< Zaburi 139 >

1 Ee Yahwe, wewe umenichunguza, na unanijua.
Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, ị nyochaala m, ị makwaara m nke ọma
2 Wewe unajua nikaapo na niinukapo; unayajua mawazo yangu tokea mbali sana.
Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ; site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile.
3 Unachunguza wenendo wangu na kulala kwangu; unazijua njia zangu zote.
Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m; ị mazukwara ụzọ m niile.
4 Kabla hakujawa na neno kwenye ulimi wangu, wewe unalijua kabisa, Yahwe.
O Onyenwe anyị, ị maara ihe m gaje ikwu tupu m kwuo ya.
5 Nyuma yangu na mbele yangu unanizunguka na kuniwekea mkono wako.
Ị na-anọ m nʼihu, ma na-esokwa m nʼazụ, ị tụkwasịla m aka gị.
6 Maarifa hayo ni mengi yananizidi mimi; yako juu sana, nami siwezi kuyafikia.
Ihe ọmụma dị otu a dị oke omimi nye m, ọ dịkwa elu apụghị m iru ya.
7 Niende wapi mbali na roho yako? Niende wapi niukimbie uwepo wako?
Ebee ka m ga-ezo onwe m si otu a zonarị Mmụọ gị? Ebeekwa ka m pụrụ ịgbaga ka m si nʼihu gị zoo onwe m?
8 Kama nikipaa mbinguni, uko huko; kama nikifanya kitanda changu Kuzimuni, tazama, uko huko. (Sheol h7585)
Ọ bụrụ na m arịgoro nʼeluigwe ị nọ nʼebe ahụ. Ọ bụrụkwa na m arịda zoo onwe m nʼala mmụọ, ị nọkwa nʼebe ahụ. (Sheol h7585)
9 Kama nikipaa kwa mbawa za asubuhi na kwenda kuishi pande za mwisho wa bahari,
Ọ bụrụ na m efepụ nʼisi ụtụtụ dịka nwa nnụnụ, felagaa nʼebe dị nnọọ anya nke oke osimiri,
10 hata huko mkono wako utaniongoza, mkono wako wa kuume utanishika.
ọ bụladị nʼebe ahụ ka aka gị ga na-edu m aka nri gị ga-ejidesi m ike.
11 Kama nikisema, “Hakika giza litanifunika, na nuru inizungukayo itakuwa usiku,”
Ọ bụrụ na m asị, “Nʼezie, ọchịchịrị ga-ekpuchi m ìhè ga-aghọ abalị gbaa m gburugburu.”
12 Hata giza lisingweza kuwa giza kwako. Usiku ungeng'aa kama mchana, maana giza na nuru kwako vinafanana.
Ọ bụladị ọchịchịrị agaghị abụ ọchịchịrị nʼebe ị nọ; abalị ga-enye ìhè dịka ehihie, nʼihi na ọchịchịrị dị ka ìhè nʼebe ị nọ.
13 Wewe uliumba sehemu zangu za ndani; uliniumba tumboni mwa mama yangu.
Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ. Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.
14 Nitakusifu, kwa maana nimeumbwa kwa jinsi ya ajabu. Nafsi yangu yalijua hili vizuri sana.
Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; ọrụ gị niile dị ebube; amaara m nke a nke ọma.
15 Mifupa yangu haikusitirika kwako nilipoumbwa kwa siri, nilipoumbwa kwa ustadi pande za chini za nchi.
Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ, mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.
16 Uliniona ndani ya tumbo; siku zote zilizo pangwa kwangu ziliandikwa kitabuni mwako hata kabla ya siku ya kwanza kutokea.
Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla. E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị tupu otu nʼime ha adịrị.
17 Ni jinsi gani mawazo yako ni ya thamani kwangu, Mungu! Njinsi ilivyo kubwa jumla zake!
Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke! Leekwa ka ha si dị ukwuu.
18 Kama nikijaribu kuyahesabu ni mengi kuliko mchanga. Niamkapo bado niko na wewe.
Ọ bụrụ na m agụọ ha ọnụ, ha ga-adị ukwuu karịa ọnụọgụgụ aja dị nʼala. Mgbe m tetara, mụ na gị ka nọ.
19 Ee Mungu, kama ungewaua waovu; ondokeni kwangu enyi watu wenye vurugu.
O Chineke, a sịkwarị na ị ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi! Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-akwafu ọbara!
20 Wanakuasi wewe na kutenda udanganyifu; adui zako wananena uongo.
Site nʼechiche ọjọọ, ha na-ekwu okwu banyere gị; ndị iro gị na-ekwutọ aha gị.
21 Je, siwachukii hao, wale wakuchukiao Yahwe? Je, siwadharau wale wanao inuka dhidi yako?
O Onyenwe anyị, ọ bụ na m akpọghị ha asị bụ ndị kpọrọ gị asị, na-asọkwa ndị na-enupu isi megide gị oyi?
22 Nawachukia kabisa; wamekuwa adui zangu.
Ọ bụ naanị ịkpọ asị ka m nwere nʼebe ha nọ? Ana m agụnye ha dịka ndị iro m.
23 Ee Mungu, unichunguze na kuujua moyo wangu; unijaribu na uyajue mawazo yangu.
O Chineke, nyochaa m, mara obi m. Nwaa m, matakwa echiche uche m niile.
24 Uone kama kuna njia ya uovu ndani yangu, na uniongoze katika njia ya milele.
Chọpụta ma o nwere ihe ọjọọ dị nʼime m, ma duo m nʼụzọ ebighị ebi.

< Zaburi 139 >