< Zaburi 145 >
1 Nitakutukuza wewe, Mungu wangu, Mfalme; nitalihimidi jina lako milele na milele.
Abụ Ọma otuto, nke Devid. Aga m ebuli gị elu, Chineke m onye bụ eze; aga m eto aha gị, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
2 Kila siku nitakuhimidi; nitalisifu jina lako milele na milele.
Ụbọchị niile ka m ga-eto gị jaakwa aha gị mma site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
3 Yahwe ndiye mkuu na wakusifiwa sana; ukuu wake hauchunguziki.
Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto; ịdị ukwuu ya karịrị ihe onye ọbụla pụrụ ịghọta.
4 Kizazi kimoja kitayasifu matendo yako kwa kizazi kijacho na kitatangaza matendo yako makuu.
Otu ọgbọ ga-eto ọrụ gị niile nʼihu ọgbọ ọzọ; ha ga-ekwupụta maka ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.
5 Nitaitafakari fahari ya utukufu wa adhama yako na matendo yako ajabu.
Ha ga-ekwupụta ihe banyere ịdị ebube nke ịma mma gị, aga m atụgharịkwa uche nʼọrụ ebube gị niile.
6 Watanena juu ya nguvu ya kazi zako za kutisha, nami nitatangaza ukuu wako.
Ha ga-ekwupụta ihe banyere ike nke ọrụ ịtụnanya gị niile, aga m ekwusakwa ọrụ ukwuu gị niile.
7 Nao watatangaza wingi wa wema wako, na wataimba kuhusu haki yako.
Ha ga-eme mmemme nʼihi ịdị mma gị dị ukwuu jirikwa ọṅụ bụọ abụ banyere ezi omume gị.
8 Yahwe ni wa neema na huruma, si mwepesi wa hasira na mwingi katika uaminifu wa agano lake.
Onyenwe anyị na-eme amara nweekwa obi ọmịiko, ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, ọ bara ụba nʼịhụnanya.
9 Yahwe ni mwema kwa wote; huruma zake zi juu ya kazi zake zote.
Onyenwe anyị dị mma nʼebe mmadụ niile dị; o nwere ọmịiko nʼebe ihe niile o kere eke dị.
10 Vyote ulivyo viumba vitakushukuru wewe, Yahwe; waaminifu wako watakutukuza wewe.
O Onyenwe anyị, ihe niile i kere eke ga-eto gị; ndị nsọ gị na-aja gị mma.
11 Waaminifu wako watanena juu ya utukufu wa ufalme wako, na watahubiri juu ya nguvu zako.
Ha ga-ekwupụta banyere ebube nke alaeze gị. Kwupụtakwa maka ịdị ike gị,
12 Watayafanya matendo makuu ya Mungu ya julikane na wanadamu na utukufu wa fahari ya ufalme wake.
ka mmadụ niile mata ihe banyere ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche na ebube nke ịdị mma alaeze gị.
13 Ufalme wako ni wa milele, na mamlaka yako ya dumu kizazi hata kizazi.
Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Onyenwe anyị na-emezu nkwa ya niile na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya.
14 Yahwe huwategemeza wote waangukao na huwainua wote walioinama chini.
Onyenwe anyị na-ekulite ndị niile dara ada na-akwagide ndị niile dara mba.
15 Macho ya wote yanakungoja wewe; nawe huwapa chakula chao kwa wakati sahihi.
Olileanya ihe niile dị na gị, ị na-enye ha nri ha mgbe oge ya ruru.
16 Huufungua mkono wako na hukidhi haja ya kila kiumbe hai.
I na-asaghepụ aka gị na-emezu ọchịchọ ihe niile dị ndụ.
17 Yahwe ni mwenye haki katika njia zake zote na neema katika yote afanyayo.
Ụzọ Onyenwe anyị niile ziri ezi; ọ na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya.
18 Yahwe yu karibu na wote wamwitao, wale wamwitao yeye katika uaminifu.
Onyenwe anyị na-anọ nso ndị niile na-akpọku ya, bụ ndị niile na-akpọku ya nʼeziokwu.
19 Hutimiza haja za wale wanao mheshimu yeye; husikia kilio chao na kuwaokoa.
Ọ na-emezu ọchịchọ niile nke ndị na-atụ egwu ya; ọ na-anụ akwa ha na-azọpụtakwa ha.
20 Yahwe huwalinda wale wampendao, lakini atawaangamiza waovu wote.
Onyenwe anyị na-echebe ndị niile hụrụ ya nʼanya, ma ọ ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi.
21 Kinywa changu kitazinena sifa za Yahwe; wanadamu wote na walitukuze jina lake takatifu milele na milele.
Ọnụ m ga-ekwupụta otuto Onyenwe anyị; ka ihe niile e kere eke too aha nsọ ya ruo mgbe ebighị ebi.