< Zaburi 95 >
1 Oh njoni, tumwimbie Yahwe; na tumwimbie kwa shangwe mwamba wa wokovu wetu.
Bịanụ ka anyị jiri ọṅụ bụkuo Onyenwe anyị abụ; ka anyị tikuo oke nkume nzọpụta anyị mkpu ọṅụ.
2 Tuingie uweponi mwake kwa shukrani; tumwimbie yeye kwa zaburi ya sifa.
Ka anyị jiri ekele bịakwute ya jirikwa iti egwu na ịbụ abụ jaa ya mma.
3 Kwa maana Yahwe ni Mungu mkuu na Mfalme mkuu juu ya miungu yote.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke dị ukwuu, eze ukwuu kachasị chi niile elu.
4 Mkononi mwake zimo bonde za dunia; navyo vilele vya milima ni vyake.
Ebe niile michasịrị emi nke ụwa dị nʼaka ya, ebe kachasị elu nke ugwu niile bụkwa nke ya.
5 Bahari ni yake, maana aliiumba, na mikono yake ilitengeneza nchi kavu.
Osimiri niile bụ nke ya, nʼihi na ọ bụ ya kere ha, aka ya kpụrụ ala akọrọ niile.
6 Oh njoni, tumwabudu na tupige magoti; tupige magoti mbele za Yahwe, muumbaji wetu:
Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe, ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu Onyenwe anyị, onye kere anyị;
7 Kwa maana yeye ni Mungu wetu, na sisi tu watu wa malisho yake na kondoo wa mkono wake. Ni heri leo mngesikia sauti yake!
nʼihi na ọ bụ Chineke anyị anyị bụkwa ndị ọ na-azụ dịka atụrụ, igwe atụrụ ọ na-elekọta anya. Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya,
8 Msiifanye migumu mioyo yenu, kama vile huko Meriba, au kama ile siku ya Masa jangwani,
“Unu emela ka obi unu sie ike dịka unu mere na Meriba, maọbụ dịka unu mere nʼụbọchị ahụ na Masa nʼime ọzara,
9 ambako baba zenu walinijaribu na kunipima, japo walikuwa wameyaona matendo yangu.
ebe nna nna unu ha nwara m, nʼagbanyeghị na ha hụrụ ihe niile m mere.
10 Kwa miaka arobaini nilikasirishwa na kizazi hicho na kusema, 'Hawa ni watu ambao mioyo yao imepotoka; hawazijui njia zangu.'
Iri afọ anọ ka m were iwe megide ọgbọ ahụ; ekwuru m sị, ‘Ndị a bụ ndị obi ha na-akpafu akpafu site nʼebe m nọ, ha amatabeghị ụzọ m niile.’
11 Hivyo katika hasira yangu niliapa kwamba wasingeingia kamwe mahali pa pumziko.”
Nʼihi nke a, aṅụrụ m iyi nʼiwe, sị, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’”