< Mambo ya Walawi 23 >

1 Yahweh akamwambia Musa:
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 “Zungumza na watu wa Israeli, na uwaambie, 'Hizi ndizo sikukuu zilizoamriwa kwa ajili ya Yahweh, ambazo ni lazima mzitangaze kuwa makusanyiko matakatifu, ni sikukuu zangu za mara kwa mara.
“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Ndị a bụ mmemme a kara aka nye Onyenwe anyị, nke unu ga-ekwusa dịka mkpọkọta dị nsọ.
3 Mnaweza kufanya kazi kwa siku sita, lakini siku ya saba ni Sabato ya kupumzika kabisa. Usifanye kazi kwa sababu ni Sabato kwa ajili ya Yahweh mahali pote mnaposhi.
“‘Ụbọchị isii ka unu ga-eji rụọ ọrụ. Ma ụbọchị nke asaa, bụ ụbọchị izuike, ụbọchị mkpọkọta dị nsọ. Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, nʼebe ọbụla unu bi. Ọ bụ ụbọchị izuike nye Onyenwe anyị.
4 Hizi ndizo sikukuu za Yahweh zilizoamriwa, Makusanyiko matakatifu mtakayoyatangaza kwa nyakati zilioamriwa:
“‘Ndị a bụ mmemme Onyenwe anyị a kara aka, mkpọkọta dị nsọ nke unu ga-ekwusa nʼoge a kara aka.
5 Katika mwenzi wa kwanza, siku ya kumi na nne ya mwezi kwenye mwanga hafifu wa machweo ya jua, ni Pasaka ya Yahweh.
Nʼọnwa mbụ, nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa ahụ, nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dara, ka Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị ga-adị.
6 Siku ya kumi na tano ya mwezi ule ule ni sikukuu ya mikate isiotiwa hamira kwa ajili ya Yahweh. Kwa muda wa siku saba mtakula mikate isiotiwa hamira.
Mmemme achịcha na-ekoghị eko Onyenwe anyị ka unu ga-ebido nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa ahụ. Abalị asaa ka unu ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
7 Siku ya kwanza ni lazima mjitenge kwa pamoja, hamtafanya kazi ya kawaida.
Nʼụbọchị mbụ nke mmemme a, unu ga-enwe mkpọkọta dị nsọ, ọ dịkwaghị onye ọbụla ga-arụ ọrụ ọbụla.
8 Kwa siku saba mtamletea Yahweh matoleo ya chakula. Siku ya saba ni ya kusanyiko takatifu lililotengwa kwa ajili ya Yahweh, nanyi katika siku hiyo hamtafanya kazi yoyote ya kawaida.”
Unu ga-eweta aja e sitere nʼọkụ chụọ nye Onyenwe anyị. Nʼụbọchị nke asaa nweenụ mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ.’”
9 Yahweh akamwambia Musa, akisema,
Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya,
10 “Sema na watu wa Israeli uwaambie, 'mtakapika kwenye nchi nitakayowapa nyinyi, na mtakapovuna mazao yake, nanyi yawapasa kumletea kuhani fungu la masuke ya nafaka ya matunda yake ya kwanza.
“Gwa ụmụ Izrel sị ha, ‘Mgbe unu banyere nʼala ahụ m na-aga inye unu, ghọta mkpụrụ ihe ubi nke mbụ unu, unu ga-ewetara onye nchụaja otu ukwu ọka site nʼọka unu ghọtara nʼubi unu.
11 Naye ataliinua hilo fungu la masuke ya nafaka mbele za Yahweh na kulileta kwake, kwa kuwa litakubalika kwa niaba yenu. Nalo litaletwa siku baada ya Sabato ili kwamba kuhani ataliinua na kulileta kwangu.
Ọ ga-anara unu ukwu ọka ahụ fufee ya nʼihu Onyenwe anyị, ka a nabata ya. Ọ bụ nʼụbọchị ahụ ga-esote ụbọchị izuike ka onye nchụaja ga-efufe ya.
12 Siku ile mtakapoliinua lile fungu la masuke ya nafaka na kulileta kwangu, itawabidi kutoa mwana—kondoo dume wa mwaka mmoja na asiye na dosari awe sadaka ya kuteketezwa kwa Yahweh.
Nʼotu ụbọchị ahụ e fufere ukwu ọka ahụ, unu ga-ewere nwa ebule na-enweghị ntụpọ, nke gbara naanị otu afọ, chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ.
13 Matoleo ya nafaka yatakuwa sehemu za kumi za efa za unga laini uliochanganywa na mafuta, uwe matoleo yaliyofanywa kwa moto kwa Yahweh, ili kutoa harufu nzuri ya kupendeza, pamoja na hiyo kutakuwa na matoleo ya kinywaji ya divai, moja ya nne ya hini.
Aja mkpụrụ ọka ga-eso aja nsure ọkụ a. Ọ ga-eji iko ọka a kwọrọ nke ọma iri na abụọ a gwara mmanụ oliv, ka ọ bụrụ ihe e surere nʼọkụ na-esi ezi isi ọma nye Onyenwe anyị. A ga-enyekwa iko mmanya atọ dịka onyinye ihe ọṅụṅụ
14 Hamtakula mkate, wala nafaka iliyokaangwa au nafaka mpya hata siku ile mliyoleta matoleo haya kwa Mungu wenu. Hii itakuwa amri ya kudumu katika vizazi vyote vya watu wenu, popote pale mnapoishi.
Unu agaghị eri achịcha, maọbụ ọka e ghere eghe, maọbụ ọka ọhụrụ tutu ruo mgbe unu buru ụzọ weta onyinye nye Chineke unu. Nʼebe ọbụla unu bi, ụkpụrụ a ga-adịgide ruo ọgbọ niile.
15 Tangu siku iliyofuata baada ya Sabato—hiyo ilikuwa siku mlipolileta lie fungu la nafaka la matoleo ya kutikiswa—hesabuni majuma saba kamili.
“‘Site nʼụbọchị ahụ sotere ụbọchị izuike, bụ ụbọchị ahụ unu wetara ukwu ọka nke onyinye mfufe, gụpụta izu asaa zuru ezu.
16 Mtahesabu siku hamsini, ambazo zingekuwa siku baada ya Sabato ya saba. Kisha mtaleta matoleo ya nafaka mpya kwa Yahweh.
Gụpụtakwa iri ụbọchị ise site nʼụbọchị izuike ahụ mezuru izu asaa ahụ ma wetara Onyenwe anyị onyinye ọka ọhụrụ.
17 Mtaleta kutoka nyumbani mwenu mikate miwili iliyotengenezwa kutokana na mbili za kumi za efa. Ni lazima ifanywe kwa unga laini na uliochanganywa na hamira; zitakuwa matoleo ya kutikiswa ya malimbuko ya kwanza kwa Yahweh.
Site nʼebe ọbụla unu bi, unu ga-ewetara Onyenwe anyị ogbe achịcha abụọ nke unu ji iko ọka a kwọrọ nke ọma iri na abụọ, nke e ji ihe na-eko achịcha mee, ya bụ yiist, dịka aja mfufe nke mkpụrụ mbụ nye Onyenwe anyị.
18 Mtaileta hiyo mikate pamoja na wana—kondoo saba wa mwaka mmoja na wasiokuwa na dosari, fahali mmoja mchanga na dume wa kondoo wawili. Watakuwa matoleo ya kuteketezwa kwa moto kwa Yahweh, pamoja na matoleo yao ya nafaka na matoleo ya kinywaji, matoleo yaliyofanywa kwa moto na kutoa harufu nzuri ya kupendeza kwa Yahweh.
Tinyere achịcha a, unu ga-eweta ụmụ atụrụ asaa gbara otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, na otu nwa oke ehi, na ebule abụọ. Ha ga-abụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ya na aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ, aja e sitere nʼọkụ chụọ, nke isisi ya dị ezi mma nye Onyenwe anyị.
19 Ni lazima mtowe mbuzi dume mmoja kwa ajili ya matoleo ya dhambi, na wana—kondoo dume wawili wa mwaka mmoja kwa ajili ya dhabihu, wawe matoleo ya ushirika.
Unu ga-ejikwa otu mkpi chụọ aja mmehie. Werekwa ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, otu afọ, chụọ aja udo.
20 Ni lazima kuhani azitikise pamoja na mkate wa malimbuko ya kwanza mbele za Yahweh na kuzileta kwake kuwa matoleo pamoja na kondoo dume wawili. Watakuwa sadaka takatifu kwa Yahweh kwa ajili ya kuhani.
Onye nchụaja ga-efufe ụmụ atụrụ abụọ ndị a, na achịcha ndị si na mkpụrụ mbụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Ha bụ aja dị nsọ nye Onyenwe anyị. Ọ bụkwa ndị nchụaja ga-ewere ha dịka nri ha.
21 Mtatoa tangazo siku iyo hiyo. Kutakuwa na kusanyiko takatifu, na hamtafanya kazi za kawaida. Hii itakuwa amri ya kudumu katika vizazi vya watu wenu mahali pote mnapoishi.
Nʼotu ụbọchị ahụ unu ga-akpọsakwa mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ. Nke a ga-abụ ụkpụrụ ga-adịgide ebighị ebi site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ niile, nʼebe ọbụla unu bi.
22 Mtakapovuna mazao ya nchi yenu, Msivune kabisa kabisa pembeni mwa mashamba yenu, wala msivune mazazo ya mavuno yenu. Inawapasa kuyaacha kwa ajili ya masikini na mgeni. Mimi ndimi Yahweh Mungu wenu.”
“‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi, unu ewechala ihe niile dị nʼakụkụ niile nke ubi unu. Hapụrụnụ ha ụmụ ogbenye, na ndị ọbịa. Hapụkwara ha mkpụrụ ubi niile dara nʼala. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’”
23 Yahweh akazungumza na Musa, akisema,
Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
24 “Zungumza na watu wa Israeli na uwaambie, “Siku ya kwanza ya mwezi wa kwanza itakuwa siku ya pumzika makini kwa ajili yenu, kumbukumbu pamoja na kupigwa kwa tarumbeta na kusanyiko takatifu,
“Gwa ụmụ Izrel sị, ‘Ụbọchị mbụ nke ọnwa nke asaa ga-abụ ụbọchị izuike, ụbọchị mkpọkọta dị nsọ nke a ga-eji opi na-ada oke ụda cheta.
25 Hamtafanya kazi ya kawaida, na ni lazima mtoe dhabihu inayofanywa kwa moto kwa Yahweh.”
Unu arụla ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, kama unu ga-achụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.’”
26 Kisha Yahweh akamwambia Musa, akisema,
Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
27 “Sasa, siku ya kumi ya mwezi huu wa saba, ni Siku ya Upatanisho. Kutakuwa na kusanyiko takatifu, na ni lazima mjinyenyekeze na kuleta kwa Yahweh matoleo kwa moto.
“Ụbọchị nke iri nke ọnwa asaa a bụ ụbọchị Mkpuchi Mmehie. Ọ bụ ụbọchị mkpọkọta dị nsọ nye unu. Unu ga-ata onwe unu ahụhụ bịa wetara Onyenwe anyị onyinye site nʼọkụ.
28 Hamtafanya kazi katika siku hiyo kwa sababu ni Siku ya Upatanisho, ili kufanya upatanisho kwa ajili yenu mbele za Yahweh Mungu wenu.
Unu arụla ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ nʼihi na ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịchụ aja mkpuchi mmehie unu nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu.
29 Yeyote asiyejinyenyekeza siku hiyo lazima akatiliwe mbali na watu wake.
Onye ọbụla na-ejighị ụbọchị ahụ weda onwe ya nʼala ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya.
30 Yeye afanyaye kazi yoyote katika siku hiyo, Mimi, Yahweh, nitamwangamiza atoke miongoni mwa watu wake.
Aga m ebibikwa onye ọbụla rụrụ ọrụ nʼụbọchị ahụ.
31 Msifanye kazi ya aina yoyote katika siku hiyo. Hii itakuwa amri ya kudumu katika vizazi vyote vya watu wenu mahali pote mnapoishi.
Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla. Nʼebe ọbụla unu bi, ụkpụrụ a ga-adịgide nye unu niile site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
32 Siku hii itakuwa Sabato ya pumziko lenye utlivu, na ni lzima siku ya tisa ya mwezi mjinyenyekeze katika majira ya jioni. Tangu jioni hata jioni mtaishika Sabato yenu.”
Ọ ga-abụ ụbọchị izuike zuruoke nye unu, unu ga-ewedakwa onwe unu nʼala. Nʼụbọchị nke itoolu nke ọnwa ahụ, site nʼuhuruchi ruo nʼuhuruchi nke na-esote ya, unu ga-edebe izuike unu.”
33 Yahweh akazungumza na Musa, akisema,
Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
34 “Zungumza na watu ISraeli, uwaambie 'Katika siku ya kumi na tano ya mwezi wa saba kutakuwa na Sikukuu ya vibanda kwa Yahweh. nayo itadumu siku saba.
“Gwa ụmụ Izrel, ‘Nʼụbọchị nke iri na ise, nʼọnwa nke asaa, ka unu ga-amalite mmemme Ụlọ Ikwu Onyenwe anyị. A ga-eme ya ụbọchị asaa.
35 Siku ya kwanza kutakuwa na kusanyiko takatifu. Hamtafanya kazi ya kawaida.
Nʼụbọchị nke mbụ bụ ụbọchị mkpọkọta dị nsọ. Onye ọbụla agaghị arụ ọrụ nʼụbọchị ahụ.
36 Kwa muda wa siku saba mtatoa dhabihu iliyofanywa kwa moto kwa Yahweh. Siku ya nane kutakuwa na kusanyiko takatifu, nanyi mtato dhabihu iliyofanywa kwa moto kwa Yahweh. Hili ni kusanyiko lenye utulivu, nanyi msifanye kazi yoyote ya kawaida.
Nʼụbọchị ọbụla nʼime ụbọchị asaa ndị a niile ka a ga-ewetara Onyenwe anyị onyinye site nʼọkụ. Nʼụbọchị nke asatọ ka mkpọkọta dị nsọ ga-adị. A ga-achụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nʼụbọchị a. Ọ bụ mkpokọta mmechi, nʼihi ya, a gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.
37 Hizi ndizo sikukuu zilizoamriwa kwa ajili ya Yahweh, ambazo mnapaswa kuzitangaza kuwa ni makusanyiko matakatifu ya kutoa dhabihu kwa moto kwa Yahweh, matoleo ya kuteketezwa na matoleo ya nafaka, dhabihu na matoleo ya vinywaji, kila moja kwa siku yake.
(“‘Ndị a bụ mmemme a kara aka, mgbe a ga-ekwusa mkpọkọta dị nsọ maka iwetara Onyenwe anyị onyinye nri, ya bụ, onyinye aja nsure ọkụ, na onyinye mkpụrụ ọka, na aja dị iche iche, na onyinye ihe ọṅụṅụ dịka e sị hazie na ọ ga na-adị kwa ụbọchị.
38 Sikukuu hizi zitakuwa nyongeza kwa Sabato za Yahweh na zawadi zenu, viapo vyenu vyote, na sadaka zenu zote za hiari mzitoazo kwa Yahweh.
Unu ga-enye onyinye ndị a, tinyere onyinye a na-enye Onyenwe anyị nʼụbọchị izuike, na tinyere onyinye ndị ọzọ unu na-enye na ihe ndị ọzọ unu kwere na nkwa, na onyinye afọ ofufu niile unu na-enye Onyenwe anyị.)
39 Kuhusu Sikukuu ya vibanda, siku ya kumi na tano ya mwezi wa saba, mtakapokuwa mmeyakusanya ndani matunda ya nchi, ni lazima muitunze sikukuu hii ya Yehweh kwa muda wa siku saba. Siku ya kwanza itakuwa ya pumziko lenye utulivu, na siku ya nane pia itakuwa ya pumziko lenye utulivu.
“‘Ya mere, malite nʼụbọchị nke iri na ise nke ọnwa asaa, mgbe unu webatasịrị ihe ubi unu, meerenụ Onyenwe anyị mmemme ụbọchị asaa, ụbọchị nke mbụ, na ụbọchị nke asatọ ga-abụ ụbọchị izuike.
40 Siku ya kwanza mtachuma tunda lililobora kutoka kwenye miti, mtakata makuti ya mtende, na matawi ya miti minene yenye majani mengi, na majani ya mierebi kutoka chemchemi za maji, nanyi mtashangilia mbele za Yahweh Mungu wenu kwa siku saba.
Nʼụbọchị nke mbụ, unu ga-ewere ụfọdụ mkpụrụ osisi dị mma nke si nʼosisi unu na-amị mkpụrụ, gbutekwa igu nkwụ, na alaka osisi nwere ahịhịa ndụ, na osisi pọpla, jiri ha mee mmemme obi ụtọ nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu ụbọchị asaa.
41 Kwa muda wa siku saba kila mwaka, mtaisherehekea sikukuu hii kwa Yahweh. Hii itakuwa amri ya kudumu katika vizazi vyote vya watu wenu mahali potepote mtakapoishi. Mtaisherehekea sikukuu hii katika mwezi wa saba.
Mmemme ụbọchị asaa a ga-adị nye Onyenwe anyị nʼafọ niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ unu niile. Ọ bụkwa nʼọnwa nke asaa ka unu ga-eme mmemme a.
42 Mtaishi kwenye vibanda vidogovidogo kwa siku saba. Waisraeli wenyeji wa kuzaliwa wote itawapasa kuishi katika vibanda vidogovidogo kwa siku saba,
Nʼoge mmemme a, ụmụ Izrel niile ga-ebi nʼụlọ e ji alaka osisi na ahịhịa wuo ụbọchị asaa. Ụmụ afọ Izrel niile ga-ebi nʼụlọ dị otu a.
43 ili kwamba wazao wenu, kizazi baada ya kizazi, waweze kujifunza nilivyowafanya wana wa Israeli kuishi kwenye vibanda kama hivi nilipowaongoza kutoka katika nchi ya Misri. Mimi ndimi Yahweh Mungu wenu.'”
Nke a ga-echetara ọgbọ ụmụ Izrel niile na mgbe m kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, unu biri nʼụlọ e ji osisi na ahịhịa wuo nʼọzara. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’”
44 Katika njia hii Musa akazitangaza kwa watu wa ISraeli sikukuu zilizoamria kwa ajili ya Yahweh.
Mosis gwara ụmụ Izrel ihe gbasara mmemme niile a kara aka nye Onyenwe anyị.

< Mambo ya Walawi 23 >