< Hesabu 28 >
1 BWANA akanena na Musa akamwambia,
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 “Waamuru wana wa Isrseli uwaambie, 'Mtanitolea sadaka kwa wakati uliopangwa, chakula cha sadaka yangu kilichotengenezwa kwa moto ili kutoa harufu nzuri kwa ajili yangu.
“Nye ndị Izrel iwu a sị ha, ‘Lezienụ anya hụ na unu na-eche nʼihu m, nʼoge niile a kara aka, nri ahụ a na-enye maka onyinye m a na-enye site nʼọkụ, nke isisi ya na-adị m ezi mma.’
3 Pia uwaambie, 'Hii ni sadaka iliyotengenezwa kwa moto ambayo mtaitoa kwa BWANA- mwanakondoo dume wa mwaka mmoja asiyekuwa na waa, wawili kila siku kuwa sadaka ya kuteketezwa ya kila siku.
Sị ha, ‘Nke a bụ onyinye unu na-enye site nʼọkụ nke unu na-eche nʼihu Onyenwe anyị: ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ, ka e jiri ha chụọ aja nsure ọkụ kwa ụbọchị niile.
4 Mwanakodoo mmoja atatolewa sadaka asubuhi, na mwingine atatolewa sadaka jioni.
Chụọ otu nwa atụrụ nʼoge ụtụtụ, chụọkwa nke ọzọ nʼoge uhuruchi.
5 Mtatoa sadaka ya sehemu ya kumi ya efa ya unga mwembamba kuwa sadaka ya unga, uliochanganywa na robo ya hini ya mafuta yaliyokamuliwa.
Ị ga-ejikwa lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri akwọzi nke a gwọkọtara nʼotu lita mmanụ oliv asụrụ asụ, chụọ aja mkpụrụ ọka.
6 Hii ni sadaka ya ya kuteketezwa ya kila siku iliyoamriwa mlima Sinai ili kutoa harufu nzuri, sadaka iliyotengenezwa kwa moto kwa ajili ya BWANA.
Nke a bụ aja nsure ọkụ ahụ Onyenwe anyị nyere iwu ya nʼugwu Saịnaị na a ga na-achụrụ ya mgbe niile, dịka aja isisi ya dị ezi mma, aja nke a chụrụ site nʼọkụ nye Onyenwe anyị.
7 Pamoja na robo ya hini ya sadaka ya kinywaji kwa mmoja wa hao wanakondoo. Utaimimina mahali patakatifu hiyo sadaka ya kinywaji kwa BWANA.
Mmanya ga-eso aja a ga-abụ otu lita mmanya gbara ụka nʼisi otu atụrụ ọbụla, ị ga-awụsa aja ihe ọṅụṅụ a nʼebe nsọ nye Onyenwe anyị.
8 Yule mwanakondoo mwingine utamtoa sadaka jioni pamoja na sadaka ya unga kama kama yule wa asubuhi alivyotolewa. Pia utatoa tena sadaka ya kinywaji pamoja naye, sadaka iliyotengenezwa kwa moto ili kutoa harufu nzuri kwa BWANA.
Nʼoge anyasị, ị ga-ewerekwa nwa atụrụ nke abụọ, ya na otu ụdị aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dị ka i mere nʼụtụtụ, jiri chụọ aja. Nke a bụkwa aja e sitere nʼọkụ chụọ, nke isisi ya dị ezi mma nye Onyenwe anyị.
9 Katika siku ya Sabato utatoa wanakondoo dume wawili, wa umri wa mwaka mmoja kila mmoja wasiokuwa na dosari, na sehemu ya kumi mbili ya efa ya unga mwembamba kwa sadaka ya unga, uliochanganywa na mafuta, pamoja na sadaka ya kinywaji.
“‘Nʼụbọchị izuike, jiri ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, ha na aja ihe ọṅụṅụ na aja mkpụrụ ọka e ji lita ụtụ ọka anọ na ọkara a kwọziri akwọzi, nke a gwaziri mmanụ mee.
10 Hii itakuwa sadaka ya kuteketezwa kwa kila siku ya Sabato, kama nyongeza ya ile sadaka ya kila siku pamoja na ile sadaka ya kinywaji.
Nke a bụ aja nsure ọkụ nke Ụbọchị Izuike, tinyere aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ ndị ahụ a na-achụ nʼoge ha.
11 Kila mwanzo wa mwezi, mtatoa sadaka za kuteketezwa kwa BWANA. Utatoa sadaka ya fahari wawili wachanga, kondoo dume mmoja, na wanakondoo dume saba wa umri wa mwaka mmoja wasiokuwa na dosari.
“‘Ọzọ, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa ọbụla, a ga-achụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ dị iche, nke a ga-eji ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ.
12 Pia mtatoa sehemu ya kumi tatu ya efa unga mwembamba kuwa sadaka ya unga uliochanganywa na mafuta kwa kila fahari, na sehemu za kumi mbili za unga mwembamba kuwa sadaka ya unga uliochanganywa na mafuta kwa yule kondoo mume mmoja.
Tinyere oke ehi ọbụla, ị ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a kwọziri nke ọma, nke a gwara mmanụ chụọ aja. Ma lita ụtụ ọka anọ na ọkara a kwọziri nke ọma, nke a gwakọtakwara mmanụ ka a ga-eji chụọ aja mkpụrụ ọka maka otu ebule ọbụla.
13 Pia mtatoa sehemu ya kumi ya efa ya unga mwembamba uliochanganywa na mafuta kuwa sadaka ya unga kwa kila mwanakondoo. Hii itakuwa sadaka ya kuteketezwa, ya kutoa harufu nzuri, sadaka iliyotengenezwa kwa moto kwa ajilI ya BWANA.
Ma nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla, ọ bụ lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri nke ọma, nke a gwakọtara ya na mmanụ ka a ga-eji chụọ aja mkpụrụ ọka. A ga-eji ha chụọ aja nsure ọkụ nke isisi ya ga-atọkwa Onyenwe anyị ezi ụtọ.
14 Sadaka ya kinywaji ya watu itakuwa nusu ya hini ya divai ya yule fahari, sehemu ya tatu ya hini ya kondoo dume, na robo ya hini ya mwanakondoo. Hii ndiyo itakuwa sadaka ya kuteketezwa ya kila mwezi kwa miezi yote ya mwaka.
Aja ọbụla a chụrụ ga-enwe aja ihe ọṅụṅụ nke ga-eso ya, lita mmanya abụọ maka otu oke ehi, ihe ji ntakịrị karịa otu lita mmanya nʼisi otu ebule, na otu lita nʼisi otu nwa atụrụ. Nke a ga-abụ aja nsure ọkụ nke a ga-achụ nʼoge ọnwa ọhụrụ ọ bụla, nʼime afọ ọbụla,
15 Mtatoa beberu mmoja kuwa sadaka ya dhambi kwa BWANA. Hii itakuwa nyongeza kwa ile sadaka ya kila siku pamoja na ile sadaka ya viinywaji.
nʼagbanyeghị aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ nke a na-achụ dịka mgbe ha si dị, a ga-eche otu mkpi nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mmehie.
16 Katika siku kumi na nne, ya mwezi wa kwanza itakuwa Pasaka ya BWANA.
“‘Nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa mbụ, ka a ga-edebe Mmemme Ngabiga. Onyenwe anyị.
17 Katika sku ya kumi na tano ya mwezi huu kutakuwa na sikukuu. Mtakuka mikate isiyo na chachu kwa siku saba.
Nʼụbọchị na-eso ya, bụ abalị iri na ise nke ọnwa ahụ ka a ga-eme mmemme. Nʼime abalị asaa ka a ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
18 Katika siku ya kwanza kutakuwa na kusanyiko takatifu la kumheshimu BWANA. Katika siku hiyo msifanye kazi zenu za kila siku
Nʼụbọchị mbụ mmemme a bidoro, a ga-akpọ nzukọ dị nsọ nke ndị Izrel niile. Ọ dịghị ọrụ siri ike a ga-arụ nʼụbọchị ahụ.
19 Hata hivyo, mtatoa sadaka iliyotengenezwa kwa moto, sadaka ya kuteketezwa kwa BWANA. Mtatoa sadaka ya fahari wawili, kondoo dume mmoja, na kondoo dume saba wa umri wa mwaka mmoja wakamilifu.
Unu ga-eji ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara naanị otu afọ, otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ ọbụla chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ.
20 Pamoja na yule fahari, mtatoa sadaka sehemu za tatu efa za unga mwembamba uliochanganywa na mafuta, pamoja na yule kondoo mume sehemu za pili za kumi.
Nʼisi otu oke ehi ọbụla, a ga-achụ aja mkpụrụ ọka nke a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a kwọziri nke ọma, a gwakọtara ya na mmanụ chụọ. Nʼisi ebule ọbụla, lita ụtụ ọka anọ na ọkara.
21 Kwa kila wale wanakondoo saba, mtatoa sehemu ya kumi ya efa ya unga mwembamba uliochanganywa na mafuta,
Ma nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla, a ga-enye lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri nke ọma.
22 na beberu mmoja kuwa sdaka ya dhambi ili kufanya upatanisho kwa ajili yenu.
Tinye otu mkpi nʼihi ịchụ aja mmehie maka ikpuchiri unu mmehie unu.
23 Mtotoa hivi vitu kama sadaka ya nyongeza katika ile sadaka ya kila siku inayotakiwa kila asubuhi.
A ga-achụ aja ndị a, tinyere aja ndị ọzọ niile a na-achụ nʼụbọchị niile.
24 Kama ilivyofafanuliwa hapa, mtatoa sadaka hizi kila siku, kwa zile siku saba za Pasaka, kile chakula cha sadaka kilichotengenezwa kwa moto kuwa harufu nzuri kwa BWANA. Hiki kitatolewa kuwa sadaka ya nyongeza ya ile sadaka ya kuteketezwa na pamoja na ile sadaka ya vinywaji.
A ga-achụ aja ndị a ụbọchị niile nʼime ụbọchị asaa nke mmemme ahụ. Ha ga-abụ aja nke isisi ha dị Onyenwe anyị ezi ụtọ. A ga-achụ ha, chụkwaa aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ nke a na-achụ dịka mgbe ha si dị.
25 Siku ya saba mtakuwa na kusanyiko takatifu ili kumheshimu BWANA, na katika siku hiyo msifanye zile kazi zenu zakila siku.
Nʼụbọchị nke asaa nweenụ mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ.
26 Pia katika siku ya malimbuko, mtakapokuwa mnatoa sadaka ya unga mpya katika sikukuu zenu za Majuma, mtakuwa na kusanyiko takatifu la kumheshimu BWANA, na katika siku hiyo msifanye kazi zenu za kila siku.
“‘Nʼụbọchị mbụ nke mkpụrụ mbụ, mgbe unu na-eche onyinye ọka ọhụrụ unu nʼihu Onyenwe anyị nʼoge mmemme Izu Asaa, nweenụ mkpọkọta dị nsọ. Unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ.
27 Mtatoa sadaka ya kuteketezwa ili kutoa harufu nzuri kwa BWANA. Mtatoa fahari wawili wachanga, kondoo mume mmoja, na wanakondoo saba waume wa mwaka mmoja.
Unu ga-achụ aja nsure ọkụ, nke isisi ya dị ezi mma nye Onyenwe anyị. Ọ bụ ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ, ka a ga-eji chụọ aja a.
28 Pamoja na hiyo mtatoa sadaka ya unga: unga mwembamba uliochanganywa na mafuta, sehemu tatu za kumi za efa za unga mwembamba uliochanganywa na mafuta kwa kila fahari na sehemu kumi mbili za yule kondoo mume.
Ihe unu ga-etinye nʼihe ndị a bụ aja mkpụrụ ọka a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a kwọziri akwọzi, nke a gwakọtara ya na mmanụ chụọ, nʼisi otu oke ehi. Lita ụtụ ọka anọ na ọkara, nʼisi otu ebule,
29 Toeni sehemu ya kumi ya efa ya unga mwembamba uliochanganywa na mafuta kwa kila wale wanakondoo saba,
na lita ụtụ ọka abụọ, nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla.
30 na beberu mmoja ili kufanya upatanisho kwa ajili yenu.
Ọzọkwa, a ga-eji otu mkpi chụọ aja maka mkpuchi mmehie unu.
31 Mtakapotoa hao wanyama wasio na dosari, pamoja na sadaka zake za vinywaji, hii itakuwa sadaka ya nyongeza katika zile sadaka za kila siku na pamoja na zile sadaka za unga.'”
Dozie aja ndị a tinyere aja ihe ọṅụṅụ ha, ya na aja nsure ọkụ na aja mkpụrụ ọka ya na aja ahụ so. Hụkwanụ na anụ ụlọ e ji chụọ aja ndị a bụ ndị na-enweghị ntụpọ ọbụla.