< Luka 13 >
1 Kwa wakataihuo huo, kulikuwa na baadhi watu waliomtaarifu juu ya Wagalilaya ambao Pilato aliwaua na kuchanganya damu yao na sadaka zao.
Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị nọ nʼebe ahụ gwara ya banyere ndị Galili ahụ Pailet jiri ọbara ha gwakọta nʼaja ha chụrụ.
2 Yesu akajibu na kuwaambia, “Je mwadhani kuwa Wagalilaya hao walikuwa na dhambi kuliko Wagalilaya wengine wote ndiyo maana wamepatwa na mabaya hayo?
Ọ zara sị ha, “Unu chere na ndị Galili a tara ụdị ahụhụ a bụ ndị mmehie karịa ndị Galili niile?
3 Hapana, nawaambia, lakini msipotubu, nanyi mtaangamia vivyo hivyo.
Mba! Asị m unu, ọ bụrụ na unu echegharịghị, unu niile ga-esi otu ahụ laa nʼiyi.
4 Au wale watu kumi na nane katika Siloamu ambao mnara ulianguka na kuwaua, mnafikiri wao walikuwa wenye dhambi zaidi kuliko watu wengine katika Yerusalemu?
Ka unu chere na mmadụ iri na asatọ ahụ, ndị mgbidi aja ụlọ elu Sailọm dagburu bụ ndị ikpe mmehie mara karịa ndị niile bi na Jerusalem?
5 Hapana, mimi nasema, lakini kama msipotubu, ninyi nyote pia mtaangamia.
Mba! Asị m unu, ọ bụrụ na unu echegharịghị, unu niile ga-ala nʼiyi dị ka ha.”
6 Yesu aliwaambia mfano huu, “Mtu mmoja alikuwa na mtini umepandwa katika shamba lake na alikwenda kutafuta matunda juu yake lakini hakupata.
Ya mere, ọ tụụrụ ha ilu a sị, “Otu nwoke kụrụ osisi fiig nʼubi vaịnị ya, ma mgbe ọ bịara chọọ nʼelu ya, ma ọ hụghị mkpụrụ ọbụla.
7 Akamwambia mtunza bustani, 'Tazama, kwa miaka mitatu nimekuja na kujaribu kutafuta matunda kwenye mtini huu lakini sikupata. Uukate. Kwani ulete uharibifu wa ardhi?
Ya mere, ọ gwara onye ọrụ ubi ya sị, ‘Nʼime afọ atọ ndị a ka m bịara ka m ghọrọ mkpụrụ site nʼosisi fiig a, ma ahụghị m mkpụrụ ọbụla. Gbutuo ya! Gịnị mere ọ ga-eji na-erikọ nri dị nʼala ubi a?’
8 Mtunza bustani akajibu na kusema, 'uache mwaka huu ili niupalilie na kuweka mbolea juu yake.
“Ọ zara sị ya, ‘Nna m ukwu, hapụkwa ya nʼafọ a, ka m gwuo ala gburugburu, hinye ya aja nri ala nʼukwu.
9 Kama ukizaa matunda mwaka ujao, ni vema; lakini kama hautazaa, uukate!”'
Ọ bụrụ na ọ mịa mkpụrụ nʼafọ ọzọ, ọ dị mma, ọ bụrụkwa na ọ mịghị, i nwere ike gbutuo ya.’”
10 Sasa Yesu alikuwa akifundisha katika mojawapo ya Masinagogi wakati wa Sabato.
Nʼụbọchị izuike ndị Juu, ọ banyere nʼime otu ụlọ ekpere na-ezi ihe.
11 Tazama, alikuwepo mama mmoja ambaye kwa miaka kumi na minane alikuwa na rohomchafu wa udhaifu, na yeye alikuwa amepinda na hana uwezo kabisa wa kusimama.
Otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye mmụọ nrịa nrịa mere ka ahụ ghara ị dị ya ike afọ iri na asatọ. Ọ na-ehu ehu, o nwekwaghị ike iguzo ọtọ kwem.
12 Yesu alipomwona, alimwita, akamwambia, “Mama, umewekwa huru kutoka kwenye udhaifu wako.”
Mgbe Jisọs hụrụ ya, ọ kpọrọ ya sị ya, “Nwanyị emeela ka i nwere onwe gị site nʼọrịa gị.”
13 Akaweka mikono yake juu yake, na mara mwili wake akajinyoosha na akamtukuza Mungu.
Mgbe o bikwasịrị ya aka, ngwangwa, o guzooro kwem malite na-eto Chineke.
14 Lakini mkuu wa sinagogi alikasirika kwa sababu Yesu alikuwa amemponya siku ya Sabato. Hivyo mtawala akajibu akawambia makutano, “Kuna siku sita ambazo ni lazima kufanya kazi. Njoni kuponywa basi, si katika siku ya Sabato. '
Ma onyendu ụlọ ekpere ahụ were iwe nke ukwuu nʼihi na Jisọs gwọrọ ọrịa nʼụbọchị izuike. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “E nwere ụbọchị isii nʼime izu ụka mgbe mmadụ kwesiri ịrụ ọrụ. Ya mere, bịanụ ka a gwọọ unu nʼụbọchị ndị a, ọ bụghị nʼụbọchị izuike.”
15 Bwana akamjibu na akasema, “wanafiki! Hakuna kila mmoja wenu kufungua punda wako au ng'ombe kutoka zizini na kuwaongoza kumpeleka kunywa siku ya Sabato?
Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Unu ndị ihu abụọ! Ọ dị onye nʼime unu na-adịghị atọpụ oke ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, site nʼụlọ anụmanụ, kpụpụ ya ebe ọ ga-aṅụ mmiri nʼụbọchị izuike?
16 Hivyo pia binti wa Abrahamu, ambaye Shetani amemfunga kwa miaka kumi na minane, je haikumpasa kifungo chake kisifunguliwe siku ya sabato?”
O kwesighị ka a tọpụ nwanyị a bụ ada Ebraham nʼagbụ ekwensu kere ya ogologo afọ iri na asatọ, nʼụbọchị izuike, mee ka o nwere onwe ya?”
17 Alipokuwa akisema maneno hayo, wale wote waliompinga waliona aibu, bali makutano wote wa wengine walishangilia kwa ajili ya mambo ya ajabu aliyotenda.
Mgbe o kwuru nke a, ihere mere ndị iro ya niile, ma ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọrụ ebube niile ọ na-arụ.
18 Yesu akasema, “Ufalme wa Mungu unafanana na nini, na naweza kuulinganisha na nini?
Ya mere, ọ na-ekwu sị, “Gịnị ka alaeze Chineke yiri? Gịnịkwa ka m ga-eji tụnyere ya?
19 Ni kama mbegu ya haradari aliyoitwaa mtu mmoja na kuipanda shambani mwake, na ikamea ikawa mti mkubwa, na ndege wa mbinguni wakajenga viota vyao katika matawi yake.
O yiri mkpụrụ mọstaadị nke mmadụ kụrụ nʼubi ya a gbara ogige. O toro ghọọ osisi, nke ụmụ nnụnụ na-ezukwa ike nʼalaka ya.”
20 Tena akasema, “Niufananishe na nini ufalme wa Mungu?
Ọzọ, ọ sịrị, “Gịnị ka m ga-eji tụnyere alaeze Chineke?
21 Ni kama chachu ambayo mwanamke aliichukua na kuchanganyakwenye vipimo vitatu vya unga hata ukaumuka.”
Ọ dị ka ihe na-eko achịchanke nwanyị gwakọtara na ọtụtụ atọ nke ụtụ ọka, tutu ruo mgbe o koro ụtụ ọka ahụ niile.”
22 Yesu alitembelea kila mji na kijiji njiani akielekea Yerusalemu na kuwafundisha.
O jegharịrị nʼobodo ukwu na nʼobodo nta niile na-ezi ihe, ka ọ na-aga Jerusalem.
23 Mtu mmoja akauliza, “Bwana, ni watu wachache tu watakaookolewa?” Hivyo akawaambia,
Otu onye sịrị ya, “Onyenwe m, ndị a ga-azọpụta ha ga-adị ole na ole?” Ọ sịrị ha,
24 “Jitahidi kuingia kwa kupitia mlango mwembamba, kwa sababu wengi watajaribu na hawataweza kuingia.
“Gbalịsienụ ike banye site nʼọnụ ụzọ dị warawara, nʼihi na ana m a gwa unu na ọtụtụ ga-achọ ịbanye ma ha agaghị enwe ike.
25 Mara baada ya mmiliki wa nyumba kusimama na kufunga mlango, basi mtasimama nje na kupiga hodi mlangoni na kusema, Bwana, Bwana, tufungulie yeye atajibu na kuwaambia, siwajui ninyi wala mtokako.'
Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ ebilie mechie ọnụ ụzọ, unu ga-eguzo na-ezi na-akụ aka nʼụzọ na-asị, ‘Onyenwe anyị meghere anyị ụzọ.’ “Na nzaghachi, ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu si bịa.’
26 Ndipo mtasema, Tulikula na kunywa mbele yako na wewe ulifundisha katika mitaa yetu.”
“Nʼoge ahụ, unu ga-asị, ‘Anyị na gị rikọrọ, ṅụkọkwaa, ị kuzikwara nkuzi nʼogbe anyị.’
27 Lakini yeye atawajibu, `nawaambia, siwajui mtokako, ondokeni kwangu, ninyi watenda maovu!'
“Ma ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu siri bịa. Pụọnụ nʼihu m, unu ndị ajọ omume.’
28 Kutakuwa na kilio na kusaga meno wakati mtakapowaona Abrahamu, Isaka, Yakobo na manabii wote katika ufalme wa Mungu, lakini ninyi wenyewe mumetupwa nje.
“Ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adịkwa mgbe unu ga-ahụ Ebraham, na Aịzik na Jekọb na ndị amụma niile ka ha nọ nʼalaeze Chineke; ma unu onwe unu abụrụ ndị a chụpụrụ nʼezi.
29 Watafika kutoka Mashariki, Magharibi, Kaskazini na Kusini, na kupumzika katika meza ya chakula cha jioni katika ufalme wa Mungu.
Ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ, nakwa ọdịda anyanwụ, na nʼugwu na ndịda nke ụwa bịa nọdụ nʼoriri nʼime alaeze Chineke.
30 Na tambua hili, wa mwisho ni wa kwanza na wa kwanza atakuwa wa mwisho.”
Ma lee, ndị bu ụzọ ga-aghọ ndị ikpeazụ, ma ndị ikpeazụ ga-aghọ ndị bu ụzọ.”
31 Muda mfupi baadaye, baadhi ya Mafarisayo walikuja na kumwambia, “Nenda na ondoka hapa kwa sababu Herode anataka kukuua.”
Nʼoge awa ahụ, ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya sị ya, “Si nʼebe a pụọ, nʼihi na Herọd na-achọ igbu gị.”
32 Yesu akasema, “Nendeni mkamwambie yule mbweha, `Tazama, ninawafukuza pepo na kufanya uponyaji leo na kesho, na siku ya tatu nitatimiza lengo langu.
Ọ sịrị ha, “Gaa gwaranụ m nkịta ọhịa ahụ, lee, ana m achụpụ mmụọ ọjọọ, gwọọkwa ndị ọrịa taa na echi, ma nʼụbọchị nke atọ ka m ga-arụcha ọrụ m.
33 Katika hali yoyote, ni muhimu kwa ajili yangu kuendelea leo, kesho, na siku iliyofuata, kwa vile haikubaliki kumuua nabii mbali na Yerusalemu.
Ma otu ọ dị, aga m aga nʼihu nʼụzọ m taa, na echi na nwanne echi, nʼihi na nʼezie, ọ dịghị onye amụma ga-anwụ nʼebe ọzọ na-abụghị na Jerusalem.
34 Yerusalemu, Yerusalemu, nani anawaua manabii na kuwapiga mawe wale waliotumwa kwenu. Mara ngapi nimetaka kuwakusanya watoto wenu kama vile kuku anavyokusanya vifaranga vyake chini ya mbawa zake, lakini humkulitaka hili.
“O Jerusalem! Jerusalem! Gị onye na-egbu ndị amụma ma na-ejikwa nkume atụgbu ndị e ziteere gị. Ọtụtụ mgbe ka m gbalịrị ịchịkọta ụmụ gị dị ka nne ọkụkụ sị achịkọta ụmụ ya nʼokpuru nku ya, ma unu ekweghị.
35 Tazama, nyumba yako imetelekezwa. Nami nawaambia, hamuwezi kuniona hata mtakaposema 'Amebarikiwa huyo ajaye kwa jina la Bwana.'”
Lee, a hapụrụla unu ụlọ unu. Ma agwa m unu, unu agaghị ahụ m anya ọzọ ruo mgbe oge ahụ ga-abịa, mgbe unu ga-asị, ‘Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.’”