-elekọta ya anya nke ọma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii.
7 Sasa kulikuwa na vita mbinguni. Mikaeli na malaika zake wakapigana na yule joka; naye joka mkubwa na malaika zake wakapigana nao.
Mgbe ahụ, agha dapụtara nʼeluigwe. Maikel na ndị mmụọ ozi ya buru agha megide agwọ ochie ahụ (a na-akpọ dragọn). Dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya bukwara agha nke ha,
8 Lakini joka hakuwa na nguvu za kutosha kushinda. Kwa hiyo haikuwepo tena nafasi mbinguni kwa ajili yake na malaika zake.
ma e meriri ha, ha enwekwaghị ọnọdụ ọbụla nʼeluigwe.
9 Joka mkubwa—yule nyoka wa zamani aitwaye ibilisi au Shetani ambaye hudanganya - dunia nzima akatupwa chini katika dunia, na malaika zake wakatupwa chini pamoja naye.
Dragọn ukwu ahụ, bụ agwọ ochie ahụ a na-akpọ ekwensu maọbụ Setan, nke na-eduhie ndị niile bi nʼụwa. A tụdara ya nʼụwa, ya na ndị mmụọ ozi ya niile.
10 Kisha nikasikia sauti kubwa kutoka mbinguni: “Sasa wokovu umekuja, nguvu—na ufalme wa Mungu wetu, na mamlaka ya Kristo wake. Kwa kuwa mshitaki wa ndugu zetu ametupwa chini—ambaye aliwashitaki mbele za Mungu wetu mchana na usiku.
Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼeluigwe na-ada sị, “O mezuola nʼikpeazụ, bụ nzọpụta Chineke na ike na alaeze Chineke anyị, na ikike ịchị isi Kraịst ya, ha abụrụla ihe dị ire. Nʼihi na e sitela nʼeluigwe chụtuo onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo. Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nʼihu Chineke.
11 Walimshinda kwa damu ya Mwanakondoo na kwa neno la ushuhuda wao, kwa maana hawakupenda sana maisha yao, hata kufa.
Ha lụgburu ya nʼagha site nʼọbara Nwa atụrụ ahụ na site nʼama nke okwu ọnụ ha, nʼihi na ha ahụghị ndụ ha nʼanya karịa, kama ha jikere inye ndụ ha ọbụladị ruo nʼọnwụ.
12 Kwa hiyo, shangilieni, ninyi mbingu, na wote mnaokaa ndani yake. Lakini ole wa nchi na bahari kwa sababu mwovu ameshuka kwenu. Amejawa na hasira kali, kwa sababu anajua kwamba ana muda mchache tu.
Ya mere, ṅụrịanụ ọṅụ eluigwe ma unu ndị niile bi nʼime ya. Ma ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼụwa na osimiri nʼihi na ekwensu abịakwutela unu. O jirila oke ọnụma bịakwute unu. Ọ makwaara na oge a o nwere ehighị nne.”
13 Wakati joka alipotambua kuwa ametupwa chini kwenye nchi, alimfuata mwanamke ambaye alikuwa amezaa mtoto wa kiume.
Mgbe agwọ ochie ahụ chọpụtara na a chụdala ya nʼụwa, ọ chụsoro nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke ahụ ọsọ.
14 Lakini mwanamke alipewa mabawa mawili ya tai mkubwa, ili kwamba aweze kuruka hadi kwenye eneo lililoandaliwa kwa ajili yake kule jangwani, eneo ambalo angeweza kutunzwa, kwa wakati, nyakati na nusu wakati-mahali asipoweza kupafikia huyo nyoka.
Ma e nyere nwanyị ahụ nku abụọ, nke dịka nku oke ugo, ka o jiri gbanarị agwọ ochie ahụ feba nʼime ọzara, ebe a kwadooro ya, na ebe a ga-anọ lezie ya anya afọ atọ na ọnwa isii.
15 Nyoka alimwaga maji kutoka mdomoni mwake kama mto, ili afanye gharika ya kumgharikisha.
Ma agwọ ahụ meghere ọnụ ya mee ka mmiri si nʼọnụ ya sọpụta dịka iyi nke ga-ebufu nwanyị ahụ.
16 Lakini ardhi ilimsaidia mwanamke. Ilifunua kinywa chake na kuumeza mto alioutema joka kutoka kinywani mwake.
Ma ala nyeere nwanyị ahụ aka. O meghere ọnụ ya loda idee mmiri a nke si nʼọnụ agwọ ahụ sọpụta.
17 Kisha joka akamkasirikia mwanamke naye aliondoka na kufanya vita na uzao wake wote—wale wanaotii amri za Mungu na kushikilia ushuhuda kuhusu Yesu.
Mgbe ahụ, agwọ ochie ahụ wesara nwanyị ahụ iwe, pụọ ịga buo agha megide ụmụ ya bụ ndị niile fọdụrụ, bụ ndị niile na-edebe iwu Chineke na ndị na-ekwupụta na ha bụ ndị ama nke Jisọs.

< Ufunuo 12 >