< Mwanzo 11 >
1 Sasa nchi yote ilikuwa inatumia lugha moja na ilikua na usemi mmoja.
Nʼoge ahụ, ụwa niile nwere naanị otu asụsụ, okwu niile bụkwa otu.
2 Ikawa waliposafiri upande wa mashariki, wakaona eneo tambarare katika nchi ya Shinari na wakakaa pale.
Mgbe ndị mmadụ gbasara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ha chọtara ala dị larịị na Shaịna biri nʼebe ahụ.
3 Wakasemezana, “Haya njoni, tufanye matofari na tuyachome kikamilifu.” Walikuwa na matofari badala ya mawe na lami kama chokaa.
Ha gwarịtara onwe ha okwu sị, “Bịanụ ka anyị kpụọ brik, kpọọ ha ọkụ nke ọma.” Ya mere, ha kpụrụ brik kama nkume, jirikwa bitumen kama ụrọ.
4 Wakasema, “njoni, na tujenge mji sisi wenyewe na mnara ambao kilele chake kitafika angani, na tujifanyie jina. Kama hatutafanya, basi tutatawanyika katika uso wa nchi yote.”
Mgbe ahụ, ha kwuru sị, “Bịanụ ka anyị wuore onwe anyị obodo na ụlọ elu, nke elu ya ga-eru nʼeluigwe, ka anyị si otu a meere onwe anyị aha, ka anyị ghara ịbụ ndị a ga-agbasa nʼụwa niile.”
5 Kwa hiyo Yahwe akashuka kuona mji na mnara ambao wazao wa Ibrahimu walikuwa wamejenga.
Onyenwe anyị rịdatara hụ obodo ahụ na ụlọ elu ahụ ndị mmadụ na-ewu.
6 Yahwe akasema, “Tazama, watu hawa ni taifa moja na lugha moja, na wameanza kufanya hivi! Hivikaribuni halitashindikana jambo watakalo kusudia kulifanya.
Onyenwe anyị sịrị, “Lee! Ọ bụrụ na ha malitere ime ihe dị otu a, ugbu a ha bụ otu ndị, nweekwa otu asụsụ, o nweghị ihe ha zubere ime nke ha na-apụghị ime.
7 Njoni, tushuke na tuvuruge lugha yao pale, ili kwamba wasielewane.”
Ngwa, ka anyị rịda gaa gbarụọ asụsụ ha, ka onye o bụla ghara ịghọta asụsụ ibe ya.”
8 Kwa hiyo Yahwe akawatawanya kutoka pale kwenda pande zote za uso wa nchi na wakaacha kujenga mji.
Onyenwe anyị mere ka ha gbasaa nʼelu ụwa niile. Ha kwụsịkwara iwu obodo ahụ.
9 Kwa hiyo, jina lake ukaitwa Babeli, kwa sababu hapo Yahwe alivuruga lugha ya nchi yote na tangu pale Yahwe akawatawanya ng'ambo juu ya uso wa nchi yote.
Ọ bụkwa nke a mere e ji kpọọ obodo ahụ Babel nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị wetara ọgbaaghara nʼasụsụ ndị niile bi nʼụwa. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị si gbasasịa ha nʼelu ụwa dum.
10 Hivi ndivyo vilikuwa vizazi vya Shemu. Shemu alikuwa na umri wa miaka mia moja, na akamzaa Alfaksadi miaka miwili baada ya gharika.
Nke a bụ akụkọ banyere usoro ezinaụlọ Shem. Mgbe afọ abụọ gafechara site nʼoge uju mmiri ahụ, nʼoge Shem gbara narị afọ, ọ mụtara Apakshad.
11 Shemu akaishi miaka miatano baada ya kumzaa Alfaksadi. Pia akazaa wana wengine wa kiume na wa kike.
Shem dịrị ndụ, mgbe ọ mụsịrị Apakshad, narị afọ ise ọzọ, mụtakwa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
12 Wakati Alfaksadi alipokuwa ameishi miaka thelathini na mitano akamzaa Shela.
Mgbe Apakshad gbara iri afọ atọ na ise, ọ mụtara Shela.
13 Alfaksadi aliishi miaka 403 baada ya kumzaa Shela. Akawazaa pia wana wengine wa kiume na wa kike.
Mgbe ọ mụchara Shela, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na atọ ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
14 Wakati Shela alipokuwa ameishi miaka thelathini, akamzaa Eberi.
Shela gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ nwa ya nwoke Eba.
15 Shela aliishi miaka 403 baada ya kumzaa Eberi. Akawazaa pia wana wengine wa kiume na wa kike.
Mgbe ọ ghọrọ nna Eba, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na atọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
16 Wakati Eberi alipokuwa ameishi miaka thelathini na minne, akamzaa Pelegi.
Eba gbara iri afọ atọ na anọ mgbe ọ mụrụ Peleg.
17 Eberi aliishi miaka 430 baada ya kumzaa Pelegi. Akawazaa pia wana wengine wa kiume na wa kike.
Mgbe ọ ghọrọ nna Peleg, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na iri atọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
18 Wakati Pelegi alipokuwa ameishi miaka thelathini, akamzaa Reu.
Peleg gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ Reu.
19 Pelegi aliishi miaka 209 baada ya kumza a Reu. Akawazaa pia wana wengine wa kiume na wa kike.
Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Reu, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ na itoolu ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
20 Wakati Reu alipokuwa ameishi miaka thelathini na miwili, alimzaa Serugi.
Reu gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ mụrụ Serug.
21 Reu aliishi miaka207 baada ya kumzaa Seregu. Akawazaa pia wana wengine wa kiume na wa kike.
Emesịa, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ na asaa ọzọ, mgbe ọ mụsịrị Serug, ọ mụtakwara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
22 Wakati Seregu alipokuwa ameishi miaka thelathini, akamzaa Nahori.
Serug gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ Nahọ.
23 Seregu aliishi miaka mia mbili baada ya kumzaa Nahori. Akawazaa pia wana wengine wa kiume na wa kike.
Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Nahọ, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
24 Wakati Nahori alipokuwa ameishi miaka ishirini na tisa, akamzaa Tera.
Nahọ gbara iri afọ abụọ na itoolu mgbe ọ mụrụ Tera.
25 Nahori aliishi mika 119 baada ya kumzaa Tera. Akawazaa pia wana wengine wa kiume na wa kike.
Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Tera, ọ dịrị ndụ narị afọ na afọ iri na itoolu ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
26 Baada ya Tera kuishi miaka sabini, akamzaa Abram, Nahori, na Haran.
Mgbe Tera gbara iri afọ asaa, ọ ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran.
27 Hivi ndivyo vilikuwa vizazi vya Tera. Tera alimzaa Abram, Nahori, na Harani, na Harani akamzaa Lutu.
Nke a bụ akụkọ gbasara usoro ezinaụlọ Tera. Tera ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran. Haran ghọrọ nna Lọt.
28 Harani akafa machoni pa baba yake Tera katika nchi aliyozaliwa, katika Ur wa Wakaldayo.
Haran nwụrụ nʼihu nna ya Tera nʼala ebe a nọ mụọ ya, nke bụ na Ụọ, obodo ndị Kaldịa.
29 Abram na Nahori wakajitwalia wake. Mke wa Abram aliitwa Sarai na mke wa Nahori aliitwa Milka, binti wa Harani, aliyekuwa baba wa Milka na Iska.
Ebram na Nahọ lụrụ nwunye. Aha nwunye Ebram bụ Serai ma aha nwunye Nahọ bụ Milka. Milka bụ nwa Haran, onye bụ nna Milka na Iska.
30 Sasa Sarai alikuwa Tasa; hakuwa na mtoto.
Ma Serai bụ nwanyị aga, ọ mụtaghị nwa ọbụla.
31 Tera akamtwaa Abram mwanawe, Lutu mwana wa mwanawe Harani, na Sarai mkwewe, mke wa mwanawe Abram, na kwa pamoja wakatoka Ur wa Wakaldayo, kwenda katika nchi ya Kanaani. Lakini walipofika Harani wakakaa pale.
Tera kpọrọ nwa ya Ebram, na nwa nwa ya Lọt, onye bụ nwa Haran, na nwunye nwa ya Serai, bụ nwunye Ebram, duru ha hapụ Ụọ, obodo ndị Kaldịa, pụọ gawa nʼala Kenan. Ma mgbe ha bịarutere nʼobodo Haran, ha kwụsịrị biri nʼebe ahụ.
32 Tera akaishi miaka 205 kisha akafa hapao Harani.
Ọ bụ nʼobodo Haran ka Tera nọ nwụọ, mgbe ọ gbara narị afọ abụọ na ise.