< Marko 5 >
1 Walikuja mpaka upande mwingine wa bahari, katika mkoa wa Gerasi
Ha gafere nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ nʼakụkụ obodo Gerazin.
2 Na ghafla wakati Yesu alipokuwa akitoka nje ya mtumbwi, mtu mwenye roho chafu alikuja kwake kutoka makaburini.
Mgbe Jisọs sitere nʼụgbọ ahụ pụta, otu nwoke mmụọ na-adịghị ọcha si nʼebe a na-eli ozu bịa zute ya.
3 Mtu huyu aliishi makaburini. Hakuna aliyeweza kumzuia zaidi, hakuna hata kwa minyororo.
Nwoke a bi nʼetiti ili ndị ahụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ ike ya agbụ, ọ bụladị iji eriri igwe kee ya.
4 Alikuwa amefungwa nyakati nyingi kwa pingu na minyororo. Aliikata minyororo na pingu zake zilivunjwa. Hakuna hata mmoja aliyekuwa na nguvu za kumshinda.
Nʼihi na e keela ya agbụ ụkwụ nʼaka ọtụtụ oge ma ọ dọbisiri eriri igwe ndị ahụ, gbajisiekwa mkpọrọ igwe dị ya nʼụkwụ. Ọ dịkwaghị onye nwere ike ijideli ya.
5 Usiku na mchana akiwa makaburini na milimani, alilia na kujikata yeye mwenyewe kwa mawe makali.
Ọ na-agagharị nʼetiti ili ahụ ehihie na abalị na nʼugwu dị ya gburugburu, na-eti mkpu, na-eji nkume dị nkọ na-egbukasị onwe ya ahụ.
6 Alipomwona Yesu kwa mbali, alikimbilia kwake na kuinama mbele yake.
Mgbe o sitere nʼebe dị anya hụ Jisọs, ọ gbaara ọsọ gaa gbuo ikpere nʼihu ya.
7 Alilia kwa sauti kuu, “Wataka nikufanyie nini, Yesu, Mwana wa Mungu aliye Juu sana? Ninakusihi kwa Mungu mwenyewe, usinitese.”
O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ, Jisọs, Ọkpara Chineke Onye kachasị ihe niile elu? Eji m aha Chineke na-arịọ gị, biko, atala m ahụhụ.”
8 Kwa kuwa alikuwa amemwambia, “Mtoke mtu huyu, wewe roho mchafu.”
Nʼihi na o nyela ya iwu sị, “Si nʼime nwoke a pụta, gị mmụọ na-adịghị ọcha!”
9 Naye alimwuliza, “Jina lako ni nani?” Naye alimjibu, “Jina langu ni Legion, kwa kuwa tuko wengi.”
Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ya sị, “Gịnị bụ aha gị?” Mmụọ ọjọọ ahụ zaghachiri ya sị, “Aha m bụ Lijiọn, nʼihi na anyị dị ọtụtụ.”
10 Alimsihi tena na tena asiwapeleke nje ya mkoa.
Ma ọ rịọsiri ya arịrịọ ike ka ọ ghara ịchụpụ ha site nʼobodo ahụ.
11 Sasa kundi kubwa la nguruwe lilikuwa likilishwa juu ya kilima,
Igwe ezi nọ nso nʼebe ahụ na-akpa nri, na ndịda ugwu dị nʼebe ahụ.
12 nao walimsihi, wakisema, “Tutume kwa nguruwe; tuingie ndani yao.”
Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ ya sị, “Biko ziga anyị nʼetiti igwe ezi ndị a, ma hapụ anyị ka anyị banye nʼime ha.”
13 Hivyo aliwaruhusu; roho wachafu waliwatoka na kuingia ndani ya nguruwe, nao walikimbilia chini ya kilima mpaka baharini, na karibia nguruwe elfu mbili walizama baharini.
Ọ hapụrụ ha; mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha pụtara baa nʼime igwe ezi ndị ahụ. Igwe ezi ahụ niile, ọnụọgụgụ ha ruru puku abụọ, gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri dakpuo nʼime osimiri ebe mmiri riri ha niile.
14 Na wale waliokuwa wakiwalisha nguruwe walikimbia na kutoa taarifa ya kilichotokea katika mji na katika nchi. Ndipo watu wengi walitoka kwenda kuona kilichotokea.
Ndị na-elekọta igwe ezi ahụ gbaara ọsọ laa, kọsaa ihe mere nʼime obodo nakwa nʼala ahụ niile. Nʼihi nke a, ọtụtụ mmadụ pụtara ilere ihe mere.
15 Ndipo walikuja kwa Yesu na walimwona mtu aliyepagawa na pepo—aliyekuwa na Jeshi—amekaa chini, amevikwa, na akiwa katika akili yake timamu, nao waliogopa.
Ha bịakwutere Jisọs, hụ nwoke ahụ nke igwe mmụọ ọjọọ bibu nʼime ya. O yi uwe, nọdụ ala, bụrụkwa onye uche ya zuruoke; egwu jidere ha.
16 Wale waliokuwa wameona kilichotokea kwa mtu aliyekuwa amepagawa na pepo waliwaambia kilichotokea kwake na pia kuhusu nguruwe.
Ndị hụrụ ihe mere kọọrọ ihe niile mere nwoke ahụ mmụọ ọjọọ bibu nʼime ya. Ha kọkwaara ihe mere igwe ezi ndị ahụ.
17 Nao walianza kumsihi aondoke katika mkoa wao.
Mgbe ahụ, ha bidoro ịrịọ Jisọs ka ọ pụọra ha nʼakụkụ ala ha.
18 Na alipokuwa akiingia ndani ya mtumbwi, mtu aliyekuwa amepagawa na mapepo alimsihi kwamba aende pamoja naye.
Dị ka ọ na-achọ ịbanye nʼime ụgbọ, nwoke ahụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ bibu nʼime ya rịọrọ ya ka o soro ha.
19 Lakini hakumruhusu, lakini alimwambia, “Nenda nyumbani kwako na kwa watu wako, na uwaambie alikufanyia Bwana, na rehema aliyokupa.”
Ma Jisọs ekweghị, kama ọ sịrị ya, “Laa nʼụlọ, lakwuru ndị enyi gị, kọọrọ ha ihe ọma Onyenwe anyị meere gị, na otu o si meere gị ebere.”
20 Hivyo alienda na alianza kutangaza mambo makuu ambayo Yesu amefanya kwake katika Dekapoli, na kila mmoja alistaajabu.
Ya mere, o si nʼebe ahụ pụọ, malitekwa ịkọsa nʼime mpaghara Dekapọlịs ihe ọma Jisọs meere ya. Ihe a juru mmadụ niile anya.
21 Na wakati Yesu alipovuka tena upande mwingine, ndani ya mtumbwi, umati mkubwa ulikusanyika kumzunguka, alipokuwa kando ya bahari.
Mgbe Jisọs jiri ụgbọ mmiri gafee nʼakụkụ nke ọzọ, ọtụtụ igwe mmadụ zukọrọ gbaa ya gburugburu mgbe ọ nọ nʼakụkụ osimiri.
22 Na mmoja wa kiongozi wa sinagogi, aliyeitwa Yairo, alikuja, na alipomwona, alianguka miguuni pake.
Ma otu nʼime ndịisi ụlọ ekpere nke aha ya bụ Jairọs bịara, mgbe ọ hụrụ ya, ọ dara nʼala nʼụkwụ ya,
23 Akamsihi zaidi na zaidi, akisema, “Binti yangu mdogo anakaribia kufa. Ninakusihi, njoo na uweke mikono yako juu yake ili kwamba aweze kupata afya na kuishi.”
rịọsie ya arịrịọ ike sị, “Ada m nwanyị nke nta nọ nʼọnụ ọnwụ ugbu a. Biko, bịa ka ị bikwasị ya aka gị ka agwọ ya, ka ọ dịkwa ndụ.”
24 Hivyo alikwenda pamoja naye, na umati mkubwa ulimfuata nao walimzonga karibu wakimzunguka.
Ya mere, Jisọs soro ya gawa. Oke igwe mmadụ sokwa ya na-akpagbu ya.
25 Kulikuwa na mwanamke ambaye damu yake ilikuwa imetoka kwa miaka kumi na miwili.
Ma otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ.
26 Aliteseka vya kutosha chini ya matabibu wengi na alitumia kila kitu alichokuwa nacho. Hata hivyo hakusaidika kwa chochote, lakini badala yake alizidi kuwa na hali mbaya.
Ọ taala ahụhụ dị ukwuu nʼaka ndị dibịa, mefukwaa ihe niile o nwere. Ma kama ọrịa ya ịdị mma, ọ na-aga nʼihu ịdị njọ.
27 Alisikia habari kuhusu Yesu. Hivyo alikuja nyuma yake wakati alipokuwa akitembea ndani ya umati, naye aliligusa vazi lake.
Ebe ọ nụrụla akụkọ banyere Jisọs, o sooro igwe mmadụ ndị ahụ, sitere nʼazụ metụ uwe ya aka.
28 Kwa kuwa alisema, “Kama nikiyagusa mavazi yake tu, nitakuwa mzima.”
Nʼihi na o kwuolarị nʼime obi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m enwe ike metụ naanị uwe ya aka, a ga-agwọkwa m.”
29 Alipomgusa, kutokwa damu kulikoma, na alijisikia katika mwili wake kwamba aliponywa kutoka kwenye mateso yake.
Ngwangwa oruru ọbara ya kwụsịrị. Ọ matakwara nʼime onwe ya na ya enwerela onwe ya site nʼọrịa ya.
30 Na ghafla Yesu aligundua ndani yake mwenyewe kwamba nguvu zimemtoka. Na aligeuka huku na huku katika umati wa watu na kuuliza, “Ni nani aliyeligusa vazi langu?”
Nʼotu oge ahụ Jisọs matara na ike esitela ya nʼahụ pụọ. Ọ tụgharịrị gburugburu nʼetiti igwe mmadụ ahụ jụọ sị, “Onye metụrụ uwe m aka?”
31 Wanafunzi wake walimwambia, “Unaona umati huu umekusonga ukikuzunguka, nawe wasema, 'Ni nani aliyenigusa?'”
Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Lee ọtụtụ igwe mmadụ gbara gị gburugburu, i sikwa aṅaa na-ajụ, ‘Onye metụrụ uwe m aka?’”
32 Lakini Yesu alitazama huku na huku kuona ambaye aliyekuwa amefanya hili.
Ma Jisọs gara nʼihu na-ele anya gburugburu ịhụ onye mere ya.
33 Mwanamke, akijua kilichotokea kwake, aliogopa na kutetemeka. Alikuja na alianguka chini mbele yake na kumwambia ukweli wote.
Ma nwanyị ahụ, ebe ọ matara ihe mere nʼahụ ya, bịara nʼegwu nʼịma jijiji daa nʼụkwụ ya, gwa ya eziokwu niile.
34 Alisema kwake, “Binti, imani yako imekufanya uwe mzima. Enenda kwa amani na uponywe kutoka kwenye ugonjwa wako.”
Ọ sịrị ya, “Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo nwerekwa onwe gị site nʼọrịa gị.”
35 Alipokuwa akizungumza, baadhi ya watu walikuja kutoka kwa kiongozi wa Sinagogi, wakisema, “Binti yako amekufa. Kwa nini kuendelea kumsumbua mwalimu?”
Mgbe ọ ka nọ na-ekwu okwu, ụfọdụ ndị mmadụ sitere nʼụlọ onyeisi ụlọ ekpere bịara sị, “Ada gị nwanyị anwụọla, olee ihe mere i ji esogbu onye ozizi a ọzọ?”
36 Lakini Yesu aliposikia ambacho walikisema, alimwambia kiongozi wa Sinagogi, “Usiogope. Amini tu.”
Ma ka ọ nụrụ ihe ha kwuru, Jisọs gwara onyeisi ụlọ ekpere ahụ sị ya, “Atụla egwu, naanị kwere.”
37 Hakumruhusu yeyote kuongozana naye, isipokuwa Petro, Yakobo, na Yohana, ndugu yake Yakobo.
O kweghị ka onye ọbụla ọzọ soro ya ma ọ bụghị Pita, na Jemis na Jọn nwanne Jemis.
38 Walikuja nyumbani kwa kiongozi wa Sinagogi naye aliona vurugu, kulia kwingi na kuomboleza.
Mgbe ha bịarutere nʼụlọ onyendu ụlọ ekpere ahụ, ọ nụrụ ụzụ hụkwa ọtụtụ mmadụ ka ha nọ na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa.
39 Alipoingia nyumbani, aliwaambia, “Kwa nini mmesikitika na kwa nini mnalia? Mtoto hajafa bali amelala.”
Mgbe ọ batara, ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa? Nwatakịrị a anwụghị anwụ, ọ na-arahụ ụra!”
40 Walimcheka, lakini yeye, aliwatoa wote nje, alimchukua baba wa mtoto na mama na wale waliokuwa pamoja naye, na aliingia ndani alimokuwa mtoto.
Ma ha chịrị ya ọchị. Mgbe ọ chụpụsịrị ha niile nʼezi, ọ kpọọrọ nne na nna nwantakịrị ahụ, na ndị ya na ha so, banye nʼime ụlọ ebe nwantakịrị ahụ dina.
41 Aliuchukua mkono wa mtoto na alimwambia, “Talitha koum,” ambayo ni kusema, “Binti mdogo, nakuambia, amka.”
O jidere ya nʼaka sị ya, “Talita koum!” (nke pụtara, “Nwa agbọghọ nta, asị m gị bilie!”).
42 Ghafla mtoto aliamka na kutembea (kwa kuwa alikuwa na umri wa miaka kumi na miwili). Na ghafla walishikwa na mshangao mkubwa.
Otu mgbe ahụ nwaagbọghọ nta ahụ biliri ọtọ bido ijegharị (ọ gbara afọ iri na abụọ). Nke a jụrụ ha niile anya nke ukwuu.
43 Aliwaamuru kwa nguvu kwamba hakuna yeyote anapaswa kujua kuhusu hili. Na aliwaambia wampatie yule binti chakula.
Ma ọ dọsiri ha aka na ntị ike, ka ha ghara ịgwa onye ọbụla ihe mere. Ọ sịrị ha, “Nyenụ ya nri ka o rie.”