< Zaburi 92 >

1 Ni jambo jema kumshukuru Yahwe na kuliimbia sifa jina lako, Uliye Juu,
Abụ Ọma. Abụ maka ụbọchị izuike. Ọ bụ ihe ziri ezi ito Onyenwe anyị, na iti egwu nye aha gị, gị Onye kachasị ihe niile elu,
2 kutangaza uaminifu wa agano lako wakati wa asubuhi na uaminifu wako kila usiku,
ikwupụta ịhụnanya gị nʼụtụtụ, na ikwesi ntụkwasị obi gị nʼabalị,
3 kwa kinubi cha nyuzi kumi na kwa tuni ya kinubi.
jiri ihe iti egwu ụbọ akwara na une bụọrọ gị abụ dị ụtọ.
4 Kwa kuwa wewe, Yahwe, matendo yako yamenifurahisha. Nitaimba kwa furaha kwa sababu ya matendo ya mikono yako.
Nʼihi na ị na-eme ka obi dị m ụtọ, site nʼọrụ gị niile, o Onyenwe anyị, Ọ bụ ya mere m ji na-abụ abụ ọṅụ.
5 Ni jinsi gani matendo yako ni makuu, Yahwe! mawazo yako ni ya kina.
Lee ka ọrụ gị si dị ukwuu, Onyenwe anyị. Leekwa ụdị echiche miri emi ị na-eche.
6 Mtu mpumbavu hawezi kuyajua, wala mjinga kuyaelewa haya:
Ndị uche kọrọ amaghị nke a, ndị nzuzu enweghị nghọta,
7 Wasio haki watakapochipuka kama nyasi, na hata watendao uovu watakapo stawi, bado wataangamizwa kwenye uharibifu wa milele.
ọ bụ ezie na ndị ajọ omume na-etopụta dịka ahịhịa ndị na-emekwa ajọ ihe na-eto na-awasa, a ga-ala ha nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi.
8 Lakini wewe, Yahwe, utatawala milele.
Ma gị, O Onyenwe anyị, bụ onye e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi.
9 Hakika, watazame adui zako, Yahwe! Hakika, watazame adui zako. Wataangamia! Wale wote watendao maovu watatawanywa.
Nʼezie, ndị iro gị niile, Onyenwe anyị, e ndị iro gị niile ga-ala nʼiyi; ndị niile na-eme ajọ ihe ka a ga-achụsasị.
10 Wewe umeyainua mapembe yangu kama mapembe ya Nyati wa porini; nimepakwa mafuta safi.
I meela ka mpi m dị elu dịka oke ehi na-akpa ike; awụsala m mmanụ dị mma.
11 Macho yangu yameona kuanguka kwa adui zangu; masikio yangu yamesikia maangamizi ya maadui zangu waovu.
Ejirila m anya m abụọ hụ ka e meriri ndị iro m; ejirila m ntị m nụ maka ịla nʼiyi nke ndị iro m afọ tara mmiri.
12 Wenye haki watastawi kama mtende; watakua kama mwerezi wa Lebanoni.
Ma ndị ezi omume ga-awa igu dịka osisi nkwụ; ha ga-ebukwa ibu dịka osisi ukwu sida nke Lebanọn,
13 Wamepandwa katika nyumba ya Yahwe; wakistawi katika nyua za Mungu wetu.
nke a kụrụ nʼime ụlọ Onyenwe anyị, ha ga-eto, wasaakwa nʼime ogige Chineke anyị.
14 Wao huzaa matunda hata uzeeni; hukaa safi na wenye afya,
Ha ga-amị mkpụrụ, ọ bụladị mgbe ha mere agadi. Ha ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ,
15 kutangaza kuwa Yahwe ni wa haki. Yeye ni mwamba wangu, na hakuna udhalimu ndani yake.
na-ekwupụta, “Onyenwe anyị bụ Onye ziri ezi; ọ bụ Oke Nkume m, ọ dịkwaghị ajọ omume dị nʼime ya.”

< Zaburi 92 >