< Ezekieli 48 >

1 Haya ndiyo majina ya makabila. Kabila la Dani litapokea sehemu moja ya nchi; mipaka yake itakuwa karibu na upande wa mashariki mpaka wa Israeli karibu na njia ya Hethloni na Lebo Hamathi. Mpaka wake utaenda hata karibu na Hazari Enani na karibu na mpaka wa Damaskasi hata upande wa kaskazini na kisha karibu na Hamathi. Mpaka wa Dani utaenda kutoka mashariki moja kwa moja hata Bahari Kubwa.
“Nke a bụ aha ebo niile, na ala ha ga-eketa: “Dan otu oke. Site na nsọtụ ugwu, nʼakụkụ ụzọ Hetlon ruo mbata Hamat. Haza Enan na oke ala ugwu Damaskọs, nke dị nʼakụkụ Hamat ga-abụ akụkụ oke ala ha site nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
2 Kupakana na mpaka wa Dani, kutoka upande wa mashariki hata upande wa magharibi, Asheri itakuwa na fungu moja.
Asha ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Dan, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
3 Kupakana na mpaka wa Asheri kutoka upande wa mashariki hata magharibi, Naftali atakuwa na fungu moja.
Naftalị ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Asha, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
4 Kupakana na mpaka wa Naftali kutoka upande wa mashariki hata magharibi, Manase atakuwa na fungu moja.
Manase nwere otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Naftalị, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
5 Kupakana na mpaka wa Manase kutoka upande wa mashariki hata magharibi, Efraimu atakuwa na fungu moja.
Ifrem ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Manase, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
6 Kupakana na mapaka wa Efraimu kutoka mashariki hata magharibi, Rubeni atakuwa na fungu moja.
Ruben ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Ifrem, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
7 Kupakana na mpaka wa Rubeni kutoka mashariki hata magharibi, Yuda atakuwa na fungu moja.
Juda ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Ruben, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
8 Sadaka ya nchi ambayo mtaifanya itakuwa karibu na mpaka wa Yuda na hapohapo kutoka upande wa mashariki hata upande wa magharibi; itakuwa ridhaa elfu ishirini na tano upana. Urefu unakaribiana na fungu la kabila moja kutoka upande wa mashariki hata upande wa magharibi, na hekalu litakuwa katikati yake.
“Ala nke ya na oke ala ndị Juda ga-agbatị site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, ka ị ga-enye dịka onyinye pụrụ iche. Obosara ya ga-abụ ihe dị kilomita iri na atọ. Ogologo ya site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ ga-aha ka ala otu ebo ketara. Ụlọnsọ ukwu ahụ ga-adịkwa nʼetiti ya.
9 Huu mji mtakao utoa sadaka kwa ajili ya Yahwe utakuwa na ridhaa elfu ishirini na tano urefu wake na ridhaa elfu kumi upana.
“Ogologo ebe a ewepụtara iche nye Onyenwe anyị ga-adị kilomita iri na atọ, obosara ya ga-abụ kilomita ise na ọkara.
10 Haya yatakuwa matoleo ya hili fungu takatifu la nchi: makuhani watakuwa na nchi watakayopewa kipimo chake ridhaa elfu ishirini na tano urefu kwa upande kaskazini; ridhaa elfu kumi upana upande wa magharibi; urefu wa ridhaa elfu kumi upande wa magharibi; na urefu rithaa elfu ishirini na tano upande wa kusini, pamoja na mahali patakatifu pa Yahwe katikati yake.
Nke a ga-abụ ala dị nsọ e debere iche nye ndị nchụaja. Nʼakụkụ ugwu, ịdị ogologo ala ahụ ga-abụ kilomita iri na atọ. Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ogologo ya bụ kilomita ise na ọkara. Ogologo nke akụkụ ndịda na nke ugwu bụ otu. Otu a kwa, ogologo nke akụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ bụ otu. Ebe nsọ Onyenwe anyị ga-adị nʼetiti ya.
11 Hii itakuwa wakfu na makuhani wa safu ya Zadoki, aliyenitumikia kwa uaminifu na ambaye hakwenda nje ya mstari wakati watu wa Israeli walipoeenda nje ya mstari, kama Walawi walivyofanya.
Ọ ga-adịrị ndị nchụaja, bụ ụmụ Zadọk ndị e doro nsọ, ndị sitere nʼikwesị ntụkwasị obi jeere m ozi, ndị na-esiteghị nʼiso ụzọ m kpafuo dịka ndị Izrel na agbụrụ Livayị mere mgbe ha mehiere.
12 Sadaka yao itakuwa fungu la hiyo nchi takatifu sana, karibu na mpaka wa Walawi.
Ọ bụ onyinye pụrụ iche a na-enye ha site nʼala ahụ dị nsọ, bụ ala ahụ kachasị nsọ, nke ya na ala ndị Livayị nwekọrọ oke ala.
13 Nchi ya Walawi karibu na mpaka wa nchi ya makuhani itakuwa ridhaa elfu ishirini na tano urefu na ridhaa elfu kumi upana. Urefu wote wa eneo la nchi utakuwa ridhaa elfu ishirini na tano urefu na ridhaa elfu ishirini upana.
“Nʼakụkụ ala ndị nchụaja, a ga-ekenye ndị Livayị ala nke ha. Ha ga-eketa ala nke ogologo ya bụ kilomita iri na atọ, nke obosara ya bụ kilomita ise na ọkara.
14 Hawataiuza au kuibadilisha; hakuna malimbuko ya hiyo nchi ya Israeli itakayogawanywa kutoka haya maeneo, kwa kuwa yote ni matakatifu kwa ajili ya Yahwe.
O nweghị akụkụ ala nsọ a a ga-ere ere, maọbụ nye ya ndị ọzọ, nʼihi na ihe dị nsọ ka ọ bụ nye Onyenwe anyị.
15 Nchi iliyobaki, ridhaa elfu kumi na tano upana na ridhaa elfu ishirini na tano urefu, itakuwa kwa wote wanayoitumia hiyo nchi, nyumba, na sehemu ya malisho; huo mji utakuwa katikati yake.
“Ala nke fọdụrụ, nke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, nke obosara ya dị kilomita ise na ọkara ga-abụ ala ọha. A ga-ewu ebe obibi nʼelu ya, wukwaa ebe ịzụ anụ ụlọ. Obodo ga-adị nʼetiti ya,
16 Hivi ndivyo vitakuwa vipimo vya mji: upande wa kaskazini utakuwa ridhaa 4, 500 urefu; upande wa kusini utakuwa ridhaa 4, 500 urefu; upande wa magharibi utakuwa ridhaa 4, 500 urefu; na magharibi itakuwa ridhaa 4, 500 urefu.
nke ogologo akụkụ ugwu ruru kilomita abụọ na ụma anọ, akụkụ ndịda ruru kilomita abụọ na ụma anọ, akụkụ ọwụwa anyanwụ ruru kilomita abụọ na ụma anọ, na akụkụ ọdịda anyanwụ rukwara kilomita abụọ na ụma.
17 Kutakuwa na malisho ya mji kuelekea kaskazini, ridhaa 250 kwenda chini; hata kusini, ridhaa 250 kwenda chini; kuelekea mashariki, ridhaa 250 kwenda chini, na kuelekea magharibi ridhaa 250 kwenda chini.
Ogologo nke ala ebe ịta nri nke ga-agba obodo ahụ gburugburu ga-aha nʼotu. Ọ ga-adị narị mita na iri mita atọ na ise nʼugwu, na ndịda narị mita na iri mita atọ na ise, nʼọwụwa anyanwụ narị mita na iri mita atọ na ise, nʼakụkụ nʼọdịda anyanwụ narị mita na iri mita atọ na ise.
18 Eneo lililobaki la matoleo matakatifu litanyooshwa ridhaa elfu kumi hata mashariki na ridhaa elfu kumi kuelekea magharibi. Litanyooshwa karibu na mpaka wa matoleo matakatifu, na mazao yake yatakuwa chakula kwa ajili ya wale wanaofanya kazi katika nchi.
Ma nke ga-afọdụ na ya, nʼakụkụ oke ala ahụ dị nsọ nke gara ogologo ya niile, ga-abụ nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ kilomita ise na ọkara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ga-abụkwa kilomita ise na ọkara. Ihe omume ya ga-abụ nri nye ndị ọrụ nke obodo ahụ.
19 Wale wafanyao kazi katika mji, watu wote wa kabila za Israeli, watailima hiyo nchi.
Ndị ọrụ si nʼobodo, bụ ndị na-akọ ya ga-abụkwa ndị sị nʼebo niile nke Izrel.
20 Matoleo yote ya nchi yatapimwa ridhaa elfu ishirini na moja kwa ridhaa elfu ishirini na tano. Kwa njia hii mtatengeneza matoleo matakatifu ya nchi, pamoja na nchi kwa ajili mji.
Ala ahụ niile, ma ala ahụ e doro nsọ, ma ala ndị obodo, ga-adị kilomita iri na atọ nʼakụkụ ya ọbụla.
21 Mabaki ya nchi mojawapo upande wa matoleo matakatifu na eneo la mji litakuwa kwa ajili ya mwana wa mfalme. Eneo la nchi ya mwana wa mfalme kuelekea mashariki litanyooshwa kwa ridhaa elfu ishirini na tano kutoka kwenye mpaka wa matoleo matakatifu hata mpaka wa mashariki-na eneo lake kuelekea mpaka wa magharibi. Katikati kutakuwa matolea matakatifu, na mahali patakatifu pa hekalu patakuwa katikati yake.
“Ala niile fọdụrụ nʼakụkụ abụọ nke ala ahụ dị nsọ, na ala ndị obodo ga-abụ nke nwa eze. Ọ ga-agbatị ruo ọwụwa anyanwụ site nʼọtụtụ kilomita iri na atọ nke oke ahụ dọ nsọ ruo nʼoke ala ọwụwa anyanwụ, sitekwa na kilomita iri na atọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ruo oke ala ọdịda anyanwụ. Akụkụ abụọ ndị a nke gbatịrị ruo nʼoke ala ndị obodo ga-abụ nke onye ọchịchị, ebe nsọ ahụ na ụlọ ukwu ahụ ga-adị nʼetiti ha.
22 Nchi imenyooka kutoka mali ya Walawi na eneo la mji katikati yake litakuwa kwa ajili ya mwana wa mfalme; itakuwa kati ya mpaka wa Yuda na mpaka wa Benjamini-hiyo nchi itakuwa kwa ajili ya mwana wa mfame.
Ya mere, oke ala nke ndị Livayị na ala ndị obodo ga-adị nʼetiti ala nke nwa eze nwee. Oke ala nke nwa eze ahụ ga-adị nʼetiti oke ala Juda na oke ala Benjamin.
23 Kwa kabila zitakazobaki, mafungu yao yataunganishwa kutoka upande wa mashariki. Benjamini atapokea fungu moja.
“Ala e nyere ebo fọdụrụ dị otu a: “Benjamin ga-enwe otu oke, nke sitere nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
24 Kupakana na mpaka wa Benjamini kutoka upande wa mashariki hata magharibi, Simioni atakuwa na fungu moja.
Simiọn ga-enwe otu oke; ha na ndị Benjamin ga-enwekọ otu oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
25 Kupakana na mpaka wa Isakari kutakuwa na fungu moja.
Isaka ga-enwe otu oke; ha na ndị Simiọn ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
26 Kupakana na mpaka wa Isakari kutoka mashariki hata magharibi, Zebuloni atakuwa na fungu moja.
Zebụlọn ga-enwe otu oke; ha na ndị Isaka ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
27 Hata kusini mwa mpaka wa Zebuloni, kutoka upande wa mashariki hata upande wa magahribi, kutakuwa na nchi ya Gadi-fungu moja.
Gad ga-enwe otu oke; ha na ndị Zebụlọn ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
28 Mpaka wa kusini mwa Gadi kutanyooshwa kutoka Tamari hata kwenye maji ya Meriba Kadeshi, mbele hadi kijito cha Misri, na kisha hata Bahari kuu.
Ma oke ala Gad nke chere ihu nʼakụkụ ndịda ga-esi na Tama ruo nʼiyi Meriba Kadesh, sorokwa ọdọ mmiri Ijipt ruo nʼosimiri Mediterenịa.
29 Hii ndiyo nchi ambayo mtakazo gawana; kutakuwa na urithi wa makabila ya Israeli. Haya yatakuwa mafungu yao. Hivi ndivy Bwana Yahwe asemavyo.
“Nke a bụ ala unu ga-ekenye ebo Izrel niile dịka oke ha. Ha ga-abụkwara ha ihe nketa.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
30 Hawa ndio watakaoishi kutoka kwenye nchi: upande wa kaskazini, ambapo patapimwa ridhaa 4, 500 kwa urefu,
“Ndị a ga-abụ ọnụ ụzọ ama e si apụ nʼobodo ahụ. “Nʼakụkụ nke ugwu, nke ịdị ogologo mgbidi ya bụ kilomita abụọ,
31 kutakuwa na malango matatu, yaitwayo kwa ajili ya Israeli: lango moja kwa ajili ya Rubeni, lango moja kwa ajili ya Yuda, na lango moja kwa ajili ya Walawi.
ọnụ ụzọ ama obodo ahụ ga-abụ aha ebo niile nke Izrel. Ọnụ ụzọ ama atọ nʼakụkụ ugwu ga-abụ ọnụ ụzọ ama Ruben, ọnụ ụzọ ama Juda, na ọnụ ụzọ ama Livayị.
32 Kwa upande wa mashariki, ambapo patapimwa ridhaa 4, 500 kwa urefu, kutakuwa na malango matatu: lango moja kwa ajili ya Yusufu, lango moja kwa ajili ya Benjamini, na lango moja kwa ajili ya Dani.
Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nke mgbidi ya dị kilomita abụọ nʼogologo, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya. Ha ga-aza ọnụ ụzọ ama Josef, ọnụ ụzọ ama Benjamin, na ọnụ ụzọ ama Dan.
33 Kwa upande wa mashariki, kutakuwa na kipimo cha ridhaa 4, 500 urefu, kutakuwa na malango matatu: lango moja kwa ajili ya Simioni, lango moja kwa ajili ya Isakari, na moja kwa ajili ya Zebuloni.
Nʼakụkụ ndịda, nke ogologo ya bụkwa kilomita abụọ, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya: ọnụ ụzọ ama Simiọn, ọnụ ụzọ ama Isaka, na ọnụ ụzọ ama Zebụlọn.
34 Kwa upande wa magharibi, ambao kipimo chake kitakuwa ridhaa 4, 500, kutakuwa ba malango matatu: lango moja kwa ajili ya Gadi, lango moja kwa ajili ya Asheri, na lango moja kwa ajili ya Naftali.
Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke ịdị ogologo mgbidi ya bụ kilomita abụọ, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya: ọnụ ụzọ ama Gad, ọnụ ụzọ ama Asha, na ọnụ ụzọ ama Naftalị.
35 Umbali kuuzunguka mji utakuwa ridhaa elfu kumi na nane; kutoka hiyo siku, jina la huo mji litakuwa “Yahwe yupo hapo.”
“Gburugburu obodo ahụ bụ kilomita iri. “Aha a ga-akpọ obodo ahụ site nʼoge ahụ gawa, ga-abụ, ‘Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ.’”

< Ezekieli 48 >