< Yona 2 >
1 Kisha Yona akamwomba Bwana Mungu wake kutoka katika tumbo la samaki.
Mgbe ahụ, Jona sitere nʼafọ azụ ahụ kpeere Onyenwe anyị Chineke ekpere.
2 Akasema, Nimemwita Bwana juu ya shida yangu naye akanijibu; kutoka tumbo la Kuzimu nililia kwa msaada! Uliisikia sauti yangu. (Sheol )
Ọ sịrị, “Esitere m nʼahụhụ m kpọkuo Onyenwe anyị, ọ zakwara m. Nʼafọ ala mmụọ ka m si tikuo gị, ị nụkwara olu akwa m. (Sheol )
3 Ulikuwa umenitupa ndani ya kina, ndani ya moyo wa bahari, na maji yaliyonizunguka; mawimbi yako yote na gharika yalipita juu yangu.
Ị tụnyere m nʼime mmiri dị omimi, nʼetiti oke osimiri. Osimiri dịkwa m gburugburu, ebili mmiri gị na mmali mmiri gị gabigakwara m nʼisi.
4 Nikasema, 'Nimefukuzwa mbele ya macho yako; lakini nitaangalia tena juu ya hekalu lako takatifu. '
Mgbe ahụ, asịrị m, ‘E sitela nʼihu gị chụpụ m; ma otu ọ dị, aga m elegidekwa anya m ọzọ nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị.’
5 Maji yalifunika kunizunguka karibu na shingo yangu; kina kilinizunguka; mwani ukakizinga kichwa changu.
Mmiri gbara m gburugburu, ruo nʼolu m, ogbu mmiri na-erikpu m. Achara mmiri kekụkwara m nʼisi.
6 Nilikwenda chini ya milima; nchi na baa zake zimefungwa juu yangu milele. Lakini wewe umeinua uhai wangu shimoni, Bwana, Mungu wangu!
Arịdaruola m nʼala ugwu ugwu nke osimiri, ala ahụ ihe ntụchi ya niile kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi. Ma i meela ka m si nʼolulu pụta na ndụ, Onyenwe anyị, bụ Chineke m.
7 Wakati nafsi yangu ilipozimia ndani yangu, nikamwita Bwana; basi sala yangu ilikujia, katika hekalu lako takatifu.
“Mgbe mmụọ m na-ada mba nʼike nʼike, e chetara m gị Onyenwe anyị, ma ekpere m bịakwutere gị, nʼime ụlọnsọ ukwu gị dị nsọ.
8 Wote ambao huzingatia miungu isiyofaa hukataa uaminifu wako wao wenyewe.
“Ndị na-arapara nʼarụsị dị iche iche na-enweghị uru ha bara, na-agbakụta ebere Chineke azụ.
9 Lakini mimi, nitakuchinjia kwa sauti ya shukrani; Nitayatimiza yale niliyoapa. Wokovu hutoka kwa Bwana!
Ma ọ bụ olu abụ ekele ka mụ onwe m ga-eji chụọrọ gị aja. Aga m akwụghachi nkwa niile m kwere. Nʼihi na ‘Nzọpụta bụ nke Onyenwe anyị.’”
10 Kisha Bwana akanena na samaki, akamtapika Yona juu ya nchi kavu.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere azụ ahụ iwu, nke mere ka ọ gbọpụta Jona nʼala akọrọ.