< Mwanzo 12 >

1 Kisha Yahwe akamwambia Abram, “Nenda utoke katika nchi yako, na toka kwa ndugu zako, na kwa jamaa za baba yako, uende katika nchi nitakayo kuonesha.
Onyenwe anyị gwara Ebram okwu sị, “Site nʼobodo gị, sikwa na ụmụnna gị na ezinaụlọ nna gị, gaa nʼala m ga-egosi gị.
2 Nitakufanya uwe taifa kubwa, na nitakubariki na kulifanya jinalako kuwa kubwa, na utafanyika baraka.
“Aga m eme gị mba ukwu, aga m agọzi gị, aga m eme ka aha gị dị ukwuu, ị ga-abụ ngọzị.
3 Nitawabariki wakubarikio, lakini asiye kuheshimu nita mlaani. Kupitia kwako familia zote za nchi zitabarikiwa.
Aga m agọzi ndị na-agọzi gị, ma onye ọbụla kọchara gị ka m ga-akọcha; a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị.”
4 Kwa hiyo Abram akaondoka kama vile Yahwe alivyo mwambia kufanya, na Lutu akaenda pamoja naye. Abram alikuwa na miaka sabini na mitano wakati alipotoka Harani.
Ya mere, Ebram hapụrụ gaa dịka Onyenwe anyị gwara ya. Lọt sokwa ya. Ebram agbaala iri afọ asaa na ise mgbe o si na Haran bulie ije.
5 Abram akamchukua Sarai mkewe, Lutu, mtoto wa ndugu yake, na vyote walivyomiliki ambavyo wamevikusanya, na watu ambao wamewapata wakiwa huko Harani. Wakatoka kwenda katika nchi ya Kanaani, wakafika nchi ya Kanaani.
O duru nwunye ya Serai na Lọt nwa nwanne ya, chịkọtakwa akụ niile ha kpakọbara, na ndị ohu niile ha nwetara nʼala Haran, chee ihu ịga nʼala Kenan. Emesịa ha rutere nʼebe ahụ.
6 Abram akapitia katikati ya nchi hadi Shekemu, hadi mwaloni wa More. Wakati huo wakanaani waliishi katika nchi hiyo.
Ebram jere ije nʼime ala Kenan jeruo nʼebe osisi ukwu More, nke dị nʼobodo Shekem. Ndị Kenan bi nʼala ahụ nʼoge ahụ.
7 Yahwe akamtokea Abram, na kusema, “Nitawapa uzao wako nchi hii.” Kwa hiyo Abram akamjengea madhabahu, Yahwe ambaye alimtokea.
Onyenwe anyị mere ka Ebram hụ ya anya, ọ sịrị, “Aga m enye mkpụrụ gị ala a.” Ya mere, Ebram wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ nye Onyenwe anyị onye gosiri ya onwe ya.
8 Kutoka pale akaenda kwenye nchi ya mlima mashariki mwa Betheli, ambapo alipiga hema yake, magaribi kukiwa na Betheli na mashariki kukiwa na mji wa Ai. Akajenga madhabahu ya Yahwe pale na kuliitia jina la Yahwe.
Emesịa, Ebram hapụrụ ebe ahụ chee ihu nʼala ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Betel, maa ụlọ ikwu ya. Obodo Betel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ma obodo Ai dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ebe ọ mara ụlọ ikwu ya. Nʼebe nsọ ahụ Ebram wuru ebe ịchụ aja, nọrọ nʼebe ahụ kpọkuo aha Onyenwe anyị.
9 Kisha Abram akaendelea kusafiri, akielekea upande wa Negebu.
Ọzọ, Ebram si nʼebe ahụ pụọ gaa ije rute Negev.
10 Kulikuwa na njaa katika nchi, kwa hiyo Abram akaenda kukaa Misri, kwa kuwa njaa ilikua kali katika nchi.
Nʼoge ahụ, oke ụnwụ dara nʼala ahụ. Nʼihi ya, Ebram hapụrụ ala ahụ gaa nʼala Ijipt, ebe o biri nwa oge.
11 Wakati alipokaribia kuingia Misri, akamwambia Sarai mkewe, “tazama, najua kuwa wewe ni mwanamke mzuri.
Ma mgbe ha na-akwado ịbanye ala Ijipt, ọ gwara Serai nwunye ya sị, “Amaara m na ị bụ nwanyị mara mma.
12 Wamisri watakapokuona watasema, huyu ni mke wake, na wataniua mimi, lakini watakuacha wewe hai.
Mgbe ndị Ijipt ga-ahụ gị, ha ga-asị, ‘Onye a bụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, ha ga-egbu m ma hapụ gị ndụ.
13 Hivyo wewe sema kuwa ni dada yangu, ili kwamba niwe salama kwa sababu yako, na kumba maisha yangu yatasalimika kwa sababu yako.”
Gwa ha na ị bụ nwanne m nwanyị, ka ha meso m mmeso ọma nʼihi gị. Ha ga-echebekwa m ndụ nʼihi gị.”
14 Ikawa kwamba Abram alipoingia Misri, Wamisri wakaona kwamba Sarai ni mzuri sana.
Mgbe Ebram rutere Ijipt, ndị Ijipt hụrụ na nwunye ya bụ nwanyị mara mma.
15 Wakuu wa Farao wakamuona, na kumsifia kwa Farao, na huyu mwanamke akachukuliwa kupelekwa nyumbani mwa Farao.
Mgbe ndị ozi Fero hụrụ ya, ha toro ya nʼihu Fero. Nʼihi nke a, ha kpọbatara Serai nʼụlọeze Fero.
16 Farao akamtendea kwa wema Abram kwa ajili yake, na akampatia kondoo, maksai, punda waume watumishi wa kiume, watumishi wa kike, punda wake, na ngamia.
Fero mesoro Ebram mmeso ọma nʼihi nwunye ya. Ebram nwetara igwe atụrụ, na ehi, na nne ịnyịnya ibu, oke na nwunye, na ndị ohu ndị nwoke na ndị nwanyị, na ịnyịnya kamel.
17 Kisha Yahwe akampiga Farao na nyumba yake kwa mapigo makuu kwa sababau ya Sarai, mke wa Abram.
Ma Onyenwe anyị jiri ajọọ ọrịa tie Fero na ndị ezinaụlọ ya ihe otiti nʼihi Serai nwunye Ebram.
18 Farao akamwita Abram na kusema, “Nini hiki ambacho umenifanyia? Kwa nini hukuniambia kuwa alikuwa mke wako?
Mgbe ahụ, Fero kpọrọ Ebram sị ya, “Gịnị bụ ihe a i mere? Gịnị mere ị gwaghị m na ọ bụ nwunye gị?
19 Kwa nini ulisema, 'ni dada yangu; na mimi nikamchukua kuwa mke wangu? Sasa kwa sababu hiyo huyu hapa mke wako. Mchukue na uende zako.”
Gịnị mere i ji sị na ọ bụ nwanne gị nwanyị, si otu a mee m ka m kpọrọ ya ka ọ bụrụ nwunye m? Ugbu a, lee nwunye gị, kpọrọ ya laa.”
20 Kisha Farao akatoa amri kwa watu wake kuhusiana naye, na wakamuondoa, yeye pamoja na mke wake na vyote alivyokuwa navyo.
Fero nyere iwu banyere Ebram na ndị ikom so ya. Ha zilagara ya, ya na nwunye ya, na ihe niile o nwere.

< Mwanzo 12 >