< Malaki 1 >

1 Tamko la neno la Bwana kwa Israeki kwa mkono wa Malaki.
Okwu amụma: Nke a bụ okwu Onyenwe anyị gwara Izrel site nʼọnụ Malakaị onye amụma.
2 “Nilikupenda, “asema Bwana. Lakini unasema, “kwa jinsi gani ulitupenda?” Esau siyo ndugu yake Yakobo?” asema Bwana. “Na bado nampenda Yakobo,
“Ahụla m unu nʼanya,” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “Ma unu na-asị, ‘Olee ụzọ i si hụ anyị nʼanya?’ “Ịsọ, ọ bụghị nwanne Jekọb?” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ma otu ọ dị, ahụrụ m Jekọb nʼanya,
3 lakini nimemchukia Esau. nimeifanya milima yake kuwa ukiwa, na nimepafanya urithi wake kuwa makao ya mbweha wa jangwani.”
ma Ịsọ ka m kpọrọ asị, mee ugwu ya niile ka ha ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu, werekwa ihe nketa ya nye nkịta ọhịa niile nke ọzara.”
4 Kama Edomu husema, “Tumepigwa, lakini tutarudi na kujenga palipoharibiwa; “Bwana wa Majeshi asama hivi, “Watajenga lakini nitaiangusha chini; na wanaume watawaita 'Nchi ya uovu', na 'Watu ambao ambao Mungu ana hasira nao milele.”'
Ndị Edọm nwere ike sị, “Ọ bụ ezie na e tikpọọla anyị, ma anyị ga-ewugharị nkpọnkpọ ebe niile.” Ma otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu, “Ha nwere ike wugharịa ya, ma aga m akwadakwa ha ọzọ. Nʼihi na a ga-akpọ ha Obodo ihe ọjọọ, ndị Onyenwe anyị na-eweso iwe ruo mgbe ebighị ebi.
5 kwa macho yenu mtaona hili, na mtasema, “Bwana ni mkuu mbele ya mipaka ya Israel.”
Anya unu ga-ahụ nke a ma unu ga-ekwukwa, ‘Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ bụladị ruo nʼofe oke ala Izrel!’”
6 mtoto amtiibaba yake, na mtumwa amtii bwana wake. ikiwa mimi, ni baba, iko wapi heshima yangu? na kama mimi ni bwana, iko wapi heshima yangu? Bwana wa majeshi asema hivi kwenu, makuhani, mnaodharau jina langu. lakini mnasema, 'tumeridharauje jina lako?
“Nwa na-asọpụrụ nna ya, ohu na asọpụrụkwa onyenwe ya. A sị na m bụ nna, ebee ka egwu m dị. A sị na m bụ onyenwe mmadụ, ebee ka nsọpụrụ m dị?” Ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. “Ọ bụ unu ndị nchụaja na-eleda aha m anya. “Ma unu na-ajụ, ‘Olee ụzọ anyị si eleda aha gị anya?’
7 kwa kutoa mikate iliyonajisi madhabahuni kwangu. Na mnasema kuwa, 'Tumekuradhau kwa namna gani?' Kwa kusema hivyomeza ya Bwana imedharauliwa.
“Unu na-eji anụ rụrụ arụ na-achụrụ m aja nʼelu ebe ịchụ aja m. “Ma unu na-ajụ, ‘Olee ụzọ anyị si merụọ ya?’ “Ọ bụ mgbe unu na-asị na tebul Onyenwe anyị bụ ihe e kwesiri ileda anya.
8 Mkitoa sadaka ya wanyama vipofu, hiyo siyo dhambi? na kama mkitoa vilema na wagonjwa, hiyo siyo dhambi? pelekeni hili kwa liwali; atawakubali au atainua nyuso zetu?” asema Bwana wa Majeshi.
Mgbe unu ji anụ ndị kpuru ìsì achụrụ m aja, ọ bụghị ihe na-ezighị ezi ka unu na-eme? Mgbe unu na-ejikwa ndị dara ngwụrọ, na anụ na-arịa ọrịa, ọ bụghị ihe ọjọọ ka unu na-eme? Werenụ anụ ndị a bugara onye na-achị obodo unu dịka onyinye. Ọ ga-atọ ya ụtọ ịnabata onyinye dị otu a? Ọ ga-anabata unu?” Ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
9 Na sasa, mnajaribu kutafuta neema ya Mungu, ili kwamba awe mwema kwetu. “Na aina gani ya sadaka kwa sehemu yenu, ataziinua nyuso zenu? asema Bwana wa Majeshi.
“Ma ugbu a, rịọọnụ Chineke ka o gosi anyị amara ya. Ọ bụrụ na unu ji onyinye ndị dị otu a nʼaka unu, ọ ga-egosi unu afọ ọma ya?” Ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
10 Kama kungekuwa na mtu ambaye angefunga lango la Hekalu, ili kwamba kusewe na mto madhabahuni bure! lakini sina radhi na ninyi, “asema Bwana wa majeshi, “na sitaikubali sadaka yeyote kutoka katika mikono yenu.
“Ọ gaara adị m nnọọ mma ma a sị na otu onye nʼime unu ga-emechi ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ, ka unu gharakwa ịkwanye ọkụ na-enweghị isi nʼelu ebe ịchụ aja m. Ihe banyere unu adịghị atọ m ụtọ. Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. Agaghị m anabatakwa onyinye ọbụla si unu nʼaka.
11 Kutoka mawio ya jua mpaka machweo jina langu litakuwa kuu katikati ya mataifa; katika kila sehemu uvumba utatolewa katika jina langu, na pia sadaka safi. Kwa sababu jina langu likuwa kuu sana katikatik ya mataif,” asema Bwana wa majeshi.
Nʼihi na site nʼọwụwa anyanwụ ruo ọdịda ya, aha m ga-adị ukwuu nʼetiti mba niile. A ga-ewebatara m ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na onyinye dị ọcha nʼaha m, nʼebe niile, nʼihi na aha m ga-adị ukwuu nʼetiti mba niile.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
12 “lakini ninyi mnachafua mnaposema meza ya Bwana mnainajisi, na matunda yake, na chakula chake kudharauka.
“Ma unu na-eme ka ọ ghara ịdị nsọ mgbe unu na-asị na, Tebul Onyenwe anyị bụ ihe e merụrụ emerụ, ebe ihe oriri ya bụkwa ihe nlelị.
13 Na ninyi pia mwasema, 'jambo hili limetuchosha, nanyi mnalidharau, “asema Bwana wa majeshi. “Mmerudisha kilichokuwa kimechukuliwa na wanyama wa mwitu au vilema au walio wagonjwa; na ndicho mnaleta kuwa sadaka zenu! Je naweza kuikubali hii mikononi mwenu?” asema Bwana.
Unu na-ekwukwa, ‘Nke a bụ ihe ike ọgwụgwụ,’ si otu a na-eduli imi unu elu nʼebe m nọ nʼọnọdụ oke nlelị.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. “Mgbe unu na-ewebata ihe a natara nʼike, na nke dara ngwụrọ, na nke na-arịa ọrịa, jiri ha chụọrọ m aja, o kwesiri ka m nabata ya?” Ka Onyenwe anyị na-ekwu.
14 Alaniwe alye mdanganyifu, ambaye anaye mnyama dume katika kundi lake ana akaahidi kunitolea, lakini bado anatoa kwangu, mimi Bwana, ambayo ni kiujanja ujanja; kwa kuwa mimi ni mfalme mkuu,” asema Bwana wa Majeshi, “na jina langu litaogopwa katika mataifa.”
“Onye a na-abụ ọnụ ka onye aghụghọ ahụ bụ nke nwere oke nʼigwe ewu na atụrụ ya, kwee nkwa inye ya, ma mesịa were anụ nwere ntụpọ chụọrọ Onyenwe anyị aja. Nʼihi na mụ onwe m bụ Eze ukwu ahụ,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “aha m bụkwa ihe a ga-atụ egwu nʼetiti mba dị iche iche.

< Malaki 1 >