< Hesabu 29 >
1 Katika siku ya kwanza, ya mwezi wa saba, mtakuwa na kusanyiko takatifu la kumwabudu BWANA. Katika siku hiyo hamtafanya kazi zenu za kila siku. Itakuwa siku ya kupiga matarumbeta.
“‘Ụbọchị unu ga-egbu opi ike ga-adị nʼabalị mbụ nke ọnwa asaa nʼafọ ọbụla. Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe mkpọkọta dị nsọ nke mmadụ niile. Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.
2 Mtatoa sadaka ya kuteketezwa ya kufanya harufu nzuri kwa BWANA. Mtatoa sadaka ya fahari mchanga, kondoo dume mmoja na wanakondoo dume saba wa mwaka mmoja, kila mmoja mkamilifu.
Nʼụbọchị ahụ, unu ga-achụ aja nsure ọkụ a ga-eji otu oke ehi, na ebule, na ụmụ atụrụ asaa gbara otu afọ, otu afọ ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ. Nke a bụ aja na-adị Onyenwe anyị ezi mma, ma na-esi ya isi ụtọ.
3 Pamoja na hao mtatoa sadaka ya unga, unga mwembamba uliochanganywa na mafuta, sehemu tatu za kumi za efa kwa ajili ya huyo fahari, sehemu mbili za kumi kwa ajili ya huyo kondoo mume,
Aja mkpụrụ ọka ka a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ, nʼisi oke ehi ahụ, lita anọ na ọkara, nʼisi ebule,
4 na sehemu ya kumi ya kila hao wanakondoo waume saba.
na lita abụọ, nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla.
5 Na mtatoa beberu mmoja kuwa sadaka ya dhambi ili kufanya upatanisho kwa ajili yenu.
Tinyere otu mkpi a ga-eji chụọ aja maka mkpuchi mmehie unu.
6 Toeni hizo sadaka katika mwezi wa saba kama nyongeza ya sadaka mtakazotoa kila mwanzo wa kila mwezi: pamoja na sadaka maalumu za kuteketezwa na sadaka za unga. Hizi zitakuwa nyongeza za sadaka za kuteketezwa za kila siku, na sadaka zake za unga, na sadaka zake za vinywaji. Utakapokuwa ukiendelea na sadaka hizi, utakuwa ukitii kile kilichoamriwa kutoa harufu nzuri, sadaka iliyotengenezwa kwa moto kwa BWANA.
Aja ndị a niile bụ nke a ga-etinye nye nʼaja nsure ọkụ a na-achụ kwa ọnwa, na aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, ha na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e depụtara. Ha bụ aja ihe oriri a na-achụrụ Onyenwe anyị, aja nwere isisi dị ụtọ.
7 Siku ya kumi ya mwezi wa saba, mtakuwa na kusanyiko takatifu la kumwabudu BWANA. Mtajinyeneyekeza na hamtafanya kazi.
“‘Nʼụbọchị nke iri nke ọnwa asaa ahụ, unu ga-enwekwa nzukọ dị nsọ. Unu ga-ebudata onwe unu nʼala. O nweghịkwa ụdị ọrụ ọbụla unu ga-arụ.
8 Mtatoa sadaka ya kuteketezwa ili kutoa harufu nzuri kwa BWANA. Mtatoa fahari mmoja mchanga ili kutoa harufu nzuri, kondoo mmoja mume, na wanakondoo saba waume wa mwaka mmoja. Wote wakamilifu.
Nʼụbọchị ahụ, unu ga-achụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ, nke isisi ya na-atọ ya ụtọ. A ga-eji otu nwa oke ehi, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja a.
9 Pamoja na sadaka hizo utatoa sadaka ya unga, unga mwembamba uliochanganywa na mafuta, sehemu tatu za kumi za efa kwa ajili ya fahari, sehemu mbili za kumi za kondoo dume mmoja,
Aja mkpụrụ ọka ga-eso ya. A ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ aja nwa oke ehi ahụ. Jiri lita ụtụ ọka anọ na ọkara chụọ aja ebule,
10 na sehemu ya kumi ya efa moja kwa kila mwanakondoo wale saba.
jirikwa lita ụtụ ọka abụọ chụọ aja nʼisi otu nʼime nwa atụrụ ọbụla.
11 Mtatatoa beberu mmoja kuwa sadaka ya upatanisho. Hii itakuwa sadaka ya nyongeza ya upatanisho, ya sadaka ya kila siku ya kuteketezwa, pamoja na sadaka za unga, na sadaka zake za vinywaji.
Tinyekwa otu mkpi a ga-eji chụọ aja mmehie. A ga-atụkwasị nke a nʼaja mkpuchi mmehie a na-achụ, tinyere aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ niile.
12 Siku ya kumi na tano ya mwezi wa saba, mtakuwa na kusanyiko takatifu lakumwabudu BWANA. Siku hiyo hamtafanya kazi za kila siku, na mtazitunza hizo sikukuu kwa muda wa siku saba kwa ajili ya BWANA.
“‘Nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa asaa, a ga-enwe mkpọkọta dị nsọ nke ụmụ Izrel niile. Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla agaghị arụ ọrụ ọbụla, nʼihi na ọ bụ mmalite mmemme abalị asaa nʼihu Onyenwe anyị.
13 Mtatoa sadaka ya kuteketezwa, sadaka iliyotengenezwa kwa moto ilikutoa harufu nzuri kwa BWANA. Mtatoa mafahari wachanga kumi na tatu, kondoo waume wawili, na wanakondoo waume kumi na nne wa mwaka mmoja. Wote wakamilifu.
Cheenụ onyinye a na-enye site nʼọkụ nʼihu Onyenwe anyị nke isisi ya na-atọ ya ụtọ, jirinụ oke ehi iri na atọ, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị na-enweghị ntụpọ, ndị gbara otu afọ, otu afọ, chụọ aja nsure ọkụ.
14 Pamoja na hao mtatoa sadaka ya unga, unga mwembaba uliochanganywa na mafuta, sehemu tatu za kumi za efa kwa kila fahari katika hao kumi na tatu, sehemu mbili za kumi kwa kila hao kondoo dume wawili,
A ga-atụkwasịkwa aja mkpụrụ ọka nke e ji lita ụtụ ọka isii na ọkara gwakọta ya na mmanụ, nʼisi otu nʼime oke ehi iri na atọ ndị ahụ niile. Lita anọ na ọkara nʼisi otu ebule nʼime ebule abụọ ndị ahụ,
15 na sehemu ya kumi ya efa ya hao wanakondoo kumi na nne.
ma lita abụọ nʼisi otu nʼime nwa atụrụ ọbụla.
16 Mtatoa beberu mmoja kuwa sadaka ya dhambi katika nyongeza ya sadaka ya kuteketezwa, sadaka yake ya unga, pamoja na sadaka za vinywaji.
Tinyekwa otu mkpi maka ịchụ aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, tinyere aja mkpụrụ ọka na aja onyinye ihe ọṅụṅụ so ha.
17 Siku ya pili ya kusanyiko, mtatoa mafahari kumi na mbili, kondoo dume wawili na wanakondoo dume kumi na mbili wa umri wa mwaka mmoja, wote wakamilifu.
“‘Nʼụbọchị abụọ nke mmemme a, a ga-eji oke ehi iri na abụọ, ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja.
18 Pamoja nao mtatoa sadaka ya unga, na sadaka ya vinywaji kwa ajili ya wale mafahari, kondoo dume, na kwa ajili ya wale wanakondoo, mkitoa sadaka nyingi kama ilvyoamriwa.
Ihe ga-eso aja oke ehi, na ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha, bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
19 Mtatoa beberu mmoja kuwa sadaka ya dhambi kuwa nyongeza ya sadaka za kila siku, sadaka yake ya unga, na sadaka zake za vinywaji.
Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
20 Siku ya tatu ya kusanyiko, mtatoa sadaka mafahari kumi na moja, kondoo dume wawili, na wanakondoo dume kumi na nne wa umri wa mwaka mmoja, wakamilifu.
“‘Nʼụbọchị nke atọ nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi iri na otu, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
21 Pamoja na hizo sadaka mtatoa sadaka ya unga na sdaka ya vinywaji kwa wale mafahari, kwa wale kondoo dume, na kwa wale wanakondoo, utoe sadaka nyingi kama ilivyoamriwa.
Ihe ga-eso aja oke ehi na ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
22 Mtatoa sadaka beberu mmoja kuwa sadaka ya dhambi kama nyongeza ya zile sadaka za kila siku, na sadaka zake za unga, na sadaka zake za vinywaji.
Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
23 Siku ya nne ya kusanyiko, mtatoa mafahari kumi, kondoo dume wawili, na wanakondoo dume kumi na nne wa mwaka mmoja, wakamilifu.
“‘Nʼụbọchị nke anọ nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi iri, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
24 Pamoja na sadaka hizo mtatoa sadaka za unga na sdaka za vinywaji kwa wale mafahari, na kwa wale kondoo dume na kwa wale wanakodoo, mtatoa sadaka nyingi kama ilivyoamriwa.
Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
25 Mtatoa beberu mmoja kuwa sadaka ya dhambi kuwa nyongeza ya sadaka za kuteketezwa za kila siku, sadaka zake za unga, na sadaka zake za vinywaji
Tinyekwa otu mkpi maka ịchụ aja mmehie ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, tinyere aja mkpụrụ ọka, na aja onyinye ihe ọṅụṅụ so ha.
26 Siku ya tano ya kusanyiko, mtatoa mafahari tisa, kondoo dume wawili, na wanakondoo dume kumi na nne wa mwaka mmoja, wakamilifu.
“‘Nʼụbọchị nke ise nke mmemme a, ị ga-ewere ụmụ oke ehi itoolu, ebule abụọ na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja.
27 Pamoja na sadaka hizo mtatoa sadaka za unga na sadaka ya vinywaji kwa ajili ya wale mafahari, kondoo dume, na wale wanakondoo, mkitoa sdaka nyingi kama ilivyoamriwa.
Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
28 Mtatoa beberu mmoja kuwa sadaka ya dhambi kama nyongeza ya sadaka za kuteketezwa za kila siku, na sadaka zake za unga, na sadaka za vinywaji.
Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
29 Siku ya sita ya kusanyiko, mtatoa mafahari wanane, kondoo dume wawili, na wanakondoo kumi na nne wa mwaka mmoja, wakamilifu.
“‘Nʼụbọchị nke isii nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi asatọ, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
30 Pamoja na sadaka hizo mtatoa sadaka za unga nasadaka za vinywaji kwa wale mafahari, kondoo wa dume na wale wanakondoo, mkitoa sadaka nyingi kama ilivyoamriwa.
Ihe ga-eso aja oke ehi, na ebule, na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
31 Mtatoa beberu kuwa sadaka ya dhambi kama nyongeza ya sadaka za kila siku za kuteketezwa, sadaka zadaka zake za unga, na sadaka zake za vinywaji.
Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
32 Siku ya saba ya kusanyiko, mtatoa mafahari saba, kondoo dume saba, na wanakondoo dume kumi na nne wa mwaka mmoja, wakamilifu.
“‘Nʼụbọchị nke asaa nke mmemme ahụ, were ụmụ oke ehi asaa, ebule abụọ na ụmụ ebule iri na anọ, ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja.
33 Pamoja nao mtataengeneza sadaka ya unga na sadaka ya vinywaji kwa ajili ya wale mafahari, na kondoo dume, na kwa wale wanakondoo, mkitoa sadaka nyingi kama ilivyoamriwa.
Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
34 Mtatoa beberu mmoja kuwa sadaka ya dhambi kama nyongeza ya sadaka ya kuteketezwa ya kila siku, na sadaka yake ya unga, na sadaka yake ya vinywaji.
Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
35 Siku ya nane mtakuwa na kusanyiko lingine makini. Hamtafanya kazi zenu za kila siku.
“‘Nʼụbọchị nke asatọ ndị Izrel niile ga-enwe oke nzukọ. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.
36 Mtafanya sadaka za kuteketezwa, sadaka iliyotengenezwa kwa moto ili kutoa harufu nzuri kwa BWANA. Mtatoa fahari mmoja, kondoo mmoja dume, na wanakondoo saba dume wa umri wa mwaka mmoja, wakamilifu.
Chụọ aja nsure ọkụ, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ. Ị ga-eji otu nwa oke ehi, otu ebule na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ ọbụla, chụọ ya.
37 Mtatoa sadaka zake za unga na sadaka zake za vinywaji kwa ajili ya yule fahari, kondoo dume, na kwa wale wanakondoo, mkifanya sadaka nyingi kadri ilivyoamriwa.
Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu.
38 Mtatoa beberu mmoja kuwa sadaka ya dhambi kama nyongeza ya sadaka za kila siku, na sadaka zake za unga, na sadaka zake za vinywaji.
Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha.
39 Hivi ndivyo utakavyotoa sadaka kwa BWANA katika sikukuu zenu za kila mwaka. Hivi vitakuwa nyongeza ya viapo vyenu na sadaka zenu za hiari. Mtavitoa hivi kama sadaka zenu za kuteketezwa, sadaka za unga, sadaka za vinywaji, na sadaka za amani.”
“‘Tinyere onyinye a na-enye dịka nkwa e kwere si dị, na onyinye afọ ofufu unu, unu ga-akwadoro Onyenwe anyị onyinye ndị a nʼoge mmemme a kara aka unu: aja nsure ọkụ unu, onyinye mkpụrụ ọka na onyinye ihe ọṅụṅụ na aja udo.’”
40 Musa aliwaambia wana wa Israeli kila kitu ambacho BWANA alikuwa amemwamuru kusema.
Ya mere Mosis gwara ụmụ Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu ịgwa ha.