< Waamuzi 5 >
1 Siku hiyo Debora na Baraka, mwana wa Abinoamu waliimba wimbo huu:
Nʼụbọchị ahụ, Debọra na Barak nwa Abinoam bụrụ abụ sị,
2 'Viongozi wanapoongoza mbele ya Israeli, watu wanapojitolea kupigana vita, tunamsifu Bwana!
“Mgbe ndị ndu na-edu nʼIzrel, mgbe ndị mmadụ jikwa afọ ofufu nye onwe ha, toonu Onyenwe anyị!
3 Sikiliza, ninyi wafalme! Sikiliza kwa makini, ninyi viongozi! Mimi nitamwimbia Bwana; Nami nitamsifu Bwana, Mungu wa Israeli.
“Nụrụnụ nke a, unu ndị eze, Geenụ ntị, unu ndịisi! Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m, ga-abụku Onyenwe anyị abụ. Aga m abụ abụ otuto nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel.
4 Ee Bwana, wakati ulipotoka Seiri, ulipokwenda kutoka Edomu, nchi ilitetemeka, na mbingu pia ilitetemeka; pia mawingu yalitoa maji.
“Onyenwe anyị, mgbe i si Sia pụta, mgbe i sitere nʼala Edọm gabiga, ụwa mara jijiji, mmiri ozuzo dị ukwuu sikwa na mbara eluigwe zodata.
5 Milima ikatoka mbele ya uso wa Bwana; hata Mlima Sinai ukatetemeka mbele ya uso wa Bwana, Mungu wa Israeli.
E, ọ bụladị ugwu ukwu niile mara jijiji nʼihu Onyenwe anyị. Ugwu Saịnaị makwara jijiji nʼihu Onyenwe anyị, Chineke Izrel.
6 Katika siku za Shamgari (mwana wa Anathi), katika siku za Jael, barabara kuu ziliachwa, na wale ambao walitembea tu walitumia njia za upepo.
“Nʼụbọchị Shamga, nwa Anat, nʼụbọchị Jael, ndị ịnyịnya ibu na-azụ ahịa nʼọzara kwusịrị, ndị ije niile na-esi nʼakụkụ ụzọ gbagọrọ agbagọ na-aga.
7 Kulikuwa na mashujaa wachache huko Israeli, mpaka mimi, Debora, nilipochukua amri- mama alichukua amri katika Israeli!
Ọ dịkwaghị ihe gara aga nʼobodo Izrel, tutu ruo mgbe m bịara, ee, mgbe m bụ Debọra bịara dịka nne nye Izrel.
8 Walichagua miungu mpya, kulikuwa na vita katika malango ya jiji lakini bado hapakuwa na ngao au mikuki iliyoonekana kati ya watu elfu arobaini nchini Israeli.
Mgbe ụmụ Izrel họrọ ife chi ndị ọzọ ofufe, mgbe agha bịara nʼọnụ ụzọ ama niile, ahụghị ọ bụladị otu ụta maọbụ ùbe. E, ọ bụladị nʼetiti iri puku ndị agha anọ, a hụghị otu ngwa agha ọbụla.
9 Moyo wangu unawaendea wakuu wa Israeli, pamoja na watu ambao walijitolea -tunambariki Bwana kwa ajili yao!
Ma ugbu a, ana m aṅụrị ọṅụ banyere ndị na-achị ụmụ Izrel. Ndị ji obi ha niile were onwe ha nye nʼetiti ndị Izrel. Toonu Onyenwe anyị!
10 Fikiria juu ya hili- ninyi ambao hupanda punda weupe mmeketi kwenye mazulia, nanyi mnaotembea njiani.
“Kwupụtanụ ya, unu ndị na-agba ịnyịnya ibu dị ọcha, unu ndị na-anọkwasị nʼelu akwa dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya unu, na unu ndị na-eji ukwu na-agagharị nʼokporoụzọ. Tụleenụ
11 Sikiliza sauti za wale wanaoimba kwenye maeneo ya kutekea maji. Huko wanasema tena juu ya matendo ya haki ya Bwana, na matendo ya haki ya wapiganaji wake katika Israeli. Ndipo watu wa Bwana wakashuka kwenye malango ya mji.
olu abụ igwe mmadụ ndị nọ nʼakụkụ olulu mmiri niile. Ha na-akọ akụkọ mmeri niile nke Onyenwe anyị, ya bụ, mmeri nke obodo nta ya niile nʼIzrel. “Mgbe ahụ, ndị nke Onyenwe anyị ridara gaa nʼọnụ ụzọ ama niile e si abata nʼobodo.
12 Amka, amka, Debora! Amka, amka, imba wimbo! Simama, Baraka, na uwakamate wafungwa wako, wewe mwana wa Abinoamu.
‘Teta, teta, gị Debọra! Teta, teta, bụọ abụ. Bilie, gị Barak nwa Abinoam, bilie! Duru ndị ahụ niile ị dọtara nʼagha.’
13 Wale waliokoka wakaja chini kwa watu wenye nguvu; watu wa Bwana walikuja kwangu pamoja na mashujaa.
“Ndị fọdụrụ na ndị a na-asọpụrụ rịdatara, ndị nke Onyenwe anyị bịakwutere m imegide ndị dị ike.
14 Walikuja kutoka Efraimu, ambao mizizi yao iko katika Amaleki; watu wa Benyamini walikufuata. Wakuu wa Makiri walitoka, na kutoka Zebuloni wale wanaobeba fimbo ya afisa.
Ụfọdụ si Ifrem bịa, bụ ndị ahụ nwere mgbọrọgwụ nʼala ndị Amalek, ndị Benjamin sokwa pụta, ndị ndu sikwa Makia bịa, ndị na-eso ndị ndu sikwa Zebụlọn pụta.
15 Na wakuu wangu katika Isakari walikuwa pamoja na Debora; na Isakari alikuwa na Baraka waliingia bobdeni kwa kasi chini ya amri yake. Miongoni mwa jamaa za Reubeni kulikuwa na utafutaji mkubwa wa moyo.
Ndị ndu ebo Isaka pụkwutekwara Debọra. E, Isaka sokwara Barak na ndagwurugwu ahụ ka ezigara ha nʼokpuru ya. Ma nʼetiti ndị Ruben, ha nọ na-atụgharị uche.
16 Kwa nini uliketi katikati ya moto, ukisikiliza wachungaji wakipiga filimbi yao kwa makundi yao? Na kwa jamaa za Reubeni kulikuwa na utafutaji mkubwa wa moyo.
Gịnị mere unu ji nọdụ nʼetiti ọgba atụrụ, ịnụ ụda ọja a na-egburu igwe atụrụ? Nʼetiti obodo niile nke Ruben, ka e nwere ọtụtụ ntụgharị uche.
17 Gileadi alikaa upande wa pili wa Yordani; na Dani, kwa nini alizunguka juu ya meli? Asheri alibakia pwani na akaishi karibu na bandari zake.
Ndị Gilead nọgidere nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan. Ndị Dan nọgidekwara nʼime ụgbọ mmiri ha. Ndị Asha nọgidere nʼahụ udo nʼakụkụ ọnụ mmiri.
18 Zabuloni lilikuwa kabila ambayo lingeweza kuhatarisha maisha yao mpaka kufikia kifo, Nafthali, pia, katika uwanja wa vita.
Ma ndị Zebụlọn na Naftalị jiri ndụ ha chụọ aja, pụọ nʼọzara ibu agha ahụ.
19 Wafalme walikuja, wakapigana; wafalme wa Kanaani wakapigana huko Taanaki karibu na maji ya Megido. Lakini hawakuondoa fedha kama nyara.
“Ndị eze ala Kenan bịara ọgụ na Teanak, nʼakụkụ mmiri ala Megido. Ma ha enweghị mmeri ọbụla. Ha akwataghị ọlaọcha maọbụ ihe nkwata ọzọ nʼagha.
20 Nyota zilipigana kutoka mbinguni, kutoka katika njia zao za mbinguni zilipigana na Sisera
Ọ bụladị kpakpando niile dị na mbara eluigwe lụrụ ọgụ megide Sisera.
21 Mto Kishoni uliwaondoa, mto ule wa kale, Mto Kishoni. Endelea mbele nafsi yangu, jipe nguvu!
Mmiri na-achị ọkụ nke iyi ukwu Kishọn bupụrụ ha niile. Ya mere, mkpụrụobi m gaa nʼihu, zoo ụkwụ gị nʼala, dị ike dịka ọdụm!
22 Kisha sauti za hofu za farasi-kupiga mbio, kupigana kwa watu wake wenye nguvu.
Gee ntị nụrụ ụda nzọ ụkwụ nke ịnyịnya ndị iro. Leekwa mwuli elu nke ụkwụ ịnyịnya ahụ!
23 'Ilaani Meroz!' asema malaika wa Bwana. 'Hakika walaani wenyeji wake!' Kwa sababu hawakuja kumsaidia Bwana, kumsaidia Bwana katika vita dhidi ya mashujaa wenye nguvu.
Ma Mmụọ ozi Onyenwe anyị sịrị, ‘Bụọ Meroz ọnụ.’ ‘Bụọ ndị bi na ya ọnụ ebe ọ dị ukwuu, nʼihi na ha abịaghị nyere Onyenwe anyị aka imeri ndị iro ya.’
24 Yaeli amebarikiawa zaidi kuliko wanawake wengine wote, Yaeli (mke wa Heberi Mkeni), amebarikiwa zaidi kuliko wanawake wote wanaoishi katika hema.
“Onye a gọziri karịchasịa ka Jael, nwunye Heba onye Ken bụ, e, onye a gọziri karịchasịa ndị inyom niile na-ebi nʼụlọ ikwu.
25 Mtu yule aliomba maji, naye akampa maziwa; akamletea siagi katika sahani inayofaa kwa wakuu.
Nwoke ahụ rịọrọ mmiri, ma o nyere ya mmiri ara ehi, o ji iko kwesiri ndị a na-asọpụrụ nye ya mmiri ara ehi rahụrụ arahụ.
26 Aliweka mkono wake kwenye kigingi cha hema, na mkono wake wa kuia katika nyundo ya mfanyakazi; kwa nyundo akampiga Sisera, alimpiga kichwani kwake. Aliligawanya fuvu lake vipande vipande wakati alipompiga pembeni ya kichwa chake.
O setịpụrụ aka ya were ǹtu ji ụlọ ikwu ahụ, aka nri ya welitere mkpirisi igwe nke onye ọrụ ji arụ ọrụ. Ọ kpọrọ ya Sisera otu mkpọ, kpọrie ya isi, ọ kpọwasịrị, ma kpọmie ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya.
27 Akaanguka katikati ya miguu yake, akaanguka akalala pale. Kati ya miguu yake akaanguka. Mahali alipoanguka ni pale ambapo aliuawa kwa ukatili.
Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala, nʼebe ahụ ọ dara, ka o dinara. Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala, nʼebe ọ dara, nʼebe ahụ o milara nʼala, nʼebe ahụ ọ dara nwụọ.
28 Aliangalia dirishani - mama yake Sisera aliangalia kupitia kamba na akasema kwa huzuni, 'Kwa nini gari lakelimechelewa kuja? Kwa nini viboko vya farasi vinavyovuta magari yake vimechelewa? '
“Nne Sisera si na oghereikuku lepụ anya nʼazụ oghere ịnata ikuku, o tiri mkpu, ‘Gịnị mere ụgbọala igwe ya ji anọ ọdụ ịbịa? Gịnị ji na mkpọtụ ụkwụ ụgbọala ya adawabeghị?’
29 Wafalme wake wenye hekima walijibu, na yeye mwenyewe akajibu jibu lile
Ma otu nʼime ndị inyom na-ejere ya ozi, nke makarịsịrị ibe ya nʼihe. E, ya onwe ya kwukwara sị,
30 'Je, hawakupata na kugawanya nyara? Tumbo, matumbo mawili kwa kila mtu; nyara ya kitambaa kilichofunikwa kwa Sisera, nyara ya kitambaa kilichofunikwa, nguo mbili za rangi iliyofunikwa kwa misumari ya wale waliopora?
‘Ọ bụ na ha adịghị achọta ma na-ekekwa ọtụtụ ihe a kwatara nʼagha: onye agha ọbụla ga-eketa otu nwaagbọghọ, maọbụ abụọ. Sisera ga-enweta uwe nwere ọtụtụ agwa dị iche iche, uwe nwere ọtụtụ agwa ndị a kpara nke ọma uwe ndị akpaziri nke ọma maka ịnya nʼolu m, ihe ndị a niile dịka ihe nkwata nʼagha?’
31 Naam, adui zako wote wataangamia, Ee Bwana! Lakini marafiki zako watakuwa kama jua wakati linapoongezeka kwa uwezo wake. Na nchi ikawa na amani kwa miaka arobaini.
“Onyenwe anyị, biko, ka ndị iro gị niile si otu a laa nʼiyi. Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nwupụta ihe dịka anyanwụ mgbe o biliri nʼike.” E nwere izuike nʼala ahụ iri afọ anọ.