< Yohana 11 >
1 Basi mtu mmoja jina lake Lazaro alikuwa mgonjwa. Alitokea Bethania, kijiji cha Mariamu na dada yake Martha.
Nʼoge ahụ, ahụ adịghị otu nwoke a na-akpọ Lazarọs onye Betani, nke bụ obodo nta nke Meri na Mata nwanne ya nwanyị.
2 Alikuwa ni Mariamu yule yule aliyempaka Bwana Marhamu na kumfuta miguu yake kwa nywele zake, ambaye ndugu yake Lazaro alikuwa ni mgonjwa.
Nke a bụ Meri ahụ weere mmanụ otite dị oke ọnụahịa tee Onyenwe anyị, ma jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Ọ bụ nwanne ya nwoke Lazarọs bụ onye nọ nʼọrịa.
3 Ndipo dada hawa walituma ujumbe kwa Yesu na kusema, “Bwana, angalia yule umpendaye anaumwa.”
Nke a mere ụmụnne ya nwanyị zigara Jisọs ozi sị, “Onyenwe anyị, onye ahụ nke ị hụrụ nʼanya nọ nʼọrịa.”
4 Yesu aliposikia alisema, “Ugonjwa huu si wa mauti, lakini, badala yake ni kwa ajili ya utukufu wa Mungu ili kwamba Mwana wa Mungu apate kutukuzwa katika huo Ugonjwa.”
Mgbe Jisọs nụrụ ya, ọ sịrị, “Ọrịa a abụghị nke ọnwụ kama ọ bụ iji nye Chineke otuto nakwa ka e site na ya nye Ọkpara Chineke otuto.”
5 Yesu alimpenda Martha na dada yake na Lazaro.
Jisọs hụrụ Mata, na nwanne ya nwanyị na Lazarọs nʼanya.
6 Aliposikia kuwa Lazaro ni mgonjwa, Yesu alikaa siku mbili zaidi mahali alipokuwa.
Mgbe ọ nụrụ na Lazarọs nọ nʼọrịa, ọ nọkwuru mkpụrụ ụbọchị abụọ nʼebe ahụ ọ nọ.
7 Ndipo baada ya hili aliwaambia wanafunzi wake, “Twendeni Uyahudi tena.”
Ya mere, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Ngwanụ ka anyị laghachi azụ na Judịa.”
8 Wanafunzi wakamwambia, “Rabi, Wayahudi walikuwa wakijaribu kukuponda mawe, na wewe unataka kurudi huko tena?”
Ma ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onye ozizi, nʼoge nta gara aga ka ndị Juu chọrọ ịtụ gị nkume. Ị na-agakwa ebe ahụ ọzọ?”
9 Yesu akawajibu, “Saa za mchana si kumi na mbili? Mtu anapotembea mchana hawezi kujikwaa, kwa sababu anaona kwa nuru ya mchana.
Jisọs zara, “Ọ bụghị awa iri na abụọ dị nʼotu ehihie nke ụbọchị? Onye na-ejegharị nʼehihie anaghị asụ ngọngọ, nʼihi na ọ na-eji ìhè nke ụwa a ahụ ụzọ.
10 Hata hivyo, ikiwa atatembea usiku, atajikwaa kwa sababu nuru haiko ndani yake.”
Ma ndị na-ejegharị nʼabalị na-azọhie ụkwụ, nʼihi na ìhè adịghị nʼime ha.”
11 Yesu akasema mambo haya, na baada ya mambo haya, akawaambia, “Rafiki yetu Lazaro amelala, lakini ninakwenda ili kwamba nipate kumuamsha kutoka usingizini.”
Mgbe o kwusiri nke a, ọ gwakwara ha, “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma ana m aga ịkpọte ya nʼụra.”
12 Ndipo wanafunzi wakamwambia, “Bwana, kama amelala, ataamka.
Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ na-arahụ ụra, ọ ga-adị mma.”
13 Wakati huu Yesu alikuwa akizungumza habari za kifo cha Lazaro, lakini wao walidhani anazungumza juu ya kulala usingizi.
Ihe Jisọs na-ekwu bụ banyere ọnwụ ya ma ha chere na ọ na-ekwu banyere ịrahụ ụra efu.
14 Ndipo Yesu akazungumza nao wazi wazi, “Lazaro amekufa.
Mgbe ahụ, Jisọs gwaghere ha ọnụ, “Lazarọs anwụọla.
15 Nina furaha kwa ajili yenu, kwamba sikuwepo kule ili kwamba mpate kuamini. Twendeni kwake.”
Ma nʼihi unu, obi dị m ụtọ na anọghị m nʼebe ahụ, ka unu nwe ike kwere. Ma bịanụ ka anyị gakwuru ya.”
16 Basi Tomaso, aliyeitwa Pacha, aliwaambia wanafunzi wenzake, “Nasi twendeni pia tukafe pamoja na Yesu.”
Tọmọs, onye a na-akpọ Didimọs, gwara ndị na-eso ụzọ ibe ya, “Ka anyị gakwanụ ka anyị soro ya nwụọ.”
17 Wakati Yesu alipokuja, alikuta kwamba Lazaro tayari amekwishakuwa kaburini siku nne.
Mgbe Jisọs rutere, ọ chọpụtara na Lazarọs anọọlarị nʼili ụbọchị anọ.
18 Nayo Bethania ilikuwa karibu na Yerusalemu kama kilomita arobaini na tano hivi.
Betani dị Jerusalem nso, ihe dị ka kilomita atọ.
19 Wengi kati ya Wayahudi wakaja kwa Martha na Mariamu kuwafariji kwa ajili ya ndugu yao.
Ma ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Mata na Meri ịkasị ha obi nʼihi ọnwụ nwanne ha nwoke.
20 Ndipo Martha aliposikia kuwa Yesu anakuja, alienda kukutana naye, lakini Mariamu aliendelea kukaa nyumbani.
Mgbe ozi ọbịbịa Jisọs ruru Mata ntị, ọ gara izute ya, ma Meri nọdụrụ nʼụlọ.
21 Ndipo Martha akamwambia Yesu, “Bwana, kama ungelikuwa hapa, kaka yangu asingelikufa.
Mata sịrị Jisọs, “Onyenwe m, a sị na ị nọ nʼebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.
22 Hata sasa, najua ya kuwa lolote utakaloomba kutoka kwa Mungu, atakupatia.”
Ma ugbu a, amara m na Chineke ga-enye gị ihe ọbụla ị rịọrọ.”
23 Yesu akamwambia, kaka yako atafufuka tena.”
Jisọs sịrị ya, “Nwanne gị nwoke ga-ebili ọzọ.”
24 Martha akamwambia, najua kwamba atafufuka katika ufufuo siku ya mwisho.”
Mata sịrị ya, “Amara m na ọ ga-ebili ọzọ nʼụbọchị mbilite nʼọnwụ nʼoge ikpeazụ.”
25 Yesu akamwambia, “Mimi ni ufufuo na uzima; yeye aniaminiye, ingawa atakufa, hata hivyo atakuwa anaishi;
Jisọs gwara ya, “Mụ onwe m bụ mbilite nʼọnwụ na ndụ. Onye ọbụla kwere na m, a sịkwarị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.
26 na yeye aishiye na kuniamini mimi hatakufa. Unaamini hili?” (aiōn )
Ma onye ọbụla dị ndụ nke na-ekwere na m agaghị anwụ. Ị kwere nke a?” (aiōn )
27 Akamwambia, “Ndiyo, Bwana naamini kwamba wewe ni Kristo, Mwana wa Mungu, yeye ajaye katika ulimwengu.”
Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe m, ekwere m na ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke, onye ga-abịa nʼụwa.”
28 Alipokwisha kusema hili, alienda zake na kumwita dada yake Mariamu faraghani. Akasema, “Mwalimu yuko hapa na anakuita.”
Mgbe o kwuchara nke a, ọ gara kpọọ nwanne ya nwanyị bụ Meri, jiri nwayọọ sị ya, “Onye ozizi abịala, ọ na-akpọ gị.”
29 Mariamu aliposikia haya, aliinuka kwa haraka na kwenda kwa Yesu.
Mgbe ọ nụrụ nke a, ọ biliri ọsịịsọ ga zute ya.
30 Naye Yesu alikuwa hajaja bado ndani ya kijiji, bali alikuwa bado mahali alipokutana na Martha.
Ruo mgbe a, Jisọs abịarutebeghị nʼobodo nta ahụ, ma ọ ka nọ nʼebe ahụ Mata zutere ya.
31 Ndipo Wayahudi waliokuwa na Mariamu katika nyumba na wale waliokuwa wakimfariji, walipomuona akiinuka haraka na kutoka nje, walimfuata; walidhani kuwa anaenda kaburini ili akalie huko.
Ndị Juu nọ nʼụlọ na-akasị Meri obi hụrụ ya ka ọ pụrụ ngwangwa. Ha sochiri ya nʼazụ nʼihi na ha chere na ọ na-aga nʼili ibe akwa nʼebe ahụ.
32 Ndipo Mariamu, alipofika pale Yesu alipokuwa alimuona na, alianguka chini ya miguu yake na kumwambia, “Bwana, kama ungelikuwa hapa, ndugu yangu asingelikufa.”
Mgbe Meri rutere nʼebe Jisọs nọ, ọ dara nʼụkwụ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị nọ nʼebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.”
33 Yesu alipomuona analia, na Wayahudi waliokuja pamoja naye walikuwa wakilia pia, aliomboleza katika roho na kufadhaika;
Mgbe Jisọs hụrụ ya ka ọ na-ebe akwa ya na ndị Juu ahụ so ya ka ha na-ebekwa akwa, o metụrụ ya nʼime mmụọ ya. O nwere ọmịiko dị ukwuu.
34 akasema, “Mmemlaza wapi? wakamwambia, Bwana, njoo utazame.”
Ọ sịrị, “Olee ebe unu liri ya?” Ha sịrị ya, “Onyenwe anyị bịa ka ị hụ.”
36 Ndipo Wayahudi wakasema, “Angalia alivyompenda Lazaro!”
Mgbe ahụ ndị Juu na-asị, “Lee ka o si hụ ya nʼanya.”
37 Lakini wengine kati yao wakasema, “Siyo huyu, mtu aliyeyafumbua macho ya yule aliyekuwa kipofu, hakuweza kumfanya huyu mtu asife?”
Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Nwoke a meghere anya onye kpuru ìsì, ọ garaghị enwe ike mee ka nwoke a hapụ ịnwụ?”
38 Ndipo Yesu, hali akiomboleza nafsini mwake tena, alienda kwenye kaburi. Sasa lilikuwa pango, na jiwe limewekwa juu yake.
Ọzọkwa, Jisọs sụrụ ude nʼime onwe ya nke ukwuu, bịarute nʼili ahụ nso. Ili ahụ bụ ọgba e jiri nkume dị ukwuu mechie ọnụ ya.
39 Yesu akasema, “Liondoweni jiwe.” Martha, dada yake na Lazaro, yeye aliyekufa, akamwambia Yesu, “Bwana, kwa muda huu, mwili utakuwa umeoza, kwa sababu amekwishakuwa maiti kwa siku nne.”
Jisọs sịrị, “Bupunụ nkume ahụ!” Ma Mata, nwanne nwanyị onye ahụ nwụrụ anwụ, sịrị ya, “Onyenwe anyị, ọ ga na-esi isi ugbu a, nʼihi na nke a bụ abalị anọ ọ nwụrụ.”
40 Yesu akamwambia, “Mimi sikukuwaambia ya kwamba, kama ukiamini, utauona utukufu wa Mungu?”
Ma Jisọs sịrị ya, “Ọ bụ na m agwaghị gị sị na ọ bụrụ na ị kwere ị ga-ahụ ọrụ ebube Chineke?”
41 Kwa hiyo wakaliondoa jiwe. Yesu akainua macho yake juu na kusema, “Baba, nakushukuru kwa kuwa unanisikiliza.
Ya mere, ha bupụrụ nkume ahụ. Jisọs lere anya nʼelu sị, “Nna, ana m ekele gị nʼihi na ị nụla olu m.
42 Nilijua kwamba unanisikia mara zote, lakini ni kwa sababu ya kusanyiko ambalo limesimama kunizunguka kwamba nimesema haya, ili kwamba wapate kuamini kuwa wewe umenituma.”
Amaara m na ị na-anụ olu m mgbe niile. Ana m ekwu nke a nʼihi ndị a gbara m gburugburu nʼebe a, ka ha kwere na ọ bụ gị zitere m.”
43 Baada ya kusema haya, alilia kwa sauti kubwa, “Lazaro, toka nje!”
Mgbe o kwusiri nke a, o jiri oke olu tie mkpu, “Lazarọs, pụta!”
44 Mfu alitoka nje amefungwa mikono na miguu kwa sanda za kuzikia, na uso wake ulifungwa na kitambaa.” Yesu akawaambia, “Mfungueni mkamwache aende.”
Onye ahụ nwụrụ anwụ pụtara, e jikwa akwa ozu kekọta aka ya na ụkwụ ya, werekwa akwa ịchafu kechie ihu ya. Jisọs sịrị ha, “Tọpụnụ ya, hapụ ya ka ọ laa.”
45 Ndipo Wayahudi wengi waliokuja kwa Mariamu na kuona Yesu alichofanya, walimwamini;
Ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Meri bụ ndị hụrụ ihe a o mere, kwere na ya.
46 lakini baadhi yao walienda kwa Mafarisayo na kuwaambia mambo aliyoyafanya Yesu.
Ma ụfọdụ nʼime ha lara gaa kọọrọ ndị Farisii ihe o mere.
47 Ndipo wakuu wa Makuhani na Mafarisayo wakakusanyika pamoja katika baraza na kusema, “Tutafanya nini? Mtu huyu anafanya ishara nyingi.
Mgbe ahụ, ndịisi nchụaja na ndị Farisii kpọrọ nzukọ ndị Sanhedrin. Ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme? Nʼihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịbama.
48 Ikiwa tutamwacha hivi peke yake, wote watamwamini; Warumi watakuja na kuchukua vyote mahali petu na taifa letu.”
Ọ bụrụ na anyị ahapụ ya ka ọ gaa nʼihu, mmadụ niile ga-ekwere na ya. Ndị Rom ga-abịakwa, kwatuo ụlọnsọ ukwu ma napụ anyị obodo anyị.”
49 Hata hivyo, mtu mmoja kati yao, Kayafa, aliyekuwa kuhani Mkuu mwaka huo, akawaambia, “Hamjui chochote kabisa.
Ma otu onye nʼime ha bụ Kaịfas, onyeisi nchụaja nʼafọ ahụ sịrị ha, “Unu amaghị ihe ọbụla.
50 Hamfikirii kwamba yafaa kwa ajili yenu kwamba mtu mmoja yapasa kufa kwa ajili ya watu kuliko taifa lote kuangamia.”
Ọ bụ na unu amaghị na ọ ka mma ka otu onye nwụọ nʼihi mmadụ niile, karịa nʼobodo anyị niile ga-ala nʼiyi.”
51 Haya hakuyasema kwa sababu yake mwenyewe, badala yake, kwa kuwa alikuwa kuhani mkuu mwaka ule, alitabiri kwamba Yesu atakufa kwa ajili ya taifa;
Dị ka onyeisi nchụaja nke afọ ahụ, o kwughị nke a site nʼechiche ya, kama o buru amụma na Jisọs ga-anwụ nʼihi mba ndị Juu.
52 na si kwa taifa peke yake, bali Yesu apate vile vile kuwakusanya watoto wa Mungu ambao wametawanyika sehemu mbali mbali.
Ọ bụghị nʼihi mba ahụ naanị, kama, ka ọ kpọkọta ụmụ Chineke ndị gbasara nʼebe niile.
53 Kwa hiyo kuanzia siku hiyo na kuendelea wakapanga namna ya kumwua Yesu.
Ya mere, site nʼụbọchị ahụ, ha malitere ịgba izu otu ha ga-esi gbuo ya.
54 Yesu hakutembea tena wazi wazi kati ya Wayahudi, bali aliondoka hapo na kwenda nchi iliyo karibu na jangwa katika mji uitwao Efraimu. Hapo alikaa na wanafunzi.
Ya mere, Jisọs kwụsịrị ịgagharị ebe ndị Juu ga-ahụ ya. O siri nʼebe ahụ pụọ gaa nʼakụkụ ọzara nʼotu obodo nta a na-akpọ Ifrem. Ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụrụ nʼebe ahụ.
55 Basi Pasaka ya Wayahudi ilikuwa karibu, na wengi wakapanda kwenda Yerusalemu nje ya mji kabla ya Pasaka ili wapate kujitakasa wenyewe.
Mmemme Ngabiga ndị Juu dịkwa nso. Ọtụtụ ndị mmadụ si nʼakụkụ ala ndị Juu niile bịa Jerusalem. Ha bịara tutu mmemme ahụ ebido ka ha mee onwe ha ka ha dị ọcha.
56 Walikuwa wakimtafuta Yesu, na kuzungumza kila mmoja walipokuwa wamesimama hekaluni, “Mnafikiri nini? Kwamba hatakuja katika sikukuu?”
Ha na-achọ Jisọs na-ajụrịta onwe ha nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ, “Gịnị ka unu chere? Ọ bụ na ọ gaghị abịa na mmemme a?”
57 Wakati huu wakuu wa makuhani na Mafarisayo walikuwa wametoa amri kwamba ikiwa mmoja atajua Yesu alipo, anapaswa kutoa taarifa ili kwamba wapate kumkamata.
Ma nʼoge ahụ, ndịisi nchụaja na ndị Farisii enyela iwu ka onye ọbụla hụrụ ya bịa gwa ha ka ha gaa jide ya.