< Zaburi 142 >
1 Kwa sauti yangu namlilia Yahwe anisaidie; kwa sauti yangu naomba kwa ajili ya neema ya Yahwe.
Abụ maskil nke Devid. Mgbe ọ nọ nʼọgba nkume. Ekpere. Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa; ewelitara m olu m rịọ Onyenwe anyị ka o meere m ebere.
2 Namwaga malalamiko yangu mbele zake; ninamwambia shida zangu.
Ekwupụtara m ihe na-esogbu m nʼihu ya, gwakwa ya ahụhụ nke m nọ nʼime ya.
3 Roho yangu inapokuwa dhaifu ndani yangu, wewe unajua mapito yangu. Kwenye njia niipitayo wamenifichia mtego.
Mgbe mmụọ m dara mba nʼime m, ọ bụ gị maara ụzọ m. Nʼụzọ ebe m na-esi aga ka ndị mmadụ siiri m ọnya.
4 Natazama kulia kwangu na sioni yeyote anayenijali. Sina pa kukimbilia; hakuna anayejali kuhusu uhai wangu.
Lee anya nʼaka nri m ma hụ na ọ dịghị onye ọbụla na-eche ihe banyere m. Enweghị m ebe mgbaba. Ọ dịghị onye ọbụla ihe banyere m na-emetụta nʼobi.
5 Nilikuita wewe, Yahwe; nikasema, “Wewe ni kimbilio langu, fungu langu katika nchi ya walio hai.
Ana m etiku gị mkpu akwa, o Onyenwe anyị, na-asị, “Gị bụ ebe mgbaba m, oke m nʼala ndị dị ndụ.”
6 Sikia kuita kwangu, maana nimeshushwa chini sana; uniokoe dhidi ya watesi wangu, maana wana nguvu kuliko mimi.
Gee ntị na mkpu akwa m, nʼihi na anọ m nʼọnọdụ ihe isiike; gbapụta m site nʼaka ndị na-achụ m ọsọ, nʼihi na ha siri ike karịa m.
7 Uitoe nafsi yangu kifungoni ili niweze kulishukuru jina lako. Wenye haki watakusanyika karibu nami kwa sababu umekuwa mwema kwangu.”
Mee ka m nwere onwe m site nʼụlọ mkpọrọ, ka m nwee ike too aha gị. Mgbe ahụ ndị ezi omume ga-agba m gburugburu nʼihi ịdị mma gị nʼebe m nọ.