< Hesabu 12 >

1 Kisha Miriamu na Haruni wakasema kinyume na Musa kwa sababu ya mwanamke Mkushi ambaye alikuwa amemwoa.
Miriam na Erọn malitere ikwu okwu megide Mosis, nʼihi na ọ lụrụ nwunye onye Kush.
2 Walisema. “Hivi BWANA amesema na Musa tu? Ni kweli hajawahi kusema nasi pia? Sasa BWANA akasikia kile walichokuwa wanaongea. Sasa
Ha kwuru sị, “Ọ bụ naanị site nʼọnụ Mosis ka Onyenwe anyị si agwa ndị ya okwu? Ọ naghị esitekwa nʼọnụ anyị kwuo okwu?” Onyenwe anyị nụrụ ihe ndị a ha kwuru.
3 Musa alikuwa mtu mpole sana, mpole kuliko mtu yeyote duniani.
(Ma nwoke ahụ bụ Mosis dị umeala nʼobi nke ukwuu karịa onye ọbụla nọ nʼelu ala.)
4 Wakati huo, BWANA akanena na Musa, Haruni na Miriamu: “tokeni nje ninyi watatu kwenye hema ya kukutania.” kwa hiyo wale watatu wakatokanje.
Na mberede, Onyenwe anyị sịrị Mosis, na Erọn, na Miriam, “Pụtanụ, bịa nʼụlọ nzute, unu mmadụ atọ” Ya mere ha atọ pụtara.
5 Kisha BWANA akashuka katika nguzo ya wingu. Akasimama kwenye lango la hema na akamwita Haruni na Miriamu. wote wakaja mbele.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime igwe ojii, guzoro na mbata ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, kpọpụta Erọn na Miriam. Mgbe ha abụọ bịara nso.
6 BWANA akasema, “Sasa sikilizeni maneo yangu, Nabii wangu anapokuwa nanyi, Mimi nitajifunua kwake kwa maono na kusema naye katika ndoto.
Onyenwe anyị gwara ha sị, “Geenụ ntị nʼokwu m ndị a: “Mgbe onye amụma nọ nʼetiti unu, Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-egosi ya onwe m site nʼọhụ. Ana m agwa ya okwu site na nrọ.
7 Lakini si hivyo kwa mtumishi wangu Musa. Yeye ni mwaminifu katika nyumba yangu yote.
Ma nʼebe ohu m Mosis nọ, o sighị otu a dịrị, ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼụlọ m niile.
8 Mimi huongea na Musa moja kwa moja, si kwa maono wala mafumbo. Yeye huniona umbo langu. Kwa hiyo, kwa nini hamuogoopi kumnenea kinyume, mtumishi wangu Musa?”
Nʼebe ọ nọ, ana m agwa ya okwu ihu na ihu nʼụzọ doro anya, ọ bụghị site nʼilu, ọ na-ahụkwa ụdịdị Onyenwe anyị. Gịnị mere ụjọ atụghị unu ikwu okwu megide ohu m Mosis?”
9 Hasira ya BWANA ikawawakia, kisha akawaacha.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide ha. O si nʼebe ha nọ pụọ.
10 Lile wingu likainuka juu ya hema, Miriamu akapata ukoma ghafla - akawa mweupe kama theluji. Naye Haruni alipogeuka kumwona Miriamu, akamwona amepata ukoma.
Ma mgbe igwe ojii ahụ hapụrụ ụlọ nzute ahụ, lee Miriam ebe o guzo, ekpenta tiwapụtara ya nʼahụ dịka nzu ọcha. Mgbe Erọn tụgharịrị ebe ọ nọ hụ na ọ ghọọla onye ekpenta,
11 Haruni akamwambia Musa, “Bwana wangu, usituadhibu kwa uovu wetu huu. Tumenena katka upumbuvu, na tumetenda dhambi.
ọ gwara Mosis okwu sị, “Biko, onyenwe m, atala anyị ahụhụ nʼihi mmehie anyị sitere na nzuzu mee.
12 Tafadhali nakuomba usimwache akawa kama mtoto mchanga aliyekufa ambaye nusu ya nyama yake imeoza tangu kuzaliwa”
Ekwela ka Miriam dịrị ka nwa ọhụrụ nwụrụ anwụ nke akpụkpọ ahụ ya rere ure nʼoge o si nʼakpanwa nne ya na-apụta.”
13 Kwa hiyo Musa akamwomba BWANA, akasema, “Mungu ninakusihi umponye tafadhali.”
Ya mere Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị ya, “Chineke, biko, gwọọ ya!”
14 BWANA akamwambia Musa, “kama baba yake angemtemea usoni angepata aibu kwa muda wa siku saba. Umfungie nje ya kambi kwa muda wa siku saba. Kisha umrejeshe ndani tena.”
Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị ya, “Ọ bụrụ na nna ya gbụrụ ya asụ nʼihu, ọ gaghị abụ onye rụrụ arụ abalị asaa? Ya mere, hapụ ya ka ọ bụrụ onye e sitere nʼogige ọmụma ụlọ ikwu Izrel wezuga abalị asaa. Mgbe oge a gafesịrị, o nwere ike ịlọghachi.”
15 Kwa hiyo Miriamu akafungiwa nje ya kambi kwa siku saba. Watu hawakusafiri mpaka aliporudi kambini.
Ya mere e wezugara Miriam site nʼogige ọmụma ụlọ ikwu Izrel abalị asaa. Ndị Izrel niile nọdụrụ chere ya ruo mgbe ọ lọghachiri, tutu ha ebilie nʼije ọzọ.
16 Kisha watu wakasafiri kutoka Hazeroti na kuweka kambi kwenye jangwa la Parani.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ha hapụrụ Hazerọt rute nʼọzara Paran ebe ha wuru ogige ụlọ ikwu ha.

< Hesabu 12 >