< Yohana 6 >
1 Baada ya mambo haya, Yesu alienda pande za Bahari ya Galilaya, pia huitwa Bahari ya Tiberia.
Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gafere nʼofe nke ọzọ nke osimiri Galili (nke a na-akpọkwa osimiri Tiberịas).
2 Mkutano mkubwa ulikuwa ukimfuata kwa sababu waliona ishara alizozifanya kwa waliokuwa wagonjwa.
Oke igwe mmadụ sooro ya, nʼihi na ha hụrụ ọrụ ebube ọ na-arụ nʼahụ ndị ọrịa.
3 Yesu alipanda juu hadi upande wa juu wa mlima na akakaa huko na wanafunzi wake
Jisọs rigooro nʼelu ugwu nọdụ ala ya na ndị na-eso ụzọ ya.
4 (Na Pasaka, Sikukuu ya Wayahudi ilikuwa imekaribia).
Nʼoge a, mmemme oriri Ngabiga ndị Juu na-abịa nso.
5 Yesu alipoinua macho yake juu na kuona umati mkubwa unakuja kwake, akamwambia Filipo, “Tutakwenda wapi kununua mikate ili hawa waweze kula”?
Mgbe Jisọs leliri anya elu hụ oke igwe mmadụ na-abịakwute ya, ọ sịrị Filip, “Olee ebe anyị ga-azụta achịcha ndị a ga-ata?”
6 (Lakini Yesu aliyasema haya kwa Filipo kwa kumjaribu kwa kuwa yeye mwenyewe alijua atakachofanya).
Ọ jụrụ nke a naanị iji nwalee ya, ya onwe ya mararị ihe ọ ga-eme.
7 Filipo akamjibu, “Hata mikate ya thamani ya dinari mia mbili isingelitosha hata kila mmoja kupata hata kipande kidogo.”
Filip zara ya, “Ụgwọ ọrụ ọnwa isii agaghị ezu ịzụta achịcha nke onye ọbụla nʼime ha ga-atatụ naanị ihe ntakịrị.”
8 Andrea, mmoja wa wanafunzi wake ndugu yake Simoni Petro akamwambia
Onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya bụ Andru, nwanne Saimọn Pita, kwupụtara,
9 Yesu, “Kuna mvulana hapa ana mikate mitano na samaki wawili, lakini hii yafaa nini kwa watu wengi namna hii?”
“Otu nwantakịrị nwoke nọ nʼebe a nwere ogbe achịcha balị ise, na azụ abụọ, ma gịnị ka ha bụ nʼetiti igwe mmadụ ha otu a?”
10 Yesu akawambia, “Waketisheni watu chini” (kulikuwa na nyasi nyingi mahali pale). Hivyo wanaume wapata elfu tano wakakaa chini.
Jisọs sịrị, “Meenụ ka ndị mmadụ ndị a nọdụ ala.” E nwere ọtụtụ ahịhịa nʼebe ahụ, ụmụ nwoke nọdụrụ ala, ha dị ihe ruru puku mmadụ ise.
11 Kisha Yesu akachukua ile mikate mitano akashukuru akawawagawia wale waliokuwa wamekaa. Vivyo hivyo akawagawia samaki kwa kadiri ya vile wavyohitaji.
Ya mere, Jisọs weere achịcha ahụ nye ekele, kee ha ndị niile nọdụrụ ala dị ka ha sịrị chọọ. O jikwa azụ ahụ mee otu ihe ahụ.
12 Watu waliposhiba, aliwambia wanafunzi wake, “Vikusanyeni vipande vya mabaki, vilivyobaki ili kwamba kisipotee chochote.”
Mgbe ha niile rijuchara afọ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Tụtụkọtanụ iberibe niile fọdụrụ, ka ihe ọbụla hapụ ịla nʼiyi.”
13 Basi wakakusanya na kujaza vikapu kumi na viwili, vipande vya mikate mitano ya shayiri- vipande vilivyosazwa na wale waliokula.
Ya mere, ha tụtụkọtara ha, kpojuo nkata iri na abụọ, bụ iberibe si nʼogbe achịcha balị ise nke ndị ahụ rifọrọ.
14 Kisha watu walipoona ishara hii aliyoifanya walisema, “Kweli huyu ndiye yule nabii ajaye ulimwenguni.”
Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ ihe ịrịbama ahụ, o mere ha bidoro na-asị, “Nʼeziokwu, onye a bụ onye amụma ahụ nke ga-abịa nʼime ụwa.”
15 Yesu alipotambua kuwa walikuwa wanataka kumkamata ili wamfanye kuwa mfalme wao, alijitenga, tena na akaenda mlimani yeye peke yake.
Mgbe Jisọs matara na ha chọrọ ịbịa dọkpụrụ ya nʼike chie ya eze, ọ hapụrụ ha ga nʼugwu naanị ya, nʼonwe ya.
16 Ilipokuwa jioni, wanafunzi wake walishuka kwenda ziwani.
Mgbe o ruru nʼuhuruchi, ndị na-eso ụzọ ya rịdara gaa nʼọnụ mmiri,
17 Wakapanda kwenye mtumbwi na walikuwa wakivuka kuelekea Kapernaumu. (Giza lilikuwa limeingia na Yesu alikuwa bado hajaja kwao).
ebe ha banyere nʼotu ụgbọ mmiri, malite ịgabiga osimiri gawa nʼofe Kapanọm. Nʼoge a ọchịchịrị agbaala ma Jisọs alọghachikwutebeghị ha.
18 Wakati huo upepo mkali ulikuwa ukivuma, na bahari ilikuwa ikendelea kuchafuka.
Ebili mmiri maliri elu nʼihi nʼoke ifufe bidoro na-efe.
19 Tena wanafunzi wake walipokuwa wamepiga makasia kama ishirini na matano au thelathini, wakamwona Yesu akitembea juu ya bahari kuukaribia mtumbwi, na wakaogopa.
Ha akwọọla ụgbọ ihe dịka kilomita ise maọbụ isii, mgbe ha hụrụ Jisọs ka ọ na-aga ije nʼelu mmiri ahụ na-abịa nso nʼụgbọ mmiri ha. Oke egwu tụkwara ha.
20 Lakini akawambia, “Ni mimi! Msiogope.”
Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ọ bụ m.”
21 Tena walikuwa tayari kumbeba kwenye mtumbwi, na mara mtumbwi ulifika kwenye nchi mahali walipokuwa wakienda.
Mgbe ahụ, ha nabatara ya nʼime ụgbọ ahụ, ọ dịkwaghị anya ụgbọ ha bịaruru nʼelu ala ebe ha na-aga.
22 Siku iliyofuata, mkutano uliokuwa umesimama upande wa bahari waliona kuwa hakuna mtumbwi mwingine isipokuwa ule ambayo Yesu na wanafunzi wake walikuwa hawajaupanda lakini wanafunzi wake walikuwa wameenda zao wenyewe.
Nʼechi ya, igwe mmadụ ahụ nọdụrụ nʼofe ọzọ nke ọnụ mmiri ahụ chọpụtara na ọ bụ naanị otu ụgbọ mmiri nta bịara nʼebe ahụ, na Jisọs esoghị ndị na-eso ụzọ ya banye nʼime ya, kama na ọ bụ naanị ndị na-eso ụzọ ya ka ụgbọ mmiri ahụ buuru pụọ.
23 (Ingawa, kulikuwa na baadhi ya mitumbwi iliyotoka Tiberia karibu na mahali walipokula mikate baada ya Bwana kutoa shukrani).
Mgbe ahụ ụfọdụ ụgbọ mmiri si Tiberịas bịara kwụsị nso nso ebe ahụ ndị mmadụ nọ rie achịcha mgbe Onyenwe anyị nyechara ekele maka ya.
24 Wakati makutano walipotambua kuwa sio Yesu wala wanafunzi wake walikuwa kule, wao wenyewe walipanda ndani ya mitumbwi wakaenda Kapernaumu wakimtafuta Yesu.
Ma mgbe igwe mmadụ ahụ ghọtara na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya anọghị nʼebe ahụ, ha banyere nʼụgbọ mmiri nta ndị ahụ kwọfee gawa Kapanọm ịchọ Jisọs.
25 Baada ya kumpata upande mwingine wa ziwa wakamuuliza, “Rabbi ulikuja lini huku?”
Mgbe ha hụrụ ya nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ, ha sịrị ya, “Onye ozizi, olee mgbe i jiri bịa nʼebe a?”
26 Yesu akawajibu, akawambia, Amini, amini, mnanitafuta mimi, sio kwa sababu mliziona ishara, bali kwa sababu mlikula mikate na kushiba.
Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ihe unu ji na-achọ m abụghị nʼihi na unu hụrụ ihe ịrịbama m mere, kama na unu riri achịcha rijuokwa afọ.
27 Acheni kukifanyia kazi chakula chenye kuharibika, bali mkifanyie kazi chakula kidumucho hata milele kile ambacho mwana wa Adamu atawapa, kwa kuwa Mungu Baba ameweka muhuri juu yake.” (aiōnios )
Unu adọgbula onwe unu maka nri nke na-emebi emebi, kama maka nri nke na-adịgide ruo ndụ ebighị ebi, bụ nke Nwa nke Mmadụ ga-enye unu. Nʼihi na Chineke Nna akakwasịla ya akara nkwado ya.” (aiōnios )
28 Kisha wakamwambia, “Ni nini tunapaswa kufanya ili kuzifanya kazi za Mungu?”
Mgbe ahụ, ha sịrị, “Gịnị ka anyị ga-eme iji rụọ ọrụ Chineke?”
29 Yesu akajibu, “Hii ndiyo kazi ya Mungu: kwamba mmwamini yeye aliyemtuma.”
Jisọs zara sị ha, “Ọrụ Chineke bụ nke a, ikwere nʼonye ahụ o zitere.”
30 Basi wakamwambia, “Ni ishara zipi utakazofanya, kwamba tunaweza kuziona na kukuamini? Utafanya nini?
Ya mere ha sịrị ya, “Olee ihe ịrịbama ị ga-egosi anyị nke anyị ga-ahụ ma kwere na gị? Kedụ ọrụ ị ga-arụ?
31 Baba zetu walikula manna jangwani, kama ilivyo andikwa, “Aliwapa mikate kutoka mbinguni ili wale.”
Nna nna anyị ha riri mánà nʼọzara; dị ka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘O sitere nʼeluigwe nye ha achịcha ka ha rie.’”
32 Kisha Yesu akawajibu, “Amini, amini, sio Musa aliyewapa mkate kutoka mbinguni, bali Baba yangu ndiye awapaye mkate wa kweli kutoka mbinguni.
Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụghị Mosis nyere unu achịcha ahụ site nʼeluigwe, kama ọ bụ Nna m na-enye unu ezi achịcha ahụ site nʼeluigwe.
33 Kwa kuwa mkate wa Mungu ni ule ushukao kutoka mbinguni na kuupatia uzima ulimwengu.
Nʼihi na achịcha Chineke bụ nke ahụ si nʼeluigwe rịdata, na-enyekwa ụwa ndụ.”
34 Basi wakamwambia, “Bwana tupatie huu mkate wakati wote.”
Ha sịrị ya, “Nna anyị ukwu, nye anyị ụdị achịcha a site ugbu a gawa.”
35 Yesu akawambia, “Mimi ndiye mkate wa uzima, yeye ajaye kwangu hatapata njaa na yeye aniaminiye hatahisi kiu kamwe.”
Jisọs sịrị ha, “Abụ m achịcha ahụ na-enye ndụ. Onye ọbụla na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya. Onye ọbụla kwa kweere na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ.
36 Ingawa niliwaambia kwamba, mmeniona, na bado hamuamini.
Ma agwa m unu, unu ahụla m ma unu ekweghịkwa.
37 Wote ambao Baba anaonipa watakuja kwangu, na yeyote ajaye kwangu sitamtupa nje kabisa.
Onye ọbụla Nna ahụ nyere m ga-abịakwute m, onye ọbụla na-abịakwute m, agaghị m achụpụ ya.
38 Kwa kuwa nimeshuka kutoka mbinguni, sio kwa ajili ya kufanya mapenzi yangu, bali mapenzi yake aliyenituma.
Nʼihi na esi m nʼeluigwe rịdata nʼụwa ime uche onye ahụ zitere m, ọ bụghị ime uche nke m.
39 Na haya ndiyo mapenzi yake aliyenituma, kwamba nisimpoteze hata mmoja wa wale alionipa, bali nitawafufua siku ya mwisho.
Nke a bụkwa uche onye ahụ zitere m, na o nweghị onye ọbụla o nyere m ga-efunarị m, kama m ga-eme ka ha site nʼọnwụ bilie nʼụbọchị ikpeazụ.
40 Kwa kuwa haya ndiyo mapenzi ya Baba yangu, kwamba yeyote amtazamaye Mwana na kumwamini apate uzima wa milele; nami nitamfufua siku ya mwisho. (aiōnios )
Nke a bụ uche nke Nna m, na onye ọbụla lere Ọkpara ahụ anya, kwerekwa na ya ga-enweta ndụ ebighị ebi, m ga-emekwa ka o bilie nʼụbọchị ikpeazụ.” (aiōnios )
41 Kisha wayahudi wakamnung`unikia kumhusu yeye kwa sababu alisema, “Mimi ni mkate ulioshuka kutoka mbinguni.”
Nʼihi nke a, ndị Juu bidoro itamu ntamu megide ya nʼihi na ọ sịrị, “Abụ m achịcha ahụ siri nʼeluigwe rịdata.”
42 Wakasema, “Huyu siyo Yesu mwana wa Yusuph, ambaye baba yake na mama yake tunamfahamu? Imekuwaje sasa anasema, 'Nimeshuka kutoka mbinguni`?”
Ha sịrị, “Onye a ọ bụghị Jisọs, nwa Josef, bụ onye anyị matara nne na nna ya? Oleekwanụ otu o si ekwu ugbu a sị, ‘Esi m nʼeluigwe rịdata’?”
43 Yesu akajibu, akawambia, “Msinung'unikiane miongoni mwenu wenyewe.
Jisọs zara sị ha, “Unu atamula nʼetiti onwe unu.
44 Hakuna mtu ajaye kwangu asipovutwa na Baba yangu aliyenituma, nami nitamfufua siku ya mwisho.
O nweghị onye nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụghị na Nna ahụ zitere m kpọtara ya, aga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ.
45 Kwa kuwa imeandikwa katika manabii, 'Watafundishwa na Mungu.' Kila aliyesikia na amejifunza kutoka kwa Baba, huja kwangu.
E dere ya nʼakwụkwọ ndị amụma, ‘Ha niile ga-abụ ndị Chineke ga-akụziri ihe.’Onye ọbụla nke gere Nna ahụ ntị ma mụtakwa ihe site na ya na-abịakwute m.
46 Sio kwamba kuna mtu aliyemwona Baba, isipokuwa yeye atokaye kwa Mungu- amemwona Baba.
O nweghị onye ọbụla hụrụla Nna ahụ karịakwa onye ahụ sitere na Chineke, naanị ya hụrụla Nna ahụ.
47 Amini, amini yeye aaminiye anao uzima wa milele. (aiōnios )
Nʼeze, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla kwerenụ nwere ndụ ebighị ebi. (aiōnios )
48 Mimi ni mkate wa uzima.
Abụ m achịcha nke ndụ.
49 mababa zenu walikula manna jangwani, na wakafa.
Nna nna unu ha riri mánà ahụ nʼime ọzara ma mecha nwụọ.
50 Huu ndio mkate ushukao kutoka mbinguni, ili kwamba mtu aule sehemu yake ili asife.
Ma nke a bụ achịcha ahụ nke si nʼeluigwe bịa, nke mmadụ pụrụ iri ma ghara ịnwụ anwụ.
51 Mimi ni mkate uishio ambao umeshuka kutoka mbinguni. Kama mtu yeyote akila sehemu ya mkate huu, ataishi milele. Mkate nitakao utoa ni mwili wangu kwa ajili ya uzima wa ulimwengu.” (aiōn )
Abụ m achịcha dị ndụ nke siri nʼeluigwe bịa. Ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ruo ebighị ebi. Nri a bụ anụ ahụ m, nke m ga-enye maka ndụ nke ụwa.” (aiōn )
52 Wayahudi wakakasirika wenyewe kwa wenyewe na wakaanza kubishana wakisema, “Mtu huyu anawezaje kutupa mwili wake tuule?”
Mgbe ahụ, ndị Juu bidoro na-arụrịta ụka ike nʼetiti onwe ha sị, “Olee otu nwoke a ga-esi nye anyị anụ ahụ ya ka anyị rie?”
53 Kisha Yesu akawambia, “Amini, amini, msipoula mwili wa Mwana wa Adamu na kuinywa damu yake, hamta kuwa na uzima ndani yenu.
Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, naanị ma unu riri anụ ahụ Nwa nke Mmadụ ma ṅụọkwa ọbara ya, unu agaghị enwe ndụ nʼime onwe unu.
54 Yeyote aulaye mwili wangu na kuinywa damu yangu anao uzima wa milele, nami nitamfufua siku ya mwisho. (aiōnios )
Onye ọbụla riri anụ ahụ m, ṅụọkwa ọbara m nwere ndụ ebighị ebi. A ga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ ahụ. (aiōnios )
55 Kwa kuwa mwili wangu ni chakula cha kweli, na damu yangu ni kinywaji cha kweli.
Nʼihi na anụ ahụ m bụ ezigbo nri, ọbara m bụkwa ezigbo ihe ọṅụṅụ.
56 Yeye aulaye mwili wangu na kuinywa damu yangu hukaa ndani yangu, nami ndani yake.
Onye ọbụla na-eri anụ ahụ m na-aṅụkwa ọbara m na-anọgide nʼime m mụ onwe m kwa nʼime ya.
57 Kama Baba mwenye uzima alivyonituma, na kama niishivyo kwa sababu ya Baba, na yeye pia ataishi kwa sababu yangu.
Dị ka Nna ahụ dị ndụ zitere m, ana m adịkwa ndụ nʼihi Nna ahụ, otu a ka onye na-eri m ga-adịkwa ndụ site na m.
58 Huu ndio mkate ushukao kutoka mbinguni, sio kama vile mababa walivyo kula wakafa. Yeye aulaye mkate huu ataishi milele. (aiōn )
Nke a bụ achịcha ahụ si nʼeluigwe bịa. Nna nna unu ha riri mánà ma nwụkwaa, ma onye ọbụla na-eri achịcha a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” (aiōn )
59 Yesu aliyasema mambo haya ndani ya sinagogi alipokuwa akifundisha huko Kapernaumu.
O kwuru ihe ndị a mgbe ọ na-akụzi ihe nʼụlọ ekpere dị na Kapanọm.
60 Ndipo wengi wa wanafunzi wake waliposikia haya, wakasema, “Hili nifundisho gumu ni nani awezaye kulipokea?”
Mgbe ọtụtụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya ha nụrụ nke a, ha sịrị, “Nke a bụ ozizi siri ike, onye nwere ike ịnabata ya?”
61 Yesu kwa sababu alijua ya kuwa wanafunzi wake walikuwa wakilinung'unikia jambo hili, akawambia je jambo hili linawakwaza?
Ebe Jisọs matara na ndị na-eso ụzọ ya na-atamu ntamu maka nke a ọ sịrị ha, “Nke a ọ na-ewute unu?
62 Basi itakuaje mtakapomwona mwana wa Adamu akishuka kutoka alikokuwa kabla?
Gịnị ka unu ga-ekwu ma ọ bụrụ na unu ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-arịgo ebe ọ nọrịị na mbụ.
63 Ni Roho ndiye atoaye uzima. Mwili haufaidii kitu chochote. Maneno niliyoyasema kwenu ni roho na ni uzima.
Ọ bụ Mmụọ ahụ na-enye ndụ; anụ ahụ abaghị uru ọbụla, okwu ndị m gwara unu bụ mmụọ bụrụkwa ndụ.
64 Bado kuna watu kati yenu wasioamini.” kwa sababu Yesu alijua tangu mwanzo yule ambaye asiyeweza kuamini na yeye ambaye angemsaliti.
Ma nʼetiti unu, ọ dị ụfọdụ na-ekwenyeghị.” Nʼihi na Jisọs maara site na mmalite ndị ahụ nʼime ha na-ekwenyeghị, matakwa onye ahụ nke ga-arara ya nye.
65 Akawambia, ni kwa sababu hii niliwambia kwamba hakuna mtu awezaye kuja kwangu isipokuwa amepewa na Baba.”
Ọ sịrị, “Ọ bụ nke a mere m jiri gwa unu na o nweghị onye ọbụla nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m enyeghị ya ike.”
66 Baada ya haya wanafunzi wake wengi walirudi nyuma na hawakuambatana naye tena.
Nʼihi nke a, ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya laghachiri azụ, kwụsị iso ya.
67 Yesu akawambia wale kumi na wawili, “Je na ninyi mnataka kuondoka?”
Jisọs sịrị mmadụ iri na abụọ ahụ, “Unu chọkwara iso ha pụọ?”
68 Simoni Petro akamjibu, “Bwana twende kwa nani kwani wewe unayo maneno ya uzima wa milele, (aiōnios )
Saimọn Pita zara ya sị, “Onyenwe anyị, onye ka anyị ga-agakwuru? Ọ bụ gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi. (aiōnios )
69 na tumeamini na kujua kuwa wewe ni Mtakatifu wa Mungu.”
Anyị kweere marakwa na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.”
70 Yesu akawambia, “Je mimi sikuwachagua ninyi, na mmoja wenu ni ibilisi?
Jisọs zara ha, “Ọ bụghị m họpụtara unu mmadụ iri na abụọ? Ma otu onye nʼime unu bụ ekwensu!”
71 Sasa alikuwa akiongea kuhusu Yuda, mwana wa Simoni Iskariote, kwa kuwa alikuwa ni yeye akiwa mmoja wa wale kumi na wawili, ambaye ndiye angemsaliti Yesu.
Ọ na-ekwu banyere Judas nwa Saimọn Iskarịọt, onye nʼagbanyeghị na ọ bụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ ahụ, bụ onye ga-arara ya nye.