< Zaburi 138 >
1 Nitakushukuru kwa moyo wangu wote; mbele ya miungu nitakuimbia sifa.
Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, aga m eji obi m niile too gị; nʼihu chi niile dị iche iche ka m ga-abụku gị abụ otuto.
2 Nitasujundu mbele ya hekalu lako takatifu na kulishukuru jina lako kwa ajili ya uaminifu wa agano lako na kwa uaminifu wako. Umelifanya muhimu zaidi neno lako na jina lako kuliko kitu chochote.
Aga m akpọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị aga m etokwa aha gị nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼihi na i meela ka aha gị na okwu gị dị elu karịa ihe niile.
3 Siku ile niliyo kuita, ulinijibu; ulinitia moyo na kuitia nguvu nafsi yangu.
Mgbe m kpọkuru gị, ị zara m; i mere m ka m nwee nkwuwa okwu ma guzosiekwa ike.
4 Wafalme wote wa nchi watakushukuru wewe, Yahwe, maana watasikia maneno kutoka kinywani mwako.
O Onyenwe anyị, ka ndị eze niile nọ nʼụwa too gị, mgbe ha nụrụ ihe niile i nyere nʼiwu.
5 Hakika, wataimba kuhusu matendo ya Yahwe, kwa kuwa utukufu wa Yahwe ni mkuu.
Ka ha bụọ abụ banyere ụzọ niile nke Onyenwe anyị, nʼihi na ebube Onyenwe anyị dị ukwuu.
6 Maana ingawa Yahwe yuko juu, lakini anawajali wanyenyekevu, lakini hawatambui wenye majivuno.
Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ na-elekwasị ndị dị umeala nʼobi anya, ma ọ naghị ekwe ka ndị nganga bịa ya nso.
7 Nijapopita katikati ya hatari, wewe utauhifadhi uhai wangu; utanyoosha mkono wako dhidi ya hasira ya adui zangu, na mkono wako wa kuume utaniokoa.
A sịkwarị na m na-eje ije nʼetiti nsogbu, ị na-echebe ndụ m; ị na-esetipụ aka gị megide iwe ndị kpọrọ m asị, ị na-eji aka nri gị zọpụta m.
8 Yahwe yuko pamoja nami hadi mwisho; uaminifu wa agano lako, Yahwe, wadumu milele. Usiwaache wale ambao mikono yako imewaumba.
Onyenwe anyị ga-emezuru m ihe niile o kwadoro m; ịhụnanya gị, o Onyenwe anyị, na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ahapụkwala ọrụ aka gị niile.