< Isaya 7 >

1 Siku zile wakati Ahazi mtoto wa Yothani mtoto wa Uzia, mfalme wa Yuda, Rezeni mfalme wa Amramu, na Peka mtoto wa Remaelia, mfalme wa Israeli, walienda Yerusalemu kupigana vita nao, lakini hawakuweza kushinda vita.
Mgbe Ehaz, nwa Jotam, nwa nwa Ụzaya bụ eze na Juda, Rezin eze Aram, na Peka eze Izrel, nwa Remalaya, busoro Jerusalem agha. Ma ha emerighị ya; obodo ahụ guzosiri ike.
2 Ilitaarifiwa kwa nyumba ya Daudi kwamba Amramu amejiunga na Efraimu. Moyo wake na moyo watu wake ukatetemeka, kama vile miti ya misitu inavyopepea kwa upepo.
Ma mgbe e mesịrị, ozi ruru ụlọ Devid ntị sị, “Ndị Aram na Ifrem ejikọọla onwe ha ọnụ”; nke a mere ka ụlọeze, na obi ndị ọ na-achị maa jijiji, dịka osisi dị nʼọhịa si ama jijiji mgbe oke ifufe na-efe.
3 Ndipo Yahwe akamwambia Isaya, ''Nenda nje na kijana wako, Sheari Jashubu ukaonane na Ahazi mwisho wa mfereji wa birika la juu, katika njia kuu ya uwanja Dobi.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Aịzaya okwu sị ya, “Jekwuru Ehaz bụ eze. Mgbe ị na-aga, kpọrọ Shịa-Jashub nwa gị nwoke. Unu ga-ahụ Ehaz nʼakụkụ Elu elu olulu ọdọ mmiri nke dị nʼụzọ ahụ gawara nʼAla ọsụ akwa.
4 Mwambie, 'awe makini, awe mtulivu, asiogope au vitisho kwa sababu ya mikia hii miwili ya vingi hivi vitokavyo moshi, kwa sababu ya hasira kubwa ya Resini na Amramu, na mtoto wa Remalia.
Gwa ya ka ọ ghara inye ndụ ya nsogbu, ka ọ gharakwa ịtụ egwu. Sị ya, ‘Lezie anya, nọ jụụ, echegbula onwe ya banyere icheku ọkụ abụọ ahụ na-anyụ anyụ. Atụla egwu nʼihi iwe Rezin nwa Aram, na iwe Peka nwa Remalaya.
5 Amramu, Ephraimu, na mtoto wa Remaeli wamepanga mabaya juu yako; wamesema, '' njooni tuwavamie Yuda na kuwaogopesha,
E, Aram, na Ifrem, na nwa nwoke Remalaya, agbaala izu ibuso gị agha ịla gị nʼiyi. Ha ekwuola sị,
6 njooni tujipange na tumueweke mfalme wetu ndani ya Yuda, mtoto wa Tabaeli.''
“Ka anyị wakpo Juda, ka anyị dọwaa ya ma kee ya nʼetiti onwe anyị, mee nwa Tabeel ka ọ bụrụ eze ya.”
7 Bwana Yahwe asema, ''haitatokea; haitaonekana,
Ma otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “‘Ọ gaghị adị ire! Ọ gaghị emezukwa.
8 maana kichwa cha Amramu ni Damaskasi, na kishwa cha Damaskasi ni Rezini. Ndani ya miaka sitini na tano, ndoto za Ephraimu zitasambaratishwa na hapatakuwa na watu.
Nʼihi isi obodo Aram bụ Damaskọs. Onyeisi Damaskọs bụ naanị Rezin. Ma tupu afọ iri isii na ise agafee a ga-etikpọkwa Ifrem.
9 Efraimu ni kichwa Samaria, na kishwa cha Samaria ni mtoto wa Remaria. Na kama hamtasimama imara katika imani yenu, hakika hamtakuwa salama''.
Isi obodo Ifrem bụ Sameria. Onyeisi Sameria bụ naanị nwa Remalaya. Ọ bụrụ na unu eguzosighị ike nʼokwukwe unu, unu agaghị eguzo ma ọlị.’”
10 Bwana akaongea tena na Ahazi,
Ọ dịghị anya, Onyenwe anyị ziri Ehaz ozi ndị a sị,
11 ''Omba ishara ya Yahwe Mungu wako; omba juu ya hilo kwa kina au kwa kiwango cha juu.'' (Sheol h7585)
“Jụọ m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, ka m meere gị ihe ịrịbama nke ga-egosi gị na m ga-ebibi ndị iro gị niile dịka m kwuru. Rịọọ m ihe masịrị gị, nʼebe dị elu nʼeluigwe maọbụ nʼebe kachasị omimi nʼụwa.” (Sheol h7585)
12 Lakini Ahazi anasema, sintomba wala kumjaribu Yahwe.''
Ma Ehaz zara sị, “Mba, agaghị arịọ, agaghị m anwakwa Onyenwe anyị m otu a.”
13 Hivyo Isaya akajibu, ''sikilizen, nyumba ya Daudi. Je haijatosha kwa watu kuujaribu uvumilivu wa watu? Je ni lazima kuujaribu uvumilivu wa Mungu?
Ma Aịzaya sịrị, “Ṅaanụ ntị unu ụlọ Devid. Ọ bụ na o zurughị unu ime ka ike gwụ mmadụ? Unu ga-emekwa ka ike gwụ Chineke nʼonwe ya?
14 Hivyo basi Mungu mwenyewe atawapa yeye mwenywe ishara: ona, mwanamke bikira atapata mimba na kumzaa mtoto, na atamwita Emanueli.
Ya mere, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-enye gị ihe ịrịbama! Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ ga-akpọ aha ya Ịmanụel, nke pụtara, Chineke nọnyeere anyị.
15 Atakula siagi na asali na wakati anapojua kuyakataa maovu na kuchagua mema.
Mmiri ara ehi rahụrụ arahụ na mmanụ aṅụ ka nwantakịrị ahụ ga-eri mgbe ọ matara ịjụ ihe ọjọọ na ịhọrọ ezi ihe.
16 Maana kabla mtoto ajajua kuyakataa maovu na kuchagua mema, nchi ambayo wewe unawachukia wafalme itakuwa ukiwa.
Tupu a zụlite nwantakịrị ahụ ịmata ịhọrọ ezi ihe na ịjụ ajọ ihe, ndị eze abụọ ndị ị na-atụ egwu ha, ga-anwụcha.
17 Yahwe ataleta juu yako, juu ya watu wako, na juu ya nyumba ya baba yako siku hazijatimmia tangu Efraimu alipompokea Yuda- atamleta mfalme wa Asiria.''
Onyenwe anyị ga-eme ka ọbụbụ ọnụ dị ukwuu bịakwasị gị na obodo gị, na ezinaụlọ gị. Ihe egwu ga-adịkwa, ụdị nke a na-ahụbeghị mbụ, site nʼoge e kewapụrụ Ifrem site na Juda. Eze Asịrịa ga-edu ndị agha ya bịa.”
18 Mda huo Yahwe atapuliza filimbikwa ajili ya kupaa kutoka mkondo wa umbali wa Misri, na maana nyuki kutoka nchi ya Asiria.
Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-akpọku ijiji site na nsọtụ Naịl dị nʼIjipt nakwa aṅụ sitere nʼala Asịrịa.
19 Zitakuja na kukaa chini ya korongo, ndani ya mapango ya miamba, kwenye vichaka vya miba, na kwenye malisho.
Ha ga-abịa nʼigwe, bichie ndagwurugwu ala gị niile, na nʼọgba nkume niile, na nʼọhịa ogwu ogwu niile, na nʼọzara niile, na nʼezi ala niile.
20 Katika mda huo Bwana atamnyoa kichwani kichwani na nywele za miguuni kwa wembe ulioazimwa mto Efrarate— mfalme wa Asiria - na vilevile utasafisha ndevu zote.
Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eji agụba e gotara nʼofe osimiri, nke bụ eze Asịrịa, kpụchapụ unu agịrị isi na ajị ụkwụ, kpụchapụkwa afụọnụ unu niile.
21 Siku hiyo, mtu atahifadhi ndama na na kondoo wawili,
Nʼụbọchị ahụ, otu onye ga-edebe otu nwa ehi na ewu abụọ ndụ.
22 na kwasababu ya maziwa yatakayo patikana ni mengi, atakula siagi, maana kila atakaye bakia kwnye nchi atakula siagi na asali.
Onye ọbụla kwa nʼala ahụ ga-eri mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, ya na mmanụ aṅụ, nʼihi na mmiri ara ehi ga-aba ụba nke ukwuu nʼala ahụ.
23 Mda huo, kutakuwa na maelfu ya mizabibu na thamani elfu za shekeli, hakutakuwa na kitu zaidi ya kuzalisha mbigiri na miiba.
Nʼụbọchị ahụ, ala ọbụla nke nwere otu puku osisi vaịnị nke ọnụahịa ya ruru otu puku shekel ọlaọcha ga-abụ naanị ogwu na uke.
24 Watu watenda pale kuwinda kwa upinde, kwa sababu nchi yote itazalisha mbigiri na miiba.
Ndị dinta ga-achịrị àkụ na ùta gaa nʼebe ahụ, nʼihi na uke na ogwu ga-ekpuchi ala ahụ.
25 Watakaa mbali na vilima vitalimwa kwa jembe, kwa sababu ya hofu ya mbigiri na miiba, lakini hapo patakuwa mahali pa kuchungia ngo'mbe na kondoo
Ma banyere ugwu eji ọgụ kọọ na mbụ, ị gaghị abakwa nʼebe ahụ ọzọ nʼihi egwu uke na ogwu; ha ga-abụ ebe a na-atọpụ ehi na ebe atụrụ na-agbagharị.

< Isaya 7 >