< Zaburi 89 >

1 Nitimba sifa za matendo ya uaminifu wa agano milele. Nitatangaza kweli yako kwa vizazi vijavyo.
Abụ maskil nke Etan, onye Ezra. Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi; aga m eji ọnụ m mee ka ọgbọ niile mara maka ikwesi ntụkwasị obi gị.
2 Maana nimesema, “Uaminifu wa agano umeimarishwa milele; na kweli yako umeiimarisha mbinguni.”
Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; na i mere ka ikwesi ntụkwasị obi gị, guzosie ike nʼeluigwe.
3 “Nimefanya agano na wateule wangu, nimeapa kiapo kwa Daudi mtumishi wangu.
Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ. Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị,
4 Nitauimarisha uzao wako milele, na nitauimarisha utawala wako vizazi vyote.” (Selah)
‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi meekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’” (Sela)
5 Mbingu husifu maajabu yako, Yahwe; kweli yako inasifiwa katika kusanyiko la watakatifu.
O Onyenwe anyị, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile, na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼetiti nzukọ ndị dị nsọ.
6 Maana ni nani katika mbingu aweza kulinganishwa na Yahwe? Ambaye kati ya wana wa miungu ni kama Yahwe?
Nʼihi, ọ bụ onye nʼeluigwe niile, ka a ga-eji tụnyere Onyenwe anyị? Onye yiri Onyenwe anyị nʼetiti ndị mmụọ ozi niile?
7 Ni Mungu anaye heshimiwa sana katika baraza la watakatifu naye ni wakutisha kati ya wote wanao mzunguka.
Na nzukọ ndị nsọ, Chineke bụ onye a na-atụ oke egwu; ọ dị oke egwu karịa ndị niile gbara ya gburugburu.
8 Yahwe, Mungu wa majeshi, ni nani aliye na nguvu kama wewe, Yahwe? Kweli yako inakuzunguka.
O Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, onye dịka gị? Gị, O Onyenwe anyị, dị ike nke ukwuu, ikwesi ntụkwasị obi gị na-agba gị gburugburu.
9 Wewe huitawala bahari yenye nguvu; mawimbi yainukapo, wewe huyatuliza.
Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ; mgbe ebili mmiri ya na-amali elu; i na-eme ka ha dajụọ.
10 Ulimwangamiza Rahabu kama mmoja aliye uliwa. Uliwatawanya adui zako kwa mkono wako wenye nguvu.
Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu; jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị.
11 Mbingu ni zako wewe, na nchi pia. Uliiumba dunia na vyote vilivyomo.
Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa, ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya.
12 Uliumba kaskazini na kusini. Tabori na Hermoni hulifurahia jina lako.
Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda; Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị.
13 una mkono wa uweza na mkono wenye nguvu, na mkono wako wa kuume uko juu.
Aka gị ka e mejupụtara nʼike; aka gị dị ike, a na-ebuli aka nri gị elu.
14 Haki na hukumu ni msingi wa kiti chako. Uaminifu wa agano lako na uaminifu huja mbele zako.
Ezi omume na ikpe ziri ezi, bụ ntọala ocheeze gị; ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, na-aga nʼihu gị.
15 Wamebarikiwa watu wakuabuduo wewe! Yahwe, wanatembea katika nuru ya uso wako.
Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ ndị na-eji olu iti mkpu ọṅụ na-abụku gị abụ, ndị na-ejegharịkwa nʼìhè nke ihu gị, O Onyenwe anyị.
16 Siku zote wanafurahia katika jina lako, na katika haki yako wanakutukuza wewe.
Ha na-aṅụrị ọṅụ nʼaha gị ogologo ụbọchị niile; ha na-aṅụrị nʼezi omume gị.
17 Wewe ni fahari ya nguvu zao, na kwa nguvu zako tu washindi.
Nʼihi na ị bụ ebube na ike ha, site nʼihuọma gị, ị na-ebuli mpi anyị elu.
18 Maana ngao zetu ni za kwako Yahwe; mfalme wetu ni wa Mtakatifu wa Israeli.
Nʼezie, ọta anyị bụ nke Onyenwe anyị, eze anyị bụkwa nke Onye nsọ Izrel.
19 Muda mrefu uliopita ulizungumza na waaminfu wako katika maono; ulisema, “Nimeweka taji juu ya mwenye nguvu; nimemuinua aliyechaguliwa kutoka kati ya watu.
I kwuru okwu otu mgbe site nʼọhụ, nye ndị gị kwesiri ntụkwasị obi sị: “Enyela m otu onye dị ike agha ike; Ebuliela m otu nwa okorobịa elu site nʼetiti ndị m.
20 Nimemchagua Daudi mtumishi wangu; kwa mafuta yangu matakatifu nimempaka yeye.
Achọtala m Devid ohu m, were mmanụ nsọ m tee ya.
21 Mkono wangu utamsaidia yeye; mkono wangu utamtia nguvu.
Aka m ga-agba ya ume; nʼezie, aka m ga-eme ka ọ dị ike.
22 Hakuna adui atakaye mdanganya; hakuna mwana wa uovu atakaye muonea.
Ọ dịghị onye iro ga-abịakwasị ya, na mberede; ọ dịghị onye ajọ omume ga-emegbu ya.
23 Nitawaangamiza adui zake mbele yake; nitawaua wale wamchukiao.
Aga m etigbu ndị iro ya niile nʼihu ya. Aga m emekwa ka ndị niile na-akpọ ya asị laa nʼiyi.
24 Kweli yangu na uaminifu wa agano vitakuwa pamoja naye; kupitia jina langu atakuwa mshindi.
Ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi ga-adịnyere ya, site nʼaha m, a ga-ebuli mpi ya elu.
25 Nitaweka mkono wake juu ya bahari na mkono wake wa kuume juu ya mito.
M ga-edo aka ya nʼoke osimiri, dokwaa aka nri ya nʼosimiri niile.
26 Yeye ataniita, 'Wewe ni Baba yangu, Mungu wangu, na mwamba wa wokovu wangu.'
Ọ ga-akpọ m sị m, ‘Ị bụ Nna m, bụrụkwa Chineke m, na oke Nkume nzọpụta m.’
27 Nitamjalia kuwa kama mzaliwa wangu wa kwanza, aliye inuliwa zaidi juu ya wafalme wa nchi.
Aga m eme ya nwa mbụ m, onye kachasị dị elu nʼebe eze niile nke ụwa nọ.
28 Nitaongeza uaminifu wa agano langu kwake milele; na agano langu pamoja naye litakuwa salama.
Aga m eme ka ịhụnanya m nwere nʼebe ọ nọ dịgide ruo ebighị ebi, ọgbụgba ndụ mụ na ya ga-adịgidekwa.
29 Nitaufanya uzao wake kudumu milele na kiti chake cha enzi kitadumu kama mbingu zilizo juu.
Aga m eme ka agbụrụ ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịgidekwa dịka eluigwe na-adịgide.
30 Ikiwa watoto wake wataziacha sheria zangu na kutokutii amri zangu,
“Ọ bụrụ na ụmụ ya elefuo iwu m niile anya, gharakwa ijegharị nʼụzọ m niile,
31 na kama watazivunja sheria zangu na kutokuzishika amri zangu,
ọ bụrụ na ha elelịa ụkpụrụ m niile anya, hapụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu,
32 ndipo nitauadhiu uasi wao kwa fimbo na uovu wao kwa makofi.
aga m eji mkpọrọ taa ha ahụhụ maka mmehie ha, tikwaa ha ụtarị maka njehie ha;
33 Lakini sitauondoa kwake upendo wangu thabiti wala kutokuwa mwaminifu kwa ahadi yangu.
ma agaghị m ewezuga ịhụnanya m, nʼebe ha nọ. Ma ọ bụ laa azụ nʼikwesị ntụkwasị obi m.
34 Sitavunja agano langu wala kubadilisha maneno ya midomoni mwangu.
Agaghị m emerụ ọgbụgba ndụ m. Agakwaghị m agbanwe ihe ọbụla siterela nʼọnụ m pụta.
35 Mara moja na kwa yote, nimeapa kwa utakatifu wangu sitamdanganya Daudi:
Ejirila m ịdị nsọ m ṅụọ iyi, kpebie na m apụghị ịghara Devid ụgha,
36 uzao wake utaendelea milele na kiti chake cha enzi kama vile jua mbele yangu.
na agbụrụ ya ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịgidekwa nʼihu m ka anyanwụ na-adịgide.
37 Kitaimarishwa milele kama mwezi, shahidi mwaminifu mawinguni.” (Selah)
Ọ ga-adịgide ruo ebighị ebi dịka ọnwa. E, dịka ọnwa ahụ, onye akaebe m kwesiri ntụkwasị obi na mbara eluigwe.” (Sela)
38 Lakini wewe umemtupa na kumkataa; umemkasirikia mfalme mpakwa mafuta wako.
Ma ị jụla, i werela nlelị jụkwa, i na-ewe iwe dị ukwu megide onye gị e tere mmanụ.
39 Wewe umelikataa agano la mtumishi wako. Umeinajisi taji yake ardhini.
Ị jụla ọgbụgba ndụ gị na ohu gị gbara i merụọla okpueze ya nʼime ntụ dị nʼala.
40 Umevunja kuta zake zote. Umeharibu ngome yake.
Ị kụtuola mgbidi gbara ya gburugburu, i meela ka ebe ya niile e wusiri ike bụrụ ihe dapịara adapịa.
41 Wapita njia wote wamemuibia, amekuwa kitu chenye kinyaa kwa majirani zake.
Ndị niile si ụzọ ahụ na-agafe, ezuruchaala ihe niile o nwere. Ndị agbataobi ya na-akwakwa ya emo.
42 Umeinua mkono wa kuume wa adui zake; umewafurahisha adui zake wote.
I meela ka aka nri ndị iro ya dị elu; mekwaa ka ndị iro ya ṅụrịa ọṅụ.
43 Umeyageuza makali ya upanga wake. Na hukumfanya asimame awapo vitani.
I meela ka aka o ji jide mma agha ya sụọ ngọngọ, i nyereghị ya aka mgbe agha dara.
44 Umeimaliza fahari yake; umekitupa ardhini kiti chake cha enzi.
I meela ka ịma mma ya gwụsịa. Ị tụdakwala ocheeze ya nʼala.
45 Umefupisha siku za ujana wake. Umemfunika kwa aibu. (Selah)
I meela ka ụbọchị ndụ nke okorobịa ya dị mkpụmkpụ. I ji ihere dịka akwa kpuchie ya.
46 Mpaka lini, Yahwe? utajificha, milele? Mpaka lini hasira yako itawaka kama moto?
Ruo ole mgbe Onyenwe anyị, ka ị ga-ezonarị onwe gị? Ruo ole mgbe ka iwe gị dị ukwuu ga-eregide dịka ọkụ?
47 Oh, fikiria jinsi muda wangu ulivyo mfupi, na ni kwa ajili gani umewaumba wana wote wa wanadamu wasio na manufaa!
Cheta, na ndụ m bụ ihe na-agafe ngwangwa. Nʼihi ihe efu gịnị ka i ji kee mmadụ niile!
48 Ni nani aweza kuishi na asife, au atakaye iokoa nafsi yake dhidi ya mkono wa kuzimu? (Selah) (Sheol h7585)
Olee onye ahụ nwere ike ịdị ndụ ghara ịhụ ọnwụ anya, maọbụ zọpụta onwe ya site nʼike nke ili? (Sela) (Sheol h7585)
49 Bwana, yako wapi matendo yako ya zamani ya uaminifu wa agano ambayo ulimwapia Daudi katika kweli yako?
O Onyenwe anyị, olee ebe oke ịhụnanya mbụ dị, nke i sitere nʼikwesị ntụkwasị obi gị ṅụọrọ Devid nʼiyi?
50 Kumbuka, Bwana, watumishi wako walivyodhihakiwa na vile nilivyo vumilia moyoni mwangu matusi mengi dhidi ya mataifa.
Onyenwe m, cheta otu e si leda ndị ohu gị anya, otu m si anagide nʼime obi m ịchị ọchị niile nke ndị mba niile.
51 Maadui zako wanavurumiza matusi, Yahwe; wanadhihaki nyayo za mpakwa mafuta wako.
O Onyenwe anyị, ịchị ọchị nke ndị iro gị ji akwa m emo, nke ha ji lelịa nzọ ụkwụ niile nke onye gị i tere mmanụ.
52 Atukuzwe Yahwe milele. Amina na Amina. Kitabu cha Nne
Otuto dịrị Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.

< Zaburi 89 >