< Nehemia 7 >
1 Wakati ukuta ulipomalizika na milango nimekwisha kuisimamisha, na walinzi wa malango na waimbaji na Walawi walikuwa wamechaguliwa,
Mgbe e wuzichara mgbidi ahụ, na mgbe m guzobesịrị ibo nʼọnụ ụzọ ya niile nʼọnọdụ ha, họpụtakwa ndị ọbụ abụ na ndị nche, na ndị Livayị.
2 nikampa ndugu yangu Hanani kuwa na amri juu ya Yerusalemu, pamoja na Hanania ambaye alikuwa msimamizi wa kijiji, kwa kuwa alikuwa mwaminifu na alimuogopa Mungu zaidi kuliko wengi.
Enyefere m ọrụ ilekọta Jerusalem nʼaka nwanne m nwoke bụ Hanani, ya na Hananaya onye bụ onyeisi ụlọ ukwu ahụ e wusiri ike, nʼihi na ọ bụ nwoke na-ekwu eziokwu, bụrụkwa onye na-atụ egwu Chineke karịa ọtụtụ ndị ọzọ.
3 Nami nikawaambia, Msifungue malango ya Yerusalemu mpaka jua litakapokuwa kali. Wakati walinzi wa mlango wanalinda, unaweza kufunga milango na kuikaza. Chagua walinzi kutoka kwa wale wanaoishi Yerusalemu, wengine mahali pa kituo chao cha ulinzi, na wengine mbele ya nyumba zao wenyewe.
Agwara m ha, “Na-emeghenụ ọnụ ụzọ ama naanị mgbe chi bọziri nke ọma. Kpọchiekwa ha mgbe ndị nche ka nọ na nche. Họpụtakwanụ ndị bi na Jerusalem ka ha bụrụ ndị nche. Ụfọdụ ga-eche nʼebe a họpụtara ha, ụfọdụ ga-eche nʼakụkụ ụlọ nke aka ha.”
4 Sasa jiji lilikuwa pana na kubwa, lakini kulikuwa na watu wachache ndani yake, na hakuna nyumba zilizojengwa tena.
Nʼoge a obodo ahụ buru ibu dịkwa mbara, ma ndị bi nʼime ya dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, ụlọ ndị dị nʼime ya bụkwa ihe ewugharịbeghị.
5 Mungu wangu aliweka moyoni mwangu, kuwakusanya pamoja wakuu, maafisa, na watu kuwaandikisha katika familia zao. Nilipata Kitabu cha kizazi cha wale ambao walirudi kwanza na nikaona kwamba imeandikwa humo.
Ya mere Chineke m tinyere ya nʼobi m ka m chịkọta ndị niile a na-asọpụrụ, ndị ọchịchị, na ndị niile bi nʼobodo, maka idebanye aha nʼakwụkwọ ezinaụlọ nʼezinaụlọ. Achọtara m ebe e depụtara usoro ndị mmadụ niile bụ ụzọ lọta Juda nʼoge gara aga. Nke a bụ ihe m chọpụtara edere nʼime ya:
6 Hawa ndio watu wa jimbo ambao walikwenda kutoka kwenye uhamisho wa wale waliohamishwa ambao Nebukadreza mfalme wa Babeli aliwachukua mateka. Wakarudi Yerusalemu na Yuda, kila mmoja kwenda kwenye mji wake.
Ndị a bụ ndị obodo niile a na-achị achị, bụ ndị sitere na ndọta nʼagha nke Nebukadneza, eze Babilọn, onye dọtara ha nʼagha buru ha laa nʼala ọzọ. Ha lọghachitere na Jerusalem nakwa Juda, onye ọbụla nʼobodo nke aka ya.
7 Walikuja na Zerubabeli, Yoshua, Nehemia, Seraya, Reelaya, Nahamani, Mordekai, Bilshani, Mispari, Bigwai, Rehumu na Baana. Idadi ya wana wa Israeli ilikuwa.
Ndịisi ha na Zerubabel soo, bụ Jeshua, Nehemaya, Azaraya, Raamaya, Nahamani, Mọdekai, Bilshan, Misperet, Bigvai, Nehum na Baana. Ihe ndepụta ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel bụ nke a:
8 Wana wa Paroshi, 2, 172.
Ndị agbụrụ Parosh, puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ,
nke Shefataya, narị atọ na iri asaa na abụọ,
nke Ara, narị isii na iri ise na abụọ,
nke Pahat-Moab site nʼụmụ Jeshua na Joab, puku abụọ, na narị asatọ na iri na asatọ,
12 kwa wana wa Yeshua na Yoabu, 2, 818.
nke Elam, otu puku, na narị abụọ na iri ise na anọ,
13 Wana wa Elamu, 1, 254.
nke Zatu, narị asatọ na iri anọ na ise,
14 Wana wa Zatu, 845. Wana wa Zakai, 760.
nke Zakai, narị asaa na iri isii,
nke Binui, narị isii na iri anọ na asatọ,
nke Bebai, narị isii na iri abụọ na asatọ,
17 Wana wa Azgadi, 2, 322.
nke Azgad, puku abụọ, na narị atọ na iri abụọ na abụọ,
18 Wana wa Adonikamu, 667.
nke Adonikam, narị isii na iri isii na asaa,
19 Wana wa Bigwai, 2, 067.
nke Bigvai, puku abụọ, na iri isii na asaa,
nke Adin, narị isii na iri ise na ise,
21 Wana wa Ateri, wa Hezekia, 98.
nke Atea (site na Hezekaya), iri itoolu na asatọ,
nke Hashum, narị atọ na iri atọ na asatọ,
nke Bezai, narị atọ na iri abụọ na anọ,
nke Harif, otu narị na iri na abụọ,
nke Gibiọn, iri itoolu na ise.
26 Watu kutoka Bethlehemu na Netofa, 188.
Ndị ikom Betlehem na Netofa, otu narị na iri asatọ na asatọ,
27 Watu wa Anathothi, 128.
ndị Anatot, otu narị na iri abụọ na asatọ,
28 Watu wa Beth Azmaweth, 42.
ndị Bet-Azmavet, iri anọ na abụọ,
29 Watu wa Kiriath Yearimu, Kefira, na Beerothi, 743.
ndị Kiriat Jearim, Kefira na Beerọt, narị asaa na iri anọ na atọ,
30 Watu wa Rama na Geba, 621.
ndị Rema na Geba, narị isii na iri abụọ na otu,
ndị Mikmash, otu narị na iri abụọ na abụọ,
32 Watu wa Betheli na Ai, 123.
ndị Betel na Ai, otu narị na iri abụọ na atọ,
ndị Nebo nke ọzọ, iri ise na abụọ,
34 Watu wa Elamu wa pili, 1, 254.
ndị agbụrụ Elam nke ọzọ, otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ,
ndị Harim, narị atọ na iri abụọ,
ndị Jeriko, narị atọ na iri anọ na ise,
37 Watu wa Lodi, Hadidi, na Ono, 721.
ndị Lod, Hadid, na Ono, narị asaa na iri abụọ na otu,
38 Watu wa Senaa, 3, 930.
ndị Senaa, puku atọ, na narị itoolu na iri atọ.
39 makuhani Wana wa Yedaya (wa nyumba ya Yeshua), 973.
Ndị nchụaja: ndị agbụrụ Jedaya site nʼezinaụlọ Jeshua, narị itoolu na iri asaa na atọ,
40 Wana wa Imeri, 1, 052.
ndị Imea, otu puku, na iri ise na abụọ,
41 Wana wa Pashuri, 1, 247.
ndị Pashua, otu puku, na narị abụọ na iri anọ na asaa,
42 Wana wa Harimu, 1, 017.
ndị Harim, otu puku, na iri na asaa.
43 Walawi, wana wa Yeshua, wa Kadmieli, wa Binui, wa Hodavia, 74.
Ndị Livayị: ndị agbụrụ Jeshua site na Kadmiel nke ụmụ Hodavaya, iri asaa na anọ.
44 Waimbaji wana wa Asafu; 148.
Ndị ọbụ abụ: ndị agbụrụ Asaf, otu narị, na iri anọ na asatọ.
45 Waliofungua mlango wana wa Shalumu, wana wa Ateri, wana wa Talmoni; wana wa Akubu, wana wa Hatita, wana wa Shobai, 138.
Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu: ndị agbụrụ Shalum, Atea, Talmon, Akub, Hatita na Shobai otu narị, na iri atọ na asatọ.
46 Watumishi wa Hekalu wana wa Siha, wana wa Hasufa, wana wa Tabaothi,
Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ: ndị agbụrụ Ziha, Hasufa na ndị Tabaot,
47 wana wa Kerosi, wana wa Siaha, wana wa Padoni,
Keros, Sia, Padon,
48 wana wa Lebana, wana wa Hagaba, wana wa Salmai,
Lebana, Hagaba, Shalmai,
49 wana wa wa Hanani, wana wa Gideli, wana wa Gahari.
Hanan, Gidel, Gaha,
50 Wana wa Reaya, wana wa Resini, wana wa Nekoda,
Reaya, Rezin, Nekoda,
51 wana wa Gazamu, wana wa Uza, wana wa Pasea,
Gazam, Ụza, Pasea,
52 wana wa Besai, wana wa Meunimu, wana wa Nefusimu.
Besai, Meunim, Nefusim,
53 Wana wa Bakbuki, wana wa Hakufa, wana wa Harhuri,
Bakbuk, Hakufa, Hahua,
54 wana wa Baslith, wana wa Mehida, wana wa Harsha,
Bazlut, Mehida, Hasha,
55 wana wa Barkosi, wana wa Sisera, wana wa Tema,
Bakos, Sisera, Tema,
56 wana wa Nesia, wana wa Hatifa.
Nezaya na Hatifa.
57 Wana wa Sulemani, wana wa Sotai, wana wa Sofeereth, wana wa Peruda,
Agbụrụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, ya bụ ndị agbụrụ Sotai, Soferat, Perida,
58 wana wa Yaala, wana wa Darkoni, wana wa Gideli,
Jaala, Dakon, Gidel,
59 wana wa Shefatia, wana wa Hatili, wana wa Pokerethi Sebaimu, wana wa Amoni.
Shefataya, Hatil, Pokeret-Hazebaim na Amọn.
60 Watumishi wote wa hekalu, na wana wa watumishi wa Sulemani, walikuwa 392.
Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ na ụmụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, dị narị atọ na iri itoolu na abụọ.
61 Hawa ndio watu waliokwenda kutoka Tel Mela, Tel harsha, Kerub, Addon, na Imeri. Lakini hawakuweza kuthibitisha kwamba wao au jamaa za baba zao walikuwa wana wa Israeli,
Ndị a bụ ndị ọzọ sitere nʼobodo Tel Mela, Tel Hasha, Kerub, Adọn na Imea, nke dị nʼala Peshịa lọta. Ma ha enweghị ike igosi ezinaụlọ ebe agbụrụ ha si nʼIzrel.
62 wana wa Delaya, wana wa Tobia, na wana wa Nekoda, 642.
Ndị agbụrụ: Delaya, ndị Tobaya na ndị Nekoda, narị isii na iri anọ na abụọ.
63 Na kutoka kwa makuhani Wana wa Habaya, Hakosi, na Barzilai ( akamchukua mkewe kutoka kwa binti za Barzilai wa Gileadi na akaitwa kwa jina lao).
Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja: Ndị agbụrụ: Hobaya, Hakoz na Bazilai (nwoke lụrụ ada Bazilai onye Gilead a kpọọ ya aha nʼaha ha).
64 Hawa walitafuta rekodi zao kati ya waliojiunga na kizazi chao, lakini hawakuweza kupatikana, kwa hivyo waliondolewa katika ukuhani kama walio najisi.
Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha nʼihi ya e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha.
65 Naye mkuu wa gavana akawaambia wasiruhusiwe kula chakula cha makuhani kutoka kwenye dhabihu mpaka atakapoinuka kuhani mwenye Urimu na Thumimu.
Nʼihi nke a, onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe aja dịkarịsịrị nsọ, tutu ruo mgbe a ga-enwe onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase.
66 Kusanyiko lote lilikuwa 42, 360,
Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ na iri isii,
67 isipokuwa watumishi wao wa kiume na watumishi wao wa kike, ambao walikuwa 7, 337. Walikuwa na wanaume na wanawake wa kuimba 245.
nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa, na narị atọ na iri atọ na asaa, ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ dị narị abụọ, na iri anọ na ise.
68 Farasi zao zilikuwa 736 kwa idadi, nyumbu zao, 245,
Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii, ịnyịnya muul narị abụọ na iri anọ na ise,
69 ngamia zao, 435, na punda zao, 6, 720.
ịnyịnya kamel dị narị anọ na iri atọ na ise, ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa na iri abụọ.
70 Baadhi ya wakuu wa familia za baba zao walitoa zawadi kwa ajili ya kazi. Gavana alitoa sadaka ya darkoni elfu ya dhahabu, mabakuli 50, na mavazi 530 ya makuhani.
Ma ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye maka ọrụ ahụ. Onyeisi ọchịchị tinyere nʼụlọakụ otu puku darik ọlaedo, iri efere ọlaedo ise na uwe ndị nchụaja narị ise na iri atọ.
71 Baadhi ya wakuu wa familia za baba zao waliwapa katika hazina kwa kazi darkroni elfu ishirini za dhahabu na mane 2, 200 za fedha.
Ụfọdụ ndịisi ezinaụlọ tinyere nʼụlọakụ maka ije ozi ahụ, darik ọlaedo puku iri abụọ, na ọtụtụ minas ọlaọcha puku abụọ na narị abụọ.
72 Watu wengine waliwapa darkoni za dhahabu ishirini elfu, na dhahabu elfu mbili za fedha, na mavazi sitini na saba kwa makuhani.
Nkpọkọta ọnụọgụgụ nke ndị mmadụ fọdụrụ nyere bụ, darik ọlaedo puku iri abụọ, na minas ọlaọcha puku abụọ, na uwe ndị nchụaja iri isii na asaa.
73 Basi makuhani, Walawi, walinzi wa malango, waimbaji, watu wengine, watumishi wa hekalu, na Israeli wote waliishi katika miji yao. Hata mwezi wa saba watu wa Israeli walikuwa wakiishi katika miji yao.”
Ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị nche ọnụ ụzọ, ndị ọbụ abụ na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, tinyere ụfọdụ ndị mmadụ na ndị Izrel niile fọdụrụ, gara birikwa nʼobodo nke ha. Mgbe ọnwa asaa ruru, nʼoge a ndị Izrel niile e birila nʼobodo nke aka ha,