< Waamuzi 8 >
1 Watu wa Efraimu wakamwambia Gideoni, “Ni nini hiki umetutenda? Haukuita wakati ulipokwenda kupigana na Midiani.” Wakamwambia kwa nguvu.
Ndị Ifrem jụrụ Gidiọn ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji meso anyị mmeso dị otu a? Ọ bụ gịnị mere i zighị ozi kpọ anyị mgbe ị gara ibuso ndị Midia agha?” Ha tara ya ụta nke ukwuu.
2 Akawaambia, “Nimefanya nini sasa kulinganisha na mlichofanya ninyi? Je! Mavuno ya zabibu za Efraimu si bora zaidi kuliko mavuno ya zabibu ya Abiezeri?
Ma Gidiọn zaghachiri ha sị, “Gịnị ka m rụpụtara e ji atụnyere nke unu. Ọ bụ na ntụtụkọta ihe ubi Ifrem adịghị mma karịa owuwe ihe ubi nke Abieza?
3 Mungu amewapa ushindi juu ya wakuu wa Midiani-Orebu na Zeeb! Mimi nimefanya nini ukilinganisha na ninyi?” Hasira yao ikashuka chini aliposema hili.
Chineke nyefere unu Oreb na Zeeb, ndị ndu Midia, nʼaka. Gịnị ka m rụpụtara a ga-eji tụnyere nke unu?” Okwu a mere ka ọnụma ha nʼebe ọ nọ dajụọ.
4 Gideoni alikuja Yordani na akavuka juu yake, yeye na watu mia tatu waliokuwa pamoja naye. Walikuwa wamechoka, lakini bado waliendelea kufuatilia.
Nʼoge a, Gidiọn gabigara, gafee osimiri Jọdan, ya na narị ndị agha atọ so ya. Ike gwụrụ ha nke ukwuu ma ha nọgidere na-achụsi ndị iro ha ọsọ ike.
5 Akawaambia watu wa Sukothi, “Tafadhali wape mikate kwa watu wanaonifuata, kwa kuwa wamechoka, nami niwafuatilia Zeba na Salmuna, wafalme wa Midiani.
Ọ sịrị ndị ikom Sukọt, “Nyetụnụ ndị agha m achịcha nʼihi na ike gwụrụ ha. Ana m na-achụso Zeba na Zalmuna, ndị eze Midia ọsọ.”
6 Na wakuu wakasema, “Je, mikono ya Zeba na Salmuna sasa ipo mikononi mwako? Kwa nini tulipe jeshi lako mikate?”
Ma ndịisi Sukọt sịrị, “Anyị ga-esi aṅaa nye ndị agha gị achịcha? Ijidela Zeba na Zalmuna nʼaka gị?”
7 Gideoni akasema, “Bwana akitupa ushindi juu ya Zeba na Salmunna, nitainyunyiza ngozi yenu kwa miiba ya jangwani na michongoma.
Mgbe ahụ, Gidiọn zaghachiri, “Nʼihi nke a, mgbe Onyenwe anyị nyefere m Zeba na Zalmuna nʼaka, aga m eji ogwu na ụga na-epu nʼọzara dọkasịa unu ahụ.”
8 Akatoka huko, akaenda Penieli, akawaambia watu maneno hayo hayo; lakini watu wa Penieli wakamjibu kama watu wa Sukothi walivyojibu.
O sitere nʼebe ahụ gaa Peniel rịọkwaa ndị obodo ahụ otu arịrịọ ahụ. Ma otu ụdị ọsịsa ahụ ndị Sukọt nyere ka ndị Peniel nyekwara.
9 Akawaambia pia watu wa Penieli, akasema, “Nitakapokuja kwa amani, nitauangusha mnara huu.”
Ya mere, ọ gwara ndị ikom Peniel sị, “Mgbe m nwere mmeri lọta, aga m akwatu ụlọ elu a.”
10 Sasa Zeba na Salmuna walikuwa huko Karkori pamoja na jeshi lao, karibu na watu elfu kumi na tano, wote waliosalia nje ya jeshi lote la watu wa Mashariki, kwa kuwa walianguka watu 120, 000 waliofundishwa kupigana na upanga.
Nʼoge a, Zeba na Zalmuna na puku ndị agha iri na ise fọdụụrụ ha nọ na Kako. Ndị a bụ naanị ndị agha fọdụrụ nʼime usuu ndị agha ndị Midia niile. Nʼihi na ọnụọgụgụ ndị agha e gburu egbu dị narị puku na iri puku abụọ.
11 Gideoni akapanda barabara iliyochukuliwa na wakaazi wa hema, Noba na Yogbena. Akalishinda jeshi la adui, kwa sababu hawakuwa wanatarajia shambulio.
Gidiọn rigoro site ụzọ ndị na-achị anụ ụlọ nke dị nʼọwụwa anyanwụ obodo Nọba na Jogbeha, bịakwasị ndị agha ahụ na mberede nʼihi na ha nọ nʼatụghị egwu ihe ọbụla ime ha.
12 Zeba na Salmuna walikimbia, na Gideoni alipowafuata, akawatwaa wafalme wawili wa Midiani-Zeba na Salmunna- na kulifanya jeshi lote kuwa na hofu.
Zeba na Zalmuna, eze abụọ ndị Midia, gbapụrụ ọsọ, ma Gidiọn na ndị agha ya chụgidere ha ọsọ, jide ha. Ha gweriri ndị agha ha niile.
13 Gideoni, mwana wa Yoashi, alirudi kutoka kwenye vita kwenda kupitia Heresi.
Emesịa, Gidiọn nwa Joash, sitere nʼokporoụzọ Heres lọta agha ahụ.
14 Akamkimbilia kijana mmoja wa watu wa Sukothi na kutafuta ushauri kutoka kwake. Kijana huyo alimwelezea viongozi wa Sukothi na wazee wake, watu sabini na saba.
Nʼebe ahụ ka Gidiọn nọ jide otu nwokorobịa onye Sukọt. O jụrụ ya ajụjụ, nwokorobịa ahụ depụtakwaara ya aha ndịisi obodo Sukọt. Ha dị iri asaa na asaa, ndị okenye obodo ahụ.
15 Gideoni akaja kwa watu wa Sukothi, akasema, “Tazameni Zeba na Salmuna, ambao mlinidhihaki kwa ajili yao, nikasema, 'Je! mmemshinda Zeba na Salmuna? Hatujui kwamba tunapaswa kulipa jeshi lako mkate.”
Mgbe Gidiọn bịaruru obodo Sukọt, ọ gwara ha okwu sị, “Ngwa leenụ Zeba na Zalmuna ndị unu kparịrị m maka ha, kwuo sị, ‘Ijidela Zeba na Zalmuna nʼaka gị ugbu a nke mere na anyị ga-enye ndị ikom gị ike gwụrụ achịcha?’”
16 Gideoni akawachukua wazee wa mji, naye akawaadhibu watu wa Sukothi pamoja na miiba ya jangwa na michongoma.
O jidere ndị okenye obodo ahụ, were ogwu na ụga taa ndị ikom Sukọt ahụhụ ime ka ha mara ihe.
17 Akaangusha mnara wa Penieli na kuwaua watu wa mji huo.
Ọ kwaturu ụlọ elu Peniel gbukwaa ndị ikom obodo ahụ niile.
18 Gideoni akamwambia Zeba na Salmuna, “Ni watu wa aina gani mliwauawa Tabori?” Wakajibu, “Kama wewe ulivyo, ndivyo walivyokuwa. Kila mmoja wao alionekana kama mwana wa mfalme.”
Mgbe ahụ, ọ jụrụ Zeba na Zalmuna, “Ndị ikom dị aṅaa ka unu gburu na Taboa?” Ha zara sị ya, “Ha nwere ụdịdị ka gị onwe gị, onye ọbụla nwere ụdịdị dịka nwa eze.”
19 Gideoni akasema, 'Wao walikuwa ndugu zangu, wana wa mama yangu. Kama Bwana anaishivyo, kama mngewaacha hai, nisingewauwa.”
Gidiọn zaghachiri sị, “Ndị ahụ bụ ụmụnne m ndị ikom, ndị nke nne m mụrụ. Ugbu a, Onyenwe anyị nʼonwe ya maara na a sị na unu egbughị ha, agaraghị m egbu unu.”
20 Akamwambia Yetheri (mzaliwa wake wa kwanza), “Simama uwaue!” Lakini kijana huyo hakutoa upanga wake kwa kuwa aliogopa, kwa sababu alikuwa bado kijana mdogo.
O chigharịrị gwa Jeta, ọkpara ya, sị ya, “Gbuo ha!” Ma Jeta amịpụtaghị mma, nʼihi na ọ bụ naanị nwokorobịa. Ọ tụrụ egwu igbu ha.
21 Ndipo Zeba na Salmuna wakasema, simama mwenyewe, utuue! Kwa maana kama mtu alivyo, ndivyo zilivyo nguvu zake. Gideoni akasimama na kumwua Zeba na Salmuna. Pia aliondoa mapambo yaliyokuwa juu ya shingo za ngamia zao.
Zeba na Zalmuna, gwara Gidiọn okwu sị, “Jiri aka gị gbuo anyị. ‘A hụ dimkpa, a hụ ike ya.’” Nʼihi nke a, Gidiọn were aka ya gbuo ha, chịkọrọkwa ihe olu niile ha nyakwasịrị ịnyịnya kamel ha nʼolu.
22 Ndipo wana wa Israeli wakamwambia Gideoni, “Ututawale, wewe, mtoto wako, na mjukuu wako; kwa sababu umetuokoa mikononi mwa Midiani.”
Mgbe ahụ, ndị Izrel gwara Gidiọn sị ya, “Bịa ka ị bụrụ eze anyị! Gị na ụmụ gị ndị ikom, na ezinaụlọ gị niile, ga-abụ ndị ga-achị, nʼihi na ị gbapụtala anyị site nʼaka usuu ndị agha Midia.”
23 Gideoni akawaambia, “Mimi sitatawala juu yenu, wala mtoto wangu hatatawala juu yenu. Bwana atatawala juu yenu.”
Ma Gidiọn gwara ha okwu sị, “Mụ onwe m na ụmụ m agaghị abụ eze unu, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke bụ eze unu.”
24 Gideoni akawaambia, “Nina haja yangu niitakayo kwenu kwamba kila mmoja wenu atanipe pete kutoka kwenye nyara zake.” (Wamidiani walikuwa na pete za dhahabu kwa sababu walikuwa Waishmaeli.)
Ọ sịrị, “Enwere m otu arịrịọ m ga-arịọ unu. Onye ọbụla nʼime unu nye m ọlantị site nʼoke unu nwetara site nʼihe nkwata nʼagha.” (Ọ bụ omenaala ndị Ishmel niile iyi ọlantị ọlaedo.)
25 Wakamjibu, “Tunafurahi kukupa.” Wakatandika vazi na kila mtu akatupa pete kutoka kwenye nyara zake.
Ha jiri obi ụtọ kwenye, gbasaa akwa nʼala, tinyechaa ọlantị ha nʼime ya. Onye ọbụla nʼime ha mere nke a.
26 Uzito wa pete za dhahabu alizoomba zilikuwa shekeli 1, 700 za dhahabu. Nyara hizi zilikuwa ni pamoja na mapambo ya makoja, vidani, nguo ya rangi ya zambarau waliyovaa na wafalme wa Midiani, na zaidi ya minyororo iliyokuwa karibu na shingo za ngamia zao.
Ịdị arọ nke ọlantị ọlaedo ndị a bụ otu puku na narị shekel asaa, na-agụnyeghị ihe ịchọ mma ndị ọzọ, na ihe olu, na uwe odo odo ndị eze Midia na-eyi, na ihe olu dị nʼolu ịnyịnya kamel ha.
27 Gideoni akafanya efodi kutoka katika pete na kuiweka katika mji wake, huko Ofra, na Israeli wote wakaiandama kwa ukahaba na kuabudu. Ilikuwa mtego kwa Gideoni na kwa wale walio nyumbani kwake.
Gidiọn jiri ọlaedo ahụ niile kpụọ efọọd debe ya nʼOfra, nʼobodo nke aka ya. Ma mgbe na-adịghị anya, ụmụ Izrel niile malitere ịgbaso na ife ihe ahụ ofufe. Nʼụzọ dị otu a, ọ ghọọrọ Gidiọn na ezinaụlọ ya ihe ịma nʼọnya.
28 Kwa hiyo Midiani ilishindwa mbele ya watu wa Israeli na hawakuinua vichwa vyao tena. Na nchi ikawa na amani kwa miaka arobaini siku za Gideoni.
Otu a ka Midia si ghọọ ndị Izrel meriri emeri. Midia eweliteghị isi ya ọzọ. Nʼihi nke a, Izrel biri nʼudo iri afọ anọ, nʼụbọchị niile Gidiọn dị ndụ.
29 Yerubaali, mwana wa Yoashi, akaenda akakaa nyumbani kwake.
Jerub-Baal, nwa Joash laghachiri nʼụlọ nke aka ya, biri nʼebe ahụ.
30 Gideoni alikuwa na wana sabini, waliokuwa uzao wake, kwa kuwa alikuwa na wake wengi.
Ọ mụtakwara iri ụmụ ndị ikom asaa, nʼihi na ọ lụrụ ọtụtụ ndị inyom.
31 Mwanamke wake, aliyekuwa Shekemu, akamzaa pia mwana, na Gideoni akampa jina lake Abimeleki.
O nwekwara iko nwanyị nʼobodo Shekem, onye mụtaara ya nwa nwoke aha ya bụ Abimelek.
32 Gideoni, mwana wa Yoashi, akafa katika uzee mzuri, akazikwa huko Ofra katika kaburi la baba yake Joashi, wa jamaa ya Abiyezeri.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Gidiọn nwa Joash, nwụrụ, mgbe ọ kasịrị nka nke ukwu. E liri ya nʼili nna ya Joash nʼobodo Ofra, nʼala Abieza.
33 Ikawa, Gideoni alipokufa, watu wa Israeli wakageuka tena na kujifanyia ukahaba wenyewe kwa kuabudu Mabaali. Wamlifanya Baali Berith kuwa mungu wao.
Ọ dịghị anya ka Gidiọn nwụsịrị, ụmụ Izrel laghachiri azụ bido ife chi Baal. Ha guzobere Baal-Berit ka ọ bụrụ chi ha.
34 Watu wa Israeli hawakukumbuka kumtukuza Bwana, Mungu wao, aliyewaokoa kutoka kwa mikono ya adui zao kila upande.
Ma ụmụ Izrel echetaghị Onyenwe anyị Chineke ha, onye napụtara ha site nʼaka ndị iro ha niile gbara ha gburugburu.
35 Hawakuweka ahadi zao kwa nyumba ya Yerubaali (yaani Gidioni), kwa ajili ya mema yote aliyoyafanya katika Israeli.
Ha ekwesighịkwa ntụkwasị obi nye ezinaụlọ Jerub-Baal (ya bụ Gidiọn) dịka ezi ihe niile o mere ha si dị.