< Isaya 9 >

1 Viza itaondolewa kwa yeyote ambaye yuko kwenye dhiki. Katika kipindi cha awali aliifedhehesha nchi ya Zebuluni na nchi ya Naftali, lakini kipindi cha baadae ataifanya itukuke, njia ya kuelekea baharini, mbele ya Yordani na mataifa ya Galilaya.
Ma otu ọbụla o siri dị, oge ahụhụ na ọchịchịrị na iru ụjụ ahụ agaghị adịgide nye ndị ahụ nọ na nkpa. Nʼihi na nʼoge gara aga, o mere ka e lelịa ala Zebụlọn na ala Naftalị anya, ma nʼoge dị nʼihu, ọ ga-eme ka a asọpụrụ Galili nke mba niile, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọdan.
2 Watu wanotembeakatika giza wameona wameona mwanga mkubwa; wale waishio katika nchi ya uvuli wa mauti, mwanga umewaka juu yao.
Ndị nọ na-agagharị nʼọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu; ndị ahụ bi nʼala nke onyinyo ọnwụ ka ìhè nwukwasịrị.
3 Umeliongeza taifa; umeongeza furaha yao. Wamefurahia mbele yako kama furaha ya kipindi cha mavuno, kama watu wanavyofurahi kugawanya nyara.
I meela ka mba ahụ baa ụba dịrị ukwuu, mee ka ọṅụ ha dịkwa ukwuu, ha na-enwe ọṅụ nʼihu gị, dịka ọṅụ nke ndị ọrụ ubi nʼoge owuwe ihe ubi, dịka ndị agha na-etegharị egwu ọṅụ mgbe ha na-ekesa ihe a kwatara nʼagha.
4 Maana nira ya mzigo wake, boriti katika mabega yake, fimbo ya mkandamizaji, umesambaratisha ndoto kama siku ya Midiamu.
Nʼihi na dịka nʼụbọchị nke Midia, i gbajisiela ibu arọ niile e bokwasịrị ha, ihe mgbochi nke dị nʼubu ha, nke bụ mkpara ndị na-akpagbu ha.
5 Kila buti likanyagalo gasia na vazi limekwisha kwenye damu itachomwa, mafuta kwa moto.
Nʼihi na akpụkpọụkwụ nke ndị agha na-eyi, na uwe agha nke ọbara mechuru, ha ga-abụ ihe a ga-agba ọkụ, ha ga-abụ ihe ndị ga-eme ka ọkụ ree nke ọma.
6 Kwetu mtoto amezaliwa, kwetu mtoto ametoka; na mtawala atakuwa kwenye mabega yake; na jina lake ataitwa mshauri wa ajabu, Mungu mwenye nguvu, Baba wa milele, Mfalme wa Amani.
Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa, e nyekwala anyị otu nwa nwoke. Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị. Ndị a ga-abụ aha ya, Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike, Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo.
7 Enzi yake na amani yake haitakuwa na mwisho, maana anatawala katika kiti cha enzi cha Daudi, na juu ya ufalme wake, ataanzisha hukumu ya haki, tangu sasa na hata milele. Bidii ya Yahwenwa majeshi itafanya haya.
Alaeze ya ga-aba ụba, ọchịchị eze ya ga-abụ nʼọnọdụ udo nke na-enweghị ọgwụgwụ. Ọ bụ nʼocheeze Devid ka ọ ga-anọkwasị, chịakwa nʼalaeze ya. Ọ ga-eme ka alaeze ahụ guzosie ike; ọ bụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume ka ọ ga-eji chịa site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Ịnụ ọkụ nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-emezukwa nke a.
8 Bwana alituma neno juu ya Yakobo, na ikaanguka juu ya Israeli,
Onyenwe anyị eziela ozi megide Jekọb ọ ga-adakwasịkwa Izrel.
9 Watu wote watajua, Hata Samaria na wakazi wote wa Samaria, wanaongea kwa kiburi na moyo wenye kiburi,
Ndị ahụ niile ga-amatakwa ya, Ifrem na ndị bi na Sameria ga-amatakwa bụ ndị na-eji nganga na mpako na-ekwu sị,
10 Matofali yameanguka, lakini tutajenga tena kwa jiwe la patasi; mkuyu umekatwa chini, lakini tutaotesha mierezi katika eneo lao.
“Nkume brik ndị ahụ adakpọsịala ma anyị ga-eji nkume a waziri awazi wughachi ha; ọ bụ ezie na e gbutusịala osisi sikamọ niile anyị ji wuo ụlọ anyị, ma anyị ga-eji osisi ọma sida dochie ha.”
11 Hivyo basi Yahwe atamwinua juu yao Rezini, adui zake, atawakoroga adui zake,
Ma Onyenwe anyị a kpaliela ndị iro Rezin ka ha bilie megide ha, ọ kwaliekwala ndị iro ha.
12 Waaramea upande wa mashariki, na wafilisti upande wa magharibi. Nao watamla Israeli kwa mdomo uliowazi. katika mambo yote haya hasira yake haijapungua; badala yake ameunyosha mkono wake nje.
Ndị Aram sitere nʼọwụwa anyanwụ, na ndị Filistia sitere nʼọdịda anyanwụ ha e werela ọnụ ghere oghe richapụ Izrel. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
13 Lakini hawatageuka kwa yule anayewapiga wao, wala kumtafuta Yahwe wa majeshi.
Ma ọ bụ ezie na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ataala ha ahụhụ dị otu a, ndị Izrel echegharibeghị, ha alọghachikwutebeghị ya.
14 Hivyo basi yao atakata kichwa nakiwiwili cha Israeli, kuti na nyasi, katika siku moja.
Nʼihi ya, nʼotu ụbọchị, Onyenwe anyị ga-ebibi ndịisi Izrel na ndị ọdụdụ, ọ ga-ebibikwa alaka nkwụ na osisi achara niile.
15 Viongozi na watu wenye vyeo na manabii wanaofundisha kuwa uongo ni mkia.
Ndị okenye na ndị a maara aha ha bụ ndịisi ha, ndị amụma ụgha bụ ọdụdụ ha.
16 Wale wanaowaongoza watu hawa wanawaongoza vibaya, na wale wanaongozwa wameangamia.
Nʼihi na ndị ndu nke ndị ya eduhiela ha; ndị na-ezi ha ụzọ emeela ka ha kpafuo.
17 Hivyo basi Bwana atafurahia juu ya vijana wadogo wala hatakuwa na huruma kwa yatima na wajane, maana kila mmoja hana Mungu na ni watenda dhambi, na kila mdomo unazungumza matendo mabaya. Mambo yote haya, hasira yake haijapungua; badala yake mkono wake umenyooka hata sasa.
Ya mere, Onyenwe anyị agaghị enwe mmasị nʼụmụ okorobịa ahụ, ọ gaghị enwekwa obi ebere nʼebe ụmụ ndị na-enweghị nna maọbụ nʼebe ụmụ nwanyị na-enweghị dị nọ, nʼihi na onye ọbụla nʼime ha adịghị asọpụrụ Chineke, bụrụkwa ndị ajọ omume, ọnụ onye ọbụla na-ekwu ihe nzuzu. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
18 Matendo mabaya yataungua kama moto, moto hulao mbigili na miiba; itachoma hata vichaka vya mwitu, na safu ya moshi mkubwa upaa.
Nʼezie, ajọ omume na-ere dị ka ọkụ: ọ na-erepịa ogwu na uke, ọ na-emekwa ka oke ọhịa nwuru ọkụ, mee ka anwụrụ ọkụ si na ya rigoruo na mbara eluigwe.
19 Japo hasira ya Yahwe wa majeshi imeunguza, na watu ni kama mafuta kwenye moto. Hakuna mtu aliyemuacha ndugu yake.
Nʼihi iwe ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ewe, ahụhụ ọ ga-enye ga-adị ka ọkụ na-ere ere; ọ na-erepịa ala ahụ niile na ndị bi nʼime ya; ọ dịkwaghị onye ga-azọpụta ibe ya.
20 Watanyakuwa chakula katika mkono kulia lakini bado watasikia njaa; watakula chakula kwa mkono wa kushoto lakini hawataridhika. Kila mmoja atakula nyama ya mkono wake mwenyewe.
Nʼala ahụ niile, ma nʼaka nri ma nʼaka ekpe, onye ọbụla ga-agbalị ịdọtara onwe ya ihe oriri. Ha ga-eri ma afọ agaghị eju ha; nʼezie, ha ga-eri ọ bụladị anụ ahụ ụmụ nke aka ha.
21 Manase; kwa pamoja watavamia Yuda. Mambo yote haya, hasira yake haitapungua; badala yake, amenyoosha mkono wake hata sasa.
Ndị Manase ga-alụso ndị Ifrem ọgụ, ndị Ifrem ga-alụsokwa ndị Manase ọgụ. Ha abụọ kwa ga-ejikọta aka lụso Juda ọgụ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ. Aka ya ka setịpụkwara esetipụ.

< Isaya 9 >