< Zaburi 118 >
1 Mshukuruni Yahwe, kwa kuwa ni mwema, kwa maana uaminifu wa agano lake wadumu milele.
Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
2 Israeli na aseme, “Uaminifu wa agano lake wadumu milele.”
Ka ụmụ Izrel kwupụta nʼonwe ha sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
3 Nyumba ya Haruni na iseme, “Uaminifu wa agano lake wadumu milele.”
Ka ndị ezinaụlọ Erọn kwuokwa sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
4 Wafuasi waaminifu wa Yahwe na waseme, “Uaminifu wa agano lake wadumu milele.”
Ka ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị kwuo sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
5 Katika dhiki yangu nilimuita Yahwe; Yahwe alinijibu na kuniweka huru.
Nʼọnọdụ oke ihe mgbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị, ọ zara m, mee ka m nwere onwe m.
6 Yahwe yuko pamoja nami; sitaogopa; mwanadamu atanifanya nini? Yahwe yuko upande wangu kama msaidizi;
Onyenwe anyị nọnyeere m, agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?
7 nitawatazama kwa ushindi wale walio nichukia.
Onyenwe anyị nọnyere m; ọ bụ onye na-enyere m aka. Aga m ele ndị iro m anya na mmeri.
8 Ni bora kuwa na makazi katika Yahwe kuliko kumtumainia mwanadamu.
Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị karịa ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi.
9 Ni bora kukimbilia katika Yahwe kuliko kuamini katika wakuu.
Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị karịa ịtụkwasị ndị amara aha ha obi.
10 Mataifa yote walinizunguka; kwa jina la Yahwe niliwakatilia mbali.
Mba niile gbara m gburugburu ma site nʼaha Onyenwe anyị aga m ala ha nʼiyi.
11 Walinizunguka; naam, walinizunguka; kwa jina la Yahwe niliwakatilia mbali.
Ha gbara m gburugburu, ma site nʼaha Onyenwe anyị ka m na-egbuda ha.
12 Walinizunguka kama nyuki; walitoweka haraka kama moto kati ya miiba; kwa jina la Yahwe niliwakatilia mbali.
Ha gbara m gburugburu dịka aṅụ, ma e menyụọla ha dịka ogwu na-ere ọkụ; site nʼaha Onyenwe anyị, ka m na-egbuda ha.
13 Walinishambulia ili waniangushe, lakini Yahwe alinisaidia.
Akwaghachiri m azụ, agaara m ada, ma Onyenwe anyị nyere m aka.
14 Yahwe ni nguvu yangu na furaha yangu, na ndiye anaye niokoa.
Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m; ọ ghọọla nzọpụta m.
15 Kelele za ushindi zimesikika katika maskani ya wenye haki; mkono wa kuume wa Mungu umeshinda.
Olu iti mkpu ọṅụ na mmeri na-ada nʼime ụlọ ikwu ndị ezi omume: “Aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!
16 Mkono wa kuume wa Mungu umetukuka; mkono wa kuume wa Yahwe umeshinda.
Aka nri Onyenwe anyị bụ ihe e weliri elu; aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!”
17 Sitakufa, bali nitaishi na kuyatangaza matendo ya Yahwe.
Agaghị m anwụ, kama aga m adị ndụ kwusaara ndị ọzọ ọrụ ebube Onyenwe anyị rụrụ.
18 Yahwe ameniadhibu vikali; lakini hajaruhusu nife.
Onyenwe anyị tara m ahụhụ nke ukwuu, ma o nyefeeghị m nʼaka ọnwụ.
19 Unifungulie milango ya haki; nitaingia na nitamshukuru Yahwe.
Megheere m ọnụ ụzọ ama nke ezi omume; aga m abanye nye Onyenwe anyị ekele.
20 Hili ni lango la Yahwe; wenye haki hupitia kwalo.
Nke a bụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ Onyenwe anyị, ebe ndị ezi omume ga-esite na ya banye.
21 Nitakushukuru wewe, kwa kuwa ulinijibu, na umekuwa wokovu wangu.
Aga m enye gị ekele, nʼihi na ị zara m; ị ghọọla nzọpụta m.
22 Jiwe ambalo wajenzi walilikataa wajenzi limekuwa msingi.
Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, aghọọla nkume isi ntọala ụlọ;
23 Yahwe ndiye afanyaye hili; ni la ajabu machoni petu.
nke a bụ ọrụ aka Onyenwe anyị, ọ bụkwa ihe ịtụnanya nʼanya anyị.
24 Hii ni siku ambayo Yahwe ametenda; tutaifurahia na kuishangilia.
Nke a bụ ụbọchị Onyenwe anyị anyị mere, ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime ya.
25 Tafadhali, Yahwe, utupe ushindi! Tafadhali, Yahwe, utupe mafanikio!
O Onyenwe anyị, zọpụta anyị; o Onyenwe anyị, mee ka ihe gaara anyị nke ọma.
26 Amebarikiwa yule ajaye katika jina la Yahwe; tunakubariki kutoka katika nyumba ya Yahwe.
Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị. Anyị sitere nʼụlọ Onyenwe anyị na-agọzi gị.
27 Yahwe ni Mungu, na ametupa sisi nuru; ifungeni dhabihu kwa kamba pembeni mwa madhabahu.
Onyenwe anyị bụ Chineke, ọ bụ ya mere ka ìhè ya mụkwasị anyị. Chịrị igu nkwụ nʼaka gị, soro ndị ji ọṅụ bata nʼogige Chineke bịaruo nʼebe ịchụ aja.
28 Wewe ni Mungu wangu, nami nitakushukuru; wewe ni Mungu wangu; nitakutukuza wewe.
Ị bụ Chineke m, aga m eto gị; ị bụ Chineke m, aga m ebuli gị elu.
29 Oh, mshukuruni Yahwe; kwa kuwa ni mwema; kwa maana uaminifu wa agano lake wadumu milele.
Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.