< Luka 18 >
1 Kisha akawaambia mfano wa namna wanavyopaswa kuomba daima, na wasikate tamaa.
Mgbe ahụ ọ tụụrụ ha ilu a iji gosi ha mkpa ọ dị ikpe ekpere na-esepụghị aka,
2 akaisema, 'Kulikuwa na hakimu katika mji fulani, ambaye hakuwa anamwogopa Mungu na hakuwaheshimu watu.
ọ sịrị, “O nwere otu ọkaikpe bi nʼotu obodo ma ọ naghị atụ egwu Chineke. Ọ naghị asọpụkwara mmadụ.
3 Kulikuwa na mjane katika jiji hilo, naye alimwendea mara nyingi, akisema, 'Nisaidie kupata haki dhidi ya mpinzani wangu.'
Nʼobodo ahụkwa, e nwere otu nwanyị di ya nwụrụ anwụ nke na-abịakwute ya, na-asị ya, ‘Kpepụta m nʼaka ndị na-emegide m.’
4 Kwa muda mrefu hakuwa tayari kumsaidia, lakini baada ya muda akasema moyoni mwake, `Ingawa mimi simwogopi Mungu au kuheshimu mtu,
“Na mmalite, ọ chọghị, ma nʼikpeazụ, ọ gwara onwe ya sị, ‘Ọ bụ eziokwu na anaghị m atụ egwu Chineke maọbụ sọpụrụ mmadụ.
5 lakini kwa vile huyu mjane ananisumbua nitamsaidia kupata haki yake, ili asije akanichosha kwa kunijia mara kwa mara. ''
Ma nʼihi na nwanyị a di ya nwụrụ anwụ nọgidere na-enye m nsogbu, aga m ahụ na o nwetara ikpe ziri ezi, ka ọ kwụsị inye m nsogbu site na ọbịbịa ọ na-abịa.’”
6 Kisha Bwana akasema, 'Sikiliza alivyosema huyo hakimu dhalimu.
Ya mere Onyenwe anyị sịrị, “Gerenụ ihe ọkaikpe nke na-eme ajọ omume na-ekwu.
7 Je Mungu pia hataleta haki kwa wateule wake ambao wanamlilia mchana na usiku? Je, yeye hatakuwa mvumilivu kwao?
Ọ bụ na Chineke agaghị ekpepụta ndị ahụ ọ họpụtara, bụ ndị na-akpọku ya ehihie na abalị? Ọ ga-anọ tee anya nʼinyere ha aka?
8 Nawaambia kwamba ataleta haki kwao upesi. Lakini wakati Mwana wa Adamu atakapokuja, je, atakuta imani duniani? '
Asị m unu, ọ ga-eme ngwangwa hụ na ha nwetara ikpe ziri ezi. Ma otu ọ dị, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa, ọ ga-ahụkwa ndị nwere okwukwe nʼime ụwa?”
9 Ndipo akawaambia mfano huu kwa baadhi ya watu ambao wanajiona wenyewe kuwa wenye haki na kuwadharau watu wengine,
Ọ tụkwara ilu a nʼihi ndị tụkwasịrị obi nʼonwe ha na ha bụ ndị ezi omume ma na-eleda ndị ọzọ anya.
10 'Watu wawili walipanda kwenda hekaluni kusali: mmoja Mfarisayo mwingine mtoza ushuru.
“Ụmụ nwoke abụọ rigoro nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere, otu onye nʼime ha bụ onye Farisii, onye nke ọzọ bụ onye ọna ụtụ.
11 Farisayo akasimama akaomba mambo haya juu yake mwenyewe, 'Mungu, nakushukuru kwa vile mimi si kama watu wengine ambao ni wanyang'anyi, watu wasio waadilifu, wazinzi, au kama huyu mtoza ushuru.
Onye Farisii ahụ guzoro ọtọ kpee ekpere banyere onwe ya sị, ‘Chineke nna m, ana m ekele gị nʼihi na adịghị m ka mmadụ ndị ọzọ ndị na-apụnara mmadụ ihe ya nʼike, maọbụ ndị ajọ omume, maọbụ ndị na-akwa iko, ma ọ bụkwanụ dị ka onye ọna ụtụ a.
12 Nafunga mara mbili kila wiki. Natoa zaka katika mapato yote ninayopata. '
Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ nʼizu ụka ọbụla. Ana m akwụkwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile m nwetara.’
13 Lakini yule mtoza ushuru, alisimama mbali, bila hakuweza hata kuinua macho yake mbinguni, akagonga kifua chake akisema, 'Mungu, nirehemu mimi mwenye dhambi.'
“Ma onye ọna ụtụ ahụ guzo nʼebe dị anya, o nwekwaghị ike iweli ihu ya elu lee anya nʼeluigwe. Kama, ọ na-eti aka nʼobi ya na mwute na-asị, ‘Chineke, biko mere m ebere nʼihi na abụ m onye mmehie.’
14 Nawaambia, mtu huyu alirudi nyumbani akiwa amehesabiwa haki kuliko yule mwingine, kwa sababu kila ajikwezaye atashushwa, lakini kila mtu anayejinyenyekeza atainuliwa. '
“Asị m unu, na nwoke a lara nʼụlọ ya bụrụ onye a gụrụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke karịa onye nke ọzọ. Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda, ma onye ọbụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”
15 Watu walimletea watoto wao wachanga, ili aweze kuwagusa, lakini wanafunzi wake walipoona hayo, wakawazuia.
Ndị mmadụ na-ekutere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, ha baara ha mba.
16 Lakini Yesu akawaita kwake akisema, 'Waacheni watoto wadogo waje kwangu, wala msiwazuie. Maana ufalme wa Mungu ni wa watu kama hao.
Ma Jisọs kpọrọ ha ka ha bịakwute ya, sị, “Kweenụ ka ha bịakwute m, unu egbochikwala ha, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị ka ha.
17 Amin, nawaambia, mtu yeyote asiyeupokea ufalme wa Mungu kama mtoto ni dhahiri hatauingia. '
Nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla na-agaghị anara alaeze Chineke dị ka nwantakịrị agaghị aba nʼime ya.”
18 Mtawala mmoja akamwuliza, akisema, 'Mwalimu mwema, nifanye nini ili niurithi uzima wa milele?' (aiōnios )
Otu onye ọchịchị jụrụ ya sị, “Ezi onye ozizi, ọ bụ gịnị ka m ga-eme keta ndụ ebighị ebi.” (aiōnios )
19 Yesu akamwambia, 'Kwa nini unaniita mwema? Hakuna mtu aliye mwema, ila Mungu peke yake.
Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji akpọ m ezi mmadụ? Ọ dịghị onye ọbụla bụ ezi mmadụ ma ọ bụghị naanị Chineke.
20 Unazijua amri- usizini, usiue, Usiibe, usishuhudie uongo, waheshimu baba yako na mama yako.
Ị maara ihe niile enyere nʼiwu, akwala iko, egbula mmadụ, ezula ohi, agbala ama ụgha, sọpụrụ nne na nna gị.”
21 Yule mtawala akasema, 'Mambo haya yote nimeyashika tangu nilipokuwa kijana.'
Ọ sịrị, “Edebezuchaala m iwu ndị a niile site na mgbe m bụ nwata.”
22 Yesu alipoyasikia hayo akamwambia, '“Umepungukiwa jambo moja. Lazima uuze vyote ulivyonavyo na uwagawie maskini, nawe utakuwa na hazina mbinguni -kisha njoo, unifuate. '
Mgbe Jisọs nụrụ nke a, ọ sịrị ya, “Otu ihe fọdụrụ ka ime: ree ihe niile i nwere, kesara ụmụ ogbenye ego ya. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, bịazie soro m.”
23 Lakini tajiri aliposikia hayo, alihuzunika sana, kwa sababu alikuwa tajiri sana.
Mgbe ọ nụrụ nke a, o wutere ya nke ukwuu, nʼihi na ọ bụ onye nwere ọtụtụ akụ.
24 Kisha Yesu, akamwona alivyohuzunika sana akasema, 'Jinsi gani itakavyokuwa vigumu kwa matajiri kuingia katika Ufalme wa Mungu!
Jisọs lere ya anya sị, “Lee ka o si bụrụ ihe siri ike bụ ndị ọgaranya ịba nʼalaeze Chineke.
25 Maana ni rahisi sana kwa ngamia kupita katika tundu la sindano, kuliko kwa tajiri kuingia katika Ufalme wa Mungu. '
Nʼezie, ọ dịrị ịnyịnya kamel mfe isite nʼanya agịga gafee karịa ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.”
26 Wale waliosikia hayo, wakasema, 'Nani basi, atakayeweza kuokolewa?'
Ndị nụrụ ya sịrị, “Onye kwanụ ka a ga-azọpụta?”
27 Yesu akajibu, 'Mambo yasiyowezekana kwa mwanadamu kwa Mungu yanawezekana.”
Ọ sịrị, “Ihe mmadụ na-apụghị ime, bụ ihe Chineke pụrụ ime.”
28 Petro akasema, 'Naam, sisi tumeacha kila kitu na tumekufuata wewe. '
Mgbe ahụ Pita sịrị, “Lee, anyị ahapụla ihe niile anyị nwere soro gị!”
29 Kisha Yesu akawaambia, Amin, nawaambia kwamba hakuna mtu aliyeacha nyumba, au mke, au ndugu, au wazazi au watoto, kwa ajili ya Ufalme wa Mungu,
Ọ sịrị ha, “Nʼezie, agwa m unu, o nweghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ nwunye, maọbụ ụmụnne, maọbụ ndị mụrụ ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, nʼihi alaeze Chineke
30 ambaye hatapokea mengi zaidi katika ulimwengu huu, na katika ulimwengu ujao, uzima wa milele. ' (aiōn , aiōnios )
nke na-agaghị anata ihe ndị a nʼọgbọ a, nwekwa ndụ ebighị ebi nʼọgbọ nke na-abịa.” (aiōn , aiōnios )
31 Baada ya kuwakusanya wale kumi na wawibili, akawaambia, 'Tazama, tunapanda kwenda Yerusalemu, na mambo yote ambayo yameandikwa na manabii kuhusu Mwana wa Adamu yatakamilishwa.
Jisọs kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nʼakụkụ, gwa ha sị, “Anyị na-aga Jerusalem, ihe niile ndị amụma dere banyere Nwa nke Mmadụ ga-emezu.
32 Kwa maana atatiwa mikononi mwa watu wa Mataifa na atatendewa dhihaka na jeuri, na kutemewa mate.
A ga-arara ya nyefee ya nʼaka ndị mba ọzọ. Ha ga-akwa ya emo, mee ya ihe ihere, bụkwaa ya ọnụ mmiri asụ.
33 Baada ya kumchapa viboko watamwua na siku ya tatu atafufuka. '
Ha ga-apịa ya ihe, gbukwaa ya; ma nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-esite nʼọnwụ bilie ọzọ.”
34 Hawakuelewa mambo haya, na neno hili lilikuwa limefichwa kwao, na hawakuelewa mambo yaliyosemwa.
Ma ha aghọtaghị ihe ọbụla nʼokwu ndị a. E mere ka nkọwa okwu ndị a bụrụ ihe e zoro ezo nʼebe ha nọ, ha aghọtakwaghị ihe o kwuru.
35 Ikawa Yesu ulipokaribia Yeriko, mtu mmoja kipofu alikuwa ameketi kando ya barabara akiomba msaada,
O ruo ka ọ bịaruru Jeriko nso, otu nwoke kpuru ìsì nọ nʼakụkụ ụzọ na-arịọ arịrịọ.
36 aliposikia umati wa watu ukipita aliuliza nini kinatokea.
Mgbe ọ nụrụ uzu igwe mmadụ ka ha na-agafe, ọ jụrụ ihe na-eme.
37 Wakamwambia kwamba Yesu wa Nazareti anapita.
Ha gwara ya, “Jisọs onye Nazaret na-agafe.”
38 Hivyo yule kipofu akalia kwa sauti, akisema, 'Yesu, Mwana wa Daudi, unirehemu.'
O tiri mkpu sị, “Jisọs nwa Devid, meere m ebere!”
39 wale waliokuwa wakitembea walimkemea huyo kipofu, wakamwambia anyamaze. Lakini yeye akazidi kulia kwa sauti, 'Mwana wa Daudi, unirehemu.
Ndị bu ụzọ baara ya mba ka o mechie ọnụ. Ma o tisiri mkpu ike sị, “Nwa Devid, meere m ebere!”
40 Yesu akasimama akaamuru mtu yule aletwe kwake. Kisha yule kipofu alipomkaribia, Yesu akamwuliza,
Jisọs kwụsịrị, nye iwu ka a kpọtara ya nwoke ahụ. Mgbe o rutere nso, ọ jụrụ ya,
41 'Unataka nikufanyie nini?' Akasema, 'Bwana, nataka kuona.'
“Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Ọ sịrị, “Onyenwe anyị, ka e mee ka m hụ ụzọ ọzọ.”
42 Yesu akamwambia, 'Upate kuona. Imani yako imekuponya. '
Jisọs sịrị ya, “Hụ ụzọ, okwukwe gị agwọọla gị.”
43 Mara hiyo akapata kuona, akamfuata Yesu akimtukuza Mungu. Walipoona hili, watu wote wakamsifu Mungu.
Ngwangwa, o bidoro ịhụ ụzọ ma soro Jisọs, na-etokwa Chineke. Ndị mmadụ niile, mgbe ha hụrụ ya tokwara Chineke.