< Yohana 20 >

1 Mapema siku ya kwanza ya juma, kungali bado giza, Mariamu Magdalena alikuja kaburini; akaliona lile jiwe limeondolewa kaburini.
Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe chi na-abọzibeghị nke ọma, Meri Magdalin bịara nʼili ahụ, ma hụ na e wepụla nkume ahụ e jiri mechie ọnụ ili ahụ.
2 Kwa hiyo akakimbia mbio kwenda kwa Simon Petro na kwa yule mwanafunzi mwingine ambaye Yesu alimpenda, kisha akawaambia, “wamemchukua Bwana kaburini, nasi hatujui kule walikomlaza.”
O ji ọsọ bịakwute Saimọn Pita na onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, bụ onye Jisọs hụrụ nʼanya sị, “Ha esitela nʼili ahụ bupụ Onyenwe anyị. Anyị amaghị ebe ha dobere ya!”
3 Kisha Petro na yule mwanafunzi mwingine wakatoka, kuelekea kaburini.
Ya mere Pita na onye nke ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya pụrụ gawa nʼili ahụ.
4 Wote walipiga mbio kwa pamoja; yule mwanafunzi mwingine alikimbia kwa kasi zaidi ya Petro nakufika kaburini wa kwanza.
Ha abụọ jiri ọsọ na-aga, ma onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya gbakarịrị Pita nʼọsọ buru ya ụzọ ruo nʼili ahụ.
5 Akasimama na kisha kuangalia kaburini; akaiona ile sanda ya kitani imelala, lakini hakuingia ndani.
O hulatara ala, nyoo anya nʼime ili, hụ akwa ọcha ahụ ebe ha wụsara nʼala, ma ọ baghị nʼime.
6 Kisha Simon Petro naye akafika akaingia ndani ya Kaburi. Akaiona ile sanda ya kitani imelala pale
Ya mere Saimọn Pita, onye na-eso ya nʼazụ bịarutere banye nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ akwa ozu ahụ ka ọ wụsara nʼala,
7 na ile leso iliyokuwa kichwani pake haikuwa imelala pamoja na zile sanda za kitani bali ilikuwa imelala pembeni peke yake.
ya na akwa nke e ji kechie ya isi. Ịchafọ a na akwa ọcha ahụ adịkọtaghị nʼotu ebe, kama a pịara ya apịa dobe ya iche nʼebe ọzọ.
8 Ndipo yule mwanafunzi mwingine naye alipoingia ndani ya kaburi; akaona na kuamini.
Onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, onye nke buru ụzọ bịaruo nʼili banyekwara nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ ma kwerekwa.
9 Kwa kuwa hadi wakati huo walikuwa bado hawajayajua maandiko kwamba ilimlazimu Yesu afufuke tena katika wafu.
(Ruo nʼoge a, ha aghọtabeghị site nʼakwụkwọ nsọ na ọ ghaghị i si nʼọnwụ bilie.)
10 Kisha wanafunzi wakaenda tena nyumbani kwao.
Emesịa ndị na-eso ụzọ ya laghachiri nʼụlọ ha.
11 Hata hivyo, Mariamu alikuwa amesimama kaburini akilia, alivyokuwa akiendelea kulia alisimama kisha akatazama kaburini.
Ma Meri guzo nʼakụkụ ili ahụ na-ebe akwa. Mgbe ọ nọ na-ebe akwa, o hulatara ala nyoo anya nʼime ili ahụ
12 Akaona malaika wawili wenye sura nyeupe wamekaa mmoja kichwani na mwingine miguuni mahali ambapo Yesu alikuwa amelala.
hụ ndị mmụọ ozi abụọ yi uwe ọcha, ka ha nọdụrụ ala otu nʼisi, nke ọzọ nʼụkwụ, nʼebe ahụ atọgbọrọ ahụ Jisọs.
13 Nao wakamwambia, “Mwanamke, kwa nini unalia?” Naye akawaambia, “Ni kwa sababu wamemchukua Bwana wangu, nami sijui walikomweka.”
Ha sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere i ji ebe akwa?” Ọ sịrị ha, “Ha ebupụla Onyenwe m, amaghị m ebe ha bujere ya.”
14 Alipokwisha sema hayo, aligeuka na kumwona Yesu akiwa amesimama. Lakini hakutambua kama huyo alikuwa Yesu.
Nʼoge a, ọ tụgharịrị hụ ka Jisọs guzo nʼebe ahụ. Ma ọ mataghị na ọ bụ Jisọs.
15 Naye Yesu akamwambia, “Mama, kwa nini unalia? Unamtafuta nani?” Naye huku akidhani kuwa ni mtunza bustani akamwambia, “Bwana, kama ni wewe uliyemchukua, niambie ulikomweka, nami nitamchukua.”
Jisọs sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere iji ebe akwa? Onye ka ị na-achọ?” Ebe o chere na ọ bụ onye na-elekọta ogige ahụ, ọ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe i debere ya ka m gaa buru ya.”
16 Yesu akamwambia, “Mariamu.” Naye akageuka mwenyewe na kumwambia kwa Kiaramu, “Raboni,” yaani hii ni kusema, “Mwalimu.”
Jisọs sịrị ya, “Meri.” Ọ tụgharịrị tie mkpu nʼolu Hibru sị ya, “Raboni!” (nke pụtara “Onye nkuzi.)”
17 Yesu akamwambia, “Usiniguse, kwani bado sijapaa kwenda kwa baba; bali uende kwa ndugu zangu ukawaambie kuwa nitapaa kwenda kwa Baba yangu ambaye pia ni Baba yenu, Mungu wangu na Mungu wenu.”
Jisọs sịrị ya, “Emetụkwala m aka nʼihi na alakwurubeghị m Nna m. Kama gakwuru ụmụnna m gwa ha, ‘Ana m alakwuru Nna m na Nna unu. Chineke m na Chineke unu.’”
18 Mariamu Magdalena akaja kuwaambia wanafunzi, “Nimemwona Bwana,” na kwamba amemwambia mambo haya.
Meri Magdalin gara gwa ndị na-eso ụzọ ya, “Ahụla m Onyenwe anyị.” Ọ kọọrọ ha na ọ bụ ya gwara ya ihe ndị a niile.
19 Na ilipokuwa jioni, siku hiyo, siku ya kwanza ya juma, na milango ikiwa imefungwa mahali wanafunzi walipokuwapo kwa kuwahofia Wayahudi, Yesu alikuja na kusimama katikati yao na kuwaambia, “Amani iwe kwenu.”
Nʼuhuruchi nke ụbọchị ahụ, bụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe ndị na-eso ụzọ ya zukọtara nʼime otu ụlọ. Ha mechiri ụzọ niile nʼihi egwu ndị Juu. Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu!”
20 Alipokwisha sema haya akawaonesha mikono yake na ubavu wake. Nao wanafunzi walipomwona Bwana walifurahi.
Mgbe o kwusiri nke a, o gosiri ha aka ya na akụkụ ya. Ọṅụ juru ndị na-eso ụzọ ya obi nʼihi na ha ahụla Onyenwe anyị.
21 Kisha Yesu akawaambia tena, “Amani iwe nanyi. Kama vile Baba alivyonituma mimi, vivyo hivyo nami nawatuma ninyi.”
Ọzọkwa, Jisọs sịrị ha, “Udo dịrị unu! Dị ka Nna m si zite m, otu a ka m na-eziga unu.”
22 Yesu alipokwisha sema hayo, akawavuvia akawaambia, Pokeeni Roho Mtakatifu.
Mgbe o kwuchara nke a, o kusara ha ume sị ha, “Naranụ Mmụọ Nsọ.
23 Yeyote mmsameheye dhambi, wamesamehewa; na wale mtakaowafungia watafungiwa.”
Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọbụla mmehie ya, a ga-agbaghara ya, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaghara ha, agaghị agbaghara ha.”
24 Thomaso, mmoja wa wale kumi na wawili, aliyeitwa Didimas, hakuwa na wanafunzi wenzake Yesu alipokuja.
Ma Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ, anọghị ya mgbe Jisọs bịara.
25 Wale wanafunzi wengine waka mwambia baadaye, “Tumemwona Bwana.” Naye akawambia, “Kama sitaona alama za misumari katika mikono yake, na kuweka vidole vyangu kwenye hizo alama, na pia kuweka mkono wangu kwenye ubavu wake sitaamini.”
Ya mere, ndị ọzọ na-eso ụzọ ya gwara ya, “Anyị ahụla Onyenwe anyị!” Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụ naanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ahụ ntu kpọpuru ya aka, tinye mkpịsịaka m nʼapa ntu ndị ahụ, ma tinyekwa aka m nʼakụkụ ya ebe ahụ a mara ya ùbe, ka m ga-ekwere.”
26 Baada ya siku nane wanafunzi walikuwa chumbani tena, naye Thomaso alikuwa pamoja nao. Wakati milango ilipokuwa imefungwa Yesu alisimama katikati yao. na akasema, “Amani na iwe nanyi.”
Mgbe abalị asatọ gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya zukọtara ọzọ. Ugbu a Tọmọs nọkwa nʼetiti ha. Nʼagbanyeghị na e mechisịrị ụzọ niile, Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.”
27 Kisha akamwambia Thomaso, leta kidole chako na uone mikono yangu; leta hapa mikono yako na uweke kwenye ubavu wangu; wala usiwe asiyeamini bali aaminiye.”
Mgbe ahụ ọ sịrị Tọmọs, “Rụnye mkpịsịaka gị nʼebe a, leekwa aka m abụọ. Wepụta aka gị tinyekwa nʼakụkụ m. Abụla onye na-enweghị okwukwe, kama kwere.”
28 Naye Thomaso akajibu na kumwambia, “Bwana wangu na Mungu wangu.”
Tọmọs zara sị ya, “Onyenwe m na Chineke m!”
29 Yesu akamwambia, Kwa kuwa umeniona, umeamini. Wamebarikiwa wao wanaoamini, pasipokuona.”
Ma Jisọs sịrị ya, “I kweere nʼihi na ị hụla m? Ma ngọzị dịrị ndị na-ahụghị ma kwere.”
30 Kisha Yesu alifanya ishara nyingi mbele ya wanafunzi, ambazo hazijawahi kuandikwa katika kitabu hiki;
Ọ dị ọtụtụ ihe ịrịbama ndị ọzọ Jisọs rụrụ nʼihu ndị na-eso ụzọ ya. Ma edeghị ha nʼime akwụkwọ a.
31 bali hizi zimeandikwa ili kwamba muweze kuamini kwamba Yesu ndiye Kristo, mwana wa Mungu, na kwamba muaminipo muwe na uzima katika jina lake.
Ma e dere ihe ndị a niile ka unu kwere na Jisọs bụ Kraịst, Ọkpara Chineke. Nʼihi na ọ bụ site nʼikwere ka unu ga-eji nweta ndụ ọhụrụ site nʼaha ya.

< Yohana 20 >